Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 3/1 p. 3-4
  • Chọọchị Dị Iche Iche Na-eme Nkwupụta

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chọọchị Dị Iche Iche Na-eme Nkwupụta
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mgbe Popu Rịọrọ Mgbaghara
  • N’ihi Gịnị?
  • Gịnị Mere Ha Ji Na-arịọ Mgbaghara?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Chọọchị Katọlik na Oké Mgbukpọ Ahụ
    Teta!—1998
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 3/1 p. 3-4

Chọọchị Dị Iche Iche Na-eme Nkwupụta

“Popu Ekpee Chọọchị Ikpe.” “Njụta Okwukwe na Imegide Ndị Juu —Chọọchị Na-akwadebe ‘Mea Culpa’ Ya.”a “‘Mea Culpa’ Maka Oké Mgbukpọ Ahụ.” “Ndị Metọdist Arịọọ Ndị India nke Ime Ime Ọdịda Anyanwụ Mgbaghara.”

Ị̀ GỤWO isi akụkọ ndị yiri ndị a? O yiri ka n’ọ̀tụ̀tụ̀ na-arịwanye elu, chọọchị dị iche iche na-anakwere ụta ma na-arịọ mgbaghara maka ihe ha meworo n’ime ọtụtụ narị afọ gafeworonụ. Usoro mgbasa ozi anọgidewo na-eme ka mea culpa ndị ọhụrụ nke popu na-apụta ìhè.

Mgbe Popu Rịọrọ Mgbaghara

N’agbata 1980 na 1996, John Paul nke Abụọ ‘nakweere mmejọ mere ihe akụkọ nke Chọọchị ma ọ bụ rịọ mgbaghara’ ọ dịkarịa ala ugboro 94, ka onye na-akọwa ihe na-eme na Vatican bụ́ Luigi Accattoli kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ Quando il papa chiede perdono (Mgbe Popu Rịọrọ Mgbaghara). Dị ka Accattoli si kwuo, “na Chọọchị Katọlik, nanị popu pụrụ izi ezi ikwupụta mea culpa.” O mewokwa nke a, na-ezo aka n’akụkọ kasị weta esemokwu nke Katọlik—Agha Ntụte, agha, ịkwado ọchịchị aka ike, nkewa n’ime chọọchị, imegide ndị Juu, Njụta Okwukwe, òtù Mafia, na ịkpa ókè agbụrụ. N’ihe odide e zigaara ndị kadinal na 1994 (bụ́ nke ụfọdụ na-eche na ọ bụ ihe odide kasị mkpa nke sitere n’ọfịs popu), John Paul nke Abụọ tụrụ aro “ime nkwupụta mmehie nke narị afọ iri n’ọha.”

Ọtụtụ ndị ụkọchukwu agbasowo ihe nlereanya popu. Na December 1994 akwụkwọ akụkọ Itali bụ́ Il Giornale kọrọ, sị: “Ọtụtụ ndị ụkọchukwu America pụtara na telivishọn ma rịọ mgbaghara n’ihu ọha.” Maka gịnị? Maka iwere nsogbu nke ndị ụkọchukwu na-edina ụmụaka dị ka ihe dị nta, nke nwere mmetụta ọjọọ n’ahụ ọtụtụ ụmụaka e dinaworo. Na January 1995 akwụkwọ akụkọ bụ́ La Repubblica kọrọ banyere “omume a na-emetụbeghị mbụ n’akụkọ ihe mere eme nke Okpukpe Katọlik dị ugbu a”—e kwuru okwu banyere nsogbu nke mgbachi nkịtị nke Popu Pius nke Iri na Abụọ n’ihe banyere Oké Mgbukpọ ahụ. Na January 1995 otu akwụkwọ akụkọ ahụ kọrọ na òtù ndị bishọp nke Germany rịọrọ mgbaghara maka “ọtụtụ mmejọ” nke ndị Roman Katọlik bụ́ ndị kwadoro mpụ nke ndị Nazi. Chọọchị Protestant dị iche iche akatọwokwa onwe ha.

N’ihi Gịnị?

Bible na-agba anyị ume ịrịọ mgbaghara mgbe anyị mejọrọ, ọtụtụ na-ajakwa chọọchị dị iche iche mma mgbe ha katọrọ onwe ha. (Jemes 5:16) Ma n’ihi gịnị ka chọọchị dị iche iche ji na-eme nke a? Olee otú o kwesịrị isi metụta ụzọ anyị si ele ha anya?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a  Okwu Latin maka “ihe m mejọrọ,” akụkụ nke ekpere ndị Katọlik (Confiteor, ma ọ bụ, “m na-eme nkwupụta”), bụ́ oge ndị ụka na-ekwughachi okwu a.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya