Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Imeri Ihe Ịma Aka Dị Iche Iche ‘n’Ala nke Ihe A Na-atụghị Anya Ya’
PỌL onyeozi jụrụ ndị Kraist nke narị afọ mbụ nọ na Kọrint, sị: “A sịkwa na opi na-ada nke a na-amaghị isi ya, ònye ga-akwadebe onwe ya ije agha? Otú a unu onwe unu kwa, ma ọ bụrụ na unu ejighị ire kwuo okwu dị mfe ịghọta, à ga-esi aṅaa mara ihe a na-ekwu?”—1 Ndị Kọrint 14:8, 9.
Na Papua New Guinea, nke a na-akpọ Ala nke Ihe A Na-atụghị Anya Ya mgbe ụfọdụ, Ndịàmà Jehova na-ezute ihe mgbochi na-akụda obi n’ịkpọsa ozi doro anya nke Bible. Ha na-ekwusara ndị na-asụ ihe karịrị asụsụ 700 dị iche iche ozi ọma, ndị nwekwara omenala dị iche iche. Ndịàmà ahụ na-anagidekwa ala bụ́ ugwu ugwu, ụkọ okporo ụzọ na ime mpụ na-arị elu. E wezụga ihe isi ike ndị a nile, e nwere mmegide sitere n’aka ụfọdụ òtù okpukpe na, mgbe ụfọdụ, site ọbụna n’aka ndị isi ụlọ akwụkwọ.
Otú o sina dị, ntụziaka ime mmụọ dị mma na ọbá akwụkwọ nke ihe ndị e ji amụ Bible na-aba ụba n’asụsụ nke ógbè dị iche iche ahụ na-akwadebe Ndịàmà izi ozi ọma ahụ dị ka ụda opi a na-anụ nke ọma. Mgbe mgbe, a na-enwe nzaghachi dị mma, dị ka akụkọ ndị na-esonụ na-egosi:
• Ná mmalite nke afọ ọhụrụ nke ụlọ akwụkwọ, otu onye nkụzi chọrọ ịma ihe mere na ụmụ Ndịàmà Jehova adịghị ekele ọkọlọtọ ma ọ bụ na-agụ egwú ito mba. Ọ jụrụ Maiola dị afọ 13, bụ́ Onyeàmà e mere baptism, ajụjụ ya. Maiola nyere nkọwa doro anya, nke dabeere n’Akwụkwọ Nsọ. Onye nkụzi ahụ nakweere echiche ya ebe o sitere na Bible. E sooro ndị nkụzi ndị ọzọ nile kerịta nkọwa ya.
Ka e mesịrị, mgbe e nyere ụmụ akwụkwọ ahụ ọrụ ide edemede, Maiola họọrọ isiokwu banyere Atọ n’Ime Otu. Edemede ya nwetara akara ule kasịnụ na klas ya, onye nkụzi ahụ jụkwara ya ebe ọ chọtara ihe ọmụma ahụ. O gosiri ya akwụkwọ ahụ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala n’asụsụ Bekee. Onye nkụzi ahụ gara n’ihu iche akwụkwọ ahụ n’ihu klas ahụ nile, ọtụtụ chọkwara inweta akwụkwọ nke onwe ha. N’echi ya, Maiola nyefere ụmụ akwụkwọ ibe ya akwụkwọ 14 na magazin 7, ọ malitekwaara atọ n’ime ha ọmụmụ Bible. Ihe mgbaru ọsọ Maiola bụ ịghọ onye ozi oge nile.
• Otu ìgwè Ndịàmà Jehova nọpụrụ iche n’otu ime obodo dị n’akụkụ oké osimiri na nso nso Port Moresby echewo mmegide ihu kemgbe mmalite afọ ndị 1970. Otú ọ dị, na nso nso a ha nwetara enyemaka site n’ebe a na-atụghị anya ya. Bishọp nke Chọọchị United n’ebe ahụ, bụ́ nwa afọ Papua New Guinea a zụrụ n’ofesi, kwuru otu ụbọchị ka ndị na-ege ntị na chọọchị jụọ ajụjụ. Otu nwoke jụrụ, sị: “E nwere okpukpe abụọ n’obodo anyị—Chọọchị United na Ndịàmà Jehova. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma Ndịàmà bịa n’ọnụ ụzọ anyị?” Mgbe ọ kwụsịtụsịrị ruo ogologo oge, bishọp ahụ zaghachiri, sị: “Eem, n’ezie amaghị m ihe m ga-agwa gị. Na nso nso a, Ndịàmà abụọ na-eto eto bịara n’ọnụ ụzọ m. Ha jụrụ m otu ajụjụ, n’agbanyeghịkwa ọzụzụ mahadum mụ, amaghị m azịza ya. Ma ha nyere m azịza ya site na Bible n’ụzọ dị mfe. Ya mere, agajeghị m ịgwa gị ihe ị ga-eme—m ga-ahapụrụ gị ya. Ọ bụghị iwu na ị ga-aṅa ntị ma ọ bụrụ na ị chọghị, ma emesola ha ihe ike.”
Otu onye nnọchiteanya Watch Tower Society na-ejegharị ejegharị bụ́ onye mesịrị leta ìgwè Ndịàmà a kọrọ, sị: “Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile n’ime obodo ahụ ṅara Ndịàmà ahụ ntị mgbe ha gara ọrụ nkwusa. Ọbụna ụfọdụ kpọbatara ha n’ime ụlọ ha. Ọ bụ paradaịs maka ime nkwusa ugbu a.”