Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 3/1 p. 4-7
  • Gịnị Mere Ha Ji Na-arịọ Mgbaghara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Mere Ha Ji Na-arịọ Mgbaghara?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Njikọ Okpukpe na Nguzo Omume Ọma
  • Ọ Bụghị Mmadụ Nile Kwere
  • Ikpe Chineke
  • Chọọchị Dị Iche Iche Na-eme Nkwupụta
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • È Nwere Nanị Otu ‘Ezi Chọọchị’?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • N’ihi Gịnị Ka Ikike Chọọchị Ji Ada?
    Teta!—1996
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 3/1 p. 4-7

Gịnị Mere Ha Ji Na-arịọ Mgbaghara?

ECHICHE ahụ bụ́ na chọọchị dị iche iche kwesịrị isi ná mmejọ ha chegharịa ma gbanwee onwe ha abụghị ihe ọhụrụ. Religioni e miti (Okpukpe na Akụkọ Ọdịbendị Na-emeghị Eme), bụ́ akwụkwọ ọkọwa okwu nke okpukpe, na-asị na ihe ahụ e chere na ọ bụ iguzosi ike n’ezi ihe nke chọọchị oge mbụ masịrị ndị mmadụ n’oge Ụwa Na-emepechabeghị Anya ma duje ọtụtụ ndị n’ịchọ ka e nwee mgbanwe.

Na 1523, mgbe Martin Luther kewapụsịrị onwe ya n’ebe Rome dị, Popu Adrian nke Isii nwara iwepụ nkewa ahụ site n’izijere Nzukọ Ndị Isi nke Nuremberg ozi a: “Anyị maara nke ọma na ruo ọtụtụ afọ ihe ndị kwesịrị ka a kpọọ asị̀ agbawo Ocheeze Popu gburugburu . . . Anyị ga-eji ịdị uchu nile buru ụzọ gbanwee Usoro Ọchịchị Popu nke Rom ebe, ikekwe, ajọ ihe ndị a nile siri malite.” Otú ọ dị, nkweta ahụ edozilighị nkewa ahụ, o gbochighịkwa mmerụ dị n’Usoro Ọchịchị popu.

Na nso nso a karị a katọwo chọọchị dị iche iche maka nkịtị ha gbara n’ihe metụtara Oké Mgbukpọ ahụ. E bowokwa ha ebubo nke agwaghị ndị òtù ha ka ha ghara ikere òkè n’agha. Na 1941, ka Agha Ụwa nke Abụọ na-alụ, otu ụkọchukwu aha ya bụ Primo Mazzolari jụrụ, sị: “Gịnị mere Rom emeghachibeghị omume n’ụzọ siri ike ná ndakpọ nke Ozizi Katọlik dị ka ọ na-emebu, ka na-emekwa, n’ihe banyere ozizi ndị na-adịchaghị ize ndụ?” Ozizi ndị na-adịchaghị ize ndụ ka gịnị? Ụkọchukwu ahụ na-ekwu banyere ịhụ mba n’anya na-akpasu agha nke na-ebibisị mmepeanya n’oge ahụ.

Otú ọ dị, eziokwu dị na ya bụ na ruo nnọọ na nso nso a, okpukpe ikweta na ikpe mara ya bụ ihe a na-adịghị ahụkebe. Na 1832, ná nzaghachi nye ụfọdụ ndị na-agba Chọọchị Katọlik ume ‘inwogha onwe ya,’ Gregory nke Iri na Isii kwuru, sị: “Ọ bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya ma dị njọ n’ụzọ doro anya ịtụ aro otu ụdị ‘mweghachi na nnwogha’ maka nchebe na uto [chọọchị], ka a ga-asị na a pụrụ ile ya anya dị ka ihe pụrụ inwe ntụpọ.” Gịnị banyere ntụpọ ndị pụtara ìhè nke na a pụghị ịgọpụ ha? E jiri ụzọ dị iche iche mee ihe iji gọpụ ha. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị ọkà mmụta okpukpe anọgidewo na-ekwu na chọọchị ahụ dị nsọ, na-emekwa mmehie. A sị na chọọchị ahụ n’onwe ya dị nsọ—bụrụ nke Chineke chebere pụọ ná mmejọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị òtù ya na-eme mmehie. N’ihi ya, mgbe a kpara arụ n’aha chọọchị ahụ, e kwesịghị ịta chọọchị ahụ ụta, kama e kwesịrị ịta ndị nọ n’ime chọọchị ahụ ụta. Nke ahụ ọ̀ dara ka ihe ezi uche dị na ya? Ọ daghị otú ahụ ná ntị ọkà mmụta okpukpe Roman Katọlik bụ́ Hans Küng, bụ́ onye dere, sị: “Ọ dịghị Chọọchị zuru okè nke ka ndị mmadụ elu.” Ọ kọwara, sị: “Chọọchị nke na-enweghị mmehie ọ ga-ekwupụta adịghị.”

Njikọ Okpukpe na Nguzo Omume Ọma

Ị pụrụ iche n’echiche ihe omume ndị dujeworo chọọchị dị iche iche ịrịọ mgbaghara ugbu a. Na mbụ, ndị Protestant na Ọtọdọks kwetara na ha kpatara “nkewa ndị gara aga” n’etiti òtù okpukpe dị iche iche. Ha mere nke a ná nnọkọ njikọ okpukpe a kpọrọ “Okwukwe na Nhazi” nke e nwere na Lausanne, Switzerland, na 1927. Chọọchị Roman Katọlik mesịrị mee otu ihe ahụ. Karịsịa kemgbe Vatican nke Abụọ,a ndị ụkọchukwu nwere ọkwá dị elu, gụnyere ndị popu, arịọwo mgbaghara mgbe mgbe karị maka nkewa dị n’ime Krisendọm. N’ihi nzube dị aṅaa? N’ụzọ doro anya, ha chọkwuru ịdị n’otu n’ime Krisendọm. Onye Katọlik na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Nicolino Sarale kwuru na n’ime “ihe omume ‘mea culpa’ nke John Paul nke Abụọ, e nwere otu ụzọ ime ihe, nke ahụ bụkwa njikọ okpukpe.”

Otú ọ dị, ọ gụnyere ihe karịrị njikọ okpukpe. Taa, a maara akụkọ ihe mere eme dị njọ nke Krisendọm ebe nile. “Katọlik apụghị nnọọ ileghara akụkọ ihe mere eme a nile anya,” ka ọkà mmụta okpukpe bụ́ Hans Urs von Balthasar na-ekwu. “Chọọchị ọ nọ n’ime ya kpọmkwem emewo ma ọ bụ kwe ka e mee ihe ndị anyị na-apụtụghị ịkwado n’oge a.” Ya mere, popu ahọpụtawo òtù ọrụ “ịkọwa ihe ọjọọ nke chọọchị mere ka . . . e wee nwee ike ịrịọ mgbaghara.” Mgbe ahụ, ihe ọzọ mere chọọchị ahụ ji dị njikere ịkatọ onwe ya yiri ka ọ bụ ọchịchọ inwetaghachi nguzo omume ọma ya.

N’ụzọ yiri nke ahụ, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Alberto Melloni, mgbe ọ na-ekwu okwu banyere arịrịọ chọọchị ahụ rịọrọ maka mgbaghara, na-ede, sị: “N’ezie, ihe a na-arịọ mgbe ụfọdụ bụ iwepụ n’ebubo nke ịbụ ndị a ga-ata ụta.” Ee, Chọọchị Katọlik yiri ka ọ na-anwa iwepụ ibu arọ nke mmehie ndị gara aga iji nwetaghachi nguzo ọma n’anya ọha mmadụ. Otú ọ dị, n’eziokwu nile, a ghaghị ikwu na o yiri ka o nwere mmasị ka ukwuu n’ime udo nke ya na ụwa karịa nke ya na Chineke.

Ụdị omume ahụ na-echetara anyị banyere Sọl, eze mbụ nke Israel. (1 Samuel 15:1-12) O mere mmehie dị oké njọ, mgbe e kpughekwara nke a, o buru ụzọ gbalịa igosi izi ezi nke ihe o mere—ịgọpụ mmehie ya—n’ihu Samuel, onye amụma Chineke kwesịrị ntụkwasị obi. (1 Samuel 15:13-21) N’ikpeazụ, eze ahụ aghaghị ikweta n’ihu Samuel, sị: “Emehiewo m: n’ihi na agabigawo m okwu ọnụ Jehova.” (1 Samuel 15:24, 25) Ee, o kwetara mmejọ ya. Ma okwu ọzọ ọ gwara Samuel na-ekpughe ihe kasị dịrị ya n’uche: “Emehiewo m: biko, sọpụrụ m ugbu a n’ihu ndị okenye ndị m, na n’ihu Israel.” (1 Samuel 15:30) Ihe àmà na-egosi na Sọl nwere mmasị karị ná nguzo ya n’Israel karịa na ya na Chineke ịdịghachi ná mma. Àgwà a emeghị ka Chineke gbaghara Sọl. Ì chere na àgwà yiri nke ahụ ga-eme ka Chineke gbaghara chọọchị dị iche iche?

Ọ Bụghị Mmadụ Nile Kwere

Ọ bụghị mmadụ nile kwere na chọọchị dị iche iche kwesịrị ịrịọ mgbaghara n’ihu ọha. Dị ka ihe atụ, ahụ adịghị eru ọtụtụ ndị Roman Katọlik ala mgbe popu ha na-arịọ mgbaghara maka ịgba ohu ma ọ bụ nabataghachi “ndị jụrụ okwukwe” dị ka Hus na Calvin. Dị ka akụkọ ndị e si na Vatican nweta na-ekwu, ndị kadinal gara nnọkọ e nwere na June 1994 katọrọ akwụkwọ ahụ e zijeere ndị kadinal na-atụ aro maka “nnyocha akọ na uche” banyere akụkọ ihe mere eme nke narị afọ iri gara aga nke Okpukpe Katọlik. Ka o sina dị, mgbe popu chọrọ itinye isi ihe dị n’aro ahụ n’otu akwụkwọ ozi o degaara ndị bishọp, kadinal Giacomo Biffi bụ́ onye Itali wepụtara otu ihe o degaara ndị dayọsis ya nke o kwuru n’ime ya, sị: “Chọọchị anyị enweghị mmehie.” Ka o sina dị, o kwetara, sị: “Ịrịọ mgbaghara maka mmejọ chọọchị na narị afọ ndị gara aga . . . pụrụ ime ka anyị bụrụ ndị a na-anabata karị.”

“Nkwupụta mmehie bụ otu n’ime okwu kasị eweta esemokwu n’ime Chọọchị Katọlik,” ka onye na-akọwa ihe na-eme na Vatican bụ́ Luigi Accattoli na-ekwu. “Ọ bụrụ na popu ekweta mmejọ nke ndị ozi ala ọzọ, e nwere ndị ozi ala ọzọ ọ na-ewute n’ezi obi.” Ọzọkwa, onye Roman Katọlik na-ede akụkọ dere, sị: “Ọ bụrụ na popu n’ezie nwere echiche dị otú ahụ na-akpata ụjọ banyere akụkọ ihe mere eme nke Chọọchị, o siri ike ịghọta otú ọ pụrụ isi gosi otu Chọọchị ahụ ugbu a dị ka onye na-akwado ‘ihe ndị ruuru mmadụ,’ ‘nne na onye ozizi’ nke nanị ya pụrụ iduru ihe a kpọrọ mmadụ gaa na narị afọ iri nke atọ dị mma n’ezie.”

Bible na-adọ aka ná ntị megide ngosipụta nke nchegharị nke ọ bụ nanị mmechuihu nke ịbụ onye e jidere n’ihe ọjọọ kwaliri. Ọ na-esi ike ụdị nchegharị ahụ iduje ná mgbanwe na-adịte anya n’ebe onye ahụ na-echegharịnụ nọ. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 7:8-11.) “Mkpụrụ kwesịrị nchegharị”—ya bụ, ihe àmà nke nchegharị ahụ isi n’ezi obi na nchegharị nke bara uru n’anya Chineke na-eso.—Luk 3:8.

Bible na-ekwu na onye na-echegharị ma na-ekwupụta mmehie ya aghaghị ịhapụ omume na-adịghị mma, kwụsị ime ha. (Ilu 28:13) Nke a ò mewo? Ọ dị mma, mgbe Chọọchị Roman Katọlik na chọọchị ndị ọzọ kwupụtasịrị mmehie ha, gịnị mere n’ọgụ obodo ndị e nwere ná nso nso a n’ebe etiti Africa na Ọwụwa Anyanwụ Europe, ebe ọnụ ọgụgụ buru ibu nke “ndị Kraịst” sonyere na ha? Chọọchị dị iche iche hà mere ihe dị ka ihe na-eweta udo? Ndị ndú ha nile hà ji otu olu kwuo okwu megide arụ nile nke ndị òtù ha na-akpa? Ee e. Leenụ, ọbụna ụfọdụ ndị ụkọchukwu okpukpe keere òkè n’igbu mmadụ ahụ!

Ikpe Chineke

Mgbe ọ na-ekwu okwu banyere mea culpa ndị popu kwughachiri ọtụtụ mgbe, Kadinal Biffi jụrụ n’ụzọ megidere ihe o bu n’obi, sị: “Maka mmehie ndị gara aga, ọ̀ bụ na ọ gaghị akara anyị nile mma ichere ikpe ụwa nile?” Ikpe nke ihe nile a kpọrọ mmadụ na-eru oké nso. Jehova Chineke maara nke ọma ihe ọjọọ nile nke akụkọ ihe mere eme nke okpukpe. N’oge na-adịghị nnọọ anya, ọ ga-ajụ ndị ikpe mara ajụjụ. (Mkpughe 18:4-8) Ka ọ dịgodị ugbu a, ọ̀ ga-ekwe omume ịchọta ụdị ofufe nke a na-emetọbeghị site n’ikpe ọmụma ọbara, ekweghị ibe nọrọ obi ọjọọ, na mpụ ndị ọzọ nke chọọchị dị iche iche nke Krisendọm na-arịọ mgbaghara maka ha? Ee.

Olee otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ? Site n’itinye ụkpụrụ nduzi nke Jisọs Kraịst kwuru n’ọrụ: “Unu ga-esite ná mkpụrụ ha mazuo ha.” Ihe ndekọ nke akụkọ ihe mere eme, nke ụfọdụ okpukpe ga-achọ ka e chefuo, na-enyere anyị aka ịmata ọ bụghị nanị ndị ahụ Jisọs kpọrọ “ndị amụma ụgha” kamakwa ndị ahụ mịpụtaworo “mkpụrụ ọma.” (Matiu 7:15-20) Ole ndị bụ ndị a? Anyị na-akpọ gị òkù ka ị chọpụta n’onwe gị site n’isoro Ndịàmà Jehova nyochaa Bible. Chọpụta ndị na-agbalị taa n’ezie ịgbaso Okwu Chineke karịa ịchọ ichekwa ọkwá ịchịisi n’ime ụwa.—Ọrụ 17:11.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Kansụl njikọ okpukpe nke 21 nke zukọrọ ná nnọkọ anọ na Rom malite na 1962-1965.

[Foto dị na peeji nke 5]

Chọọchị dị iche iche na-arịọ mgbaghara maka arụ ndị yiri nke a

[Ebe E Si Nweta Foto]

The Complete Encyclopedia of Illustration/J. G. Heck

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya