Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 1/15 p. 21-24
  • Ndị Ọzọ Hà Na-anara Ndụmọdụ Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Ọzọ Hà Na-anara Ndụmọdụ Gị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘Mee Ka O Guzozie n’Ime Mmụọ nke Ịdị Nwayọọ’
  • Jiri Amara Na-enye Ndụmọdụ
  • Jiri Obi Dị Umeala Na-enye Ndụmọdụ
  • Ndụmọdụ A Naara
  • ‘Gee Ntị n’Ihe Onye Ma Ihe Na-ekwu’
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Nụrụ Ndụmọdụ, Nara Ịdọ Aka ná Ntị
    Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
  • Ndụmọdụ Ị Na-enye Ọ̀ “Na-eme Ka Obi Dị Mmadụ Ụtọ”?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Ndị Okenye—Meenụ Ka Ndị Ọzọ Guzozie ná Mmụọ nke Ịdị Nwayọọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 1/15 p. 21-24

Ndị Ọzọ Hà Na-anara Ndụmọdụ Gị?

NDỤMỌDỤ dị mma e nyere n’ụzọ kwesịrị ekwesị na-arụpụta ihe ndị dị mma mgbe nile. Ọ̀ bụ eziokwu? Ọ bụghị eziokwu! Ọbụna ndụmọdụ magburu onwe ya nke ndị ndụmọdụ maara nke a na-akọ nyere na-abụkarị nke a na-eleghara anya ma ọ bụ na-ajụ.—Ilu 29:19.

Nke a mere mgbe Jehova nyere Ken ndụmọdụ, bụ́ onye zụliteworo ịkpọasị n’ebe nwanne ya, bụ́ Ebel nọ. (Jenesis 4:3-5) N’ịmara ihe ize ndụ nke a chere Ken n’ihu, Chineke gwara ya, sị: “N’ihi gịnị ka ị na-ewe iwe dị ọkụ? ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ihu gị gbarụrụ? Ọ bụrụ na ị na-eme nke ọma, ọ́ bụghị mgbasa ihu ka ị ga-enwe? ọ bụrụkwa na i meghị nke ọma, n’ọnụ ụzọ ka mmehie na-amakpu dị ka anụ ọhịa: ọ bụkwa n’ebe ị nọ ka ọchịchọ ya dị, ma o kwesịrị ka gị onwe gị chịa ya.”—Jenesis 4:6, 7.

Jehova si otú a were mmehie tụnyere anụ na-eri ibe ya nke na-echere ịwakwasị Ken ma ọ bụrụ na ọ nọgide na-ebu iwe n’obi megide nwanne ya nwoke. (Tụlee Jemes 1:14, 15.) Ken ka nwere oge ịgbanwe àgwà ya, ‘ime nke ọma’ kama ịgbaso ụzọ na-eweta ọdachi. N’ụzọ dị mwute, Ken aṅaghị ntị. Ọ jụrụ ndụmọdụ Jehova, nke rụpụtara ihe ndị dị njọ.

Ụfọdụ na-ewe iwe banyere ma na-ajụ ụdị ndụmọdụ ọ bụla. (Ilu 1:22-30) Ọ̀ pụrụ ịbụ na ọ bụ onye ahụ na-enye ndụmọdụ kpatara e ji jụ ndụmọdụ ahụ? (Job 38:2) Gị onye na-enye ndụmọdụ, ị̀ na-eme ka o siere ndị ọzọ ike ịnara ya? Ezughị okè mmadụ na-eme ka nke ahụ bụrụ ihe ize ndụ n’ezie. Ma ị pụrụ ibelata ohere e nwere maka nke ahụ ime site n’iji nlezianya na-agbaso ụkpụrụ Bible. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha.

‘Mee Ka O Guzozie n’Ime Mmụọ nke Ịdị Nwayọọ’

“Ụmụnna m, a sị na ọ bụ ezie na a nwụde mmadụ mgbe ọ nọ ná ndahie ọ bụla, unu onwe unu, bụ́ ndị Mmụọ Nsọ na-achị, meenụ ka mmadụ dị otú a guzozie n’ime mmụọ nke ịdị nwayọọ; na-elezi onwe gị anya, ka a ghara ịnwakwa gị onwe gị.” (Ndị Galetia 6:1) Pọl onyeozi si otú a kọwaa na ndị ahụ “Mmụọ Nsọ na-achị” kwesịrị ịgbalị ime ka onye Kraịst nke ‘a nwụdere mgbe ọ nọ ná ndahie ọ bụla’ guzozie. Mgbe ụfọdụ ọ na-eyi ka ndị ahụ na-eruchaghị nnọọ eru ime otú ahụ na-akasị enwe ọchịchọ inye ndụmọdụ. N’ihi ya, adịla oké ngwa inye ndị ọzọ ndụmọdụ. (Ilu 10:19; Jemes 1:19; 3:1) N’ụzọ bụ́ isi, ọ bụ ndị okenye ọgbakọ ruru eru n’ụzọ ime mmụọ ime nke a. Otú ọ dị, onye Kraịst ọ bụla tozuru okè kwesịrị inye ịdọ aka ná ntị ma ọ bụrụ na ọ hụta nwanna ka ọ na-aba n’ihe ize ndụ.

Ọ bụrụ na ị na-enye ịdọ aka ná ntị ma ọ bụ ndụmọdụ, jide n’aka na ihe ị na-ekwu dabeere n’amamihe Chineke, ọ bụghị ná nchepụta echiche na nkà ihe ọmụma mmadụ. (Ndị Kọlọsi 2:8) Yie osi ite bụ́ onye na-ejide n’aka na ngwá nri ọ bụla o ji mee ihe dị ọcha, n’enweghịkwa ihe ọ bụla pụrụ igbu egbu. Jide n’aka na ndụmọdụ gị dabesiiri ike n’Okwu Chineke, n’abụghịkwa nanị n’echiche onwe onye. (2 Timoti 3:16, 17) Site n’ime nke a, ị pụrụ ijide n’aka na ndụmọdụ gị agaghị emerụ onye ọ bụla ahụ.

Nzube e ji enye ndụmọdụ ahụ bụ iji ‘mee ka onye na-adahie adahie guzozie,’ ọ bụghị iji manye ya ka o mee mgbanwe ọ na-achọghị ime. Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ ‘mee ka o guzozie’ nwere njikọ ya na okwu metụtara ịgbazi ọkpụkpụ chipụrụ echipụ iji gbochie inwekwu mmebi. Dị ka onye na-ede akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ W. E. Vine si kwuo, ọ na-atụkwa aro “mkpa ndidi na nnọgidesi ike dị n’usoro ahụ.” Cheedị banyere ịdị nro na nkà a chọrọ iji zere iweta ihe mgbu anụ ahụ nke na-adịghị mkpa. N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ dị onye na-enye ndụmọdụ mkpa ịkpachapụ nnọọ anya iji zere ime ihe ga-ewute onye ọ na-enye ndụmọdụ. Nke a sidịrị ike mgbe mmadụ rịọrọ ka e nye ya ndụmọdụ. Mgbe a na-arịọghị maka ndụmọdụ gị, a chọrọ ọbụna nkà na ịdị akọ ka ukwuu.

N’ezie ị gaghị ‘eme ka mmadụ ọ bụla guzozie’ ma ọ bụrụ na i wezụga onwe gị n’ebe ọ nọ. Iji zere ime nke a, buru n’uche mkpa ọ dị igosipụta “obi ebere, obiọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi.” (Ndị Kọlọsi 3:12) Ọ bụrụ na onye dọkịta enweghị ndidi, na-emekwa ihe n’aka ike n’ụzọ na-enweghị isi, onye ọrịa pụrụ ileghara ndụmọdụ ya anya ma ghara ịlaghachi ọzọ maka ọgwụgwọ dị mkpa.

Nke a adịghị apụta na ndụmọdụ agaghị esi ike. Jisọs Kraịst kwụsiri ike mgbe o nyere ọgbakọ asaa ahụ dị n’ógbè Esia ndụmọdụ. (Mkpughe 1:4; 3:1-22) O nyere ha ụfọdụ ndụmọdụ gara kpọmkwem bụ́ ndị ọ dị ha mkpa ịnụ ma tinye n’ọrụ. Ma e ji àgwà ndị dị ka ọmịiko na obiọma tigwaa nkwụsi ike Jisọs mgbe nile, na-egosipụta mmụọ ịhụnanya nke Nna ya nke eluigwe.—Abụ Ọma 23:1-6; Jọn 10:7-15.

Jiri Amara Na-enye Ndụmọdụ

“Ka okwu unu dị n’amara mgbe nile, ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ, ka unu wee mata otú unu na-aghaghị ịza mmadụ nile ọ bụla.” (Ndị Kọlọsi 4:6) Nnu pụrụ ime ka ụtọ nri ka mma, na-eme ka ọ na-adọrọ adọrọ. Ọ bụrụ na ndụmọdụ gị ga-adị ụtọ, ọ ghaghị ịbụ nke e nyere ‘n’amara, ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ.’ Otú ọ dị, ọbụna mgbe e ji ngwá nri ndị kasị mma mee ihe, nri pụrụ ịbụ nke a kwadebere n’ụzọ na-adịghị mma ma ọ bụ nke e kunyere n’efere n’ikpo na-adịghị adọrọ mmasị. Nke ahụ adịghị akpalitekwu agụụ onye ọ bụla. N’ezie, ọ pụrụ isi ike iloda ọbụna otu nju ọnụ na-adịghị ụtọ.

Mgbe ị na-enye ndụmọdụ, ọ dị mkpa ịhọrọ okwu ndị ziri ezi. Nwoke amamihe ahụ bụ́ Solomọn kwuru, sị: “Mkpụrụ osisi apple ọlaedo n’ime nkata ọlaọcha ka okwu e kwuru na mgbe kwesịrị ya bụ.” (Ilu 25:11) Ọ pụrụ n’ezie ibuwo n’uche efere ọlaọcha a wụrụ awụ nke nwere ọmarịcha mkpụrụ osisi apple ọlaedo ndị a tụrụ nke ọma n’ime ya. Lee otú nke ahụ ga-esi dị mma n’anya, leekwa otú ị ga-esi nwee ekele ịnata ya dị ka onyinye! N’otu ụzọ ahụ, okwu ndị dị n’amara, a họọrọ nke ọma pụrụ inwe mkpali dị ike n’ebe onye ị na-agbalị inyere aka nọ.—Eklisiastis 12:9, 10.

N’ụzọ megidere nke ahụ, “okwu mwute na-akpali iwe.” (Ilu 15:1) Okwu ndị a na-ahọrọghị nke ọma pụrụ ịkpata ihe mgbu na iwe n’ụzọ dị mfe kama iweta ekele. N’ezie, ọ bụghị nanị okwu ndị a na-ahọrọghị nke ọma kama ụda olu na-ezighi ezi pụrụ ime ka mmadụ jụ ndụmọdụ dịrịị mma. Inye ndụmọdụ n’ụzọ na-egosighị akọ na nke na-enweghị mmetụta pụrụ imerụ ahụ dị ka iji ngwá agha awakpo mmadụ. “O nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị eche dị ka ndụpu nke mma agha,” ka Ilu 12:18 na-ekwu. N’ihi gịnị ka ị ga-eji ekwu okwu n’echeghị eche ma mee ka o siere mmadụ ike ige ntị na ndụmọdụ?—Ilu 12:15.

Dị ka Solomọn kwuru, okwu ndụmọdụ kwesịrị ịbụ nke “e kwuru na mgbe kwesịrị ya.” Oge dị mkpa nke ukwuu ma ọ bụrụ na ndụmọdụ gaje ịga nke ọma! O doro anya na nri pụrụ ịbụ nke onye na-enwekwaghị agụụ iri ihe na-enweghị mmasị na ya. Ma eleghị anya o riwo nri buru ibu n’oge na-adịbeghị anya, ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ na ọ na-arịa ọrịa. Ịmanye onye na-achọghị iri nri ka o rie nri abụghị ihe ezi uche dị na ya, ọ bụghịkwa nke a na-anabata.

Jiri Obi Dị Umeala Na-enye Ndụmọdụ

“Meenụ ka ọṅụ m jupụta, . . . unu emela ihe ọ bụla n’ụzọ ịkpa iche iche ma ọ bụ n’ụzọ ịchọ otuto efu, kama n’obi dị umeala na-agụrịtanụ ibe unu ná ndị ka unu onwe unu mma; unu nile n’otu n’otu [na-ele anya, ọ bụghị nanị ná mmasị onwe onye n’ihe nke aka unu, kamakwa ná mmasị onwe onye n’ihe nke ndị ọzọ, NW].” (Ndị Filipaị 2:2-4) Ọ bụrụ na ị bụ ezi onye ndụmọdụ, ị ga-abụ onye “mmasị onwe onye” n’ọdịmma nke ndị ọzọ kpaliri. Ị ga-egosipụtakwa ‘obi dị umeala’ mgbe gị na ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ na-emekọ ihe, na-agụ ndị ọzọ ná ndị ka gị onwe gị mma. Gịnị ka nke ahụ pụtara?

Obi dị umeala ga-egbochi gị inwe omume ma ọ bụ ụda olu nke ịka ndị ọzọ mma. Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị nwere ihe ndabere maka inwe mmetụta nke ịka ndị kwere ekwe ibe ya mma. Onye ọ bụla n’ime anyị na-emehie site n’oge ruo n’oge. Ebe ọ bụ na ị pụghị inyocha obi, ọ dị mkpa karịsịa ịghara ikpebi ebumnobi nke onye ị na-enye ndụmọdụ. Ọ pụrụ ịbụ na o nweghị ebumnobi ọjọọ ọ bụla ma ghara ịma banyere àgwà ma ọ bụ omume ọ bụla ndị na-ezighị ezi. Ọ bụrụgodị na ọ maara n’ụzọ ụfọdụ na ya anaghị eme dị ka ihe Chineke na-achọ si dị, obi abụọ adịghị ya na ọ ga-ahụ ya dị ka ihe ka nnọọ mfe ịnara ndụmọdụ ma ọ bụrụ na e ji obi umeala nye ya, na-enwe ezi mmasị n’ọdịmma ime mmụọ ya.

Cheedị banyere otú ọ ga-adị gị ma ọ bụrụ na a kpọrọ gị òkù ịbịa rie nri ma onye kpọrọ gị òkù emesoo gị omume n’ụzọ ikpo ọkụ na-adịghị ya, na nke nlelị! N’ezie ị gaghị anụ ụtọ nri ahụ. N’ezie, “ọ dị mma, bụ́ òkè ihe oriri nke bụ́ nanị akwụkwọ nri, ma ịhụnanya dị n’ebe ahụ, karịa ehi a zụrụ azụ igbu egbu, ma ịkpọ asị adị ya.” (Ilu 15:17) N’otu aka ahụ, ọbụna ndụmọdụ kasị mma pụrụ isi ike ịnara ma ọ bụrụ na onye ahụ na-enye ndụmọdụ egosipụta ịkpọasị n’ebe onye ọ na-enye ndụmọdụ nọ ma ọ bụ wetuo ya ala ma mechuo ya ihu. Otú ọ dị, ịhụnanya, nkwanyerịta ùgwù, na ntụkwasị obi ga-eme ka ndụmọdụ dị mfe inye nakwa ịnara.—Ndị Kọlọsi 3:14.

Ndụmọdụ A Naara

Netan onye amụma gosipụtara obi umeala mgbe o nyere Eze Devid ndụmọdụ. Ịhụnanya na nkwanye ùgwù n’ebe Devid nọ pụtara ìhè n’ihe Netan kwuru, meekwa. Netan ji ihe atụ nke lebara anya n’ihe isi ike nke Devid pụrụ inweworị n’ige ntị ná ndụmọdụ, malite. (2 Samuel 12:1-4) Onye amụma ahụ jiri ịhụnanya Devid nwere n’ebe ikpe ziri ezi na ezi omume dị mee ihe, ọ bụ ezie na o gosipụtaghị ya n’omume ya n’ebe Bat-sheba nọ. (2 Samuel 11:2-27) Mgbe a kọwara isi ihe dị n’ihe atụ ahụ, mmeghachi omume si n’ezi obi nke Devid bụ: “Emehiewo m megide Jehova.” (2 Samuel 12:7-13) N’adịghị ka Ken, bụ́ onye na-egeghị Jehova ntị, Devid ji obi umeala nara mgbazi.

Obi abụọ adịghị ya na Jehova duziri Netan, na-eburu n’uche ezughị okè Devid na ohere e nwere na ọ pụrụ imeghachi omume n’ụzọ na-adịghị mma. Netan ji akọ dị ukwuu mee ihe, o dokwara anya na o lere Devid anya dị ka onye ka ya elu n’ihi ọkwá Devid nọ na ya dị ka eze Jehova họpụtara. Ọ bụrụ na ị nọ n’ọnọdụ nke ikike ụfọdụ, ị pụrụ inye ndụmọdụ kwesịrị ekwesị, ma ọ pụrụ isi ike nnara ma ọ bụrụ na i gosipụtaghị obi dị umeala.

Netan ji mmụọ nke ịdị nwayọọ mee ka Devid guzozie. Okwu onye amụma ahụ dị n’amara, bụrụkwa nke e ji nlezianya kwadebe n’ụzọ nke na Devid pụrụ imeghachi omume n’ụzọ nke ga-abụ n’ọdịmma kasị mma nke ya onwe ya. Ọdịmma onwe onye akpalighị Netan, ọ nwaghịkwa iwere onwe ya na ya ka Devid mma n’ụzọ omume ma ọ bụ n’ụzọ ime mmụọ. Lee ihe nlereanya ọma nke ikwu okwu ndị ziri ezi n’ụzọ ndị kwesịrị ekwesị nke a bụ! Ọ bụrụ na i gosipụta mmụọ yiri nke ahụ, o yikarịrị nnọọ ka ndị ọzọ hà ga-anara ndụmọdụ gị.

[Foto dị na peeji nke 22]

Dị ka nri na-edozi ahụ, ndụmọdụ gị kwesịrị ịdị mma

[Foto dị na peeji nke 23]

Ị̀ na-eme ka ndụmọdụ gị na-adọrọ mmasị dị ka mkpụrụ osisi apple ọlaedo n’ime nkata ọlaọcha?

[Foto dị na peeji nke 24]

Netan onye amụma ji obi umeala jiri ịhụnanya Devid nwere n’ebe ikpe ziri ezi na ezi omume dị mee ihe

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya