‘Isite n’Okwukwe Na-ejegharị, Ọ Bụghị n’Ọhụhụ Ụzọ’
“Anyị sitere n’okwukwe na-ejegharị, ọ bụghị n’ọhụhụ ụzọ.”—2 NDỊ KỌRINT 5:7.
1. Gịnị ka ‘isite n’okwukwe na-ejegharị’ pụtara?
MGBE ọ bụla anyị na-ekpe ekpere n’ụzọ kwekọrọ ná ntụziaka ndị e setịpụrụ n’Okwu Chineke, anyị na-egosi na anyị nwere ma ọ dịghị ihe ọzọ ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke okwukwe. Mgbe anyị malitere ịgbara ndị ọzọ àmà banyere Alaeze Chineke, nke a kwa na-egosi okwukwe. Mgbe anyị rarakwaara ndụ anyị nye Jehova, anyị na-enye ihe àmà na ọ bụ ọchịchọ anyị ‘isite n’okwukwe na-ejegharị,’ ya bụ, ịgbaso ụzọ ndụ nke okwukwe na-achị.—2 Ndị Kọrint 5:7; Ndị Kọlọsi 1:9, 10.
2. Gịnị mere na ikere òkè n’ihe omume ọgbakọ abụchaghị ihe àmà na mmadụ nwere okwukwe?
2 Ọ bụrụ na anyị gaje ịdị ndụ n’ezie n’ụzọ dị otú ahụ, okwukwe gbanyesiri mkpọrọgwụ ike dị anyị mkpa. (Ndị Hibru 11:1, 6) A na-adọta ọtụtụ ndị n’ebe Ndịàmà Jehova nọ n’ihi ụkpụrụ omume ndị dị elu na ịhụnanya ha na-ahụ n’etiti Ndịàmà. Nke ahụ bụ mmalite dị mma, ma ọ pụtaghị na ndị dị otú ahụ nwere okwukwe. Ndị ọzọ pụrụ inwe onye òtù ọlụlụ ma ọ bụ nne ma ọ bụ nna siri ike n’okwukwe, ha pụkwara ikere òkè n’ụfọdụ ọrụ ndị onye ahụ ha hụrụ n’anya na-arụ. Mmadụ inwe mmetụta dị otú ahụ n’ebe obibi ya bụ ngọzi n’ezie, ma nke a kwa abụghị ihe iji dochie anya ịhụnanya mmadụ nwere n’ebe Chineke nọ na okwukwe onwe onye.—Luk 10:27, 28.
3. (a) Ka anyị wee nwee okwukwe gbanyesiri mkpọrọgwụ ike, gịnị ka anyị onwe anyị na-aghaghị ikwere banyere Bible? (b) Gịnị mere ụfọdụ ndị ji ekwere ngwa ngwa karịa ndị ọzọ na Bible sitere n’ike mmụọ nsọ?
3 Ndị na-esite n’okwukwe na-ejegharị n’ezie kwenyere n’ụzọ zuru ezu na Bible bụ Okwu Chineke. E nwere ihe àmà bara ụba na Akwụkwọ Nsọ “si n’obi Chineke pụta” n’ezie.a (2 Timoti 3:16) Ole n’ime ihe àmà a ka a na-aghaghị inyocha tupu mmadụ ekwere? Nke ahụ pụrụ ịdabere ná nzụlite ya. Ihe na-eju otu onye afọ nwere ike ọ gaghị akwali onye ọzọ. N’ọnọdụ ụfọdụ, ọ bụrụgodị na e gosi mmadụ ụba ihe àmà a na-apụghị ịgbagha agbagha, ọ ka pụrụ ịjụ nkwubi okwu ọ na-atụ aka na ya. N’ihi gịnị? N’ihi ọchịchọ ndị dị n’ala ala obi ya. (Jeremaịa 17:9) N’ihi ya, ọ bụ ezie na mmadụ pụrụ ikwu na ya nwere mmasị ná nzube Chineke, nnwapụta ndị ụwa pụrụ ịdị na-agụ obi ya agụụ. O nwere ike ọ gaghị achọ ịhapụ ụdị ndụ nke na-emegide ụkpụrụ Bible. Otú ọ dị, ọ bụrụ na agụụ eziokwu na-agụsi onye ọ bụla ike, ọ bụrụ na ọ na-agwa onwe ya eziokwu, ọ bụrụkwa na ọ dị obi umeala, mgbe oge na-aga ọ ga-aghọta na Bible bụ Okwu Chineke.
4. Gịnị ka a chọrọ n’aka mmadụ ka o wee nwee okwukwe?
4 Ọtụtụ mgbe, n’ime nanị ọnwa ole na ole, ndị a na-enyere aka ịmụ Bible na-aghọta na ha ahụworị ihe nnwapụta dị ukwuu na ọ bụ Okwu Chineke. Ọ bụrụ na nke a akwalie ha imeghe obi ha ka Jehova zie ha ihe, mgbe ahụ ihe ha na-amụta na-eji nwayọọ nwayọọ akpụzi echiche ha ndị kasị mie emi, ọchịchọ ha, na mkpali ha. (Abụ Ọma 143:10) Ndị Rom 10:10 na-asị na mmadụ “na-eji obi” egosipụta okwukwe. Okwukwe dị otú ahụ na-egosi mmetụta onye ahụ na-enwe n’ezie, ọ ga-apụtakwa ìhè n’ụzọ ndụ ya.
Noa Ji Okwukwe Gbanyesiri Mkpọrọgwụ Ike Mee Ihe
5, 6. Na gịnị ka okwukwe Noa dabeere?
5 Noa bụ mmadụ nwere okwukwe gbanyesiri mkpọrọgwụ ike. (Ndị Hibru 11:7) Olee ihe ndabere o nwere maka ya? Noa nwere okwu Chineke, ọ bụghị n’ụdị e dere ede, kama dị ka a gwara ya. Jenesis 6:13 na-asị: “Chineke wee sị Noa, Ọgwụgwụ anụ ahụ nile abịawo n’ihu m; n’ihi na ụwa jupụtara n’ihe ike site na ha.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Jehova gwara Noa ka o wuo ụgbọ, o kwukwara ihe ndị a chọrọ banyere owuwu ya. Mgbe ahụ Chineke gbakwụnyere, sị: “Ma Mụ onwe m, lee, ana m eme ka iju mmiri bịakwasị ụwa, ibibi anụ ahụ nile, nke ume nke ndụ dị n’ime ya, ka ọ pụọ n’okpuru eluigwe; ihe nile nke dị n’ụwa ga-ekubi ume.”—Jenesis 6:14-17.
6 Mmiri ò zotụwo tupu nke a? Bible ekwughị. Jenesis 2:5 na-asị: “Jehova, bụ́ Chineke, aka-emeghị ka mmiri zoo.” Ma, otú a ka Mosis, onye dịrị ndụ ọtụtụ narị afọ ka e mesịrị, si kwuo ya n’ịtụle, ọ bụghị ụbọchị Noa, kama ogologo oge tupu mgbe ahụ. Dị ka e gosiri na Jenesis 7:4, Jehova zoro aka na mmiri ozuzo mgbe ọ na-agwa Noa okwu, ihe àmà na-egosikwa na Noa ghọtara ihe o kwuru. Ma, okwukwe Noa adịghị n’ihe ọ pụrụ ịhụ. Pọl onyeozi dere na a ‘dụrụ Noa ọdụ banyere ihe a ka-ahụghị anya ruo oge ahụ.’ Chineke gwara Noa na Ya gaje iweta n’elu ụwa “iju mmiri,” ma ọ bụ “oké osimiri eluigwe,” dị ka nkọwa ala ala peji na New World Translation si ekwu ya na Jenesis 6:17. Ruo oge ahụ, ihe dị otú ahụ emetụbeghị. Ma ihe nile e kere eke Noa na-ahụ anya guzo dị ka ihe àmà pụtara ìhè na Chineke pụrụ n’ezie iweta iju mmiri dị otú ahụ na-ebibi ihe. N’ịbụ onye okwukwe kwaliri, Noa wuru ụgbọ ahụ.
7. (a) Olee ihe na-adịghị Noa mkpa iji mee ihe Chineke nyeworo ya n’iwu? (b) Olee otú anyị si erite uru n’ịtụle okwukwe Noa, oleekwa otú okwukwe anyị pụrụ isi bụụrụ ndị ọzọ ngọzi?
7 Chineke agwabeghị Noa ụbọchị Iju Mmiri ahụ ga-amalite. Ma Noa ejighị nke ahụ mere ihe ngọpụ maka inwe àgwà a hụ n’anya e kwere, na-etinye iwu ụgbọ na ime nkwusa n’ọnọdụ nke abụọ ná ndụ ya. N’ezi oge, Chineke gwara Noa mgbe ọ ga-abanye n’ụgbọ ahụ. Ka ọ dịgodị, “Noa wee mee ya; dị ka iwu nile si dị nke Chineke nyere ya, otú a ka o mere.” (Jenesis 6:22) Noa sitere n’okwukwe jegharịa, ọ bụghị n’ọhụhụ ụzọ. Lee ekele anyị nwere na o mere otú ahụ! N’ihi okwukwe ya, anyị dị ndụ taa. N’ọnọdụ nke anyị kwa, okwukwe anyị na-egosipụta pụrụ inwe mmetụta dị ike n’ihe ọdịnihu nwere ọ bụghị nanị maka anyị onwe anyị kamakwa maka ụmụ anyị na maka ndị ọzọ nọ anyị gburugburu.
Okwukwe Abraham
8, 9. (a) Na gịnị ka Abraham dabeere okwukwe ya? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si mee ka Abraham “hụ Ya anya”?
8 Tụlee ihe nlereanya ọzọ—nke Abraham. (Ndị Hibru 11:8-10) Na gịnị ka Abraham dabeere okwukwe ya? Gburugburu ebe o tolitere na Ua nke ndị Kaldea jupụtara n’ikpere arụsị na ịhụ ihe onwunwe n’anya. Ma mmetụta ndị ọzọ kpụziri echiche Abraham. E nweghị obi abụọ na ọ pụrụ isoro nwa Noa bụ́ Shem kpakọrịta, bụ́ onye ya na ya bikọrọ ndụ ruo afọ 150. O doro Abraham anya na Jehova bụ “Chineke Nke kachasị ihe nile elu, Onyenwe eluigwe na ụwa.”—Jenesis 14:22.
9 Ihe ọzọ nwere mmetụta dị ike n’ahụ Abraham. Jehova “mere ka . . . Abraham hụ Ya anya, mgbe ọ nọ na Mesọpọtemia, mgbe ọ ka-ebighị na Heran, O wee sị ya, Si n’ala gị na n’etiti ikwu gị pụọ, bịa n’ala ahụ nke M ga-egosi gị.” (Ọrụ 7:2, 3) N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova mere ka Abraham “hụ Ya anya”? Abraham ahụghị Chineke anya kpọmkwem. (Ọpụpụ 33:20) Ma, o kwere omume na Jehova mere ka Abraham hụ ya anya ná nrọ, site ná ngosipụta ebube karịrị nghọta mmadụ, ma ọ bụ site n’aka otu mmụọ ozi, ma ọ bụ onye nnọchiteanya. (Tụlee Jenesis 18:1-3; 28:10-15; Levitikọs 9:4, 6, 23, 24.) Otú ọ sọrọ ya bụrụ ụzọ Jehova si mee ka Abraham hụ ya anya, nwoke ahụ nwere okwukwe nwere obi ike na Chineke na-esetịpụ ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa n’ihu ya. Abraham ji okwukwe mee ihe.
10. Olee ụzọ Jehova si wusie okwukwe Abraham ike?
10 Okwukwe Abraham adabereghị na ya ịmata ihe zuru ezu banyere ala ahụ Chineke du ya aga. Ọ dabereghị na ya ịmara mgbe a ga-enye ya ala ahụ. O nwere okwukwe n’ihi na ọ maara Jehova dị ka Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. (Ọpụpụ 6:3) Jehova gwara Abraham na ọ ga-enwe nwa, ma mgbe ụfọdụ o juru Abraham anya otú nke ahụ pụrụ isi mee. Ọ na-aka nká. (Jenesis 15:3, 4) Jehova wusiri okwukwe Abraham ike site n’ịgwa ya ka o welie anya lee kpakpando ma gụọ ha ma o nwee ike. “Otú a ka mkpụrụ gị ga-adị,” ka Chineke kwuru. A kpaliri Abraham n’ụzọ miri emi. O doro anya na Onye Okike nke ihe ndị ahụ dị egwu dị n’igwe pụrụ imezu ihe o kweworo ná nkwa. Abraham “kweere na Jehova.” (Jenesis 15:5, 6) Abraham ekweghị nanị n’ihi na ihe ọ na-anụ masịrị ya; o nwere okwukwe gbanyesiri mkpọrọgwụ ike.
11. (a) Ka ọ na-eru afọ 100, olee otú Abraham si meghachi omume ná nkwa Chineke bụ́ na Sera meworo agadi ga-amụ nwa nwoke? (b) Ụdị okwukwe dị aṅaa ka Abraham ji chee ihu n’ule dị n’ịkpọga nwa ya nwoke n’Ugwu Moraịa iji chụọ ya dị ka àjà?
11 Mgbe Abraham na-eru afọ 100, nwunye ya kwa, Sera, na-eru afọ 90, Jehova kwere nkwa ya ọzọ na Abraham ga-enwe nwa nwoke nakwa na Sera ga-abụ nne ya. Abraham ji ezi uche cheere ọnọdụ ha echiche. “O jighịkwa ekweghị ekwe nwee obi abụọ n’ebe nkwa Chineke dị, kama e jiri okwukwe ya mee ka o nwee ike, ọ na-enyekwa Chineke otuto, na-ekwezukwa na ihe O kwererịị ná nkwa, Ọ pụrụ imekwa.” (Ndị Rom 4:19-21) Abraham maara na nkwa Chineke apụghị ịda ada. E mesịa, n’ihi okwukwe ya, Abraham rubere isi mgbe Chineke gwara ya ka ọ kpọrọ nwa ya nwoke bụ́ Aịsak gaa ala Moraịa ma chụọ ya dị ka àjà. (Jenesis 22:1-12) Abraham nwere obi ike zuru ezu na Chineke onye mere ka a mụọ nwa nwoke ahụ n’ụzọ ọrụ ebube pụkwara iweghachite ya ná ndụ iji mezuo nkwa ndị ọzọ O kweworo n’ihe banyere ya.—Ndị Hibru 11:17-19.
12. Ogologo oge hà aṅaa ka Abraham nọgidere na-ejegharị site n’okwukwe, oleekwa ụgwọ ọrụ na-echere ya na ndị òtù ezinụlọ ya gosipụtara okwukwe siri ike?
12 Abraham gosiri na okwukwe chịkwara ya, ọ bụghị nanị n’ọnọdụ ụfọdụ, kama ná ndụ ya nile. N’oge ndụ ya Abraham enwetaghị n’aka Chineke akụkụ ọ bụla nke Ala Nkwa ahụ dị ka ihe nketa. (Ọrụ 7:5) Ma, ike agwụghị Abraham, o wee laghachikwa na Ua nke ndị Kaldea. Ruo afọ 100, ruo kpọmkwem n’ọnwụ ya, o biri n’ụlọikwuu n’ala ebe Chineke sịworo ka ọ gaa. (Jenesis 25:7) Banyere ya na nwunye ya bụ́ Sera, nwa ha nwoke bụ́ Aịsak, na nwa nwa ha bụ́ Jekọb, Ndị Hibru 11:16 na-asị: “Ihere ha adịghị eme Chineke, ka a kpọọ Ya Chineke ha: n’ihi na O doziworo ha otu obodo.” Ee, Jehova nwere ebe o debeere ha n’ógbè elu ụwa nke Alaeze Mesaịa ya.
13. Olee ndị n’etiti ndị ohu Jehova taa na-enye ihe àmà inwe okwukwe yiri nke Abraham?
13 E nwere n’etiti ndị ohu Jehova taa ndị dị ka Abraham. Ha esitewo n’okwukwe na-ejegharị eri ọtụtụ afọ. N’ume Chineke na-enye, ha emeriwo ihe mgbochi ndị ha ka ugwu. (Matiu 17:20) Ha adịghị ama jijiji n’okwukwe n’ihi na ha amaghị kpọmkwem mgbe Chineke gaje inye ha ihe nketa o kweworo ná nkwa. Ha maara na okwu Jehova apụghị ịda ada, ha na-ewerekwa ya dị ka ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa ịbụ ndị a gụnyere n’etiti Ndịàmà ya. Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị gị?
Okwukwe nke Kwaliri Mosis
14. Olee otú e si tọọ ntọala maka okwukwe Mosis?
14 Ihe nlereanya ọzọ nke okwukwe bụ Mosis. Gịnị bụ ntọala nke okwukwe ya? A tọrọ ya mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ. Ọ bụ ezie na ada Fero chọtara Mosis n’igbe papyrus n’Osimiri Naịl ma kpọrọ ya ka ọ bụrụ nwa ya nwoke, nne Mosis n’onwe ya bụ́ onye Hibru, bụ́ Jokebed, zụlitere nwa okoro ahụ ma lekọta ya mgbe ọ dị na nwata. Ihe àmà na-egosi na Jokebed ziri ya ihe nke ọma, na-akụnye n’ime ya ịhụnanya maka Jehova na obi ekele maka nkwa ndị O kwere Abraham. E mesịa, dị ka onye òtù nke ezinụlọ Fero, ‘e ziri Mosis ihe n’amamihe nile nke ndị Ijipt.’ (Ọrụ 7:20-22; Ọpụpụ 2:1-10; 6:20; Ndị Hibru 11:23) Ma, n’agbanyeghị ọnọdụ ọma Mosis nwere, obi ya dịnyeere ndị Chineke nọ n’ohu.
15. Gịnị ka ime ka a mata ya dị ka otu n’ime ndị Jehova pụtaara Mosis?
15 N’afọ nke 40 ya, Mosis tigburu onye Ijipt iji napụta onye Israel a na-emejọ. Ihe omume a gosiri otú Mosis si were ndị Chineke. N’ezie, “mgbe Mosis toruru mmadụ, ọ bụ okwukwe ka o ji jụ ka a kpọọ ya nwa nwoke nke nwa nwanyị Fero.” Kama ịrapagide ‘n’ihe ụtọ nke mmehie ruo nwa oge,’ dị ka onye òtù nke obí eze ndị Ijipt, okwukwe akwaliwo ya ime ka a mata ya dị ka onye so ná ndị Chineke a na-emekpa ahụ.—Ndị Hibru 11:24, 25; Ọrụ 7:23-25.
16. (a) Ọrụ dị aṅaa ka Jehova nyere Mosis, oleekwa otú Chineke si nyere ya aka? (b) N’ịrụ ọrụ ya, olee otú Mosis si gosi okwukwe?
16 Ọ dị Mosis ọkụ n’obi ime ihe iji wetara ndị ya ahụ efe, ma oge Chineke maka mgbapụta ha aka-erughị. Mosis aghaghị ịgbapụ n’Ijipt. Ọ bụ mgbe ihe dị ka afọ 40 gasịrị ka Jehova, site n’otu mmụọ ozi, nyere Mosis ọrụ ịlaghachi Ijipt iji dupụta ndị Israel n’ala ahụ. (Ọpụpụ 3:2-10) Olee otú Mosis si meghachi omume? O nweghị obi abụọ banyere ikike Jehova nwere ịgbapụta Israel, ma ọ dị ya ka o rughị eru maka ọrụ Chineke setịpụrụ n’ihu ya. N’ịhụnanya, Jehova nyere agbamume dị Mosis mkpa. (Ọpụpụ 3:11–4:17) Okwukwe Mosis bịara sie ike. Ọ laghachiri Ijipt ma dọọ Fero aka ná ntị ugboro ugboro ihu na ihu banyere ihe otiti ndị ga-abịakwasị Ijipt n’ihi ọjụjụ onye ọchịchị ahụ jụrụ ịhapụ Israel ịga fee Jehova. Mosis enweghị ike n’onwe ya ịkpata ihe otiti ndị ahụ. O sitere n’okwukwe jegharịa, ọ bụghị n’ọhụhụ ụzọ. Okwukwe ya dị na Jehova na okwu ya. Fero yiri Mosis egwu. Ma Mosis nọgidesiri ike. “Okwukwe ka o ji hapụ Ijipt, n’ihi na ọ tụghị egwu ọnụma nke eze ahụ: n’ihi na ọ nọgidesiri ike, dị ka ọ̀ na-ahụ Onye ahụ Nke a na-apụghị ịhụ Ya anya.” (Ndị Hibru 11:27) Mosis ezughị okè. O mehiere ihe. (Ọnụ Ọgụgụ 20:7-12) Ma, mgbe Chineke nyesịrị ya ọrụ, okwukwe chịkwara ụzọ ndụ ya dum.
17. Gịnị ka isite n’okwukwe na-ejegharị rụpụtaara Noa, Abraham, na Mosis, ọ bụ ezie na ha adịghị ndụ wee hụ ụwa ọhụrụ Chineke?
17 Ka okwukwe gị dị ka nke Noa, Abraham, na Mosis. Ọ bụ ezie na ha ahụghị ụwa ọhụrụ Chineke n’ụbọchị ha. (Ndị Hibru 11:39) Ọ ka-erughị oge Chineke kara aka; e nwere akụkụ ndị ọzọ nke nzube ya ndị ka dị mkpa ka ha mezuo. Ma, okwukwe ha n’okwu Chineke amaghị jijiji, aha ha dịkwa n’akwụkwọ nke ndụ Chineke.
18. Nye ndị a kpọrọ ịga ná ndụ eluigwe, n’ihi gịnị ka o jiworo dị mkpa isite n’okwukwe na-ejegharị?
18 “Chineke buru ụzọ lepụta ihe ka mma banyere anyị,” ka Pọl onyeozi dere. Ya bụ, Chineke buru ụzọ lepụta ihe ka mma maka ndị, dị ka Pọl onyeozi, a kpọworo ịga ná ndụ eluigwe ha na Kraịst. (Ndị Hibru 11:40) Ndị a bụ ndị Pọl bu n’uche kpọmkwem mgbe o dere okwu ndị dị ná 2 Ndị Kọrint 5:7: “Anyị sitere n’okwukwe na-ejegharị, ọ bụghị n’ọhụhụ ụzọ.” Mgbe e dere nke ahụ, ọ dịghị nke n’ime ha nwetaworo ụgwọ ọrụ eluigwe ha. Ha apụghị iji anya nkịtị ha hụ ya, ma okwukwe ha na ya gbanyesiri mkpọrọgwụ ike. A kpọlitewo Kraịst site ná ndị nwụrụ anwụ, bụ́ mkpụrụ mbụ nke ndị a kpọlitere gaa ná ndụ eluigwe. Ihe karịkwara ndị akaebe 500 ahụwo ya tupu nrịgo ya n’eluigwe. (1 Ndị Kọrint 15:3-8) Ha nwere ọtụtụ ihe mere ha ga-eji jiri okwukwe ahụ chịkwaa ụzọ ndụ ha dum. Anyị onwe anyị kwa nwere ezi ihe mere anyị ga-eji site n’okwukwe na-ejegharị.
19. Dị ka e gosiri ná Ndị Hibru 1:1, 2, ònye ka Chineke siteworo na ya gwa anyị okwu?
19 Taa, Jehova ejighị mmụọ ozi agwa ndị ya okwu, dị ka ọ gwara Mosis n’ọhịa ahụ na-ere ọkụ. Chineke ekwuwo okwu site n’Ọkpara ya. (Ndị Hibru 1:1, 2) Ihe Chineke kwuru site n’ọnụ ya, O dekọwo ya n’ime Bible, bụ́ nke a sụgharịworo gaa n’ọtụtụ asụsụ ụmụ mmadụ gburugburu ụwa.
20. Olee otú ọnọdụ anyị si dị mma karịa nke Noa, Abraham, na Mosis?
20 Anyị nwere ihe karịrị ihe Noa, Abraham, na Mosis nwere. Anyị nwere Okwu Chineke zuru ezu—ihe dị ukwuu n’ime ya emezuwo. N’ihi ihe nile Bible na-ekwu banyere ndị ikom na ndị inyom gosiri onwe ha ịbụ ndị àmà kwesịrị ntụkwasị obi nke Jehova n’agbanyeghị ụdị ule ọ bụla, Ndị Hibru 12:1 na-agba ume, sị: “Ka anyị tụpụkwa ibu nile ọ bụla, ya na mmehie ahụ nke na-arapara anyị n’ahụ nke ukwuu, ka anyị werekwa ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu.” Okwukwe anyị abụghị ihe a ga-ewere n’ihe efu. “Mmehie ahụ nke na-arapara anyị n’ahụ nke ukwuu” bụ enweghị okwukwe. Ọ chọrọ ọgụ siri ike ma ọ bụrụ na anyị ga-anọgide ‘na-esite n’okwukwe na-ejegharị.’
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee akwụkwọ bụ́ The Bible—God’s Word or Man’s?, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
Gịnị Bụ Azịza Gị?
◻ Gịnị ka ‘isite n’okwukwe na-ejegharị’ na-agụnye?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ụzọ Noa siri gosi okwukwe?
◻ Olee otú ụzọ Abraham siri gosi okwukwe si enyere anyị aka?
◻ N’ihi gịnị ka Bible ji ezo aka n’ebe Mosis nọ dị ka ihe nlereanya nke okwukwe?
[Foto dị na peeji nke 10]
Abraham sitere n’okwukwe jegharịa
[Foto dị na peeji nke 10]
Mosis na Erọn gosiri okwukwe mgbe ha nọ n’ihu Fero