Ị̀ Na-echeta?
Ị̀ hụwo mbipụta ndị na-adịbeghị anya nke Ụlọ Nche dị ka ihe baara gị ezi uru? Mgbe ahụ gịnị ma i jiri ajụjụ ndị na-esonụ nwalee ikike ncheta gị?
◻ Gịnị ka Amagedọn ga-adị ka ya? (Mkpughe 16:14, 16)
Ọ gaghị abụ apọkalips nuklia ma ọ bụ ọdachi nke ụmụ mmadụ kpalitere. Ee e, ọ bụ agha Chineke ga-eji kwụsị agha nile nke ụmụ mmadụ, bibie ndị nile na-akwalite agha ndị dị otú ahụ, na iji weta ezi udo maka ndị hụrụ udo n’anya. Ọ gaghị anọ ọdụ. (Habakuk 2:3)—4/15, peji nke 17.
◻ Ụdị agbamakwụkwọ dị aṅaa na-asọpụrụ Jehova?
Agbamakwụkwọ ebe ihe ime mmụọ na-achịkwa ụzọ ụwa si eme ihe ga-asọpụrụ Jehova n’ezie. Ndị Kraịst ga-anụ ụtọ ihe omume ahụ ma ọ bụrụ na ha ezere omenala rụrụ arụ, nkwenkwe ụgha, na imebiga ihe ókè nke ụwa; ma ọ bụrụ na ha ekweghị ka o gbochie ihe omume ọchịchị Chineke a na-eme mgbe nile; na ma ọ bụrụ na ha egosipụta obi umeala kama ime oké ngosi.—4/15, peji nke 26.
◻ Olee ihe ndị e ji amata onye na-eguzosi ike n’ezi ihe?
A pụrụ ịtụkwasị onye na-eguzosi ike n’ezi ihe obi, ọ bụghị nanị site n’aka mmadụ ibe ya kamakwa, nke ka mkpa, site n’aka Chineke. A na-ahụta ịdị ọcha nke obi onye dị otú ahụ n’omume ya. O nweghị ihu abụọ. Ọ dịghị aghụghọ ma ọ bụ bụrụ onye rụrụ arụ. (2 Ndị Kọrint 4:2)—5/1, peji nke 6.
◻ Gịnị ka mpụta Mosis na Elaịja pụtara n’ọhụụ nnwogha ahụ sere onyinyo ya?
N’ọnọdụ nnwogha ahụ Mosis na Elaịja bụ ihe nnọchianya kwesịrị ekwesị nke ụmụnna Jisọs e tere mmanụ. Na ha, dịkwa ka Jisọs, bụ “ndị e mere ka a hụ ha anya n’ebube” sere onyinyo na a ‘ga-enyekọ’ ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ ha na Jisọs ‘otuto’ ná ndokwa Alaeze eluigwe. (Luk 9:30, 31; Ndị Rom 8:17; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:10)—5/15, peji nke 12, 14.
◻ Gịnị bụ “ihe nzuzo dị nsọ” nke Chineke? (1 Ndị Kọrint 2:7, NW)
“Ihe nzuzo dị nsọ” nke Chineke hiwere isi na Jisọs Kraịst. (Ndị Efesọs 1:9, 10) Otú ọ dị, ọ bụghị nanị ịmata Jisọs dị ka onye bụ Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa. Ọ na-emetụta ọchịchị eluigwe, Alaeze Mesaịa nke Chineke, ọ na-agụnyekwa ọrụ e kenyere Jisọs ịrụ ná nzube Chineke.—6/1, peji nke 13.
◻ Olee otú onye Kraịst kwesịrị isi ele ịka nká ma ọ bụ nrịanrịa anya?
Kama ile ọnwụnwa ndị dị otú ahụ anya dị ka ihe ndị na-ebelata ozi ọ na-ejere Jehova, o kwesịrị ile ha anya dị ka ohere ịmụba ndabere ọ na-adabere na ya. O kwesịkwara icheta na a na-atụ abamuru nke onye Kraịst n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, ọ bụghị nanị site n’ókè ọrụ ya, kamakwa site n’okwukwe na ịdị omimi nke ịhụnanya ya. (Mak 12:41-44)—6/1, peji nke 26.
◻ Olee otú ojiji Jehova ji ụmụ mmadụ dee Bible, kama iji ndị mmụọ ozi, si egosi oké amamihe ya?
A sị na mmetụta mmadụ adịghị ya ma ọlị, ọ pụrụ isiri anyị ike ịghọta ozi Bible. Ọzọ, Bible nwere ikpo ọkụ, ịdịgasị iche, na ndọrọ nke mmetụta mmadụ na-enye ya.—6/15, peji nke 8.
◻ Gịnị bụ isi ihe na-akpata obi ụtọ ezinụlọ?
A na-achọta isi ihe ahụ na peji dị iche iche nke Okwu Chineke, bụ́ Bible, na n’itinye ụkpụrụ ya ndị dị ka njide onwe onye, ịnakwere ịbụisi, ezi nkwurịta okwu, na ịhụnanya n’ọrụ.—6/15, peji nke 23, 24.
◻ Olee otú ọgwụgwọ Jisọs gwọrọ si dị nnọọ iche n’ihe ndị na-azọrọ ikike ịgwọ ọrịa na-emekarị taa?
E nweghị ngosi mmetụta uche siri ike site n’aka ìgwè mmadụ, e nweghịkwa mwụgharị ihu na azụ n’akụkụ nke Jisọs. Ọzọkwa, ọ dịghị mgbe Jisọs ji nzọrọ bụ na onyinye ha erughị ihe a chọrọ ma ọ bụ na ha enweghị okwukwe hapụ ịgwọ ndị ahụ na-adịghị ike.—7/1, peji nke 5.
◻ Olee otú Jehova siworo nyere ndị ya aka inwe ọnọdụ ná nzube ya dị nsọ n’ihe banyere aha na Alaeze ya?
Nke mbụ, Jehova nyere ndị ya eziokwu ahụ. Nke abụọ, o nyere ha mmụọ nsọ ya. Nke atọ kwa, anyị nwere òtù ụmụnna anyị zuru ụwa ọnụ na ndokwa nzukọ Jehova maka ofufe.—7/1, peji nke 19, 20.
◻ Gịnị bụ ịdị mma?
Ịdị mma bụ mma omume, ịma mma, omume na echiche ziri ezi. Ọ bụghị àgwà na-adịghị irè kama nke na-arụ ọrụ, nke dị mma. Ịdị mma pụtara ihe karịrị izere mmehie; ọ pụtara ịchụso ihe dị mma. (1 Timoti 6:11)—7/15, peji nke 14.
◻ Gịnị bụ ihe nketa kasị baa uru ndị mụrụ ụmụ pụrụ inyefe ụmụ ha?
Ihe nketa kasị baa uru bụ ihe nlereanya nke ha n’igosi ndị ọzọ ịhụnanya. N’ụzọ pụtara ìhè ọ dị ụmụaka mkpa ịhụ na ịnụ ka ndị mụrụ ha na-ekwupụta ma na-egosi ezi ịhụnanya maka Chineke n’ihe nile ha na-eme.—7/15, peji nke 21.
◻ Gịnị bụ ụfọdụ n’ihe ndị dị mkpa maka ọmụmụ ihe ezinụlọ dị irè?
A ghaghị ịdị na-enwechi ọmụmụ ihe ezinụlọ anya. Unu aghaghị ‘ịzụchapụta oge’ maka ọmụmụ ihe ahụ. (Ndị Efesọs 5:15-17) Mee ka oge ọmụmụ ihe dị ụmụaka ahụ ụtọ site n’ime ka Bible dịrị ndụ. Ka ụmụaka wee nụ ụtọ ya, ha aghaghị inwe mmetụta nke ịbụ ndị so n’ihe a na-amụ.—8/1, peji nke 26, 28.