Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w25 Julaị p. 8-13
  • Otú E Si Enye Ndụmọdụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú E Si Enye Ndụmọdụ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • MGBE MMADỤ GWARA ANYỊ KA ANYỊ NYE YA NDỤMỌDỤ
  • INYE MMADỤ NDỤMỌDỤ MGBE Ọ NA-AGWAGHỊ ANYỊ
  • INYE NDỤMỌDỤ N’OGE DỊ MMA NAKWA OTÚ DỊ MMA
  • AKWỤSỊKWALA INYE NDỤMỌDỤ NA ỊNABATA NDỤMỌDỤ
  • Gịnị Mere Anyị Kwesịrị Iji Na-achọ Ka E Nye Anyị Ndụmọdụ?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • “Kpọọ Ndị Okenye”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Ndụmọdụ Ị Na-enye Ọ̀ “Na-eme Ka Obi Dị Mmadụ Ụtọ”?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • ‘Gee Ntị n’Ihe Onye Ma Ihe Na-ekwu’
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
w25 Julaị p. 8-13

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 29

ABỤ NKE 87 Bịa Ka A Gbaa Gị Ume

Otú E Si Enye Ndụmọdụ

“M ga-enye gị ndụmọdụ, anya m ga-adịkwa n’ebe ị nọ.”​—ỌMA 32:8.

IHE A GA-AMỤ

Otú anyị ga-esi enye ndụmọdụ ga-abara ndị ọzọ uru.

1. Ònye kwesịrị inye ndụmọdụ? Kọwaa.

Ọ̀ NA-AMASỊ gị inye ndị ọzọ ndụmọdụ? Ọ na-atọ ụfọdụ ndị ụtọ. Ma, e nwere ndị ọ na-esiri ike inye ndụmọdụ, ụjọ na-atụkwa ha ma ha mewe ya. Nke ọ bụla ọ bụ, anyị niile ji ụgwọ inye ndị ọzọ ndụmọdụ mgbe ụfọdụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jizọs sịrị na ihe a ga-eji mara ezigbo ndị na-eso ụzọ ya bụ na ha ga na-egosi ibe ha ịhụnanya. (Jọn 13:35) Otu ụzọ anyị ga-esi egosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya bụ inye ha ndụmọdụ mgbe ọ dị mkpa. Okwu Chineke kwuru na ‘ezigbo ndụmọdụ enyi nyere enyi ya na-eme ka obi dị enyi ya ụtọ.’​—Ilu 27:9.

2. Gịnị ka ndị okenye kwesịrị ịmụta ime, n’ihi gịnị? (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “Inye Ndụmọdụ n’Ọmụmụ Ihe Etiti Izu.”)

2 Ndị okenye kwesịrị ịma otú e si enye ndị ọzọ ezigbo ndụmọdụ. Jehova si n’aka Jizọs nye ụmụ nwoke ndị a ọrụ ilekọta ọgbakọ Chineke. (1 Pita 5:2, 3) Otu n’ime ụzọ ndị ha si eme ya bụ isi na Baịbụl enye ndụmọdụ ma ha kwuwe okwu n’ọgbakọ. Ha na-enye ndị nọ n’ọgbakọ ndụmọdụ mgbe ọ dị mkpa, na-enyekwara ndị hapụrụ Jehova aka ịlọghachi n’ọgbakọ. Olee otú ndị okenye nakwa anyị niile ga-esi na-enye ezigbo ndụmọdụ?

Ebe onyeisi oche ọmụmụ ihe etiti izu ji broshọ bụ́ “Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe” na-aja nwa akwụkwọ mma ma na-enye ya ndụmọdụ.

Inye Ndụmọdụ n’Ọmụmụ Ihe Etiti Izu

Onyeisi oche ọmụmụ ihe etiti izu na-atụrụ ụmụ akwụkwọ mere ihe omume aro ndị ga-enyere ha aka. Ka nwa akwụkwọ na-eme ihe omume ya, onyeisi oche na-eleru anya ka ọ chọpụta otú o si mee n’ihe a gwara ya ka o mee.

O mechaa ihe omume, onyeisi oche na-aja ya mma n’ebe o mere nke ọma. Ọ bụrụkwa na ọ dị mkpa, ọ na-eji akọ nye nwa akwụkwọ ahụ ndụmọdụ otú ọ ga-esi na-emekwu nke ọma n’ihe a gwara ya ka o mee. Ihe a na-abara ma nwa akwụkwọ ahụ ma mmadụ niile nọ n’ọgbakọ uru.​—Ilu 27:17.

3. (a) Olee otú anyị ga-esi mụta inye ndị ọzọ ezigbo ndụmọdụ? (Aịzaya 9:6; kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “Na-eme Ka Jizọs ma I Nyewe Ndụmọdụ.”) (b) Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?

3 Anyị ga-amụta ọtụtụ ihe gbasara otú e si enye ezigbo ndụmọdụ ma anyị mụọ banyere ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, karịchaa Jizọs. Otu n’ime aha ndị e turu ya na Baịbụl bụ “Onye Ndụmọdụ Dị Ebube.” (Gụọ Aịzaya 9:6.) N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe anyị ga-eme ma mmadụ gwa anyị ka anyị nye ya ndụmọdụ nakwa ihe anyị ga-eme mgbe ọ dị mkpa ka anyị nye mmadụ ndụmọdụ mgbe ọ na-agwaghị anyị. Anyị ga-ahụkwa ihe mere o ji dị mkpa ka anyị na-enye ndụmọdụ n’oge dabara adaba nakwa otú dabara adaba.

Na-eme Ka Jizọs ma I Nyewe Ndụmọdụ

Lee ihe ụfọdụ mere ka Jizọs bụrụ “Onye Ndụmọdụ Dị Ebube” nakwa otú anyị ga-esi eme ka ya.

  • Jizọs na-ama ihe ọ ga-ekwu mgbe niile. Jizọs na-ama ihe dabara adaba ọ ga-ekwu mgbe niile n’ihi na ndụmọdụ ya na-esi n’amamihe Jehova, ọ bụghị n’amamihe nke ya. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ihe ndị m na-agwa unu abụghị uche m.”​—Jọn 14:10.

    Ihe anyị na-amụta: Ọ bụ eziokwu na o nwere ike anyị amụtala ọtụtụ ihe ná ndụ, ma anyị nyewe ndụmọdụ, anyị kwesịrị ijide n’aka na ọ bụghị echiche anyị ka anyị ga-eji enye ya, kama ọ bụ Okwu Chineke.

  • Jizọs ma mgbe o kwesịrị inye ndụmọdụ. Ọ gwaghị ndị na-eso ụzọ ya ihe niile ha kwesịrị ịma n’otu oge. Kama, o cheere ruo oge dabara adaba ka o nye ha ndụmọdụ. Ihe ọ na-agwakwa ha bụ naanị ihe ha ga-aghọtali.​—Jọn 16:12.

    Ihe anyị na-amụta: Anyị chọọ inye mmadụ ndụmọdụ, anyị kwesịrị ichere ruo oge kwesịrị ekwesị “ikwu okwu.” (Ekli. 3:7) Ọ bụrụ na anyị ekwuo ọtụtụ ihe, o nwere ike ọ gaghị ama ihe ọ ga-eme eme, obi adaakwa ya mbà. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgwa ya naanị ihe o kwesịrị ịma ga-enyere ya aka ná nsogbu ya.

  • Jizọs na-akwanyere mmadụ ùgwù ma o nyewe ndụmọdụ. Jizọs nyere ndịozi ya ndụmọdụ ọtụtụ ugboro ka ha na-adị umeala n’obi. Ma na nke ọ bụla n’ime ha, o medara obi, kwanyekwara ha ùgwù.​—Mat. 18:1-5.

    Ihe anyị na-amụta: Ọ bụrụgodị na ọ dị mkpa ka anyị nye mmadụ otu ndụmọdụ ugboro ugboro, ọ ga-aka aba uru ma anyị wetuo obi, gwakwa onye ahụ okwu otú gosiri na anyị na-akwanyere ya ùgwù.

MGBE MMADỤ GWARA ANYỊ KA ANYỊ NYE YA NDỤMỌDỤ

4-5. Ọ bụrụ na mmadụ agwa anyị ka anyị nye ya ndụmọdụ, gịnị ka anyị kwesịrị ibu ụzọ jụọ onwe anyị? Mee ihe atụ.

4 Ọ bụrụ na mmadụ agwa anyị ka anyị nye ya ndụmọdụ, gịnị ka anyị kwesịrị ibu ụzọ mee? Obi nwere ike ịtọ anyị ụtọ na enyi anyị tụkwasịrị anyị obi. Anyị nwekwara ike ịchọ inyere ya aka ozugbo. Ma, anyị kwesịrị ibu ụzọ jụọ onwe anyị, sị: ‘M̀ ma gbasara ihe a nke ọma nke na m ga-enye ya ndụmọdụ bara uru?’ Mgbe ụfọdụ, otú kacha mma anyị ga-esi nyere mmadụ aka bụ ịghara inye ya ndụmọdụ, kama anyị enyere ya aka ịchọta onye ma gbasara ihe ahụ nke ọma.

5 Tụlegodị ihe atụ a. Ka e were ya na ezigbo ọrịa bịara enyi gị, ya agwa gị na ya ebidola ime nchọnchọ n’ụzọ ndị e nwere ike isi agwọ ya, ya ajụzie gị nke i chere ka mma ọ ga-ahọrọ. O nwere ike ịbụ na e nwere nke i chere kacha mma. Mana ị bụghị dọkịta, a zụbeghịkwanụ gị ịgwọ ụdị ọrịa ahụ. Ụdị ihe a mee, ihe kacha mma i nwere ike imere enyi gị bụ inyere ya aka ịchọta onye a zụrụ nke ọma ịgwọ ọrịa ahụ.

6. Gịnị mere anyị nwere ike iji ekpebi ichere tupu anyị enye mmadụ ndụmọdụ?

6 Ọ bụrụgodị na anyị chere na anyị ruru eru inye mmadụ ndụmọdụ gbasara otu ihe, anyị nwere ike ikpebi ichere ruo oge ụfọdụ tupu anyị azaghachi onye ahụ. N’ihi gịnị? Ilu 15:28 kwuru, sị: “Onye ezi omume na-atụgharị uche tupu ya azaghachi.” Gịnị ka anyị nwere ike ime ma anyị chee na anyị ma azịza ya? Anyị nwere ike iwepụtatụ oge mee nchọnchọ, kpee ekpere, ma chebara ya echiche. Anyị mee otú ahụ, obi ga-esi anyị ike na ihe anyị ga-aza onye ahụ ga-adaba n’ihe Jehova chere gbasara okwu ahụ. Ka anyị lee ihe Netan onye amụma mere.

7. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Netan onye amụma?

7 Eze Devid gwara Netan onye amụma na ọ chọrọ ịrụrụ Jehova ụlọ nsọ. Netan gwara ya ozugbo ka o mee ya. Ma, Netan gaara ebu ụzọ jụọ Jehova ihe o chere. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jehova achọghị ka Devid rụọrọ ya ụlọ nsọ. (1 Ihe 17:1-4) Akụkọ a na-egosi na mmadụ sị anyị nye ya ndụmọdụ, anyị ekwesịghị ikwu “okwu ngwa ngwa.” Ọ ga-egosi na anyị ma ihe.​—Jems 1:19.

8. Olee ihe ọzọ mere anyị kwesịrị iji kpachara anya tupu anyị enye mmadụ ndụmọdụ?

8 Ka anyị lee ihe ọzọ mere anyị kwesịrị iji kpachara anya mgbe anyị na-enye mmadụ ndụmọdụ. Ọ bụrụ na ndụmọdụ anyị nyere mmadụ emee ka o mee mkpebi ghọrọ ya ahịa, a ga-atakwa anyị ụta maka ya. N’eziokwu, anyị kwesịrị ịna-eche echiche nke ọma tupu anyị enye mmadụ ndụmọdụ.

INYE MMADỤ NDỤMỌDỤ MGBE Ọ NA-AGWAGHỊ ANYỊ

9. Tupu ndị okenye enyewe mmadụ ndụmọdụ, gịnị ka ha kwesịrị ijide n’aka? (Ndị Galeshia 6:1)

9 Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị mkpa ka ndị okenye nye nwanna ‘zọhiewerela ụkwụ’ ndụmọdụ. (Gụọ Ndị Galeshia 6:1.) Ihe e ji kọwaa amaokwu a kwuru na onye dị otú ahụ na-etinye isi n’ebe na-adịghị mma, ọ bụ eziokwu na o nwere ike o mebeghị mmehie dị oké njọ. Ihe bụ́ mkpa ndị okenye bụ inyere ya aka ịnọsi ike n’ụzọ na-eduga ná ndụ ebighị ebi. (Jems 5:19, 20) Ma, ọ bụrụ na ha chọrọ ka ndụmọdụ ha ga-enye baa uru, ha kwesịrị ibu ụzọ jide n’aka na onye ahụ azọhiewela ụkwụ n’eziokwu. Ha ma na ọ bụrụ na mmadụ emee mkpebi dị iche na nke ha, ọ pụtaghị na onye ahụ emeela ihe Jehova kpọrọ asị. (Rom 14:1-4) Gịnịkwanụ ka ndị okenye ga-eme ma ọ bụrụ na o doola ha anya na nwanna azọhiewela ụkwụ, ha ekpebiekwa na ha kwesịrị inye ya ndụmọdụ?

10-12. Ndị okenye nyewe mmadụ ndụmọdụ mgbe onye ahụ na-ekwughị ka e nye ya, gịnị ka ha kwesịrị ime? Nye ihe atụ. (Kọwaakwa foto.)

10 Ọ naghị adịrị ndị okenye mfe inye mmadụ ndụmọdụ ma ọ bụrụ na onye ahụ agwaghị ha ka ha nye ya. N’ihi gịnị? Pọl onyeozi sịrị na mmadụ nwere ike ịzọhiewe ụkwụ tupu ya amata ihe ọ na-eme. N’ihi ya, ndị okenye kwesịrị ibu ụzọ mee ka ọ dịrị onye ahụ mfe ịnabata ndụmọdụ ahụ.

11 Inye mmadụ ndụmọdụ mgbe ọ na-ekwughị ka e nye ya dị ka ebe mmadụ chọrọ ịkụ ihe n’ala kpọrọ nkụ. Tupu onye ọrụ ubi akụọ ihe n’ala ahụ, ọ na-ebu ụzọ akọ ya. Ihe a na-eme ka ala ahụ dị nro. O mechazie, ya akụọ mkpụrụ. Ihe ikpeazụ ọ na-eme bụ ịgba ya mmiri iji nyere ya aka ito. Otú ahụ ka ọ dị okenye chọrọ inye mmadụ ndụmọdụ mgbe onye ahụ na-agwaghị ya. Ọ na-ebu ụzọ eme ka ọ dịrị onye ahụ mfe ịnabata ya. E nwere ike iji ya tụnyere ịkọ ala tupu a kụọ mkpụrụ. Dị ka ihe atụ, okenye ahụ ga-achọta oge dị mma ya na onye ahụ ga-eji kwurịta okwu, gwakwa ya na ihe gbasara ya na-emetụ ya n’obi nakwa na e nwere ihe ọ chọrọ ịgwa ya ga-enyere ya aka. Ọ bụrụ na a ma okenye ahụ ka onye dị obiọma ma hụ ndị ọzọ n’anya, ọ ga-adịrị ndị ọzọ mfe ịnabata ndụmọdụ ya.

12 Ha kwurịtawa okwu, okenye ahụ nwere ike ime ka ọ dịrị nwanna ahụ mfe ịnabata ndụmọdụ ọ ga-enye ya. Otú ọ ga-esi eme ya bụ ịgwa ya na onye ọ bụla na-emejọ ihe, na ọ na-adịkwa mkpa ka e nye onye ọ bụla ndụmọdụ mgbe ụfọdụ. (Rom 3:23) Okenye ahụ ga-emeda obi jiri Akwụkwọ Nsọ gosi ya otú o si bụrụ na ọ zọhiela ụkwụ. Ozugbo nwanna ahụ kwetara na ihe o mere adịghị mma, okenye ahụ ga-akọwara ya ihe ọ ga-eme ka o nwee ike ịgbanwe. Ihe ọ na-eme mgbe ahụ bụ “ịkụ mkpụrụ.” Ihe ikpeazụ okenye ahụ ga-eme bụ ‘ịgba mkpụrụ ahụ mmiri.’ Otú ọ ga-esi eme ya bụ ịja ya mma n’ihe ndị dị mma ọ na-eme nakwa ikpere ya ekpere.​—Jems 5:15.

Foto ndị na-egosi otú okenye na-enye nwanna ndụmọdụ si yie onye ọrụ ugbo na-akụ mkpụrụ n’ala kpọrọ nkụ. 1. Kọọ ala: Ebe onye ọrụ ugbo ahụ na-akọ ala; ebe okenye ahụ weturu obi na-agwa nwanna ahụ okwu. 2. Kụọ mkpụrụ: Ebe onye ọrụ ugbo ahụ na-akụ mkpụrụ n’ala ọ kọrọ akọ; ebe okenye ahụ ji Baịbụl na-agwa nwanna ahụ okwu. 3. Gbaa ya mmiri: Ebe onye ọrụ ugbo ahụ na-agba mkpụrụ ahụ ọ kụrụ mmiri; ebe okenye ahụ na-ekpere nwanna ahụ ekpere.

Ọ dị mkpa ka anyị dịrị akọ ma gosi mmadụ na anyị hụrụ ya n’anya mgbe anyị na-enye ya ndụmọdụ ọ na-agwaghị anyị nye ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 ruo na nke 12)


13. Olee otú ndị okenye ga-esi jide n’aka na onye ha nyere ndụmọdụ ghọtara ndụmọdụ e nyere ya?

13 Mgbe ụfọdụ, ihe onye na-enye ndụmọdụ kwuru nwere ike ịdị iche n’ihe onye a na-enye ndụmọdụ ghọtara. Gịnị ka ndị okenye ga-eme ka ụdị ihe ahụ ghara ime? Ha nwere ike iji akọ jụọ onye ahụ ajụjụ iji mata ma ọ̀ ghọtakwara ihe a na-ekwu. (Ekli. 12:11) Ihe ọ zara ga-enyere ha aka ijide n’aka na ọ ghọtara ndụmọdụ ahụ e nyere ya.

INYE NDỤMỌDỤ N’OGE DỊ MMA NAKWA OTÚ DỊ MMA

14. Ànyị kwesịrị inye mmadụ ndụmọdụ mgbe iwe ji anyị? Kọwaa.

14 Anyị niile ezughị okè. N’ihi ya, anyị nwere ike ikwu ma ọ bụ mee ihe ga-akpasu ndị ọzọ iwe. (Kọl. 3:13) Okwu Chineke kwuru na mgbe ụfọdụ, mmadụ nwere ike ikwu ma ọ bụ mee ihe ga-akpasu anyị iwe. (Efe. 4:26) Ma, anyị ekwesịghị inye mmadụ ndụmọdụ mgbe iwe ji anyị. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na “onye na-ewe iwe anaghị eme ezi omume Chineke chọrọ ka anyị na-eme.” (Jems 1:20) Ọ bụrụ na anyị enye mmadụ ndụmọdụ mgbe iwe ji anyị, anyị nwere ike ịkpata nsogbu kama inyere onye ahụ aka. Ihe a apụtaghị na anyị ekwesịghị ịgwa onye kpasuru anyị iwe otú obi dị anyị ma ọ bụ ihe anyị chere. Ma, anyị kwesịrị ichere ruo mgbe obi jụụrụ anyị tupu anyị agwawa ya okwu. Anyị nwere ike ịmụta ihe n’aka Elaịhu, bụ́ onye nyere Job ezigbo ndụmọdụ.

15. Gịnị ka anyị na-amụta n’aka Elaịhu? (Kọwaakwa foto.)

15 Elaịhu ji ọtụtụ ụbọchị gee ntị ka Job nọ na-agbachitere onwe ya mgbe ndị sị na ha bụ ndị enyi ya nọ na-ebo ya ebubo. Elaịhu metaara Job ebere. Ma ezigbo iwe were ya n’ihi na mgbe Job na-agbalị igosi na aka ya dị ọcha, o kwuru ihe ndị na-abụghị eziokwu gbasara Jehova. N’agbanyeghị ya, Elaịhu cheere ka o ruoro ya ikwu okwu, ya emedazie obi kwanyere Job ùgwù mgbe ọ na-enye ya ndụmọdụ. (Job 32:2; 33:1-7) Ihe a Elaịhu mere na-akụziri anyị otu eziokwu dị mkpa. Ọ kacha mma inye mmadụ ndụmọdụ mgbe obi jụụrụ anyị, anyị akwanyekwara onye ahụ ùgwù ma gosi ya na anyị hụrụ ya n’anya.​—Ekli. 3:1, 7.

Ebe Elaịhu weturu obi na-ege Job ntị mgbe ọnyá juru Job n’ahụ́.

N’agbanyeghị na e nwere ihe Job kwuru were Elaịhu iwe, o cheere, wetuo obi, kwanyekwara Job ùgwù mgbe ọ na-agwa ya okwu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)


AKWỤSỊKWALA INYE NDỤMỌDỤ NA ỊNABATA NDỤMỌDỤ

16. Gịnị ka ị mụtara n’Abụ Ọma 32:8?

16 Amaokwu Baịbụl isiokwu a si kwuru na ‘Jehova ga-enye anyị ndụmọdụ, anya ya ga-adịkwa n’ebe anyị nọ.’ (Gụọ Abụ Ọma 32:8.) Ihe a na-egosi na ọ naghị akwụsị inyere anyị aka. Ihe ọ na-eme abụghị naanị inye anyị ndụmọdụ. Ọ na-enyekwara anyị aka ime ihe ọ gwara anyị. Anyịnwa kwesịkwara ime otú ahụ. Ọ bụrụ na anyị ga-enye mmadụ ndụmọdụ, anyị kwesịrị ime ka Jehova ma gbaa onye ahụ ume, nyekwara ya aka ka o nwee ike ime ezigbo mkpebi.

17. Olee otú obi na-adị anyị ma ndị okenye nye anyị ndụmọdụ si na Baịbụl? (Aịzaya 32:1, 2)

17 Ọ dị anyị mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ ịna-enye ezigbo ndụmọdụ na ịna-anabata ya. (2 Tim. 3:1) Ndị okenye ndị na-eji Baịbụl enye ndụmọdụ dabara adaba dị ka “iyi na-asọ n’ala mmiri na-adịghị.” (Gụọ Aịzaya 32:1, 2.) Ọ na-atọ anyị ụtọ na anyị nwere ndị enyi ma ihe anyị chọrọ ịnụ ma ha akata obi gwa anyị ihe e kwesịrị ịgwa anyị. Okwu ha na-agwa anyị mara mma otú “apụl ndị e ji ọlaedo kpụọ si ama mma ma e tinye ha n’efere e ji ọlaọcha kpụọ.” (Ilu 25:11) Ka anyị niile na-amụta otú e si enye ezigbo ndụmọdụ na otú e si anabata ezigbo ndụmọdụ.

GỊNỊ KA ANYỊ KWESỊRỊ ICHETA MGBE . . .

  • mmadụ gwara anyị ka anyị nye ya ndụmọdụ?

  • ọ dị mkpa ka anyị nye mmadụ ndụmọdụ mgbe ọ na-agwaghị anyị?

  • iwe ji anyị?

ABỤ NKE 109 Jirinụ Obi Unu Niile Hụ Ibe Unu n’Anya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya