Mgbakọ Distrikti “Ndị Ozi nke Udo Chineke” nke Ndịàmà Jehova nke 1996
1 A nụrụ ezi okwu ekele maka usoro ihe omume na-enyeghachi ume ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ site n’ọnụ ọtụtụ n’ime 462,540 ndị jere Mgbakọ Distrikti “Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto” nke 1995 na Nigeria. Obi anyị jupụtara n’ọṅụ n’ịhụ ka 7,603 ndị na-enye Jehova otuto gosipụtara nraranye ha site na baptism mmiri. Anyị ṅụrịrị ọṅụ ịnata akwụkwọ ọhụrụ abụọ ndị ahụ, Jehovah’s Witnesses and Education na Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Anyị ịnụwo ụtọ usoro ihe omume dị otú ahụ na-akpali akpali n’afọ gara aga, ma ọ bụ ná mmalite afọ a, kwesịrị ịkwali anyị n’ezie ime mgbalị nile iji nọrọ ya n’usoro ihe omume a na-edokwa maka Mgbakọ Distrikti “Ndị Ozi nke Udo Chineke” nke 1996. N’ezie anyị nile kwesịrị ịkpọ ndị anyị na-eduziri Bible òkù ma nyere ha aka iso anyị nọrọ n’ebe ahụ. Mgbakọ ndị a ga-abụ nnọọ isi iyi nke agbamume na ike ka anyị na-aga n’ihu n’iji ọṅụ ejere Jehova ozi n’ụbọchị ikpeazụ ndị a.
2 Jide n’aka ime ndokwa gị maka mgbakọ n’ezi oge ka i wee nwee ike ịnọ n’ebe ahụ irite uru n’ụbọchị atọ ahụ nile nke ihe omume ime mmụọ na-enye obi ụtọ, site n’abụ mmeghe ruo n’ekpere mmechi. N’ihi ịrị elu ọnụ ahịa nke usoro ime njem, ugbu a bụ oge ịmalite ichekwa ego ka gị na ezinụlọ gị dum wee nwee ike ịga. Jiri ịhụnanya tinye n’atụmatụ gị ndị pụrụ inwe mkpa enyemaka, karịsịa ndị na-enwe mmasị ọhụrụ, ka ha onwe ha nweekwa ike ịnọ ná nnọkọ ahụ nile. Ọ ga-abụ nnọọ ihe na-enye aka iso onye ọ bụla ị na-eduziri ọmụmụ Bible nke pụrụ ime atụmatụ ịga ya tụlee ihe ọmụma dị n’ihe ntinye a. (Gal. 6:6, 10) Usoro ihe omume ahụ ga-eji olu ụtọ malite n’elekere 9:20 ụtụtụ na Friday ma kwụsị n’ihe dị ka n’elekere 4:30 uhuruchi. Usoro ihe omume Saturday ga-amalite n’elekere 9:00 ụtụtụ ma jiri abụ na ekpere mechie n’ihe dị ka n’elekere 4:00 n’uhuruchi. Nnọkọ ụtụtụ na Sunday ga-amalite n’elekere 9:00, ihe omume ụbọchị ahụ ga-emechikwa n’ihe dị ka n’elekere 3:30 n’ehihie. Ihe ọmụma na-esonụ ga-enyere gị aka ná nkwadebe ndị mbụ ị na-eme.
3 Ntụziaka Maka Inweta Ebe Obibi: Anyị ga-agba mbọ inye ọgbakọ ọ bụla ọnụ ọgụgụ fọm Room Request zuru ezu. Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ijide n’aka na e dejupụtara fọm Room Request ọ bụla e tinyere nke ọma. EDELA nanị ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa chọrọ ebe obibi, dị ka “50 ndị nkwusa,” n’ohere ebe ndị e kwesịrị ide aha ndị a. A ghaghị idejupụta ihe ọmụma nile n’ụzọ dị ọcha na n’ụzọ ga-ekwe ọgụgụ. Biko jide n’aka na i nyere ihe ọmụma zuru ezu banyere aha, afọ ndụ, nwoke ka ọ̀ bụ nwanyị, na ma onye ahụ na-etinye akwụkwọ maka ebe obibi ọ̀ bụ onye ọsụ ụzọ ka ọ̀ bụ onye nkwusa ọgbakọ. Tinye aha ụmụaka ná ndepụta ahụ. N’oge ndị gara aga, ọgbakọ ụfọdụ edepụtawo nanị aha ndị toro eto. Nke a na-eme ka ndokwa ebe obibi sie ike nke ukwuu. Ọ bụrụ na ohere dị na fọm ahụ ezughịrị unu, jiri ibe akwụkwọ ọzọ mee ihe. Ọ bụrụ na e dere ihe karịrị aha otu onye na fọm ahụ, biko gosipụta ihe jikọrọ ndị ahụ na-etinye akwụkwọ ebe obibi n’ohere kwesịrị ekwesị. Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ijide n’aka na e dejupụtara fọm Room Request ahụ n’ụzọ ziri ezi tupu o zigara ya Ngalaba Ụlọ Obibi nke mgbakọ.
4 Mkpa Ndị Pụrụ Iche: Ndokwa nke a bụ nanị maka ndị nkwusa na-egosi ezi ihe nlereanya, tinyere ụmụ ha na-akpa ezi àgwà, bụ́ ndị Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ nwapụtara. Ndokwa ilekọta ndị nwere mkpa pụrụ iche kwesịrị ịbụ nke ọgbakọ ebe ha na-aga ga-eme kama ịtụkwasị ibu ọrụ nke a n’isi nhazi mgbakọ. Ndị okenye na ndị ọzọ maara banyere ọnọdụ onye ahụ pụrụ iji ịhụnanya nye aka. Ọtụtụ mgbe nke a na-achọ ka ndị nkwusa tụlee mkpa nke ndị nọ n’ozi oge nile, ndị agadi, ndị ahụ na-adịkwaghị ike, na ma eleghị anya ndị ọzọ. Ndị nkwusa pụrụ inye aka site n’ịkpọrọ ndị dị otú ahụ ma ọ bụ site n’ilekọta mkpa ha n’ụzọ ndị ọzọ dị irè.—Jes. 2:15-17; 1 Jọn 3:17, 18.
5 N’ezie, Ngalaba Ụlọ Obibi ga-agba mbọ inye ndị nkwusa nwere mkpa ndị pụrụ iche ụlọ ndị kwesịrị ekwesị ma ọ bụrụ na ndị nọ n’ọgbakọ apụghị inyere ha aka. Ndị nkwusa a pụrụ isoro odeakwụkwọ ọgbakọ kwurịta ọnọdụ ha. Odeakwụkwọ kwesịrị isoro Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwurịta okwu iji hụ ma ọ̀ ga-ekwe ọgbakọ mee inyere ndị a aka ịhụ maka ụlọ obibi nke ha. Ọ bụrụ na ọgbakọ enweghị ike inye enyemaka dị mkpa, odeakwụkwọ pụrụ inye ndị dị otú ahụ otu fọm Room Request bụ́ nke o dekwasịworo n’ụzọ doro anya, n’elu peji nke mbụ, okwu ndị bụ́ “MKPA NDỊ PỤRỤ ICHE.” Nanị ndị nwere mkpa pụrụ iche kwesịrị idejupụta fọm nke a e nyere akara pụrụ iche. Ọ bụ onye ahụ na-achọ ka e nye ya ụlọ ga-edejupụta ya. E kwesịrị iweghachiri ya odeakwụkwọ, bụ́ onye ga-eleru ya anya maka izu ezu, izi ezi, na ịnwapụta ọnọdụ ndị mere ka onye ahụ ruo eru maka nchebara echiche dị otú ahụ. Odeakwụkwọ GA-AKỌWA N’ỤZỌ ZURU EZU ọnọdụ ahụ n’ohere e nyere n’azụ fọm ahụ. E kwesịrị ime ihe a nile n’ezigbo oge tupu mgbakọ eruo. Odeakwụkwọ ga-ezipụziri Ngalaba Ụlọ Obibi fọm ahụ. A ga-ezi kpọmkwem onye ahụ na-achọ ka e nye ya ụlọ ozi banyere ụlọ ahụ.
6 Ndị nwere mkpa pụrụ iche EKWESỊGHỊ ịga ná mgbakọ ma tinye akwụkwọ maka ụlọ mgbe ha bịarutere, n’ihi na Ngalaba Ụlọ Obibi aghaghị inweta nkwado nke Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ.
7 Ụlọ Obibi n’Ebe Obibi Ndị Mmadụ: Ọ bụrụ na e nyere gị ụlọ n’ebe obibi nke nwanna ma ọ bụ onye ụwa, biko buru n’uche na o kwesịghị ekwesị iji mmụọ ile ọbịa ya mee ihe na-ezighị ezi wee tụọ anya ka ọ hapụrụ gị ụlọ maka ụbọchị ndị ọzọ tupu ma ọ bụ mgbe mgbakọ ahụ gasịrị. A na-enye ụlọ ndị a maka oge mgbakọ ahụ NANỊ. Ndị e nyere ụlọ ndị dị otú ahụ kwesịrị ijide n’aka na ha na ụmụ ha ji nkwanye ùgwù mee ihe metụta ebe obibi onye ha bi na nke ya, gharakwa ịkwaghasị ma ọ bụ ibibi ihe onwunwe nke onye nwe ụlọ ma ọ bụ banye n’akụkụ ebe obibi ahụ ndị dịịrị nanị onye nwe ụlọ. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ enwee ihe isi ike ọ bụla n’akụkụ ndị a, e kwesịrị ime ka onye nlekọta ụlọ ná mgbakọ ahụ mata ozugbo, ọ ga-enwekwa obi ụtọ inye aka.
8 Ịhọrọ Mgbakọ Gị: N’okpuru, n’usoro ụbọchị, e depụtasịrị obodo mgbakọ ọ bụla na sekit (ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ) e kenyere ije mgbakọ nke ọ bụla. Ọ gwụla ma e nwere ọnọdụ ndị pụrụ iche, i kwesịrị ije mgbakọ ebe e kenyere sekit ma ọ bụ ọgbakọ unu. N’ebe a ga-enwe mgbakọ abụọ ma ọ bụ karị n’otu ebe, i kwesịrị ije n’ụbọchị e depụtara maka sekit unu ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ. Ka ị na-eme atụmatụ gị ịga, were ịhụnanya gụnye ndị ọzọ nwere mkpa enyemaka, karịsịa ndị na-enwe mmasị ọhụrụ, ka ha onwe ha nweekwa ike ịga nnọkọ ahụ nile.—Gal. 6:10.
9 Asụsụ Ndị Ogbi na Ndị Ntị Chiri: Ná mgbakọ OTA 7, a ga-enwe na December 13-15, 1996, na mgbakọ ULI 7 a ga-enwe na January 10-12, 1997, a ga-eme ndokwa ka ụmụnna nwoke na nwanyị ruru eru sụgharịa ihe omume ahụ nile gaa n’Asụsụ Ndị Ogbi na Ndị Ntị Chiri. A na-agba ndị ntị chiri n’ọgbakọ nile na Nigeria ume ka ha malite na-eme atụmatụ ịga ọ dịkarịa ala, otu n’ime mgbakọ ndị a. Ndị okenye kwesịrị iji ịdị uchu chọpụta site n’aka onye ọ bụla ntị chiri n’ọgbakọ ha onye na-aghọta Asụsụ Ndị Ogbi na Ndị Ntị Chiri iji jide n’aka na ndị a maara banyere ndokwa nke a na iji kpebie ma è nwere mkpa enyemaka ọ bụla ka ha wee nwee ike ịga.
10 Ndị Na-eje Mgbakọ Ebe A Na-ekenyeghị Ha: N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ọnọdụ nile, ebe e kenyere unu ije bụ ebe kasị dịrị ọgbakọ unu nso. Inwe oche, akwụkwọ, ihe oriri, ụlọ, na ihe ndị ọzọ zuru ezu, na-adabere ná nkweta nke na ndị nkwusa ka n’ọnụ ọgụgụ ga-eje mgbakọ nke e kenyere ọgbakọ ha. Otú ọ dị, ọ bụrụ na n’ihi ezi ihe ụfọdụ, ị ga-eje mgbakọ na-abụghị nke e kenyere gị, i wee chọọ ka e nye gị ụlọ, odeakwụkwọ ọgbakọ pụrụ inye gị fọm Room Request. Ị pụrụ idejupụta ya wee nye ya odeakwụkwọ ka ọ bịanye aka na ya tupu i ziga ya ná mgbakọ nke ị chọrọ ịga.
11 A Chọrọ Nkwado Unu: Ịga nke ọma nke ndokwa nke a maka ụlọ obibi na-adabere ná nkwado nke ndị nile o metụtara. (Hib. 13:17) Ya mere, anyị na-arịọ mmadụ nile ka ha kwadoo ndokwa ụlọ nke Society mere n’ụzọ zuru ezu. Biko dịrị njikere ịnara ụlọ e kenyere gị ma ọ bụ ìgwè ma ọ bụ ọgbakọ gị. Ọ bụrụ na ị ghaghị ime ndokwa nke gị, ma eleghị anya n’ihi na ụlọ e kenyere gị amasịghị gị, ị pụrụ ime otú ahụ. Ma anwala inweta ụlọ nke Ngalaba Ụlọ Obibi nwetaworo, site n’ịchọ ịkwụ ego karịrị nke e kwekọrịtaworo ịkwụ. Nke a agaghị abụ igosi ụmụnna gị obi ọma na ịhụnanya, ọ bụkwa omume eguzosighị ike n’ihe nye nzukọ Jehova. Anyị maara na ọ na-amasịkarị ụmụnna inweta ụlọ n’ebe dị nso n’ala mgbakọ ahụ, ma ọ bụghị mmadụ nile ka a pụrụ inyecha ụlọ n’ụzọ dị otú a. Ụfọdụ aghaghị ibi n’ebe dịtụ anya site n’ala mgbakọ ahụ. Ọ bụrụ na ọ dabara gị ịnọ n’ebe obibi dị anya site n’ala mgbakọ, gụọ nke a dị ka àjà ị na-aghaghị ịchụ ma gosi ekele maka nrụsi ọrụ ike nke Ngalaba Ụlọ Obibi n’idokwara gị ebe obibi. Ọ bụ nanị maka ụbọchị ole na ole, mgbe ahụ ị pụrụ ịlaghachi n’ọgbakọ ebe i bi. Ma ọ bụrụ na ị chọrọ ime ndokwa nke onwe gị, biko buru ụzọ chọpụta site n’aka Ngalaba Ụlọ Obibi ma hà enwetawo ụlọ ahụ nke ị na-achọ ikwu okwu ya ma ọ bụ na ha enwetabeghị ya. Ọ ga-abụ nzube nke Ngalaba Ụlọ Obibi ịhụ na ụmụnna anyị na ndị ọzọ ga-abịa nwetara ụlọ nke ga-enye ha ntụsara ahụ nke dịkwa ọnụ ala ruo ókè o kwere mee, dị ka ọnọdụ ha si dị, ka ha wee nwee ume ọhụrụ, nweekwa ike inwetazu ezi uru ime mmụọ nke usoro ihe omume ahụ.
12 Ịda iwu n’akụkụ nile e kwuru n’elu na-eme ka o sie ike ikwu okwu ụlọ, ha na-ewetakwara aha na nzukọ Jehova nkọcha. (Abụ Ọma 119:168) Ya mere, Society ga-agwa Ngalaba Ụlọ Obibi ka ha jụta ndị nwe ụlọ iji mara ma ọ̀ dị nke na-enwe nsogbu na onye na-akpata ya. Nhazi mgbakọ na-arụsi ọrụ ike iji gbochiere ụmụnna anyị mmefu dị ukwuu ruo ókè o kwere mee. Ya mere, ọ ga-akara mmadụ nile mma ịkwado ndokwa ebe obibi nke Society na-eme n’ụzọ zuru ezu ka ndokwa a wee na-aga n’ihu. A na-enwe ekele dị ukwuu ná nkwado unu ji nguzosi ike n’ihe na-enye ndokwa a sitere n’aka Jehova, site n’aka ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.
[Okwu Dịịrị Òtù Ndị Okenye: Mgbe unu natara ihe ntinye a, biko maanụ ọkwa ná Nzukọ Ije Ozi nke so ya, tinyekwara n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ga-esochi banyere ebe na ụbọchị nke Society kenyere ọgbakọ unu. Ọ ga-adị mma ịka akara n’ebe na ụbọchị mgbakọ nke e kenyere ọgbakọ unu, wee mapawa akụkụ ihe ntinye ahụ na bọọdụ ịma ọkwa.
Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ime akụkụ ihe omume na ịma ọkwa ndị metụtara mgbakọ ná nzukọ ndị a ga-enwe n’ọdịnihu. Ndị okenye nile ga-achọ inye nkwado zuru ezu, iji hụ na e mere ihe ọsọ ọsọ, n’ịnụ ọkụ n’obi, na n’ụzọ dịkwa irè banyere ihe ndị metụtara mgbakọ.]