Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w22 Febụwarị p. 8-13
  • ‘Gee Ntị n’Ihe Onye Ma Ihe Na-ekwu’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Gee Ntị n’Ihe Onye Ma Ihe Na-ekwu’
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • NDỊ JỤRỤ NDỤMỌDỤ E NYERE HA
  • NDỊ NABATARA NDỤMỌDỤ E NYERE HA
  • OLEE IHE GA-ENYERE ANYỊ AKA ỊNABATA NDỤMỌDỤ?
  • NA-AGWA NDỊ ỌZỌ KA HA DỤỌ GỊ ỌDỤ, Ọ GA-ABAKWARA GỊ URU
  • Ndụmọdụ Ị Na-enye Ọ̀ “Na-eme Ka Obi Dị Mmadụ Ụtọ”?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Nụrụ Ndụmọdụ, Nara Ịdọ Aka ná Ntị
    Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
  • Ndị Ọzọ Hà Na-anara Ndụmọdụ Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Otú E Si Enye Ndụmọdụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
w22 Febụwarị p. 8-13

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 7

‘Gee Ntị n’Ihe Onye Ma Ihe Na-ekwu’

“Geekwa ntị n’ihe onye ma ihe na-ekwu.”​—ILU 22:17.

ABỤ NKE 123 Ka Anyị Na-erubere Chineke Isi

IHE ISIOKWU A NA-EKWUa

1. Olee ụzọ ụfọdụ e nwere ike isi nye anyị ndụmọdụ? Gịnịkwa mere ndụmọdụ ji dị anyị niile mkpa?

E NWEGHỊ onye n’ime anyị ndụmọdụ na-adịghị mkpa. Mgbe ụfọdụ, anyị na-agakwuru onye anyị tụkwasịrị obi ka o nye anyị ndụmọdụ. Nwanna na-eche banyere anyị nwekwara ike ịgwa anyị na anyị na-achọ ‘ịzọhie ụkwụ,’ ya bụ, ime ihe anyị ga-emecha kwaara mmakwaara. (Gal. 6:1) E nwekwara ike ịdụ anyị ọdụ mgbe anyị mejọrọ ihe. N’agbanyeghị otú e si nye anyị ndụmọdụ, anyị kwesịrị ige ntị na ya, n’ihi na ige ntị na ndụmọdụ na-abara anyị uru. Ọ ga-emekwa ka anyị dị ndụ.​—Ilu 6:23.

2. Dị ka e kwuru n’Ilu 12:​15, gịnị mere anyị kwesịrị iji gee ntị mgbe a na-enye anyị ndụmọdụ?

2 Amaokwu Baịbụl isiokwu a si gbara anyị ume ka anyị ‘gee ntị n’ihe onye ma ihe na-ekwu.’ (Ilu 22:17) E nweghị mmadụ ma ihe niile. A ga-enwerịrị onye ka anyị mara ihe ụfọdụ. (Gụọ Ilu 12:15.) N’ihi ya, ige ntị na ndụmọdụ a na-enye anyị na-egosi na anyị dị umeala n’obi. Ọ na-egosi na anyị ma ebe ike anyị ruru, marakwa na e kwesịrị inyere anyị aka ka anyị nwee ike ime ihe ndị anyị chọrọ ime. Mmụọ nsọ mere ka Eze Solomọn ma ihe dee, sị: “A na-arụpụta ezigbo ihe ma e nwee ọtụtụ ndị ndụmọdụ.”​—Ilu 15:22.

Foto ndị na-egosi: Ebe otu nwanna nwoke na-eche gbasara ụzọ dị iche iche e nwere ike isi nye ya ndụmọdụ. Baịbụl meghere emeghe e sere n’elu na-egosi ụzọ dị iche e nwere ike isi nye ya ndụmọdụ. 1. Ndụmọdụ o si ebe ndị ọzọ nweta: ebe nwanna ahụ gara ọmụmụ ihe; ebe ọ na-agụ Baịbụl; ebe ọ na-ele ihe omume tiivi anyị; ebe ọ na-amụ akwụkwọ anyị. 2. Ndụmọdụ mmadụ nyere anyị: ebe nwanna ahụ na-ege nwanna ọzọ ntị ka ọ na-egosi ya ihe na tablet ya; ebe ndị okenye abụọ bịara na nke ya.

Olee nke n’ime ha na-esiri gị ike ịnabata? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3 na nke 4)

3. Olee ụzọ ụfọdụ e nwere ike isi nye anyị ndụmọdụ?

3 Mgbe ụfọdụ, otú anyị nwere ike isi nweta ndụmọdụ bụ ma anyị gụọ Baịbụl ma ọ bụ akwụkwọ ndị nzukọ Jehova bipụtara, ya emee ka anyị chọpụta na anyị kwesịrị ịgbanwe otú anyị si eme ihe na otú anyị si eche echiche. (Hib. 4:12) Otú ọzọ anyị nwekwara ike isi enweta ndụmọdụ bụ na okenye ma ọ bụ nwanna ọzọ ma nke a na-akọ nwere ike ịgwa anyị ebe anyị kwesịrị imezikwu ihe. Ọ bụrụ na mmadụ enye anyị ndụmọdụ si na Baịbụl n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya, otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ndụmọdụ ahụ bụ ige ntị nụ ihe ọ chọrọ ịgwa anyị ma mee ihe ọ gwara anyị.

4. Dị ka e kwuru n’Ekliziastis 7:​9, olee ihe anyị na-ekwesịghị ime ma e nye anyị ndụmọdụ?

4 Nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere ike isiri anyị ike ịnabata ndụmọdụ mmadụ nyere anyị. O nwedịrị ike iwe anyị iwe. N’ihi gịnị? Ọ bụ eziokwu na anyị nwere ike ikweta na anyị ezughị okè, ma ya esiere anyị ike ịnabata ndụmọdụ ma mmadụ gwa anyị ebe anyị na-anaghị emeta. (Gụọ Ekliziastis 7:9.) Anyị nwere ike ịgọrọwa isi anyị ma ọ bụ na-ekwu na onye ahụ na-enye anyị ndụmọdụ ahụ bu ihe ọjọọ n’obi ma ọ bụkwanụ iwe ewewe anyị maka otú o si nye anyị ndụmọdụ ahụ. Anyị nwekwara ike ịna-ekwu, sị: ‘Onye a ekwesịghị inye m ndụmọdụ. O nwekwara ihe ndị ọ na-anaghị emeta.’ Ọ bụrụ na anyị chere na e kwesịghị inye anyị ndụmọdụ e nyere anyị, o nwere ike ime ka anyị ghara ime ihe a gwara anyị ma ọ bụkwanụ mee ka anyị gakwuru onye ga-agwa anyị ihe anyị chọrọ ịnụ.

5. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

5 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya ná ndị ụfọdụ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl na-anabataghị ndụmọdụ e nyere ha nakwa ndị nke nabatara ya. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe ga-enyere anyị aka ịnabata ndụmọdụ e nyere anyị nakwa otú ọ ga-esi baara anyị uru.

NDỊ JỤRỤ NDỤMỌDỤ E NYERE HA

6. Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe Eze Rehoboam mere mgbe e nyere ya ndụmọdụ?

6 Ka anyị tụlee akụkọ Rehoboam. Mgbe ọ ghọrọ eze Izrel, ndị ọ na-achị bịakwutere ya ma rịọ ya arịrịọ. Ha rịọrọ ya ka o mee ka ihe katụrụ ha mfe karịa otú ọ dị n’oge nna ya bụ́ Solomọn na-achị. Rehoboam gara jụọ ndị okenye Izrel ihe ọ ga-eme. Ihe a o mere dị mma. Ndị okenye ahụ gwara ya na ọ bụrụ na o mee ihe ndị Izrel rịọrọ ya, na ha ga na-akwado ya mgbe niile. (1 Eze 12:​3-7) Ọ ga-abụ na ihe ahụ ha gwara Rehoboam adịghị ya mma. N’ihi ya, ọ gakwuuru ụmụ okorobịa ndị ha na ya tokọrọ ka ha nye ya ndụmọdụ. Ọ ga-abụ na ha dị ihe dị ka afọ iri anọ. N’ihi ya, ha amatala ihe ná ndụ. (2 Ihe 12:13) Ma n’oge ahụ, ndụmọdụ ha nyere Rehoboam adịghị mma. Ha gwara ya ka o mee ka ihe sikwuoro ndị Izrel ike. (1 Eze 12:​8-11) Ebe ọ bụ na e nweela ihe abụọ a gwara Rehoboam ka o mee, ọ gaara ekpe ekpere rịọ Jehova ka o nyere ya aka ịma ihe ọ ga-eme. Kama ime otú ahụ, o kpebiri ịnabata ndụmọdụ nke dị ya mma, ya bụ, ndụmọdụ ndị ọgbọ ya. Ihe ahụ Rehoboam mere kpataara ma yanwa ma ndị Izrel nsogbu. Taakwa, ndụmọdụ a na-enye anyị nwere ike ịbụ ihe anyị na-achọghị ịnụ. Ma, ọ bụrụhaala na o si n’Okwu Chineke bụ́ Baịbụl, anyị kwesịrị ịnabata ya.

7. Gịnị ka akụkọ Eze Ọzaya na-akụziri anyị?

7 Eze Ọzaya jụrụ ndụmọdụ e nyere ya. Ọ banyere n’ebe naanị ndị nchụàjà na-abanye n’ụlọ nsọ Jehova, chọọkwa ịmụnye insens ọkụ. Ndị nchụàjà Jehova sịrị ya: “Ọzaya, ọ bụghị gị kwesịrị ịmụnyere Jehova insens ọkụ. Ọ bụ naanị ndị nchụàjà kwesịrị ịna-amụnye insens ọkụ.” Gịnị ka Ọzaya mere? Kama ige ha ntị, “Ọzaya were ezigbo iwe.” A sị na o gere ha ntị si n’ụlọ nsọ ahụ pụọ ozugbo, o nwere ike ịbụ na Jehova gaara agbaghara ya. Gịnị mere Ọzaya ji jụ ndụmọdụ ahụ? O nwere ike ịbụ na o chere na ebe ọ bụ eze, na o nwere ikike ime ihe ọ bụla ọ chọrọ. Ma ọ bụghị otú Jehova si were ya. Jehova mere ka Ọzaya rịawa ekpenta n’ihi na o mere ihe a na-enyeghị ya ikike ime. Ọ “rịagidere ekpenta ruo ụbọchị ọ nwụrụ.” (2 Ihe 26:​16-21) Ihe mere Ọzaya na-akụziri anyị na n’agbanyeghị ndị anyị bụ, ọ bụrụ na anyị ajụ ndụmọdụ e si na Baịbụl nye anyị, anyị na Jehova agaghị adị ná mma.

NDỊ NABATARA NDỤMỌDỤ E NYERE HA

8. Olee ihe Job mere mgbe e nyere ya ndụmọdụ?

8 E nwere ndị ọzọ Baịbụl kwuru na Chineke gọziri n’ihi na ha nabatara ndụmọdụ e nyere ha. Chegodị gbasara Job. Ọ bụ eziokwu na ọ na-atụ egwu Chineke, o zughị okè. Mgbe ọnwụnwa kpụ ọkụ n’ọnụ bịaara ya, o nwere ihe ndị na-adịghị mma o kwuru. Ihe a mere ka ma Elaịhu ma Jehova nye ya ndụmọdụ. Gịnị ka Job mere? Ọ nabatara ndụmọdụ e nyere ya. Ọ sịrị: “M kwuru okwu n’aghọtaghị ihe ndị juru m anya . . . Ekwukwaghị m ihe m kwuru. Anọzi m ọdụ n’ájá nakwa ná ntụ iji gosi na echegharịala m.” Jehova gọziri Job maka na ọ dị umeala n’obi.​—Job 42:​3-6, 12-17.

9. Gịnị ka Mosis mere mgbe e nyere ya ndụmọdụ? Oleekwa ihe mere anyị ji kwesị ime ka ya?

9 Mosis nabatara ndụmọdụ e nyere ya mgbe o mere ihe dị ezigbo njọ. N’otu oge, o were iwe ọkụ, nke mere ka ọ ghara ịkwanyere Jehova ùgwù. N’ihi ihe ahụ Mosis mere, Chineke kwuru na ọ gaghị abanye n’Ala Nkwa. (Ọnụ Ọgụ. 20:​1-13) Mgbe Mosis rịọrọ Jehova ka o kwe ka ọ banye n’Ala Nkwa, Jehova gwara ya, sị: “Agwakwala m okwu banyere ihe a ọzọ.” (Diut. 3:​23-27) Iwe eweghị Mosis maka ya, kama ọ nabatara ihe Jehova kpebiri. Jehova akwụsịghịkwa iji ya na-eduzi ndị Izrel. (Diut. 4:1) Ma Job ma Mosis nabatara ndụmọdụ e nyere ha. Anyị kwesịkwara ime ka ha. Job gbanwere otú o si ele ihe anya. Ọ bịaghị gọrọwa isi onwe ya. Mosis nabatara ndụmọdụ Jehova nyere ya. Otú anyị si mara bụ na o ji obi ya niile na-ejere Jehova ozi n’agbanyeghị na ọ gaghị abanye n’Ala Nkwa ọ na-atụsi anya ike ịbanye.

10. (a) Gịnị ka Ilu 4:​10-13 kwuru gbasara uru ịnabata ndụmọdụ na-aba? (b) Olee ihe dị mma ụfọdụ ndị mere mgbe e nyere ha ndụmọdụ?

10 Ọ bụrụ na anyị ana-anabata ndụmọdụ ka Mosis na Job, ọ ga-abara anyị uru. (Gụọ Ilu 4:​10-13.) Ọtụtụ ụmụnna anyị emeekwala otú ahụ. Ka anyị tụlee banyere otu nwanna bi na Kongo aha ya bụ Emmanuel. Legodị ihe o kwuru maka aka ná ntị a dọrọ ya. Ọ sịrị: “Ụmụnna ma nke a na-akọ n’ọgbakọ anyị hụrụ na m na-achọ ime ihe ga-eme ka mụ na Jehova ghara ịdị ná mma. Ha gbakwara mbọ nyere m aka. M mere ihe ha gwara m. O nyekwaara m aka ịgbara ọtụtụ nsogbu ọsọ.”b E nwere otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ bi na Kanada. Aha ya bụ Megan. Ọ sịrị: “Ndụmọdụ a na-enye m anaghị abụkarị ihe m chọrọ ịnụ, ma ọ na-abụ ihe dị m ezigbo mkpa.” Nwanna ọzọ bi na Kroeshia aha ya bụ Marko kwuru, sị: “A napụrụ m ọrụ m na-arụ n’ọgbakọ. Ma mgbe ọ bụla m chetara ihe mere n’oge ahụ, m na-aghọta na aka ná ntị ahụ a dọrọ m baara m uru n’ihi na o nyeere m aka ka mụ na Jehova dịghachi ná mma.”

11. Gịnị ka Nwanna Karl Klein kwuru gbasara ịnabata ndụmọdụ?

11 Onye ọzọ nabatara ndụmọdụ e nyere ya bụ Nwanna Karl Klein. O sobu n’Òtù Na-achị Isi. N’akụkọ ndụ ya, o kwuru na o nwere mgbe ezigbo enyi ya bụ́ Nwanna Joseph F. Rutherford dụsiri ya ọdụ ike. Nwanna Klein kwuru na ndụmọdụ ahụ were ya iwe. Ọ sịrị: “N’oge ọzọ [Nwanna Rutherford] hụrụ m, ọ mụmụrụ ọnụ ọchị, sị m, ‘Karl, ndeewo.’ Ma enyeghị m ya ihu n’ihi na iwe ka ji m. Ọ sịrị m, ‘Karl, kpachara anya. Ekwensu na-achọ inweta gị.’ Ihere mewere m, mụ asị ya, ‘Nwanna Rutherford, anaghị m ewere gị iwe.’ Mana, ọ ma na iwe ka na-ewe m, ya agwakwa m ọzọ, sị, ‘Nsogbu adịghị. Ma, kpachara anya. Ekwensu na-achọ inweta gị.’ Ihe a ọ gwara m bụ eziokwu. Ọ bụrụ na anyị buuru Nwanna anyị iwe n’obi, karịchaa, n’ihi na o kwuru ihe o kwesịrị ikwu . . . , anyị na-enye Ekwensu ohere ịnwata anyị.”c (Efe. 4:​25-27) Nwanna Klein nabatara ndụmọdụ Nwanna Rutherford nyere ya, ha aka bụrụkwa ezigbo enyi.

OLEE IHE GA-ENYERE ANYỊ AKA ỊNABATA NDỤMỌDỤ?

12. Olee otú ịdị umeala n’obi ga-esi nyere anyị aka ịnabata ndụmọdụ? (Abụ Ọma 141:5)

12 Olee ihe ga-enyere anyị aka ịnabata ndụmọdụ? Anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi ma cheta na anyị ezughị okè nakwa na mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịkpa àgwà ka ndị na-amaghị ihe. Dị ka anyị kwuru na mbụ, Job lere ihe anya otú na-adịghị mma. Ma o mechara lewe ihe anya otú dị mma. Jehova gọzikwara ya maka ya. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Job dị umeala n’obi. Otú o si gosi ya bụ na ọ nabatara ndụmọdụ Elaịhu nyere ya n’agbanyeghị na ọ tọgburu Elaịhu atọgbu. (Job 32:​6, 7) Ọ bụrụkwa na anyị adịrị umeala n’obi, ọ ga-enyere anyị aka ịnabata ndụmọdụ e nyere anyị ọ bụrụgodị na anyị chere na e kwesịghị inye anyị ndụmọdụ ahụ ma ọ bụkwanụ na anyị tọrọ onye nyere anyị ya. Otu okenye bi na Kanada sịrị: “Ebe ọ bụ na anyị enweghị ike ịhụ onwe anyị otú ndị ọzọ si ahụ anyị, olee otú anyị ga-esi na-emekwu nke ọma ma ọ bụrụ na e nyeghị anyị ndụmọdụ?” È nwere onye n’ime anyị ọ na-adịghị mkpa ịgba mbọ na-akpakwu àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ ma na-emekwu nke ọma n’ozi ọma?​—Gụọ Abụ Ọma 141:5.

13. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ịdọ aka ná ntị anya?

13 Na-ele ịdọ aka ná ntị anya ka otú Jehova si egosi anyị na ọ hụrụ anyị n’anya. Jehova chọrọ ka ihe dịrị anyị ná mma. (Ilu 4:​20-22) Ọ bụrụ na o jiri Okwu ya, akwụkwọ anyị, na ihe ndị ọzọ nzukọ ya wepụtara, ma ọ bụkwanụ si n’aka nwanna ma nke a na-akọ dọọ anyị aka na ntị, ọ na-egosi na ọ hụrụ anyị n’anya. Ndị Hibru 12:​9, 10 kwuru na “Chineke na-adọ anyị aka ná ntị ga-abara anyị uru.”

14. Gịnị ka anyị kwesịrị ilekwasị anya na ya ma e nye anyị ndụmọdụ?

14 Lekwasị anya na ndụmọdụ e nyere gị, ọ bụghị n’otú e si nye gị ya. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike iche na otú e si nye anyị ndụmọdụ abụghị otú kacha mma e kwesịrị isi enye anyị ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na onye na-enye mmadụ ndụmọdụ kwesịrị ịgba mbọ mee ka ọ dịrị onye ọ na-enye ya mfe ịnabata ya.d (Gal. 6:1) Ma ọ bụrụ na ọ bụ anyị ka a na-enye ndụmọdụ, anyị kwesịrị ịgba mbọ lekwasị anya na ndụmọdụ a na-enye anyị, ọ bụrụgodị na anyị chere na otú e si nye anyị ya adịghị mma. Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ọ bụrụgodị na otú e si nye m ndụmọdụ ahụ adịghị m mma, ò nwere ihe m ga-amụta na ya? M̀ nwere ike ghara ilekwasị anya n’ihe onye na-enye m ndụmọdụ na-emetaghị ma lekwasị anya n’otú ndụmọdụ o nyere m ga-esi baara m uru?’ Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na anyị agbalịa kwe ka ndụmọdụ e nyere anyị baara anyị uru.​—Ilu 15:31.

NA-AGWA NDỊ ỌZỌ KA HA DỤỌ GỊ ỌDỤ, Ọ GA-ABAKWARA GỊ URU

15. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-agwa ndị ọzọ ka ha dụọ anyị ọdụ?

15 Baịbụl gbara anyị ume ka anyị na-agwa ndị ọzọ ka ha dụọ anyị ọdụ. Ilu 13:10 sịrị: “Ndị na-achọ ka a dụọ ha ọdụ ma ihe.” Ihe a o kwuru bụ eziokwu. Ndị na-agakwuru ndị ọzọ ka ha nye ha ndụmọdụ na-aka eme nke ọma n’ọgbakọ karịa ndị nke na-eche ka a bịa nye ha ndụmọdụ. N’ihi ya, gbalịa na-agwa ndị ọzọ ka ha nye gị ndụmọdụ.

Foto ndị na-egosi: 1. Ebe otu nwanna nwaanyị na-akatabeghị ahụ́ chọrọ isi n’Ịntanet zụọ uwe. Ọ na-ele uwe elu na-ekpuchighị ahụ́ onye yi ya, traụza ya ataparakwa ya n’ahụ́. 2. Ebe nwanna nwaanyị ahụ na-akatabeghị ahụ́ na-egosi nwanna nwaanyị ma nke a na-akọ n’ọgbakọ uwe ahụ ọ chọrọ ịzụ.

Gịnị mere nwanna nwaanyị a na-akatabeghị ahụ́ ji gwa nwanna nwaanyị a katarala ahụ́ ka o nye ya ndụmọdụ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)

16. Olee ihe ndị nwere ike ime ka anyị gwa ndị ọzọ ka ha nye anyị ndụmọdụ?

16 Olee mgbe anyị nwere ike ịgwa nwanna ka o nye anyị ndụmọdụ? Ka anyị lee ụfọdụ n’ime ha. (1) Nwanna nwaanyị nwere ike ịgwa onye nkwusa ma nke a na-akọ ka o soro ya gaa mụọrọ mmadụ ihe. E mechaa, ya ajụọ ya ebe ndị ọ ga-emekwu nke ọma n’otú o si akụzi ihe. (2) Nwanna nwaanyị na-alụbeghị di nwere ike ịjụ nwanna nwaanyị ma nke a na-akọ n’ọgbakọ ihe o chere banyere uwe ndị ọ chọrọ ịzụ. (3) Nwanna nwoke chọrọ ikwu okwu ihu ọha mbụ ya nwere ike ịgwa nwanna nwoke ma akụzi ihe ka o gee ntị nke ọma mgbe ọ na-ekwu okwu ya, ka o nwee ike ịgwa ya ebe ọ ga-emekwu nke ọma. Nwanna kwurula okwu ruo ọtụtụ afọ nwekwara ike ịgwa nwanna ọzọ na-ekwu okwu nke ọma ka ọ gwa ya ebe ọ ga-emekwu nke ọma, ya agbalịa mee ihe ọ gwara ya.

17. Gịnị ka anyị ga-eme ka ndụmọdụ e nyere anyị baara anyị uru?

17 N’izu ma ọ bụ ọnwa ndị na-abịa abịa, a ga-enye anyị niile ndụmọdụ. O nwere ike isi n’aka mmadụ ma ọ bụ, anyị agụta ya na Baịbụl ma ọ bụkwanụ, anyị esi n’ụzọ ndị ọzọ nweta ya. E nye gị ndụmọdụ, cheta ihe ndị anyị mụrụ n’isiokwu a. Dịrị umeala n’obi. Lekwasị anya na ndụmọdụ e nyere gị, ọ bụghị n’otú e si nye gị ya. Meekwa ihe ahụ a gwara gị. O nweghị onye n’ime anyị si n’afọ mara ihe. Mana ọ bụrụ na anyị egee ntị na ‘ndụmọdụ, nabatakwa aka ná ntị a na-adọ anyị,’ Okwu Chineke kwere anyị nkwa na anyị ‘ga-amara ihe.’​—Ilu 19:20.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Olee ihe anyị mụtara n’aka ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl na-anabataghị ndụmọdụ?

  • Olee ihe anyị mụtara n’aka ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl nabatara ndụmọdụ?

  • Gịnị ga-enyere anyị aka ịnabata ndụmọdụ?

ABỤ NKE 124 Hụ Jehova na Ụmụnna Anyị n’Anya

a Ndị Jehova ma na ọ dị mkpa ịna-ege ntị na ndụmọdụ si na Baịbụl ma na-eme ya. Ma, ọ naghị adịcha mfe ịnabata ndụmọdụ mgbe niile. Gịnị mere o ji dị otú ahụ? Oleekwa ihe anyị ga-eme ka ndụmọdụ e nyere anyị baara anyị uru?

b Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

c Gụọ Ụlọ Nche Eprel 15, 1985, peeji nke 21-28.

d N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-atụle otú onye chọrọ inye mmadụ ndụmọdụ ga-esi jiri akọ mee ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya