Ndị Okenye—Meenụ Ka Ndị Ọzọ Guzozie ná Mmụọ nke Ịdị Nwayọọ
OBI nke ezi onye Kraịst bụ nke a pụrụ iji atụnyere ubi ime mmụọ nke na-amị ezi mkpụrụ. Ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obi ọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, na imeru ihe n’ókè, dị ka a pụrụ ịtụ anya ya, ga-etojupụta nke ọma n’ebe ahụ. Oleekwa ihe mere na ọ gaghị adị otú ahụ? Ekwuwerị, ihe ndị a nile bụ mkpụrụ nke mmụọ nsọ nke Jehova Chineke na-enye ndị ohu ya rarawooro onwe ha nye. (Ndị Galetia 5:22, 23) Ma, onye Kraịst ọ bụla nke chọrọ ime ka ubi nke obi ya nọgide na-abụ ebe na-atọ Nna ya nke eluigwe ụtọ aghaghị ịlụ ọgụ siri ike, nke na-agakwa n’ihu megide atá nke mmehie e bu pụta ụwa.—Ndị Rom 5:5, 12.
Mgbe ụfọdụ, ihe na-adịghị mma na-amalite itopụta n’obi n’ezughị okè nke onye na-atụ egwu Chineke. Onye ahụ pụrụ inweworị ihe ndekọ ime mmụọ magburu onwe ya. Ma mgbe ahụ nsogbu ụfọdụ na-ebilite, nke nwere ike isite ná mkpakọrịta na-ekwesịghị ekwesi ma ọ bụ mkpebi amamihe na-adịghị n’ime ya. Olee otú ndị okenye ọgbakọ pụrụ isi nyere onye dị otú ahụ aka n’ụzọ ime mmụọ?
Ndụmọdụ Ndị Ozi
N’inyere onye Kraịst jehieworonụ aka, ọ dị ndị okenye mkpa ịgbaso ndụmọdụ nke Pọl onyeozi: “Ụmụnna m, a sị na ọ bụ ezie na a nwụde mmadụ mgbe ọ nọ ná ndahie ọ bụla, unu onwe unu, bụ́ ndị mmụọ nsọ na-achị, meenụ ka mmadụ dị otú a guzozie n’ime mmụọ nke ịdị nwayọọ; na-elezi onwe gi anya, ka aghara ịnwakwa gị onwe gi.” (Ndị Galetia 6:1) Mgbe onye kwere ekwe ibe anyị “nọ na ndahie,” ndị okenye nwere ibu ọrụ nke inye enyemaka ngwa ngwa ruo ókè o kwere mee.
Pọl zoro aka n’ebe “nwoke” (NW) nọ dị ka onye nọ ná ndahie. Otú ọ dị, okwu Grik bụ́ (anʹthro·pos) nke e ji mee ihe n’ebe a pụrụ izo aka n’ebe nwoke ma ọ bụ nwanyị nọ. Oleekwa ihe ọ pụtara bụ ime ka mmadụ “guzozie”? Okwu Grik nke a (ka·tar·tiʹzo) pụtara “ime ka ihe dabakọọ otu kwesịrị ekwesị.” A na-ejikwa otu okwu ahụ eme ihe maka imezi ụ̀gbụ́. (Matiu 4:21) A na-ejikwa ya eme ihe n’ịgbazi ụkwụ ma ọ bụ aka mmadụ gbajiri agbaji. Onye dọkịta na-eji nlezianya eme nke a ka ọ ghara ịkpatara onye ọ na-agwọ ọrịa ihe mgbu na-enweghị isi. N’otu aka ahụkwa, inyere nwanna nwoke ma ọ bụ nwanyị aka ịbata n’ime usoro ime mmụọ kwesịrị ekwesị chọrọ nlezianya, akọ, na ọmịiko.
Ndị okenye na-enye ihe àmà na-egosipụta ọnọdụ ime mmụọ nke ha site n’igosipụta mmụọ nke ịdị nwayọọ mgbe ha na-agbalị ime ka mmadụ guzozie. N’ezie, Jisọs bụ́ onye dị nwayọọ ga-eji ịdị nwayọọ mee ihe n’okwu ndị dị otú ahụ. (Matiu 11:29) Ndị okenye kwesịrị igosipụta àgwà nke a n’ebe ohu Jehova nọ, bụ́ onye zọhiere ụkwụ n’ihi na ha onwe ha akarịghị ịdaba ná mmehie, n’ụzọ megidere nzube nke obi ha. Nke a pụrụ ime n’ọdịnihu ma ọ bụrụ na o mebeghị n’oge gara aga.
Ụmụ nwoke ndị a ruru eru n’ụzọ ime mmụọ kwesịrị iji ịhụnanya ‘na-ebu ibu’ nke ndị na-efe ofufe ibe ha. N’ezie, ndị okenye na-ebu ya n’obi ha inyere nwanna nwoke ma ọ bụ nwanyị aka ịlụ ọgụ megide Setan, ọnwụnwa, adịghị ike nke anụ ahụ, na ihe otiti nke mmehie. Nke a kpọmkwem bụ otu ụzọ ndị nlekọta bụ ndị Kraịst ga-esi ‘na-edebezu iwu nke Kraịst.’—Ndị Galetia 6:2.
Ụmụ nwoke ndị nwere ezi iru eru n’ụzọ ime mmụọ na-adị umeala n’obi, na-aghọta na “a sị na mmadụ na-eche na ya bụ ihe, mgbe ọ na-abụghị ihe ọ bụla, ọ na-aghọ onwe ya aghụghọ n’obi.” (Ndị Galetia 6:3) N’agbanyeghị otú ọ bụla ndị okenye si gbalịsie ike ime ihe ziri ezi na ihe na-enye aka, ha ka ga-abụkwa ndị na-erughị ọ̀tụ̀tụ̀ nke Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst, onye zuru okè ma nwee obi ebere ịhụnanya. Ma nke ahụ abụghị ihe mere ha ga-eji ghara ime ihe kasị mma ha nwere ike ime.
Ndị okenye maara na ọ ga-adị njọ iji àgwà mpako, na nke onye dịkarịrị ibe ya ná nsọ katọọ onye kwere ekwe ibe ha! E ji n’aka na Jisọs agaghị eme nke ahụ. Leenụ, ọ tọgbọrọ ndụ ya ọ bụghị nanị maka ndị enyi ya kamakwa ọbụna maka ndị iro ya! Ndị okenye na-agbalịsi ike igosipụta ụdị ịhụnanya ahụ mgbe ha na-anwa inyere ụmụnna nwoke ma ọ bụ nwanyị aka ịpụta n’ihe isi ike ma mee ka ha bịaruo Nna ha nke eluigwe na ụkpụrụ ezi omume ya nso. Olee nzọụkwụ ụfọdụ ndị ga-enyere ndị okenye aka ime ka ndị na-efe ofufe ibe ha guzozie?
Nzọụkwụ Ụfọdụ Ndị Na-enye Aka
Jiri ekpere dabere na Jehova mgbe ị na-ekwu okwu ma na-eme omume n’ụzọ ịdị nwayọọ n’obi. Jisọs dị nwayọọ n’obi, kpesie ekpere ike nye Nna ya nke eluigwe maka nduzi, na-emekwa ihe ndị na-atọ Ya ụtọ mgbe nile. (Matiu 21:5; Jọn 8:29) Ndị okenye kwesịrị ime otu ihe ahụ mgbe ha na-agbalị ime ka onye jehieworonụ guzozie. Dị ka onye ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru, nke dị nwayọọ n’obi, onye okenye ga na-agba ume ma na-ewuli elu n’okwu, ọ bụghị onye na-agbọchi mmadụ ọnụ. Mgbe a na-enwe nkwurịta okwu ahụ, ọ ga-agbalị ime ka e nwee ọnọdụ nke onye Kraịst chọrọ enyemaka ga-enwere onwe ya ruo otu o kwere mee n’ikwupụta echiche ya. Iji mee nke ahụ, ekpere mmeghe si n’ala ala obi ga-enye aka nke ukwuu. Onye na-anara ndụmọdụ nke e ji ịdị nwayọọ nye ga-adị njikere karị ịmeghe obi ya nye ya ma ọ bụrụ na ọ maara na, dị ka Jisọs, onye ahụ na-enye ndụmọdụ chọrọ ime ihe ndị na-atọ Chineke ụtọ. Ekpere mmechi yikarịrị ka ọ ga-akụnye n’ime onye ahụ mkpa nke itinye ndụmọdụ ahụ e nyeworo ya n’ụzọ ịhụnanya na ịdị nwayọọ n’ọrụ.
Mgbe e kpesịrị ekpere, nye ịja mma nke bụ eziokwu. Ọ pụrụ ịmetụta ezi àgwà dị iche iche nke onye ahụ, dị ka obi ọma, ịbụ onye a pụrụ ịdabere na ya ma ọ bụ onye na-arụsị ọrụ ike. A pụrụ ịhota ihe ndekọ nke ije ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ya nye Jehova, eleghị anya eri ọtụtụ afọ. N’ụzọ dị otú a, anyị na-egosi na anyị nwere nchegbu ma nweekwa nchebara echiche yiri nke Kraịst n’ebe onye ahụ nọ. Jisọs ji ịja mma malite ozi ya nye ọgbakọ Taịataịra, na-asị: “Amatara m ọrụ gị nile, na ịhụnanya gị na okwukwe gị na ije ozi gị na ntachi obi gi, matakwa na ọrụ ikpeazụ gị karịrị nke mbụ.” (Mkpughe 2:19) Okwu ndị ahụ mesịrị ndị nọ n’ọgbakọ ahụ obi ike na Jisọs maara ọrụ ọma ha na-arụ. Ọ bụ ezie na ọgbakọ ahụ nwere adịghị ike ya—a na-anabata mmetụta “Jezebel”—ọ na-eme nke ọma n’akụkụ ndị ọzọ, Jisọs chọkwara ka ụmụnna nwoke na nwanyị ndị ahụ mara na ọrụ ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ abụghị nke a na-adịghị ahụ. (Mkpughe 2:20) N’ụzọ yiri nke ahụ ndị okenye kwesịrị ịja mma ebe e kwesịrị ime otu ahụ.
Emela ihe banyere njehie gabiga otú ọnọdụ chọrọ. Ndị okenye aghaghị ichebe igwe atụrụ Chineke ma debe nzukọ ya ọcha. Ma ụfọdụ njehie ime mmụọ nke chọrọ ndụmọdụ siri ike pụrụ ịbụ nke otu onye okenye ma ọ bụ abụọ ga-eme ihe ha chere kasị mma banyere ya na-eguzobeghị nnọkọ ikpe. N’ọtụtụ ọnọdụ, adịghị ike nke mmadụ kama ị bụ ajọ omume a kpachaara anya mee na-akpatakarị njehie nke onye Kraịst. Ndị okenye kwesịrị imeso ìgwè atụrụ ahụ n’ụzọ dị nro ma cheta nke a: “N’ihi na ọ bụ ikpe nke ebere na-adịghị ya ka a ga-ekpe onye na-emeghị ebere: ebere na-anyara ikpe isi.” (Jemes 2:13; Ọrụ 20:28-30) Ya mere, kama ime ka okwu ahụ hie nne karịa otú ọ hà n’ezie, ndị okenye kwesịrị imeso ndị kwere ekwe ibe ha nwere obi nchegharị n’ụzọ ịdị nwayọọ, dị ka Chineke anyị nwere obi ebere ma dị ọmịiko, bụ́ Jehova.—Ndị Efesọs 4:32.
Gosi nghọta nke ihe ndị pụrụ idujewori ná njehie ahụ. Ọ dị ndị okenye mkpa ịge ntị nke ọma mgbe onye kwere ekwe ibe ha na-ekwupụtasị ihe ndị dị ya n’obi. Ebe ‘Chineke adịghị eleda obi tiwara etiwa na nke e gwepịara egwepịa anya,’ ndị okenye ekwesịghịkwa ime otú ahụ. (Abụ Ọma 51:17) Eleghị anya enyeghị nkwado n’ụzọ mmetụta nke di ma ọ bụ nwunye mmadụ pụrụ ịbụ ihe kpatara nsogbu ahụ. Ịda mbà n’uche nke siri oké ike na nke nọteworo aka pụrụ ikpochapụwo ụfọdụ n’ime ọnọdụ mmetụta uche siri ike nke onye ahụ nwere na mbụ ma ọ bụ na ọ pụrụ imewori ka o sie oké ike ime mkpebi ndi amamihe dị n’ime ha. Ndị okenye na-ahụ n’anya ga-atụle ụdị ihe ndị ahụ, n’ihi na ọ bụ ezie na Pọl rịọsiri ụmụnna ya ike ka ha ‘na-adụ ndị na-adịghị agazi ije ọdụ,’ ọ gbakwara ha ume, sị: “na-agụgụnụ ndị dara mbà n’obi, na-enyerenụ ndị na-adịghị ike aka, nweenụ ogologo ntachị obi n’ebe mmadụ nile nọ.” (1 Ndị Tesalọnaika 5:14) Ọ bụ ezie na ndị okenye ekwesịghị iwetu ikike nke ụkpụrụ ezi omume nke Chineke ala, ha kwesịrị icheba echiche n’ihe ndị na-ebelata ihe mgbu, ọbụna dị ka Chineke na-eme.—Abụ Ọma 103:10-14; 130:3.
Zere ibibi ùgwù onwe onye nke onye Kraịst ibe gị. Anyị achọghị mgbe ọ bụla ibibi ùgwù nke nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị ọ bụla ma ọ bụ mee ka e nwee echiche nke na ọ baghị uru. Kama nke ahụ, mmesi obi ike na anyị nwere obi ike n’àgwà ndị Kraịst na ịhụnanya nke onye ahụ maka Chineke ga-agba ya ume imezi njehie. O yikarịrị ka a gbara ndị Kọrịnt ume ịbụ ndị na-emesapụ aka mgbe Pọl gwara ha na ya na-anyara ndị ọzọ isi banyere “obi dị ọkụ” na ‘ịnụ ọkụ n’obi’ ha n’akụkụ nke a.—2 Ndị Kọrint 9:1-3.
Gosi na a pụrụ imeri nsogbu ahụ site n’ịtụkwasị Jehova obi. Ee, gbalisịe ike inyere onye ahụ aka ịmata na ịtụkwasị Chineke obi na itinye ndụmọdụ nke Okwu Ya n’ọrụ ga-enye aka iweta nguzozi nke dị mkpa. Iji mee nke a, okwu anyị ga-adabere n’Akwukwọ Nsọ na akwụkwọ ndị dabeere na Bible. Ihe mgbaru ọsọ anyị gbara mkpị: (1) inyere onye ahụ chọrọ enyemaka aka ịhụ ma ghọta echiche Jehova na (2) igosi onye ahụ otú o si n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ leghara ma ọ bụ ghara ịgbaso nduzi ndị a nke Chineke.
Jikọta ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ na ajụjụ obi ọma nke dabara n’okwu ahụ. Nke a pụrụ ịdị irè n’irute obi. Site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Malakai, Jehova ji ajụjụ mee ka ndị Ya ghọta otú ha siworo gahie. “Mmadụ, ọ̀ ga-apụnara Chineke ihe?” ka ọ jụrụ, na-asịkwa: “Ma unu na-apụnara m ihe.” (Malakai 3:8) Ọdịda nke Israel dara ịtụnye otu ụzọ n’ụzọ iri nke mkpụrụ ala ubi ha dị ka Iwu Mosis chọrọ ka ha mee na ịpụnara Jehova ihe bụ otu ihe. Iji mezie ọnọdụ a, ọ dị ndị Israel mkpa imezu ibu ọrụ ha n’ebe ofufe dị ọcha dị, na-enwe okwukwe na Chineke ga-agọzi ha n’ụba. Site n’iji ajụjụ ndị na-akpali echiche na ndị na-egosi nchebara echiche, ndị okenye pụkwara imesi ya ike na ime ihe ziri ezi taa gụnyere ịtụkwasị Nna anyị nke eluigwe obi na irubere ya isi. (Malakai 3:10) Ịkụnye echiche ahụ n’ime obi ga-etinye ihe dị ukwuu n’inyere nwanna anyị aka ịkwara ‘ụkwụ ya ụzọ nke na-eguzozi ọtọ.’—Ndị Hibru 12:13.
Mesie ike uru ndị dị n’ịnakwere ndụmọdụ ahụ. Ndụmọdụ dị irè gụnyere ma ịdọ aka ná ntị banyere ihe ga-esi n’ịgbaso ụzọ ajọ omume pụta na nchetaghachi nke uru ndị a na-erite site n’ịgbazi olu. Mgbe o nyesịrị ịdọ aka ná ntị bịara n’oge ya, Jisọs mesiri ọgbakọ Leọdisia nke na-adịghị egosi mmasị n’ụzọ ime mmụọ obi ike na ọ bụrụ na ha echegharịa n’ụzọ mbụ ha ma ghọọ ndị na-eso ụzọ na-anụ ọkụ n’obi, ha ga-enweta ihe ùgwù ndị pụrụ iche, gụnyere olileanya nke iso ya chịa ọchịchị n’eluigwe.—Mkpughe 3:14-21.
Gosi mmasị n’ịmata ma à na-agbaso ndụmọdụ ahụ. Dị ka ezi onye dọkịta na-atụle site na mgbe ruo na mgbe iji chọpụta ma ọkpụkpụ ọ gbaziri ọ̀ ka nọkwa n’usoro, otú a ka ndị okenye kwesịrị isi gbalịa ịchọpụta ma a na-etinye ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ ahụ n’ọrụ. Ha pụrụ ịjụ onwe ha, sị: À chọkwuru enyemaka ọzọ? È kwesịrị inyeghachi ndụmọdụ ahụ, eleghi anya n’ụzọ ọzọ? Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ ugboro ugboro banyere mkpa nke ịdị umeala n’obi. Ruo ogologo oge ụfọdụ, o ji ndidi chọọ ime ka echiche ha guzozie site na ndụmọdụ, ilu dị iche iche, na ihe mmụta ndị a na-ahụ anya. (Matiu 20:20-28; Mak 9:33-37; Luk 22:24-27; Jọn 13:5-17) N’iji ya atụnyere nke a, ndị okenye pụrụ inye aka n’ime ka e jiri n’aka na nwanna nwoke ma ọ bụrụ nwanyị guzoziri site n’ime ndokwa maka nkwurịta okwu dabeere n’Akwụkwọ Nsọ ndị na-esochi nke mbụ, bụ́ ndị a haziri iji kwalite ọganihu nke onye ahụ gaa n’ahụ ike ime mmụọ zuru ezu.
Nye ija mma maka ọganihu ọ bụla e nwere. Ọ bụrụ na onye ahụ jehierenụ ji obi eziokwu na-agbalị itinye ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ n’omume, jaa ya mma n’ụzọ na-ekpo ọkụ. Nke a ga-ewusiwanye ndụmọdụ mbụ ahụ ike ma yie ka ọ ga-agba ume inwewanye ọganihu. N’akwụkwọ ozi mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt, ọ bụ onye a rụgidere inye ha ndụmọdụ siri ike n’ọtụtụ ihe. Ngwa ngwa ka Titọs gwasịrị onyeozi ahụ banyere mmeghachi omume magburu onwe ya nye akwụkwọ ozi ya, Pọl dere akwụkwọ ozi iji jaa ha mma. “Ugbu a ana m aṅụrị ọṅụ,” ka o kwuru, “ọ bụghị na e mere ka ihe wuta unu, kama na e mere ka o wuta unu ruo nchegharị: n’ihi na e mere ka o wuta unu dị ka Chineke chọrọ.”—2 Ndị Kọrịnt 7:9.
Ihe Na-akpata Ịṅụrị Ọṅụ
Ee, Pọl ṅụrịrị ọṅụ mgbe ọ nụrụ na ndụmọdụ ya enyeworo ndị Kọrịnt aka. N’otu aka ahụ, ndị okenye nke oge ugbu a na-enwe ọṅụ dị ukwuu mgbe onye na-efe ofufe ibe ha nwetaghachiri onwe ya ọzọ pụọ ná njehie n’ihi ịnakwere enyemaka ịhụnanya ha nke ọma. N’ezie ha pụrụ nnọọ inwe mmasị n’inyere onye Kraịst nwere obi nchegharị aka ifopụ atá ogwu nke mmehie site n’obi ya nke ga-eme ka mkpụrụ nke Chineke nwee ike itojupụta n’ebe ahụ n’ụba.
Ọ bụrụ na ndị okenye e nwee ihe ịga nke ọma n’ime ka onye jehierenụ guzozie, a pụrụ ịkpọghachi onye ahụ azụ site n’ịgbaso ụzọ nke ga-abụ ihe ọdachi ime mmụọ kpam kpam. (Tụlee Jemes 5:19, 20.) Maka ụdị enyemaka ahụ, onye ahụ a na-enyere aka kwesịrị ikwupụta ekele nye Jehova Chineke. Okwu dị iche iche nke ezi ekele maka enyemaka ịhụnanya, ebere, na nghọta nke ndị okenye ahụ ga-ekwesịkwa ekwesị. Mgbe e nwetaghachikwara ahụ ike ime mmụọ n’ụzọ zuru ezu, ndị ahụ nile o metụtara pụrụ ịṅụrị ọṅụ na emewo ka mmadụ guzozie ná mmụọ nke ịdị nwayọọ n’obi.