Chọọchị Katọlik na Oké Mgbukpọ Ahụ
Site n’aka onye nta akụkọ Teta! n’Itali
MALITERỊ na 1987, e nwere nkwurịta okwu banyere atụmatụ Chọọchị Katọlik na-eme ibipụta otu ihe odide ga-anakwere ụta dịịrị ya n’Oké Mgbukpọ ahụ. Ya mere e nwere atụmanya dị ukwuu na March 1998 mgbe Òtù Vatican Na-ahụ Maka Mmekọrịta Ya na Ndị Juu n’Ụzọ Okpukpe wepụtara ihe odide a kpọrọ We Remember: A Reflection on the Shoah.a
Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị nwere mmasị n’ihe odide ahụ, ọtụtụ ndị enweghị afọ ojuju n’ihe dị n’ime ya. N’ihi gịnị? Gịnị bụ ihe na-adịghị ha mma?
Imegide Ndị Juu na Ụmụ Shem
Ihe odide ahụ si Vatican na-akpa ókè n’etiti imegide ndị Juu, bụ́ nke chọọchị na-anakwere ụta maka ya, na imegide ụmụ Shem, bụ́ nke ọ na-agọrọ isi ya na ya. Ọtụtụ ndị na-ahụ ịkpa ókè ahụ na nkwubi okwu ọ na-eduga na ya dị ka nke na-adịghị eju afọ. Onye Germany bụ́ rabaị bụ́ Ignatz Bubis kwuru, sị: “Nye m o yiri ka ọ bụ ịsị na ụta adịghịrị anyị; ọ bụ onye ọzọ ka ụta dịịrị.”
Ọ bụ ezie na onye Itali bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme Katọlik bụ́ Giorgio Vecchio nabatara ịkpa ókè ahụ dị n’etiti imegide ndị Juu na imegide ụmụ Shem, ọ na-akọwa na “ihe bụkwa nsogbu bụ ịghọta otú ndị Katọlik imegide ndị Juu pụrụ isiwo tụnye ụtụ ná ntolite nke imegide ụmụ Shem.” Ọ dị mma ịmara na akwụkwọ Vatican bụ́ L’Osservatore Romano, nke November 22-23, 1895, bipụtara otu akwụkwọ ozi na-ekwu, sị: “N’ụzọ bụ́ isi, onye Katọlik ọ bụla nwere obi eziokwu na-emegide ụmụ Shem: otú ahụ ka ọ dị ndị ụkọchukwu, site ná mmanye nke ozizi na ọrụ ha.”
Otú ọ dị, akụkụ nke ihe odide ahụ si Vatican nke kpalitere nkatọ kasịnụ bụ mgbachitere nke a ghachiteere ihe ndị Pius nke Iri na Abụọ mere, bụ́ popu a họpụtara nwa mgbe nta tupu Agha Ụwa nke Abụọ amalite. Pius nke Iri na Abụọ ejewo ozi dị ka onye nnọchiteanya kasị elu nke popu na Germany malite na 1917 ruo 1929.
Ịgba Nkịtị nke Pius nke Iri na Abụọ
Ọkàikpe bụ́ onye Itali bụ́ Francesco Margiotta Broglio echeghị na ihe odide ahụ “na-ekwu ihe ọhụrụ ma ọ bụ ihe ndị na-akọwa okwu ahụ a na-arụsiri ụka ike banyere ihe ahụ a kpọrọ ‘ịgba nkịtị’ nke Popu Pius nke Iri na Abụọ, ná nkwado a sị na ọ kwadoro ndị Germany, nakwa n’ihe ndị o ji akọ meere ọchịchị Nazi tupu na n’oge ọ bụ popu.”
Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị na-enye nkọwa kwenyere na n’agbanyeghị otú mmadụ si lee ihe ihe odide ahụ bụ́ We Remember pụtara anya, ajụjụ banyere ihe mere ndị ndú Chọọchị Katọlik ji gbachi nkịtị banyere mgbuchapụ ahụ weere ọnọdụ n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche nke ndị Nazi bụ nke “a na-azabeghị.” Dị ka onye America bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ George Mosse si kwuo, site n’ịhọrọ ịgbachi nkịtị Pius nke Iri na Abụọ “zọpụtara chọọchị ma bibie ozi ya banyere omume ọma. Ọ kpara àgwà dị ka onyeisi ala, ọ bụghị dị ka popu.” Ndị ma nke a na-akọ na-ekiri ihe na-eme na Vatican kwenyere na ihe mere mwepụta nke ihe odide ahụ ji nọọ ọdụ bụ nsogbu dị n’ikwu banyere òkè Pius nke Iri na Abụọ keere n’Oké Mgbukpọ ahụ.
Mgbachitere nke ihe odide ahụ ghachiteere Popu Pius nke Iri na Abụọ akpasuwo ọtụtụ ndị iwe. “Ịgbachi nkịtị n’ihe banyere ‘ịgba nkịtị nke popu’ ahụ na-eme ka e nwee ndakpọ olileanya banyere ihe odide a,” ka Arrigo Levi na-ede. Elie Wiesel, bụ́ onye nwetara Onyinye Nobel Maka Udo na 1986, kwuru, sị: “Ọ dị m ka ikwu na anyị bụ́ ndị Juu kwesịrị ịdị na-ekele Pius nke Iri na Abụọ ọ̀ bụ ịjụ okwukwe, n’ikwu ya n’ụzọ dị nro.”
Ibugara Ndị Ọzọ Ụta Ahụ
Ihe odide ahụ nakweere ịkpa ókè ọkpụtọrọkpụ nke ndị ọkà mmụta okpukpe Katọlik kpara, bụ́ nke a na-ekwu na ọ bụ ya mere ka chọọchị dị ka otu òtù dị nsọ ma bụrụ nke Chineke chekwara pụọ ná njehie, ebe ndị òtù ya, ndị bụ́ ndị mmehie, bụ ndị ụta dịịrị maka ihe ọjọọ ọ bụla e mere. Òtù Vatican ahụ na-ede, sị: “Nguzogide ime mmụọ na nke omume doro anya nke ndị Kraịst ndị ọzọ abụghị nke a pụrụ ịtụwori anya ya n’aka ụmụazụ Kraịst. . . . [Ndị dị otú ahụ] esirughị ike ime mkpesa ha n’ihu ọha. . . . Njehie na ọdịda nke ndị ahụ na-eje Chọọchị wutere anyị nke ukwuu.”
Otú ọ dị, ịsị na ụta dịịrị ndị mmadụ n’otu n’otu bụ́ ndị òtù chọọchị kama ịnakwere ya dị ka otu òtù yiri ịdaba n’ọnọdụ ka njọ n’anya ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ, ma e jiri ya tụnyere arịrịọ doro anya maka mgbaghara a rịọrọ na nso nso a. Dị ka ihe atụ, Chọọchị Roman Katọlik dị na France bipụtara “Nkwupụta nke Nchegharị,” na-arịọ Chineke na ndị Juu mgbaghara n’ihi omume “ọ gbasaghị m” nke Chọọchị Katọlik gosiri ná mkpagbu nke a kpagburu ndị Juu n’okpuru ọchịchị Vichy nke France n’oge agha. N’ihe odide Achịbishọp Olivier de Berranger gụpụtara, chọọchị a kwetara na o kwerewo ka ọdịmma nke onwe ya “kpuchie ibu ọrụ dabeere na Bible nke ịkwanyere mmadụ nile e kere n’onyinyo Chineke ùgwù.”
Nkwupụta ahụ e dere n’asụsụ French kwuru ná mkpirikpi, sị: “Chọọchị a aghaghị ịmata na n’ihe banyere mkpagbu nke ndị Juu, na karịsịa n’ihe banyere ọtụtụ iwu imegide ụmụ Shem nke ndị ọchịchị Vichy tiri, omume ọ gbasaghị m karịrị enweghị mmasị n’ebe ọ dị nke ukwuu. Ịgba nkịtị bụ ihe e mere, ikwukwa okwu n’ịkwado ndị ahụ a na-emegbu bụ ihe a na-adịghị emekebe. . . . Taa, anyị na-ekwupụta na ịgba nkịtị a bụ ihie ụzọ. Anyị ghọtakwara na chọọchị a dị na France arụghị ọrụ ya dị ka onye na-akụziri akọ na uche ụmu mmadụ ihe.”
Ihe karịrị afọ 50 ka ajọ ọdachi nke Shoah, ma ọ bụ Oké Mgbukpọ ahụ gasịrị, Chọọchị Katọlik anakwerebeghị akụkọ ihe mere eme ya—nke ihe na-edoghị anya na nke ịgba nkịtị, n’ikwu ya nanị otú ahụ. Ma e nwere ụfọdụ ndị ọ na-adịtụbeghị mkpa na ha ga-eme ihe dị otú ahụ. Ndịàmà Jehova, bụ́ okpukpe ka nta n’ọnụ ọgụgụ bụ́ ndị ndị Nazi kpagburu n’ụzọ obi ọjọọ, emebighị okwukwe ha.
Dị ka o dowanyere anya n’oge ndị na-adịbeghị anya, n’ụzọ dị iche n’ebe ndị chọọchị nọ, Ndịàmà katọrọ obi ọjọọ nke ndị Nazi. Ọ bụghịkwa nanị dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu ka ha mere otú ahụ. Ndị na-ekwuchitere ha tinyere akwụkwọ ha mekwara otú ahụ. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Christine King, bụ́ onyeisi na Mahadum Staffordshire dị na England, kọwara, sị: “Ndịàmà Jehova kwupụrụ okwu. Ha kwupụrụ okwu site ná mmalite. Ha kwupụrụ okwu n’otu olu. Ha jikwa obi ike dị ukwuu kwupụ okwu, bụ́ nke nwere ihe mmụta nye anyị nile.”
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Shoah bụ okwu Hibru maka Oké Mgbukpọ ahụ, bụ́ ogbugbu ndị Nazi gburu ndị Juu, ndị Gypsy, ndị Poland, ndị Ọwụwa Anyanwụ Europe, na ndị ọzọ n’ìgwè n’oge Agha Ụwa nke Abụọ.
[Foto dị na peeji nke 28]
Popu Pius nke Iri na Abụọ gbachiri nkịtị n’oge Oké Mgbukpọ ahụ
[Ebe E Si Nweta Foto]
U.S. Army photo