Mgbakọ Distrikti nke Ndịàmà Jehova nke Afọ 2009
1. (a) Olee ngọzi ndị anyị ga-enweta ma anyị gaa ụbọchị atọ niile nke mgbakọ distrikti anyị? (b) Olee atụmatụ anyị kwesịrị ime ugbu a?
1 Anyị niile na-atụ anya mgbakọ distrikti nke afọ 2009, na-atụkwa anya ohere ọzọ anyị ga-enwe iso ndị anyị na ha so eto Jehova, bụ́ ndị “maara mkpa ime mmụọ ha,” zukọọ. (Mat. 5:3) Ka ụbọchị Jehova ji ọsọ na-abịa, anyị na-agba onye ọ bụla n’ime unu ume ịbịa ụbọchị atọ niile a ga-enwe mgbakọ a iji rite uru zuru ezu mgbe anyị na ụmụnna anyị na-akpakọrịta, ritekwa uru n’okwu agbamume si n’Okwu Chineke nke ga-enyere anyị aka ịnọgidesi ike n’okwukwe. (Zef. 1:14) Meenụ ka ndị nkụzi unu na ndị weere unu n’ọrụ mara na mgbakọ a so n’ụzọ dị oké mkpa unu si efe Jehova. Bido n’oge mewe atụmatụ otú ị ga-esi aga, rịọkwa Jehova ka ọ gọzie atụmatụ ndị ị na-eme; obi siekwa gị ike na ọ ga-akwado gị.—Aịza. 50:10.
2. Ọ bụrụ na a họrọghị anyị ịga mgbakọ mba niile, olee ihe ndị nwere ike ime ka mgbakọ distrikti anyị dịrị ka mgbakọ mba niile?
2 Mgbakọ Mba Niile: Ebe ọ bụ na e nwere mba ole na ole a họọrọ ịnọ mee mgbakọ a, ọ bụ naanị ndị a họọrọ ịga kwesịrị ịga. Ọ bụrụ na anyị esoro ntụziaka a, ọ ga-eme ka ndị ga-abịanụ ghara ịkarị akarị. (1 Kọr. 14:40; Hib. 13:17) Ma, ọtụtụ mgbakọ distrikti ndị ọzọ ga-adịkwa ka mgbakọ mba niile, n’ihi na ọtụtụ ndị ozi ala ọzọ, ndị ozi Betel si mba ọzọ, nakwa ụmụnna ndị na-eje ozi ná mba ọzọ ga-aga mgbakọ distrikti ná mba a mụrụ ha.
3. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị hụrụ ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ anyị n’anya?
3 Inyere Ndị Ọzọ Aka Ịga: Ò nwere ụfọdụ ndị n’ọgbakọ unu ọ dị mkpa ka e nyere aka ịga mgbakọ? O nwere ike ịdị mkpa karịchaa ka e nyere ndị ogbi aka ịga mgbakọ nke asaa a ga-enwe na Benin City. A ga-eme ihe omume niile naanị n’asụsụ ndị ogbi. Ọ bụrụ na i nyere ndị ọzọ aka ime otú ahụ, ị “na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe [gị], kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.”—Fil. 2:4.
4, 5. Ọ bụrụ na o nwere ihe mere ị ga-eji aga mgbakọ na-abụghị nke e kenyere ọgbakọ unu, gịnị ka i kwesịrị ime?
4 Ịjụ Ajụjụ: Iji belata ugboro ole a na-akpọ alaka ụlọ ọrụ na fon maka ịjụta ha ụbọchị na ebe a ga-enwe mgbakọ, biko buru ụzọ jụọ odeakwụkwọ ọgbakọ unu ihe ị chọrọ ịma.
5 Ọ bụrụ na ị ga-aga mgbakọ na-abụghị nke e kenyere ọgbakọ unu, i nwere ike ịnara Room Request Form. I dejupụtachaa fọm ahụ, ziga ya ebe e kwesịrị iziga ya, n’adres nke dị n’azụ Room Request Form ndị ọhụrụ anyị nwere. A ga-ezitere ndị odeakwụkwọ ọgbakọ fọm a n’oge na-adịghị anya.
6. Gịnị ka e kwesịrị ime ma ọ bụrụ na onye nkwusa nwere mkpa pụrụ iche chọrọ ka a chọtara ya ụlọ?
6 Ndị Nwere Mkpa Pụrụ Iche: Ọ bụrụ na onye nkwusa chọrọ ka e nyere ya aka chọta ụlọ, Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwesịrị ikpebi ma ò ruru eru ka e dejupụtara ya ebe e dere Special Needs na Room Request Form. Ha kwesịrị ịtụle ntụziaka ndị e dere na fọm ahụ, tupu odeakwụkwọ ọgbakọ ezigara Ndị Na-enye Ụlọ n’Ala Mgbakọ fọm ahụ.
7. (a) Olee ihe anyị ga-eme ma anyị chọọ inweta ụlọ? (b) Olee ihe ndị a na-echetara anyị, bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ịkpa àgwà ọma n’ebe ọ bụla e nyere anyị ụlọ? (Lee igbe bụ́ “Ntụziaka Banyere Ebe Ị Ga-ebi.”)
7 Ịchọ Ụlọ: Ọ bụrụ na ị ga-achọ ka Ndị Na-enye Ụlọ n’Ala Mgbakọ chọtara gị ụlọ n’ebe a ga-enwe mgbakọ, biko mee ihe ndị a:
◼ Nara odeakwụkwọ ọgbakọ unu otu Room Request Form.
◼ Dejupụta Room Request Form ahụ n’ezigbo oge. Biko hụ na i dere ihe niile a chọrọ ka i dee, aha gị, afọ ndụ gị, ma ị̀ bụ nwoke ka ị̀ bụ nwaanyị, nakwa ma ị̀ bụ ọsụ ụzọ ka ị̀ bụ onye nkwusa ọgbakọ. Ihe ndị e dere na Room Request Form ahụ kwesịrị ido anya ma dị mfe ọgụgụ.
◼ Odeakwụkwọ kwesịrị ịhụ na e dejupụtara Room Request Form ahụ nke ọma, bịanye aka na ya, ma zigazie ya n’obodo a ga-enwe mgbakọ ahụ, Ọ BỤGHỊ izitere ya alaka ụlọ ọrụ. Nke a bụ n’ihi na fọm ahụ nwere ike ọ gaghị eru n’oge ma e si n’alaka ụlọ ọrụ ziga ya.
◼ E kwesịrị izigara Ndị Na-enye Ụlọ n’Ala Mgbakọ Room Request Form n’ezigbo oge. Nke a ga-eme ka Ndị Na-enye Ụlọ n’Ala Mgbakọ nwee oge zuru ezu iji chọtara gị ụlọ dị mma.
8. Olee otú anyị ga-esi soro nye aka hụ na onye ọ bụla nwetara ụlọ na-agaghị efu ya oké ego?
8 Anyị achọpụtala na ọ bụghị ndị niile ga-abịa mgbakọ ga-achọ ibi n’ụlọ obibi ndị dị n’Ụlọ Mgbakọ. Ụfọdụ nwedịrị ike ịhọrọ ibi na họtel. Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ibi na họtel, ọ ga-adị mma ma anyị buru ụzọ chọpụta ma Ndị Na-enye Ụlọ n’Ala Mgbakọ hà enwetala ebe ahụ maka ndị ọzọ ga-abịa mgbakọ. Ọ bụrụ na ha enwetala ụlọ ahụ anyị chọrọ ịga okwu ya, ọ ga-adị mma ma anyị chọrọ ebe ọzọ. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, i sorola nye aka hụ na onye ọ bụla nwetara ụlọ na-agaghị efu ya oké ego.—1 Kọr. 10:24.
9. Olee ihe kacha mkpa anyị kwesịrị iburu n’uche mgbe anyị na-akwadebe nakwa mgbe anyị gara mgbakọ distrikti nke afọ 2009?
9 Omume Ndị Na-ewetara Chineke Otuto: Ọ bụrụ na anyị ana-egosi na anyị nwere mkpụrụ nke mmụọ nsọ n’ihe niile anyị na-eme, karịchaa n’otú anyị si akpaso ndị na-arụ ọrụ na họtel na ndị ọzọ nọ n’ebe anyị gara mgbakọ àgwà nakwa n’otú anyị si agwa ha okwu, anyị ga-emekwu ka aha ọma Ndịàmà Jehova nwere pụtakwuo ìhè, meekwa ka ndị ọzọ ghara ịsụ ngọngọ. (1 Kọr. 10:31; 2 Kọr. 6:3, 4) Ka ọbịbịa gị na àgwà gị wetara Chineke otuto ná mgbakọ distrikti nke afọ 2009!—1 Pita 2:12.
Igbe dị na peeji nke 4]
Oge Ihe Omume:
Thursday (Naanị Maka Mgbakọ Mba Niile)
1:20 ehihie - 4:55 uhuruchi
Friday na Saturday
9:20 ụtụtụ - 4:55 uhuruchi
Sunday
9:20 ụtụtụ - 4:00 uhuruchi
[Igbe dị na peeji nke 5]
Ntụziaka Banyere Ebe Ị Ga-ebi:
◼ Were ụlọ Ndị Na-enye Ụlọ n’Ala Mgbakọ nyere gị. Anọla n’ụlọ obibi ndị dị n’ala mgbakọ ma ọ bụrụ na ọ bụghị ebe Ndị Na-enye Ụlọ n’Ala Mgbakọ nyere gị. Ekwela ka ndị gị na ha ga-anọ n’ụlọ e nyere gị karịa ole e kwuru ga-anọ na ya.
◼ Agala n’ebe ndị nwe ụlọ e nyere gị na-achọghị ka ndị mmadụ na-aga. Sie nri naanị ma ọ bụrụ na e kwere ka i mee otú ahụ, siekwa ya naanị n’ebe a gwara gị ka ị nọrọ sie ya.
◼ Agwala onye nwe ụlọ na ị ga-etinyere ya ego n’ihe ya na Ndị Na-enye Ụlọ n’Ala Mgbakọ kwekọrịtara iji hụ na o nyere gị ụlọ ahụ.
◼ Mgbe ị na-achọ ụlọ nke gị, buru ụzọ jụọ Ndị Na-enye Ụlọ n’Ala Mgbakọ iji hụ na ị gaghị were ụlọ ha nwetarala.