Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 1/1 p. 11-20
  • “Meenụ Ka Obi Unu Guzosie Ike”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Meenụ Ka Obi Unu Guzosie Ike”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Nlereanya Abraham Banyere Okwukwe
  • Ịṅa Chineke Ntị
  • Isoro Chineke Kwurịta Okwu
  • Ihe Ndekọ nke Okwukwe Taa
  • Zụlite Okwukwe Taa
  • A Gaje Imezu Olileanya Anyị n’Isi Nso
  • Jehova Kpọrọ Ya “Enyi M”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Ì Nwere Okwukwe Dị Ka Nke Abraham?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ònye Bụ Ebreham?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • ‘Isite n’Okwukwe Na-ejegharị, Ọ Bụghị n’Ọhụhụ Ụzọ’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 1/1 p. 11-20

“Meenụ Ka Obi Unu Guzosie Ike”

“Ntachi obi dị unu mkpa, ka ọ ga-abụ, mgbe unu meworo ihe Chineke na-achọ, ka unu wee nata nkwa ahụ.”—NDỊ HIBRU 10:36.

1, 2. (a) Gịnị mere ụfọdụ ndị Kraịst na narị afọ mbụ? (b) N’ihi gịnị ka o ji adị mfe okwukwe ịda mbà?

N’IME ndị nile so dee Bible, ọ dịghị onye kpọtụrụ okwukwe aha ọtụtụ ugboro karịa Pọl onyeozi. Mgbe mgbe kwa, o kwuru banyere ndị okwukwe ha daworo mbà ma ọ bụ ndị nke ha nwụworo. Dị ka ihe atụ, ‘ụgbọ Haịmeniọs na Aleksanda kpuru n’ebe okwukwe ha dị.’ (1 Timoti 1:19, 20) Dimas gbahapụrụ Pọl n’ihi na “ọ hụrụ oge dị ugbu a n’anya.” (2 Timoti 4:10) Ụfọdụ ‘agọnarịwo okwukwe anyị’ site n’ime ihe ndị na-ekwesịghịrị ndị Kraịst, nke ejighị ihe akpọrọ ihe. E ji amamihe ụgha ghọgbuo ndị ọzọ, ha ‘ehiekwa [ụzọ] n’ihe banyere okwukwe anyị.’—1 Timoti 5:8; 6:20, 21.

2 N’ihi gịnị ka ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ jiri si n’ụzọ ndị dị otú a ghara inweta ụgwọ ọrụ? “Ma okwukwe bụ ndabere nke ihe a na-ele anya, bụrụkwa nnwapụta nke ihe a na-ahụghị anya.” (Ndị Hibru 11:1) Anyị na-egosi okwukwe n’ihe anyị na-apụghị ịhụ anya. Ọ dịghị anyị mkpa maka ihe ndị a na-ahụ anya. Ọ ka mfe ịrụ ọrụ maka akụ̀ na ụba a na-ahụ anya karịa akụ̀ na ụba ime mmụọ a na-adịghị ahụ anya. (Matiu 19:21, 22) Ọtụtụ ihe ndị a na-ahụ anya—dị ka “agụụ ihe ọjọọ nke anụ ahụ, na agụụ ihe ọjọọ nke anya”—na-amasị anụ ahụ anyị na-ezughị okè, ha pụkwara ime ka okwukwe anyị daa mbà.—1 Jọn 2:16.

3. Ụdị okwukwe dị aṅaa ka onye Kraịst kwesịrị ịzụlite?

3 Ma, Pọl na-ekwu na “onye na-abịakwute Chineke aghaghị ikwe na Ọ dị, na Ọ na-egosikwa Onwe ya Onye na-enyeghachi ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ.” Mosis nwere okwukwe dị otú ahụ. O “wepụrụ anya ya lee nnyeghachi nke ụgwọ ọrụ ahụ” ma ‘nọgidesie ike, dị ka ọ na-ahụ Onye ahụ Nke a na-apụghị ịhụ anya.’ (Ndị Hibru 11:6, 24, 26, 27) Okwukwe dị otú a dị onye Kraịst mkpa. Dị ka e kwuru n’isiokwu bu ụzọ, Abraham bụ ezi ihe nlereanya n’akụkụ a.

Ihe Nlereanya Abraham Banyere Okwukwe

4. Olee otú okwukwe Abraham si metụta ụzọ ndụ ya?

4 Abraham nọ na Ua mgbe ọ natara nkwa Chineke na ọ ga-amụta mkpụrụ nke ga-abụ ngọzi nye ndị nke mba nile. (Jenesis 12:1-3; Ọrụ 7:2, 3) Ná ndabere nke nkwa ahụ, Abraham rubeere Jehova isi, buru ụzọ kwaga Heran ma mesịzie kwaga Kenean. N’ebe ahụ, Jehova kwere nkwa inye mkpụrụ Abraham ala ahụ. (Jenesis 12:7; Nehemaịa 9:7, 8) Otú ọ dị, ọtụtụ n’ime ihe ndị Jehova kwere ná nkwa gaje imezu mgbe Abraham nwụsịrị. Dị ka ihe atụ, Abraham n’onwe ya enwetaghị akụkụ Kenean ọ bụla ma ọlị—e wezụga ọgba Makpila, nke ọ zụụrụ dị ka ebe ili ozu. (Jenesis 23:1-20) Ma, o nwere okwukwe n’okwu Jehova. Karịsịa, o nwere okwukwe ‘n’obodo ọdịnihu nke nwere ntọala ahụ, nke Chineke bụ onyeọkà ya na onye rụrụ ya.’ (Ndị Hibru 11:10) Okwukwe dị otú ahụ kwagidere ya ná ndụ ya nile.

5, 6. N’ụzọ dị aṅaa ka e si tinye okwukwe Abraham n’ule n’ihe banyere nkwa Jehova?

5 A na-ahụ nke a karịsia n’ihe banyere nkwa ahụ e kwere bụ́ na mkpụrụ Abraham ga-aghọ mba dị ukwuu. Ka nke a mezuo, nwa nwoke dị Abraham mkpa, o cherekwaara ruo ogologo oge ka e jiri otu nwa nwoke gọzie ya. Anyị amaghị afọ ole ọ dị mgbe ọ nụrụ nkwa Chineke nke mbụ ya, ma mgbe o mere ogologo njem ahụ ruo Heran, Jehova enyebeghị ya nwa. (Jenesis 11:30) O bitere aka na Heran ruo ókè nke ‘ịkpata akụ̀ na inweta mmadụ,’ mgbe ọ kwagakwara Kenean ọ dị afọ 75, Sera dịkwa afọ 65. Ma nwa abịabeghị. (Jenesis 12:4, 5) Mgbe Sera ruru afọ 75, o kwubiri na ya emewo agadi gabiga ókè ịmụtara Abraham nwa. N’ihi ya, n’ịgbaso omenala dị n’oge ahụ, o nyere Abraham ohu ya nwanyị bụ́ Hega, ọ mụtakwaara Abraham nwa nwoke. Ma nke a abụghị nwa ahụ e kwere ná nkwa. N’ikpeazụ a chụpụrụ Hega na nwa ya bụ́ Ishmael. Ma, mgbe Abraham rịọrọ arịrịọ n’isi ha, Jehova kwere nkwa ịgọzi Ishmael.—Jenesis 16:1-4, 10; 17:15, 16, 18-20; 21:8-21.

6 N’oge nke Chineke—ogologo oge ha nụsịrị nkwa ahụ na nke mbụ ya—Abraham bụ́ onye gbara afọ 100 na Sera bụ́ onye gbara afọ 90 mụtara nwa nwoke, bụ́ Aịsak. Lee ihe magburu onwe ya ọ na-aghaghị ịbụworị! Nye di na nwunye a meworo agadi, ọ fọrọ nke nta ka o yie mbilite n’ọnwụ mgbe ahụ ha nke ‘nwụwororịị’ wepụtara ndụ ọhụrụ. (Ndị Rom 4:19-21) Nchere ahụ dịruru ogologo oge, ma ka e mesịrị mezuo nkwa ahụ, nchere ahụ ruru ya.

7. Olee otú e si jikọta okwukwe na ntachi obi?

7 Ihe nlereanya Abraham na-echetara anyị na okwukwe ekwesịghị ịdịru nanị nwa mgbe. Pọl jikọtara okwukwe na ntachi obi mgbe o dere, sị: “Ntachi obi dị unu mkpa, ka ọ ga-abụ, mgbe unu meworo ihe Chineke na-achọ, ka unu wee nata nkwa ahụ. . . . Anyị onwe anyị adịghị n’etiti ndị wezụgara onwe ha ịla n’iyi; kama anyị dị n’etiti ndị kwere ekwe inweta mkpụrụ obi ha.” (Ndị Hibru 10:36-39) Ọtụtụ echewo ogologo oge maka mmezu nkwa ahụ. Ụfọdụ echewo ruo ogologo ndụ ha nile. Okwukwe ha siri ike akwagidewo ha. Dịkwa ka Abraham, ha ga-anata ụgwọ ọrụ ha n’oge Jehova.—Habakuk 2:3.

Ịṅa Chineke Ntị

8. Olee otú anyị si aṅa Chineke ntị taa, n’ihi gịnịkwa ka nke ahụ ga-eji wusie okwukwe anyị ike?

8 Ọ dịkarịa ala ihe anọ mere ka okwukwe Abraham sie ike, otu ihe ndị ahụ pụkwara inyere anyị aka. Nke mbụ, o gosipụtara na ya ‘kweere na Chineke dị’ site n’ịṅa ntị mgbe Jehova kwuru okwu. N’ihi ya, ọ dị iche n’ebe ndị Juu nke oge Jeremaịa nọ, bụ́ ndị kweere na Jehova ma ha enweghị okwukwe n’okwu ya. (Jeremaịa 44:15-19) Taa, Jehova na-agwa anyị okwu site na Bible, bụ́ Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ nke Pita sịrị na ọ dị ka “oriọna mgbe ọ na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị . . . n’obi unu.” (2 Pita 1:19) Mgbe anyị ji nlezianya na-agụ Bible, “a na-azụpụta [anyị] n’okwu nile nke okwukwe anyị.” (1 Timoti 4:6; Ndị Rom 10:17) Ọzọkwa, na mgbe ikpeazụ ndị a, “ohu ahụ kwesịrị ka atụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-enye nri ime mmụọ “n’oge ya,” bụ́ nduzi n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ na ịghọta amụma Bible. (Matiu 24:45-47) Isi n’ụzọ dị otú a na-aṅa Jehova ntị dị oké mkpa iji nwee okwukwe siri ike.

9. Gịnị ka ọ ga-arụpụta ma ọ bụrụ na anyị kwenyere n’olileanya nke ndị Kraịst n’ezie?

9 Okwukwe na olileanya Abraham nwere njikọ chiri anya. “Onye kwere . . . dabere n’olileanya, ka o wee ghọọ nna ọtụtụ mba.” (Ndị Rom 4:18) Nke a bụ ihe nke abụọ pụrụ inyere anyị aka. Anyị ekwesịghị ichezọ mgbe ọ bụla na Jehova bụ “Onye na-enyeghachi ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ.” Pọl onyeozi kwuru, sị: “Anyị na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ, na-agbasikwa mgba ike, n’ihi na anyị elewo anya Chineke dị ndụ.” (1 Timoti 4:10) Ọ bụrụ na anyị kwenyere n’olileanya ndị Kraịst n’ezie, ụzọ ndụ anyị nile ga-abụ ihe ngosipụta nke okwukwe anyị, dị ka nke Abraham gosipụtara.

Isoro Chineke Kwurịta Okwu

10. Ụdị ekpere dị aṅaa ga-ewusi okwukwe anyị ike?

10 Abraham sooro Chineke kwurịta okwu, nke a bụkwa ihe nke atọ mere ka okwukwe ya sie ike. Taa, anyị onwe anyị kwa pụrụ isoro Jehova kwurịta okwu, na-eji onyinye nke ekpere site na Jisọs Kraịst eme ihe. (Jọn 14:6; Ndị Efesọs 6:18) Ọ bụ mgbe Jisọs kọsịrị otu ilu na-emesi mkpa ọ dị ikpe ekpere mgbe nile ike, ka ọ jụrụ sị: “Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa, Ọ̀ ga-ahụ okwukwe n’elu ụwa?” (Luk 18:8) Ekpere na-ewuli okwukwe abụghị nke a na-adịghị echebara echiche ma ọ bụ nke e bu n’isi. Ọ na-esite nnọọ n’ezi uche. Dị ka ihe atụ, ekpere sitere n’ala ala obi dị mkpa mgbe anyị ga-eme mkpebi ndị dị mkpa ma ọ bụ mgbe anyị na-enwe oké nchegbu.—Luk 6:12, 13; 22:41-44.

11. (a) Olee otú e si wusie Abraham ike mgbe ọ gwara Chineke obi ya nile? (b) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ahụmahụ Abraham?

11 Mgbe Abraham na-eme agadi ma Jehova enyebeghịkwa ya mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa, ya na Chineke kwurịtara okwu banyere nchegbu ya. Jehova mesiri ya obi ike. Gịnị ka ọ rụpụtara? Abraham “wee kwere na Jehova; O wee gụọ ya nye ya n’ezi omume.” Mgbe ahụ, Jehova nyere ihe ama iji kwado okwu ya na-emesi obi ike. (Jenesis 15:1-18) Ọ bụrụ na anyị agwa Jehova obi anyị nile n’ekpere, nara mmesi obi ike nile nke Jehova dị n’Okwu ya, bụ́ Bible, ma rubere ya isi n’okwukwe zuru ezu, mgbe ahụ Jehova ga-ewusikwa okwukwe anyị ike.—Matiu 21:22; Jud 20, 21.

12, 13. (a) Olee otú e si gọzie Abraham mgbe ọ gbasoro nduzi Jehova? (b) Ụdị ahụmahụ ndị dị aṅaa ga-ewusi okwukwe anyị ike?

12 Ihe nke anọ wusiri okwukwe Abraham ike bụ nkwado Jehova nyere ya mgbe ọ gbasoro nduzi Chineke. Mgbe Abraham gara ịnapụta Lọt n’aka ndị eze ahụ na-eme mwakpo, Jehova mere ka o merie. (Jenesis 14:16, 20) Mgbe Abraham bi dị ka ọbịa n’ala nke mkpụrụ ya ga-eketa, Jehova duziri ya n’ụzọ ihe onwunwe. (Tụlee Jenesis 14:21-23.) Jehova gọziri mgbalị nke onye na-achị ezinụlọ ya ịchọtara Aịsak nwunye kwesịrị ekwesị. (Jenesis 24:10-27) Ee, Jehova ‘gọziri Abraham n’ihe nile.’ (Jenesis 24:1) Nke a kpatara okwukwe ya ji sie nnọọ ike, mmekọrịta ya na Jehova Chineke echiekwa nnọọ anya nke na Jehova kpọrọ ya “enyi m.”—Aịsaịa 41:8 NW; Jemes 2:23.

13 Ànyị pụrụ inwe okwukwe siri ike dị otú ahụ taa? Ee. Ọ bụrụ na dị ka Abraham, anyị anwapụta Jehova site n’irube isi n’iwu ya, ọ ga-agọzikwa anyị, nke ahụ ga-ewusikwa okwukwe anyị ike. Dị ka ihe atụ, igwutụ anya n’Ihe Ndekọ Ije Ozi nke Afọ 1998 na-egosi na a gọziri ọtụtụ ndị n’ụzọ magburu onwe ya mgbe ha rubere isi n’iwu ya nke ikwusa ozi ọma ahụ.—Mak 13:10.

Ihe Ndekọ nke Okwukwe Taa

14. Olee otú Jehova si gọzie mkpọsa ahụ e ji Akụkọ Alaeze nke 35 mee?

14 Laa azụ n’October 1997, mkpọsa zuru ụwa ọnụ e jiri Akụkọ Alaeze nke 35 mee nwere ihe ịga nke ọma dị ịrịba ama, n’ihi ịnụ ọkụ n’obi nke ọtụtụ nde Ndịàmà n’otu n’otu. Otu ihe atụ ya bụ ihe mere na Ghana. E kesara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde traktị 2.5 n’asụsụ anọ, n’ihi ya kwa ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ 2,000 rịọrọ maka ọmụmụ Bible. Na Saịprọs, Ndịàmà abụọ nọ na-ekesa Akụkọ Alaeze hụrụ otu ụkọchukwu na-eso ha n’azụ. Mgbe nwa oge gasịrị, ha nyere ya otu Akụkọ Alaeze. Ọ nataworị otu ma kwuo, sị: “Ozi dị n’ime ya masịrị m nke ukwuu nke na m chọrọ ịja ndị bipụtara ya mma.” Na Denmark, e kesara nde 1.5 nke Akụkọ Alaeze, ọ rụpụtakwara ezi ihe. Otu nwanyị na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ mmekọrịta ọha n’ebe ahụ kwuru, sị: “Traktị ahụ nwere ozi maka onye ọ bụla. Ọ dị mfe nghọta, ọ na-akwalikwa gị, na-eme ka i nwee ọchịchọ ịmatakwu ihe. Ọ gara kpọmkwem n’ihe a chọrọ n’ezie!”

15. Olee ahụmahụ ndị na-egosi na Jehova gọziri mgbalị ndị e mere ịgakwuru ndị mmadụ n’ebe nile?

15 Na 1998 a gbalịrị izisara ndị mmadụ ozi ọma, ọ bụghị nanị n’ebe obibi ha kama n’ebe ọ bụla. Na Côte d’Ivoire otu di na nwunye bụ́ ndị ozi ala ọzọ jere leta ụgbọ mmiri 322 dị n’ọgba ha. Ha tinyere akwụkwọ 247, magazin 2,284, broshuọ 500, na ọtụtụ narị traktị, nakwa vidio maka ndị ọrụ ụgbọ mmiri ikiri ka ha nọ ná njem. Na Canada otu Onyeàmà jere n’ụlọ ọrụ ebe a na-edozi ahụ ụgbọ ala. Onye nwe ya nwere mmasị, nwanna nwoke ahụ nọgidekwara ruo awa anọ na ọkara, ọ bụ ezie na ọ bụ ihe dị ka otu awa ka o jiri gbaa àmà n’ihi ndị ahịa na-abịa ma na-apụ. N’ikpeazụ, a haziri iduziri ya ihe n’elekere 10:00 abalị. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ a maliteghị ya ruo etiti abalị ma mụruo ya n’elekere abụọ nke ụtụtụ. Ndokwa ahụ aghaghị ịbụworị ihe ịma aka, ma ọ rụpụtara ezi ihe. Nwoke ahụ kpebiri ịgbachi ụlọ ahịa ya n’ụbọchị Sunday nile iji nwee ike jee nzukọ. N’oge na-adịghị anya, ya na ezinụlọ ya nwewara ọganihu dị mma.

16. Olee ahụmahụ ndị na-egosi na broshuọ Na-achọ na akwụkwọ Ihe Ọmụma bụ ngwá ọrụ dị ike n’ọrụ ime nkwusa na izi ihe?

16 Broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? na akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi anọgidewo na-abụ ngwá ọrụ dị ike n’ọrụ ime nkwusa na izi ihe. N’Itali otu onye nọn na-echere bọs natara otu Akụkọ Alaeze. N’echi ya, e jekwuuru ya ọzọ, ọ natakwara broshuọ Na-achọ. Kwa ụbọchị mgbe nke a gasịrị, ọ na-enwe ọmụmụ Bible na-ewe minit 10 ruo 15 n’ebe ahụ bọs na-akwụsị. Mgbe otu ọnwa na ọkara gasịrị, o kpebiri ịhapụ ebe obibi ndị nọn ma laa ụlọ na Guatemala iji gaa n’ihu n’ọmụmụ ihe ya. Na Malawi o wutere otu onye na-agachi chọọchị anya aha ya bụ Lobina mgbe ụmụ ya ndị nwanyị malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Ma, ụmụ agbọghọ ndị ahụ na-eso nne ha ekwurịta eziokwu Bible mgbe ọ bụla ha nwere ike. Na June 1997, Lobina hụrụ akwụkwọ Ihe Ọmụma, okwu ahụ bụ́ “Ihe Ọmụma Na-eduba” masịkwara ya. Na July o kwetara ka e duziere ya ọmụmụ Bible. N’August o jere mgbakọ distrikti ma ṅaa ntị nke ọma n’ihe omume nile. Ka ọ na-erule ngwụsị nke ọnwa ahụ, ọ hapụwo chọọchị ya, ruokwa eru dị ka onye nkwusa a na-emebeghị baptism. E mere ya baptism na November 1997.

17, 18. Olee otú vidio Society si bụrụ ihe bara uru n’inyere ndị mmadụ aka “ịhụ” ihe ime mmụọ?

17 Vidio Society enyeworo ọtụtụ ndị aka “ịhụ” ihe ime mmụọ. Na Mauritius otu nwoke hapụrụ chọọchị ya n’ihi adịghị n’otu dị n’ebe ahụ. Otu onye ozi ala ọzọ gosiri ya ịdị n’otu dị n’etiti Ndịàmà Jehova, na-eji vidio bụ́ United by Divine Teaching eme ihe. N’ịbụ onye ọ masịrị, nwoke ahụ kwuru, sị: “Unu bụ́ Ndịàmà Jehova anọrọlarị na Paradaịs!” Ọ nakweere ka e duziere ya ọmụmụ Bible. Otu nwanna nwanyị na Japan gosiri di ya na-ekweghị ekwe vidio ahụ bụ́ Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name, a kpalikwara ya inwe ọmụmụ Bible mgbe nile. Mgbe o kirisịrị United by Divine Teaching, ọ chọrọ ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Usoro akụkụ atọ ahụ a kpọrọ The Bible—A Book of Fact and Prophecy nyeere ya aka itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ ya. N’ikpeazụ, vidio ahụ bụ́ Jehovah’s Witnesses Stand Firm Against Nazi Assault gosiri ya na Jehova na-ewusi ndị Ya ike megide mwakpo Setan. E mere nwoke ahụ baptism n’October 1997.

18 Ndị a bụ nanị ole na ole n’ime ọtụtụ ahụmahụ ndị e nwetara n’afọ ije ozi gara aga. Ha na-egosi na Ndịàmà Jehova nwere okwukwe siri ike nakwa na Jehova na-ewusi okwukwe ahụ ike site n’ịgọzi ọrụ ha.—Jemes 2:17.

Zụlite Okwukwe Taa

19. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka anyị si nọrọ n’ọnọdụ ka nke Abraham mma? (b) Mmadụ ole gbakọtara n’afọ gara aga ime ememe ncheta ọnwụ ịchụ àjà Jisọs? (ch) Olee mba ndị nwere ọnụ ọgụgụ dị ịrịba ama nke ndị bịara Ememe Ncheta n’afọ gara aga? (Lee chaatị dị na peji nke 12 ruo 15.)

19 N’ọtụtụ ụzọ taa, anyị nọ n’ọnọdụ ka nke Abraham mma. Anyị maara na Jehova mezuru nkwa nile o kwere Abraham. Ụmụ Abraham ketara Kenean, ha ghọkwara mba dị ukwuu. (1 Ndị Eze 4:20; Ndị Hibru 11:12) Ọzọkwa, mgbe ihe dị ka afọ 1,971 gasịrị mgbe Abraham kwapụsịrị na Heran, Jọn Onye Na-eme Baptism mere onye sitere n’usoro ọmụmụ ya bụ́ Jisọs baptism ná mmiri, e mesịakwa Jehova n’onwe ya ejiri mmụọ nsọ mee ya iji ghọọ Mesaịa ahụ, Mkpụrụ Abraham n’echiche ime mmụọ zuru ezu. (Matiu 3:16, 17; Ndị Galetia 3:16) Na Nisan 14, 33 O.A., Jisọs nyefere ndụ ya dị ka ihe mgbapụta maka ndị ga-egosipụta okwukwe n’ebe ọ nọ. (Matiu 20:28; John 3:16) Ọtụtụ nde mmadụ pụrụ isite na ya ugbu a gọzie onwe ha. N’afọ gara aga, mmadụ 13,896,312 gbakọtara na Nisan 14 ime ememe ncheta omume ịhụnanya a dị ebube. Lee iwepụ aha Jehova bụ́ Onye Ukwu Na-emezu nkwa, n’ụta ọ bụ!

20, 21. Olee otú ndị sitere ná mba nile si site na Mkpụrụ Abraham gọzie onwe ha na narị afọ mbụ, oleekwa otú ha si na-agọzi onwe ha taa?

20 Na narị afọ mbụ, ọtụtụ ndị sitere na mba nile—malite n’Israel anụ ahụ—nwere okwukwe ná Mkpụrụ Abraham a ma ghọọ ụmụ ndị ikom Chineke e tere mmanụ, ndị òtù nke ‘Israel ime mmụọ ọhụrụ nke Chineke.’ (Ndị Galetia 3:26-29; 6:16; Ọrụ 3:25, 26) Ha nwere atụmanya e ji n’aka nke ibi ndụ anwụghị anwụ dị ka mmụọ n’eluigwe dị ka ndị ga-eso achị n’Alaeze Chineke. Nanị 144,000 ka a ga-esi otú a gọzie, ọ bụkwa ole na ole n’ime ha fọdụrụ. (Mkpughe 5:9, 10; 7:4) N’afọ gara aga, mmadụ 8,756 gbara akaebe nkwenye ha kwenyere na ha so n’ọnụ ọgụgụ a site n’ikere òkè n’ihe nnọchianya ndị ahụ n’oge Ememe Ncheta ahụ.

21 Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ Ndịàmà Jehova nile taa so ‘n’oké ìgwè mmadụ’ ahụ e buru amụma ya na Mkpughe 7:9-17. N’ihi na ha sitere na Jisọs na-agọzi onwe ha, ha nwere olileanya nke ibi ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. (Mkpughe 21:3-5) Mmadụ 5,888,650 keere òkè n’ọrụ nkwusa na 1998 bụ ihe àmà na ìgwè mmadụ a bụ “oké” ìgwè n’ezie. Ọ na-enye ọṅụ karịsịa ịhụ ka ma Russia ma Ukraine nyere ihe ndekọ ozi nke ihe karịrị ndị nkwusa 100,000 na nke mbụ ha. Akụkọ ozi sitere United States—ndị nkwusa 1,040,283 n’August pụkwara iche. Ndị a bụ nanị atọ n’ime mba 19 nyere akụkọ ozi nke ihe karịrị ndị nkwusa 100,000 n’afọ gara aga.

A Gaje Imezu Olileanya Anyị n’Isi Nso

22, 23. (a) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji mee ka obi anyị guzosie ike taa? (b) Olee otú anyị pụrụ isi dị ka Abraham, ọ bụghị dị ka ndị ahụ na-enweghị okwukwe Pọl kpọtụrụ uche?

22 E chetaara ndị bịara Ememe Ncheta ahụ ókè anyị bịarurula ná mmezu nke nkwa Jehova. Na 1914, e chiri Jisọs Eze nke Alaeze eluigwe Chineke, na-amalite ọnụnọ ya n’ike Alaeze. (Matiu 24:3; Mkpughe 11:15) Ee, Mkpụrụ Abraham na-achị ugbu a n’eluigwe! Jemes gwara ndị Kraịst nọ n’oge ya, sị: “Na-atachikwanụ ogologo ntachi obi; meenụ ka obi unu guzosie ike: n’ihi na [ọnụnọ NW] nke Onyenwe anyị dị nso.” (Jemes 5:8) Ọnụnọ ahụ abịawo ugbu a! Lee ihe ọzọ dị nnọọ ukwuu mere anyị ga-eji mee ka obi anyị guzosie ike!

23 Ka ọmụmụ Bible chiri anya na ekpere sitere n’ezi obi mee ka obi ike anyị nwere ná nkwa Chineke na-adị ọhụrụ mgbe nile. Ka anyị ghara ịkwụsị mgbe ọ bụla ịdị na-enweta ngọzi Jehova ka anyị na-erube isi n’Okwu ya. Mgbe ahụ anyị ga-adị ka Abraham, ọ bụghị dị ka ndị ahụ okwukwe ha dara mbà ma nwụọ, dị ka Pọl kpọtụrụ uche. Ọ dịghị ihe ọ bụla ga-ekewapụ anyị n’okwukwe anyị dịkarịsịrị nsọ. (Jud 20) Anyị na-ekpe ekpere ka nke a bụrụ eziokwu n’ebe ndị ohu Jehova nile nọ n’afọ ije ozi nke 1999 ma gaa n’ihu banye n’ọdịnihu ebighị ebi.

Ị̀ Maara?

◻ Olee otú anyị pụrụ isi ṅaa Chineke ntị taa?

◻ Olee abamuru ndị a na-enweta site n’ekpere e ji ezi uche kpegara Chineke?

◻ Ọ bụrụ na anyị jiri nrubeisi gbasoo nduzi Jehova, olee otú a ga-esi wusie okwukwe anyị ike?

◻ Olee akụkụ nke akụkọ mgbaafọ (na peji nke 12 ruo 15) masịrị gị karịsịa?

[Chaatị dị na peeji nke 12-15]

AKỤKỌ AFỌ IJE OZI 1998 NKE NDỊÀMÀ JEHOVA N’ỤWA NILE

(Lee Ụlọ Nche a nke e biri ebi)

[Foto dị na peeji nke 16]

Ọ bụrụ na anyị ṅaa ntị n’Okwu Jehova, obi ike anyị nwere ná nkwa ya ga-adịghachi ọhụrụ

[Foto dị na peeji nke 18]

A na-ewusi okwukwe anyị ike mgbe anyị keere ókè n’ozi ahụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya