Ámá Nzukọ—Ebe Kasị Mkpa n’Atens Oge Ochie
ÓGBÈ Atens ahụ nke nwere ndị ụbụrụ na-aghọ nkọ nọ n’ọgba aghara! A na-akpọsa echiche ọhụrụ mgbe nile n’ámá nzukọ, ma ọ bụ ọmà ahịa nke obodo ukwu Gris. Otú ọ dị, ọ dị nnọọ iche na nke ugbu a. N’ịbụ onye ka bịarutere abịarute n’obodo ukwu ahụ, otu nwoke onye Juu yiri ka ọ bụ “onye na-ekwusa ndị mmụọ nke ala ọzọ.” Ọ nọ na-ekwu okwu dị ịrịba ama nye “ndị ọ na-ezute.” “Gịnị ka onye ekwukwu a na-achọ ikwu?” ka ndị Epikurean dị mpako na ndị Stoik ahụ na-enweghị ihu ọchị jụrụ. Ee, ámá nzukọ ndị Atens ahụ bụ ebe a na-enwe nrụrịta ụka ihu ọha n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ isiokwu ọ bụla n’okpuru anyanwụ. Ma iwebata chi ndị ọhụrụ—ee e, nke a karịrị akarị n’ezie!—Ọrụ 17:17, 18.
Nke ahụ bụ mmeghachi omume inyo ihe enyo nke ndị Atens mgbe Pọl onyeozi malitere ime nkwusa nke mbụ ya n’ámá nzukọ ndị Atens. Ọ na-ekwu banyere Jisọs Kraịst na mbilite n’ọnwụ. Otú ọ dị, nye ọdịbendị Atens ahụ yiri nke na-anabata ihe, gịnị pụrụ iche n’iwebata ụdị echiche ọhụrụ ahụ n’ámá nzukọ ahụ?
Atens Enweta Ámá Ya
Ihe pụrụ iche n’ezie bụ ámá nzukọ ahụ n’onwe ya na òkè dị oké mkpa o keere ná ndụ okpukpe na nke ọha nke ndị Atens. Ámá nzukọ Atens bụ ebe kpọdatụrụ akpọda nke dị ihe dị ka hekta 10 dị n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ nke Acropolis. O yiri ka ná mbido nke narị afọ nke isii T.O.A., n’oge Solon bụ́ onye ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị na ome iwu n’Atens, a họpụtara ala a dị ka ámá nke obodo ukwu ahụ. Nguzobe nke ọchịchị onye kwuo uche ya n’Atens, ya na ịrị elu nke anya ọ na-elekwasị ná ndụ ụmụ amaala, dugara ná ntiwapụ nke ọrụ ihe owuwu n’afọ ndị mbụ nke narị afọ sochirinụ. Nke a nyere ámá nzukọ ahụ ike ọhụrụ na òkè dị mkpa ikere.
Okwu ahụ bụ́ ámá nzukọ nwere ihe jikọtara ya na ngwaa nke pụtara “gbakọta, zukọta.” Nke a na-ekwekọ n’ojiji a na-eji ámá nzukọ ahụ eme ihe dị ka ebe nzukọ bụ́ isi nke obodo ukwu ahụ. Ámá nzukọ ahụ ghọrọ ebe kasị mkpa ná ndụ nke ọha mmadụ. Ọ bụ ebe e nwere ọchịchị na ụlọikpe obodo, ebe bụ́ isi maka azụmahịa na achụmnta ego, ọgbọ nke ihe ngosi egwuregwu ebe a na-egosi ihe nkiri ndị Gris, ebe a na-anọ eme egwuregwu, na ebe nzukọ a ma ama maka mkparịta ụka ndị isi na-aghọ nkọ.
Ị̀ ga-enwe mmasị ịga njem nleta n’ihe ndị fọdụrụ n’ụlọ nsọ, ị̀bà, ihe ndị a kpụrụ akpụ, ihe ncheta, na ụlọ ọha na eze nke ámá nzukọ ahụ dị n’Atens? Ná mgbalị inyocha ihe ndị gara aga nke ámá nzukọ ahụ, ka anyị hapụtụgodị oké ụzụ nke obodo ukwu nke oge a ma gaa n’okporo ụzọ ajịrịja nkume, n’etiti mkpọmkpọ ebe nke marble dị na ya, nkume ndị a tụrụ atụ, na ọnụ ụzọ ndị na-adakasị adakasị nke ahịhịa dị iche iche tojuru.
Ụlọ Nsọ, Ihu Arụsị, na Chi Bụ́ Ndị Nchebe
Ọtụtụ ụlọ nsọ, ihu arụsị, na ebe nsọ ndị dị ebe ahụ ndị a raara nye chi dị iche iche na-adọrọ mmasị ndị ọbịa. Ihe ndị a nile mere ka ámá nzukọ ahụ bụrụ ebe bụ́ isi nke ofufe, ma e wepụ nanị Acropolis. N’oge Ọgbọ Ọma nke Atens oge ochie, okpukpe abanyewo n’akụkụ nile nke ndụ ọha mmadụ. Nke a pụtara n’ụzọ dị mkpa na e nyere chi ndị ahụ a maara dị ka “chi bụ́ ndị nchebe” nke ngalaba ọchịchị na ọrụ nlekọta dị iche iche ebe nsọ nke ụlọ nsọ n’ámá nzukọ ahụ.
Nke pụtara ìhè n’ime ihe owuwu ndị a bụ Ụlọ Nsọ Hephaetus. E jikọtara chi nwanyị bụ́ Atena na Hephaetus. A na-efe chị abụọ a ofufe n’ebe a dị ka chi bụ́ ndị nchebe nke nkà na ịtụ̀ ihe. Nchọpụta nke ihe ndị e gwupụtara n’ala nke ihe e ji ígwè rụọ na ihe a kpụrụ akpụ gburugburu ụlọ nsọ a egosiwo na o metụtara Hephaetus, bụ́ chi ndị Gris nke nkà nke na-achọ ka e jiri ọkụ mee ihe. Ma e leghị anya na narị afọ nke asaa O.A., a gbanwere ụlọ nsọ a e chekwara nke ọma ịbụ Chọọchị Ọtọdọks nke Grik nke St. George, ọ bụ ezie na e jighị ya eme ihe dị ka nke ahụ taa.
N’ezie, ámá nzukọ ahụ chọrọ chi nchebe nke ya. Nke a bụ Zeus Agoraios, onye e weere na ọ bụ ya na-akpali nkà okwu bụ́ onye a raara otu ebe ịchụaja a chọrọ mma e si na marble Pentelic dị oké ọnụ ahịa mepụta nye. (Tụlee Ọrụ 14:11, 12.) Otu ebe ịchụaja dị nso nke Nne nke Ndị Bụ́ Chi bụ́ nke e doro ndị dike a kpụrụ akpụ n’usoro n’akụkụ ya abụọ n’ụzọ na-adọrọ anya.
N’ịgatụkwu n’ihu, anyị na-ahụ otu obere ụlọ nsọ Ion. Onye ọkà banyere ọdịdị ụwa bụ́ Pausanias kọwara ya dị ka Ụlọ Nsọ nke Apollo bụ́ Nna. N’ihi gịnị? N’ihi na dị ka otu akụkọ nke ndị Gris oge ochie si kọọ, ọ bụ nna Ion, onye malitere agbụrụ ndị Ion nke ndị Atens bụ akụkụ ya.a N’ọkwá a, Apollo bụ otu n’ime chi bụ́ ndị nchebe nke òtù ọchịchị obodo, karịsịa n’ihe metụtara òtù ụmụnna dị iche iche nke dịworo n’obodo ukwu ahụ.
Kpọmkwem n’ebe ugwu, anyị na-ahụ ihe ndị fọdụrụnụ na nkume limestone nke otu ụlọ nsọ ka nta, nke e wuru n’etiti narị afọ nke anọ T.O.A. Ihe ndị a na-efe ofufe n’ebe a bụ́ Zeus na Atena Phatrios, chi ndị bụ́ isi nke òtù ụmụnna okpukpe ndị nna nna. Ịbụ onye òtù ná ndị a fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe a chọrọ iji bụrụ nwa amaala Atens. Kpọmkwem n’ófè okporo ámá ahụ, anyị na-ahụ ihe ndị fọdụrụnụ nke otu ebe ịchụaja nke Chi Iri na Abụọ.
N’Obí Zeus Eleutherios dị nso, ka a sọpụụrụ chi bụ́ isi nke ndị Gris ọzọ, na nke ugbu a dị ka chi nke nnwere onwe na mgbapụta. Ị̀bà, ma ọ bụ obí nke a, bụ ebe mkpagharị a ma ama na ebe nzukọ. A sịrị na onye ọkà ihe ọmụma a ma ama bụ́ Socrates na ndị enyi ya ezukọwo na obí a, ebe ha pụrụ ịnọdụ ala ma kparịta ụka ma ọ bụ kpagharịa. Ọtụtụ nraranye na àjà a chụrụ iji chọọ obí a mma, dị ka ọta nke ndị dike bụ́ ndị nwụrụ ebe ha na-alụ ọgụ maka Atens, nwere njikọ kpọmkwem ná mgbapụta nke obodo ukwu ahụ pụọ n’aka ndị iro ya ma ọ bụ ná nchekwa nke nnwere onwe ya.
Ụzọ Panathenaea
Otu ụzọ dị obosara nke nwere ala ajịrịja nkume nke a kpọrọ Ụzọ Panathenaea, si n’etiti ámá nzukọ ahụ gafee. E nwetara aha ya na ihe pụrụ iche e ji mara ya site n’ememe mba nke Atens, bụ́ Panathenaea. N’oge ememe a, a na-eburu ákwà mkpuchi isi nke chi nwanyị bụ́ Atena gaa ogologo ụzọ a site n’Ụlọ Njem (nke na-esote ọnụ ụzọ ámá obodo ukwu ahụ) ruo Acropolis. Ihe e ji chọọ Parthenon mma na-enyere anyị aka iji anya nke uche hụ ịdị ukwuu na ịma mma nke njem ememe ahụ—ndị na-agba ịnyịnya, ụgbọ ịnyịnya ndị e ji asọ mpi ọsọ, ehi na atụrụ ndị e ji achụ àjà, ụmụ okoro na agbọghọ na-eto eto ndị na-ebu ihe ndị a ga-eji mee ihe n’ịchụ àjà ahụ. Ndị kiriri njem ahụ bụ ụmụ amaala Atens na ndị ọbịa ha, bụ́ ndị ọ bụ n’ihi ntụsara ahụ ha ka ndị tụrụ ụkpụrụ ámá nzukọ ahụ jiri mee ndokwa zuru ezu mgbe a na-arụ ya. Dị ka ihe atụ, e ji nkà guzobe ịbà ndị ahụ nwere ihu dị n’usoro na stepụ ha n’ụzọ ahụ e si eme njem ahụ. Ọtụtụ stepụ ndị ahụ a rụrụ n’ihu ụlọ ndị ahụ pụrụ ịba ọtụtụ ndị na-ekiri ihe na-emenụ.
Ebe “Jupụtara n’Arụsị”
N’inwe ọtụtụ ụlọ nsọ, ihe a kpụrụ akpụ, na ihe ncheta a rụkọtara ọnụ, ọ bụghị ihe ijuanya na “oke iwe na-ewe mmụọ [Pọl onyeozi] n’ime ya, mgbe ọ hụrụ ka obodo ahụ jupụtara n’arụsị.” (Ọrụ 17:16) Ihe Pọl hụrụ mgbe ọ batara n’ámá nzukọ ahụ aghaghị ịwụwo ya akpata oyi n’ahụ. Akụkụ ahụ nwoke a kpụrụ akpụ nke chi Hermes dị ọtụtụ nke na a chọrọ otu ịbà dum, nke a maara dị ka Obí Hermes maka idebe ha. Uwe ndị dị n’ihe onyinyo Hermes ndị ọzọ e sere ese na-egosi swastika—ihe nnọchianya nke ọmụmụ na ndụ. E nwere otu ihe oyiyi Venus Genetrix, bụ́ chi nwanyị nke ịhụnanya mmekọahụ, tinyekwara nke Daịọnisiọs nke nwere ọtụtụ obe ndị e ji akụkụ ahụ nwoke a kpụrụ akpụ mee. Ihe na-aka “ịdị nsọ” nke ámá nzukọ ahụ akara bụ́ otu nkume e ji mere ókè na nnukwu efere nke mmiri “nsọ” dị n’ime ya maka nsacha n’ụzọ omenala nke ndị nile bataranụ.
N’ihi ọnọdụ okpukpe dị omimi dị otú ahụ, anyị pụrụ ịghọta n’ụzọ dị mfe ihe mere ọnọdụ Pọl ji dịrị oké ize ndụ. A na-enyo ya enyo dị ka “onye na-ekwusa ndị mmụọ nke ala ọzọ,” iwu oge ahụ kwukwara na ‘ọ dịghị onye ọ bụla ga-enwe chi ndị ọzọ dị iche, ma ọ bụ ndị ọhụrụ; ọ gaghịkwa efe chi ala ọzọ ọ bụla ofufe na nzuzo, ọ gwụla ma ọha na eze nabatara ha.’ Mgbe ahụ, ka a sịkwa ihe mere e ji kuru onyeozi ahụ gaa Areọpagọs iji gbaa ya ajụjụ.—Ọrụ 17:18, 19.
Ebe Bụ́ Isi nke Ọchịchị
Isi ụlọ ọrụ ọchịchị Atens dị n’otu ụlọ dị okirikiri nke a kpọrọ Tholos. Ọtụtụ ndị isi oche nke obodo ukwu ahụ na-arahụ n’ụlọ a n’oge abalị ka e wee nwee ndị ọrụ selitere isi nọ nso mgbe nile. E debere ụkpụrụ ịtụ ihe n’ọ̀tụ̀tụ̀ n’ime Tholos. Ụlọ maka ngalaba dị iche iche nke ọchịchị ahụ dị nnọọ nso. Ụlọ Kansụl nọ n’otu ebe dị n’usoro nke dịlara azụ gaa n’akụkụ ugwu nke ebe ugwu ọdịda anyanwụ nke Tholos. N’ebe ahụ, ndị òtù Kansụl nke mmadụ 500 mejupụtara nwere nzukọ nke ha nọ na ya wee rụọ ọrụ kọmitii ma meekwa iwu maka Mgbakọ ahụ.
Ụlọ ọchịchị ọzọ dị mkpa bụ Obí Ọchịchị. N’ebe ahụ ka Majie Bụ́ Onye Ọchịchị nke Atens—bú otu n’ime ndị majie atọ bụ́ isi nke obodo ukwu ahụ—na-anọ. Site n’ebe ahụ, ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ nlekọta nke metụtara ma okwu okpukpe ma nke iwu. O yikarịrị ka ọ bụ ebe a ka a chọrọ ka Socrates bịa mgbe e boro ya ebubo enweghị nsọpụrụ. E dere iwu ndị nna ochie nke Atens n’ahụ ájá nke otu ụlọ nke chere ya ihu. N’otu nkume nke e debere n’ihu otu ụlọ ahụ, ka ndị majie bụ́ isi na-eguzo kwa afọ ịṅụ iyi ọrụ ha.
Obí Attalus
Ụlọ a kasị chekwaa nke ọma n’ámá nzukọ ahụ bụ Obí Attalus. Dị ka nwa okoro, Attalus, bụ́ Eze Pagamọm (narị afọ nke abụọ T.O.A.), agụwo akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ nke Atens, dị nnọọ ka ọtụtụ ụmụ si n’ezinụlọ ndị ọzọ si n’agbụrụ ndị eze n’ógbè Mediterranea meworo. Mgbe ọ rịgoro n’ocheeze ya, o nyere obodo ukwu ahụ ọ gụrụ akwụkwọ na ya onyinye a dị ebube—Obí Attalus.
Ọrụ bụ́ isi nke Obí Attalus ahụ bụ inye ebe mkpagharị nwere ndò ma maa mma maka mkpakọrịta na mkparịta ụka a na-eyighị eyi. Ala ya na akụkụ ya a rụpụrụ iche mere ka e nwee ebe ndị magburu onwe ya a pụrụ ịnọ kirie ndị na-agafe, ebe ọmụma a maara ya dị ka ebe mkpagharị aghaghịkwa ime ka ọganihu ya dị ka ebe a na-azụ ahịa bụrụ ihe e ji n’aka. E leghị anya Ọchịchị nyere ndị ahịa ụlọ ahịa ndị ahụ ka ha na-akwụ ụgwọ ya, ka ụlọ ahụ wee bụrụ ebe a ga-esi na-enweta ego.
N’ịbụ nke e weghachiworo n’ọnọdụ mbụ ya, Obí Attalus na-enye ihe atụ magburu onwe ya nke nkà ihe osise mgbakọ na mwepụ. Otú ọ hà n’ibu, ọdịiche ọma dị n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ n’etiti usoro kọlum ala na nke elu, otú na-adọrọ mmasị ìhè na ndo si apụtakọ, na ịdị mma na ịma mma nke ihe ndị e ji rụọ ya, ha nile na-eme ka ọ pụọ iche. E ji ụzọ dị iche iche wepụ ọnọdụ nke inwe nanị otu ihe, karịsịa site n’iji ụdị kọlum atọ dị iche iche mee ihe—nke ndị Gris oge ochie, nke ndị Ion, na nke ndị Ijipt.
Ebe A Na-eme Ihe Omume Ọdịbendị
Otu ụlọ nke rụrụ ọrụ dị ka ebe ihe nkiri maka ọtụtụ ihe omume ọdịbendị n’Atens bụ Ụlọ Egwuregwu. Ọ bụ onyinye nke Vipsanius Agrịpa, onye na-alụ nwa nwanyị Eze Ukwu Ọgọstọs nke Rom. E ji marble tụrụ àgwà rụọ mpaghara ebe ihu ya. Ụlọ mgbakọ ya, nke ihe dị ka mmadụ 1,000 pụrụ ịnọ, gbasaruru ihe dị ka mita 25 ma bụrụ nke e jibu ihe mkpuchi ụlọ na-enweghị ihe nkwado n’ime wee kpuchie. Nke a bụ otu n’ime nnwale ịka anya kasịnụ n’ikpuchi elu ụlọ a maara n’ụwa oge ochie! Otú ọ dị, ma e leghị anya, ọtụtụ n’ime ntụrụndụ ndị e mere n’ebe ahụ ga-abụworị ihe a na-enyo enyo nye ezi ndị Kraịst na ụkpụrụ omume ha dị elu.—Ndị Efesọs 5:3-5.
O yiri ka ndị na-achọ ịmata ihe n’oge ochie letara Ọ́bá Akwụkwọ nke Pantainos. Ahụ ájá ya jupụtara n’igbe ebe e debere akwụkwọ mpịakọta ndị e ji aka dee nke papyrus na akpụkpọ anụ na ha. Ime ụlọ bụ́ isi nke ọ́bá akwụkwọ ahụ chere ihu n’ebe ọdịda anyanwụ, sitekwa n’otu usoro kọlum mmadụ pụrụ ịhụ otu ogige nwere ịbà—ebe mara mma maka mkpagharị, ịgụ ihe, ma ọ bụ ịtụgharị uche. A chọtawo otu ihe odide nke nwere iwu abụọ nke ọ́bá akwụkwọ ahụ. Ha bụ: “E kwesịghị iji akwụkwọ ọ bụla pụọ,” na “[Ọ́bá akwụkwọ a] ghere oghe site na hour mbụ ruo na nke isii.”
Ámá Nzukọ ahụ Taa
N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ọ fọla nke nta ka Ụlọ Akwụkwọ America Maka Ọmụmụ Ihe Oge Ochie gwupụtasịzuo ihe ndị nọ n’ime ala ámá nzukọ ahụ. N’ịbụ nke nọ nnọọ n’okpuru Acropolis ahụ dị elu, ọ ghọwo ebe na-amasịkarịsị onye na-eme njem nleta nke chọrọ ikiritụ akụkọ ihe mere eme nke Atens oge ochie.
Ahịa Ọkịrịka Monastiraki dị nso—ijeụkwụ ole na ole nke ntụsara ahụ site n’ámá nzukọ ahụ nakwa n’Acropolis—bụ nzọụkwụ ịbanyekwa n’ebe ọzọ na-adọrọ adọrọ. Ọ na-enye onye nleta ahụ ihe ọmụma dị ịtụnanya ma na-atọ ụtọ nke ọdịnala ndị Gris na ihe omume yiri bazaa na ikwe ọnụ ahịa nke Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. N’ezie, onye nleta ahụ ga-ahụkwa Ndịàmà Jehova n’ebe ahụ ka ha ji ọṅụ na-eme kpọmkwem ihe Pọl onyeozi mere n’ihe karịrị afọ 1,900 gara aga—ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ n’ihu ọha ‘nye ndị ha na-ezute.’
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Aha ahụ bụ́ Ion sitere na nke Jevan, nwa Jefet na nwa nwa Noa.—Jenesis 10:1, 2, 4, 5.
[Igbe dị na peeji nke 28]
Azụmahịa n’Atens
Ámá nzukọ ahụ abụghị nanị ebe bụ́ isi nke ndị ụbụrụ na-aghọ nkọ na ebe isi ọchịchị nke Atens kamakwa ọ bụ ọmà ahịa bụ́ isi nke obodo ukwu ahụ. Atens bịara ghọọ ebe bụ́ isi nke azụmahịa, wuo ewu maka ma uru nke ego ígwè ya ma mkpachapụ anya nke ndị majie ya, bụ́ ndị e nyere ikike ịhụ na azụmahịa nile bụ nke ịkwụwa aka ọtọ na nke ziri ezi.
Atens na-ebupụ mmanya, mmanụ olive, mmanụ aṅụ, marble, na ihe ndị a na-emepụta n’ụlọ ọrụ dị ka ceramics na ígwè ndị a nụchara anụcha gaa n’obodo ndị ọzọ. Ná mgbanwerịta, ọ na-atụbata wheat n’ụzọ bụ́ isi. Ebe Attica (ógbè dị gburugburu Atens) emepụtaghị ngwa ahịa ndị ga-ezu iji nyejuo ndị bi n’ime ya afọ, ụkpụrụ nke azụmahịa siri ike. Ahịa dị na Piraeus (ọdụ ụgbọ mmiri nke Atens) aghaghị inwe nri ọhụrụ mgbe nile nke ga-ezu inye ma obodo ukwu ahụ ma ndị agha ya. E kweghịkwa ka ndị na-ere ahịa kwakọba nri iji wee ree ha n’ọnụ ahịa dị elu n’oge ndị e nwere mkpa.