Nanị Ụzọ Na-eduga ná Ndụ Ebighị Ebi
“Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ.”—JỌN 14:6.
1, 2. Gịnị ka Jisọs ji ụzọ na-eduga ná ndụ ebighị ebi tụnyere, gịnịkwa bụ isi ihe dị n’ihe atụ ya?
N’OZIZI Elu Ugwu ya a ma ama, Jisọs ji ụzọ na-eduga ná ndụ ebighị ebi tụnyere ụzọ mmadụ na-esite n’ọnụ ụzọ ámá abanye. Rịba ama na Jisọs mesiri ya ike na ụzọ a na-eduga ná ndụ adịghị mfe, na-asị: “Sinụ n’ọnụ ụzọ dị warara baa: n’ihi na obosara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mbara ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba n’ịla n’iyi, ọtụtụ ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-esi na ya na-aba. N’ihi na warara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mkpagide ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba ná ndụ [ebighị ebi], ole na ole ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-achọta ya.”—Matiu 7:13, 14.
2 Ị̀ ghọtara isi ihe dị n’ihe atụ a? Ọ́ dịghị ekpughe na e nwere nanị otu ụzọ nke na-eduga ná ndụ nakwa na ọ ga-achọ nlezianya n’aka anyị iji chọta ya na iji zere isi n’ụzọ ahụ na-eduga ná ndụ pụọ? Mgbe ahụzi, gịnị bụ nanị otu ụzọ a na-eduga ná ndụ ebighị ebi?
Ọrụ Jisọs Kraịst
3, 4. (a) Olee otú Bible si gosi ọrụ dị mkpa Jisọs na-arụ ná nzọpụta anyị? (b) Olee mgbe mbụ Chineke kpughere na ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ inweta ndụ ebighị ebi?
3 N’ụzọ doro anya, Jisọs nwere ọrụ dị mkpa n’ihe banyere ụzọ ahụ, dị ka onyeozi ya bụ́ Pita kpọsara: “Nzọpụta adịghịkwa n’onye ọ bụla ọzọ: n’ihi na aha ọzọ dị iche adịghịkwa [ma e wezụga nke Jisọs] n’okpuru eluigwe, nke e nyeworo n’etiti mmadụ, nke a na-aghaghị ịzọpụta anyị n’ime ya.” (Ọrụ 4:12) N’otu aka ahụ, Pọl onyeozi kwuru, sị: “Onyinye amara nke Chineke bụ ndụ ebighị ebi n’ime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 6:23) Jisọs n’onwe ya kpughere na nanị ụzọ na-eduga ná ndụ ebighị ebi bụ site na ya, n’ihi na o kwuru, sị: “Mụ onwe bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ.”—Jọn 14:6.
4 Ya mere, ọ dị oké mkpa na anyị matara ọrụ Jisọs nwere n’ime ka ndụ ebighị ebi kwe omume. N’ihi ya, ka anyị nyochaa ọrụ ya n’ụzọ chiri anya karị. Ị̀ maara, ka Adam na Iv mehiesịrị, mgbe Jehova Chineke mere ka a mata na ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ ịdị ndụ ebighị ebi? Ọ bụ ozugbo Adam mehiesịrị. Ugbu a ka anyị nyochaa otú e si buo amụma na nke mbụ ya banyere onyinye e nyere Jisọs Kraịst dị ka Onye Nzọpụta nke ihe a kpọrọ mmadụ.
Mkpụrụ ahụ E Kwere ná Nkwa
5. Olee otú anyị pụrụ isi mata agwọ ahụ rafuru Iv?
5 Jehova Chineke ji asụsụ ihe atụ mee ka a mata onye bụ́ Onye Nzọpụta ahụ e kwere ná nkwa. O mere nke a mgbe ọ mara “agwọ” ahụ ikpe bụ́ onye gwara Iv okwu ma nwaa ya inupụrụ Chineke isi site n’iri mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu. (Jenesis 3:1-5) N’ezie, agwọ ahụ abụghị agwọ nkịtị. Ọ bụ mmụọ e kere eke dị ike, onye a kọwara n’ime Bible dị ka “agwọ ochie ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan.” (Mkpughe 12:9) Setan ji anụmanụ nkịtị a mere ọnụ na-ekwuru ya iji rafuo Iv. N’ihi ya, n’ịma Setan ikpe, Chineke sịrị ya: “Iro ka M ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya: mkpụrụ [nwanyị] ahụ ga-echifịa gị n’isi, gị onwe gị ga-echifịakwa ya n’ikiri ụkwụ.”—Jenesis 3:15.
6, 7. (a) Ònye bụ nwanyị ahụ mụpụtara “mkpụrụ” ahụ? (b) Ònye bụ Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa, gịnịkwa ka ọ na-arụzu?
6 Ònye bụ “nwanyị” a Setan na-ebuso iro, ma ọ bụ kpọọ asị? Dị nnọọ ka a kọwara “agwọ ochie ahụ” ná Mkpughe isi nke 12, otú a kwa ka a kọwara nwanyị ahụ Setan kpọrọ asị. Rịba ama na e kwuru n’amaokwu nke 1 na ‘e yikwasịrị ya anyanwụ, na-eguzo n’elu ọnwa, kpakpando iri na abụọ dịkwa n’isi ya.’ Nwanyị a na-anọchite anya nzukọ eluigwe nke Chineke nke ndị mmụọ ozi na-ekwesị ntụkwasị obi, “nwa nwoke” ahụ ọ mụpụtara na-anọchitekwa anya Alaeze Chineke, nke Jisọs Kraịst na-achị dị ka Eze.—Mkpughe 12:1-5, The Jerusalem Bible.
7 Ònyezi bụ “mkpụrụ,” ma ọ bụ nwa, nke nwanyị ahụ e hotara na Jenesis 3:15, nke ga-echifịa Setan “n’isi,” si otú a na-eti ya ihe otiti ga-egbu ya? Ọ bụ onye ahụ Chineke zitere site n’eluigwe ka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke mụọ ya n’ụzọ ọrụ ebube, ee, nwoke ahụ bụ́ Jisọs. (Matiu 1:18-23; Jọn 6:38) Isi nke 12 nke Mkpughe na-ekpughe na dị ka Onye Ọchịchị eluigwe e si n’ọnwụ kpọlite, Mkpụrụ a, bụ́ Jisọs Kraịst, ga-ebute ụzọ n’imeri Setan, ọ ga-eguzobekwa, dị ka Mkpughe 12:10 na-ekwu, “alaeze Chineke anyị, na ịchịisi nke Kraịst Ya.”
8. (a) Olee ihe ọhụrụ Chineke nyere n’ihe banyere nzube ya mbụ? (b) Olee ndị mejupụtara ọchịchị ọhụrụ nke Chineke?
8 Alaeze a nke dị n’aka Jisọs Kraịst si otú a bụrụ ihe ọhụrụ Chineke nyere n’ihe banyere nzube ya mbụ ka ụmụ mmadụ wee bie ndụ ebighị ebi n’elu ala. Mgbe Setan nupụsịrị isi, Jehova mere ihe ozugbo iji mezie ihe ọjọọ nile ajọ omume kpatara site n’ọchịchị Alaeze ọhụrụ a. Mgbe ọ nọ n’elu ala, Jisọs kpughere na ya agaghị anọ nanị ya n’ọchịchị a. (Luk 22:28-30) A ga-ahọta ndị ọzọ site n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ, ndị a ga-esonyekwara ya n’eluigwe iji soro chịa, n’ụzọ dị otú a kwa ha ga-abịa mejupụta akụkụ nke abụọ nke mkpụrụ nwanyị ahụ. (Ndị Galetia 3:16, 29) N’ime Bible e kwuru na ọnụ ọgụgụ nke ndị a ga-eso Jisọs chịa—ndị e sicha n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ na-eme mmehie nọ n’elu ala were—bụ 144,000.—Mkpughe 14:1-3.
9. (a) Gịnị mere o ji dị mkpa ka Jisọs bịa n’ụwa dị ka mmadụ? (b) Olee otú Jisọs si mebie ọrụ nile nke Ekwensu?
9 Otú ọ dị, tupu Alaeze ahụ enwee ike ịmalite ịchị, ọ dị mkpa na akụkụ bụ́ isi nke mkpụrụ ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, bịara n’ụwa. N’ihi gịnị? N’ihi na Jehova Chineke ahọpụtawo ya ịbụ Onye ‘ga-ala [ma ọ bụ, ga-emebi] ọrụ nile nke ekwensu n’iyi.’ (1 Jọn 3:8) Ọrụ nile nke Setan gụnyere nrabanye ọ rabanyere Adam ime mmehie, bụ́ nke wetaara ụmụ Adam nile amamikpe mmehie na ọnwụ. (Ndị Rom 5:12) Jisọs mebiri ọrụ a nke Ekwensu site n’inye ndụ Ya dị ka ihe mgbapụta. N’ụzọ dị otú a o nyere ihe ndabere maka ntọhapụ nke ihe a kpọrọ mmadụ pụọ n’amamikpe mmehie na ọnwụ ma meghee ụzọ na-eduga ná ndụ ebighị ebi.—Matiu 20:28; Ndị Rom 3:24; Ndị Efesọs 1:7.
Ihe Ihe Mgbapụta ahụ Na-arụzu
10. Olee otú Jisọs na Adam si yie?
10 Ebe e si n’eluigwe bufee ndụ Jisọs n’akpa nwa nwanyị, a mụrụ ya dị ka mmadụ zuru okè, nke na-eketaghị mmehie sitere n’aka Adam. O nwere ikike ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’elu ala. N’otu aka ahụ, e kere Adam dị ka mmadụ zuru okè nke nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala. Pọl onyeozi bu myirịta dị n’etiti ndị ikom abụọ a n’uche mgbe o dere, sị: “Mmadụ mbụ, bụ́ Adam, ghọrọ mkpụrụ obi dị ndụ. Adam ikpeazụ [Jisọs Kraịst] ghọrọ mmụọ nke na-enye ndụ. Mmadụ mbụ sitere n’ala, e jikwara ájá kpụọ ya: Mmadụ nke abụọ sitere n’eluigwe.”—1 Ndị Kọrint 15:45, 47.
11. (a) Mmetụta dị aṅaa ka Adam na Jisọs nwere n’ahụ ihe a kpọrọ mmadụ? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi were àjà Jisọs?
11 E mesiri myirịta dị n’etiti mmadụ abụọ a—nanị ndị ikom abụọ zuru okè dịworo ndụ n’elu ala—ike n’okwukwu Bible kwuru na Jisọs “nyere Onwe ya ka Ọ bụrụ ihe mgbapụta [kwekọrọ ekwekọ, NW] n’ihi mmadụ nile.” (1 Timoti 2:6) Ònye ka ya na Jisọs kwekọrọ? Ọ bụnụ Adam mgbe ọ ka bụ mmadụ zuru okè! Mmehie nke Adam mbụ wetaara ezinụlọ dum nke mmadụ amamikpe ọnwụ. Àjà nke “Adam ikpeazụ” nyere ihe ndabere maka nnapụta pụọ ná mmehie na ọnwụ, ka anyị wee nwee ike ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Lee ka àjà Jisọs si dị oké ọnụ ahịa! Pita onyeozi kwuru, sị: “E jighị ihe a pụrụ imebi, bụ́ ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo, gbapụta unu.” Kama nke ahụ, ka Pita kọwara: “E ji ọbara dị oké ọnụ ahịa, dị ka nke nwa atụrụ nke [ọrụsị] ma ọ bụ ntụpọ na-adịghị ya n’ahụ, bụ́ ọbara nke Kraịst.”—1 Pita 1:18, 19.
12. Olee otú Bible si akọwa nkagbu a kagburu amamikpe ọnwụ a mara anyị?
12 Bible na-akọwa n’ụzọ mara mma ụzọ a ga-esi kagbuo amamikpe ọnwụ nke ezinụlọ mmadụ, na-asị: “Ikpe ahụ sitere n’otu ndahie [nke Adam] bịaruo mmadụ nile iwetara ha amamikpe; ọbụna otú a ka onyinye amara ahụ sitere n’otu ọrụ ezi omume [ụzọ ndụ Jisọs nile nke iguzosi ike n’ezi ihe nke bịaruru n’ọnwụ ya] bịaruo mmadụ nile ịgụ ha ná ndị ezi omume ka ha nata ndụ. N’ihi na dị ka e doro ọha mmadụ ná ndị mmehie site n’aṅaghị ntị nke otu mmadụ ahụ [Adam], ọbụna otú a ka a ga-edo ọha mmadụ ná ndị ezi omume site n’ịṅa ntị nke otu Onye ahụ [Jisọs].”—Ndị Rom 5:18, 19.
Olileanya Dị Ebube
13. Gịnị mere ọtụtụ ndị ji na-enwe echiche ha nwere banyere ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi?
13 Ndokwa a Chineke mere kwesịrị ime ka obi dị anyị ụtọ nke ukwuu! Obi ọ́ dịghị gị ụtọ na e nyewo Onye Nzọpụta? Mgbe a jụrụ n’otu nnyocha nke otu akwụkwọ akụkọ dị n’otu obodo ukwu America duziri n’otu oge, sị, “Ì nwere mmasị n’olileanya nke ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi?” n’ụzọ na-eju anya, pasent 67.4 nke ndị zara ya sịrị, “Ee e.” Gịnị mere ha ji sị na ha achọghị ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi? Dị ka ihe àmà gosiri, ọ bụ n’ihi na ndụ a na-adị n’elu ala jupụtara ugbu a n’ọtụtụ nsogbu. Otu onye sịrị: “Achọghị m iche n’echiche otú m ga-adị ma m dị afọ 200.”
14. N’ihi gịnị ka ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi ga-eji bụrụ ihe obi ụtọ zuru ezu?
14 Ma, Bible adịghị ekwu banyere ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ime ụwa ebe ndị mmadụ na-arịa ọrịa, na-aka nká, na-enwekwa ọdachi ndị ọzọ. Ee e, n’ihi na dị ka Onye Ọchịchị nke Alaeze Chineke, Jisọs ga-ewepụ nsogbu nile dị otú ahụ Setan kpatara. Dị ka Bible si kwuo, Alaeze Chineke ‘ga-etipịa ma wepụsịa’ ọchịchị mmegbu nile dị n’ụwa a. (Daniel 2:44) N’oge ahụ, n’ịza ekpere ahụ Jisọs kụziere ndị na-eso ụzọ ya, a ga-eme “uche” Chineke “n’ụwa dị ka e si eme ya n’eluigwe.” (Matiu 6:9, 10, Today’s English Version) N’ime ụwa ọhụrụ Chineke, mgbe e kpochapụsịworo ihe ọjọọ nile n’ụwa, a ga-eji uru nke ihe mgbapụta Jisọs mee ihe n’ụzọ zuru ezu. Ee, ndị nile ruru eru ga-enweghachi ahụ ike zuru okè!
15, 16. Ọnọdụ dịgasị aṅaa ga-adị n’ụwa ọhụrụ Chineke?
15 Nye ndị na-ebi n’ime ụwa ọhụrụ Chineke, akụkụ Bible a ga-emezu: “Anụ ahụ ya ga-adị ọhụrụ karịa nke nwata; ọ na-alaghachiru ụbọchị okorobịa ya.” (Job 33:25) Nkwa ọzọ nke Bible ga-emezukwa: “A ga-emeghe anya ndị ìsì, ọ bụkwa ntị nke ndị ntị chiri ka a ga-emeghe. Mgbe ahụ ka onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.”—Aịsaịa 35:5, 6.
16 Chee nnọọ echiche: N’agbanyeghị afọ ole anyị dị mgbe ahụ, ma anyị dị afọ 80, 800, ma ọ bụ ọbụna karịa, ahụ anyị ga-anọgide na-enwe ahụ ike bụ́ ịgba. Ọ ga-adị dị ka Bible na-ekwe ná nkwa: “Onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” Mgbe ahụ a ga-emezukwa nkwa a: “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Aịsaịa 33:24; Mkpughe 21:3, 4.
17. Ihe dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ ịtụ anya na ndị mmadụ ga-emezu n’ime ụwa ọhụrụ Chineke?
17 N’ime ụwa ọhụrụ ahụ, anyị ga-enwe ike iji ụbụrụ anyị dị ebube mee ihe n’ụzọ Onye Okike anyị zubere ka e jiri ya mee ihe mgbe o kere ya inwe ikike a na-akparaghị ókè ịmụta ihe. Cheedị nnọọ ihe ndị dị ịtụnanya anyị pụrụ ịrụzu! Ọbụna ụmụ mmadụ na-ezughị okè esiwo n’ụbara ihe dị n’ụwa mepụta ihe nile anyị na-ahụ gburugburu anyị—fon na-enweghị eriri, ígwè okwu, elekere mgbanaka, ígwè ozi pager, kọmputa, ụgbọelu, ee, ihe ọ sọrọ ya bụrụ. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha e mere site n’ihe ndị ha si n’ebe dị anya na mbara ụwa weta. N’ịbụ ndị ndụ na-enweghị ngwụsị nọ na-echere, ikike iji nkà mepụta ihe n’ime Paradaịs elu ala ahụ na-abịanụ ga-abụ nke a na-akparaghị ókè!—Aịsaịa 65:21-25.
18. N’ihi gịnị ka ndụ na-agaghị eji agwụ ike ma ọlị n’ime ụwa ọhụrụ Chineke?
18 Ndụ agaghịkwa na-agwụ ike. Ọbụna ugbu a anyị na-adị na-atụ anya nri ọzọ, ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na anyị eriwo nri ọtụtụ iri puku ugboro. N’izu okè mmadụ, anyị ga-anụ ụtọ nke ihe ubi na-atọ ụtọ nke ụwa Paradaịs ahụ ruo n’ókè ka ukwuu. (Aịsaịa 25:6) Anyị ga-enwekwa obi ụtọ ebighị ebi nke ilekọta ụbara anụmanụ dị n’ụwa na ikiri ọdịda anyanwụ, ugwu, osimiri, na ndagwurugwu ya ndị dị ebube. N’ezie, ndụ enweghị mgbe ọ ga-agbụ agbụ n’ime ụwa ọhụrụ Chineke!—Abụ Ọma 145:16.
Imezu Ihe Ndị Chineke Chọrọ
19. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ezi uche dị na ya ikweta na e nwere ihe ndị a chọrọ iji nweta onyinye Chineke bụ́ ndụ?
19 Ị̀ ga-atụ anya inweta onyinye dị ebube nke Chineke bụ́ ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs n’emeghị mgbalị ọ bụla? Ọ́ bụghị ihe ezi uche dị na ya na Chineke ga-achọ ihe ụfọdụ? N’ezie ọ bụ. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, Chineke adịghị nnọọ atụpụrụ anyị onyinye ahụ. Ọ na-enye ya anyị, ma anyị aghaghị ịmatị aka were ya. Ee, ọ chọrọ mgbalị. Ị pụrụ ịjụ otu ajụjụ ahụ nwa okorobịa ahụ bụ́ onye ọchịchị bara ọgaranya jụrụ Jisọs: “Ọ̀ bụ ezi ihe gịnị ka m ga-eme, ka m wee nwee ndụ ebighị ebi?” Ma ọ bụ ị pụrụ ịjụ ajụjụ ahụ otú onye nche ụlọ mkpọrọ bụ́ onye Filipaị si jụọ ya Pọl onyeozi: “Gịnị dị mkpa ka m mee ka e wee zọpụta m?”—Matiu 19:16; Ọrụ 16:30.
20. Gịnị bụ ihe dị mkpa a chọrọ maka ndụ ebighị ebi?
20 N’abalị ahụ tupu ọ nwụọ, Jisọs gosiri otu ihe bụ́ isi a chọrọ mgbe ọ gwara Nna ya nke eluigwe n’ekpere, sị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ọ́ bụghị ihe a chọrọ nke ezi uche dị na ya na anyị ga-amara Jehova, bụ́ onye mere ka ndụ ebighị ebi kwe omume, marakwa onye ahụ nwụrụ maka anyị, bụ́ Jisọs Kraịst? Ma, a chọrọ ihe karịrị nanị ịmara ha.
21. Olee otú anyị si egosi na anyị na-emezu ihe a chọrọ n’igosi okwukwe?
21 Bible na-ekwukwa, sị: “Onye kwere n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi.” O kwukwasịziri: “Onye na-ekwenyeghị Ọkpara ahụ agaghị ahụ ndụ, kama iwe Chineke na-anọgide n’ahụ ya.” (Jọn 3:36) Ị pụrụ igosi na i kwere n’Ọkpara ahụ site n’ime mgbanwe ná ndụ gị ma mee ka o kwekọọ n’uche Chineke. Ị ghaghị ịjụ ụzọ ọjọọ ọ bụla ị pụrụ ịdị na-agbasobu ma mee ihe iji mee ihe dị Chineke ụtọ. Ọ dị gị mkpa ime ihe Pita onyeozi nyere n’iwu: “Ya mere chegharịanụ, chigharịakwanụ, ka e wee hichapụ mmehie nile unu, ka oge inwe ume ndụ wee si n’ihu Onyenwe anyị bịa otú a.”—Ọrụ 3:19.
22. Olee ihe ndị a ga-eme so n’ịgbaso ijeụkwụ Jisọs?
22 Ka anyị ghara ichefu mgbe ọ bụla na ọ bụ nanị site n’inwe okwukwe na Jisọs ka anyị pụrụ inwe ndụ ebighị ebi. (Jọn 6:40; 14:6) Anyị na-egosi na anyị nwere okwukwe na Jisọs site ‘n’iso ijeụkwụ Ya nile.’ (1 Pita 2:21) Gịnị ka ime nke ahụ gụnyere? N’ekpere o kpegaara Chineke, Jisọs tiri, sị: ‘Lee, abịawo m ime ihe Ị na-achọ Chineke.’ (Ndị Hibru 10:7) Ọ dị mkpa iṅomi Jisọs n’ikweta ime uche Chineke na ịrara ndụ gị nye Jehova. E mesịa ọ dị gị mkpa igosipụta nraranye ahụ site na baptism ime mmiri; Jisọs nyekwara onwe ya ka e mee ya baptism. (Luk 3:21, 22) Ime ihe ndị dị otú ahụ bụ ihe ezi uche dị na ha n’echiche nile. Pọl onyeozi kwuru na “ịhụnanya Kraịst [na-arụgide] anyị.” (2 Ndị Kọrint 5:14, 15) N’ụzọ dị aṅaa? Ịhụnanya kpaliri Jisọs inye ndụ ya n’ihi anyị. Nke ahụ ó kwesịghị ịkpali anyị ịṅa ntị site n’inwe okwukwe na ya? Ee, o kwesịrị ịkpali anyị ịgbaso ihe nlereanya ịhụnanya ya nke iwepụta onwe ya iji nyere ndị ọzọ aka. Kraịst dịrị ndụ maka ime uche Chineke; anyị aghaghịkwa ime otú ahụ, kwụsị ịdịrị onwe anyị ndụ.
23. (a) Na gịnị ka a na-aghaghị ịtụkwasị ndị ga-enweta ndụ? (b) Gịnị ka a chọrọ n’aka ndị nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst?
23 Nke ahụ abụghị ebe okwu ahụ biri. Bible na-ekwu na mgbe e mere mmadụ 3,000 baptism na Pentikọst 33 O.A., a “tụkwasịrị ha.” A tụkwasịrị ha na gịnị? “Ha wee na-anọgidesi ike n’ozizi ndị ozi na nnwekọ,” ka Luk na-akọwa. (Ọrụ 2:41, 42) Ee, ha zukọtara ọnụ maka ọmụmụ Bible na mkpakọrịta wee si otú a bụrụ ndị a tụkwasịrị na, ma ọ bụ ghọọ akụkụ nke ọgbakọ ndị Kraịst. Ndị Kraịst oge mbụ gachiri nzukọ anya maka ntụziaka ime mmụọ. (Ndị Hibru 10:25) Ndịàmà Jehova taa na-emekwa nke a, ọ ga-amasịkwa ha ịgba gị ume iso ha gaa nzukọ ndị a.
24. Gịnị bụ “ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie,” n’ụzọ dị aṅaa, ọ bụkwa olee mgbe ka a ga-enweta ya?
24 Ọtụtụ nde na-eje ije ugbu a n’ụzọ ahụ dị mkpagide nke na-eduga ná ndụ. Ịnọgide n’ụzọ a dị mkpagide chọrọ ezigbo mgbalị! (Matiu 7:13, 14) Pọl gosiri nke a n’arịrịọ ya na-ekpo ọkụ: “Na-agbasi mgba ọma nke okwukwe ike, jide ndụ ebighị ebi aka, nke a kpọrọ gị ka ị nata ya.” Ịgbasi mgba a ike dị mkpa iji “jide ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie.” (1 Timoti 6:12, 19) Ndụ ahụ abụghị ndụ nke a jupụtara n’ihe mgbu na ahụhụ nke mmehie Adam wetaara anyị. Kama nke ahụ, ọ bụ ndụ n’ime ụwa ọhụrụ Chineke, bụ́ nke a ga-enweta n’isi nso mgbe e ji àjà mgbapụta Kraịst mee ihe maka ndị nile hụrụ Jehova Chineke na Ọkpara ya n’anya mgbe e wepụsịrị usoro ihe a. Ka anyị nile họrọ ndụ—“ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie”—ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ dị ebube nke Chineke.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
◻ Ònye bụ agwọ ahụ, nwanyị ahụ, na mkpụrụ ahụ dị na Jenesis 3:15?
◻ Olee otú Jisọs si kwekọọ n’Adam, gịnịkwa ka ihe mgbapụta ahụ mere ka o kwe omume?
◻ Gịnị ka ị pụrụ ịtụ anya ya nke ga-eme ka ụwa ọhụrụ Chineke bụrụ ihe oké obi ụtọ nye gị?
◻ Olee ihe ndị a chọrọ anyị na-aghaghị ime iji dị ndụ n’ime ụwa ọhụrụ Chineke?
[Foto dị na peeji nke 10]
Nye ụmụaka na ndị agadi, nanị Jisọs bụ ụzọ na-eduga ná ndụ
[Foto dị na peeji nke 11]
N’oge nke Chineke, ndị agadi ga-enweghachi ume okorobịa