Oge na Mgbe Ebighị Ebi—Gịnị Ka Anyị Maara n’Ezie Banyere Ha?
“OGE yiri ka ọ bụ otu n’ime ụdị ihe ndị kasị agbagwoju anya mmadụ hụtụworo,” ka otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma na-ekwu. Ee, ịkọwa oge n’okwu ndị dị mfe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe na-ekweghị omume. Anyị pụrụ ikwu na oge “na-aga,” “na-agwụ,” “na-efe ọsọ,” ọbụnakwa na anyị onwe anyị ‘so oge na-aga.’ Ma anyị amaghị n’ezie ihe anyị na-ekwu banyere ya.
A kọwawo oge dị ka “agbata dị n’etiti ihe omume abụọ.” Ma, ahụmahụ anyị na-enwe yiri ka ọ na-agwa anyị na oge adịghị adabere n’ihe omume; o yiri ka ọ na-aga n’ihu ma ọ̀ dị ihe mere ma ọ bụ na ọ dịghị. Otu onye ọkà ihe ọmụma na-azọrọ na oge adịghị adị n’ezie kama na ọ bụ nnọọ ihe e chepụtara echepụta. Ihe ahụ nke ihe dị ukwuu n’ahụmahụ anyị dabeere na ya ọ̀ pụrụ ịbụ nanị ihe anyị chepụtara echepụta?
Echiche Bible Banyere Oge
Bible enyeghị nkọwa ọ bụla banyere oge, na-enye echiche na ma eleghị anya ọ karịrị ikike mmadụ ịghọta ya n’ụzọ zuru ezu. Ọ dị ka mbara igwe na-adịghị agwụ agwụ, bụ́ nke na-esikwara anyị ike ịghọta. Ihe àmà na-egosi na oge bụ otu n’ime ihe ndị ahụ ọ bụ nanị Chineke pụrụ ịghọta ha n’ụzọ zuru ezu, n’ihi na nanị ya dị “site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 90:2.
Ọ bụ ezie na Bible akọwaghị oge, ọ na-ekwu banyere oge dị ka ihe dị adị n’ezie. Iji malitegodi, Bible na-agwa anyị na Chineke kere “ihe nke na-enye ìhè”—anyanwụ, ọnwa, na kpakpando—dị ka ihe ndị na-aka akara oge, iji “bụrụkwa ihe igosi ihe ịrịba ama dị iche iche, na ịgụ mgbe a kara aka, na ịgụ ụbọchị na afọ.” A gbagidesiri ụkwụ ike ná ngafe nke oge wee dekọọ ọtụtụ ihe omume ndị dị n’ime Bible. (Jenesis 1:14; 5:3-32; 7:11, 12; 11:10-32; Ọpụpụ 12:40, 41) Bible na-ekwukwa banyere oge dị ka ihe anyị kwesịrị iji mee ihe n’ụzọ amamihe dị na ya iji bụrụ ndị ga-enweta ngọzi Chineke nke oge na-adịghị agwụ agwụ—atụmanya nke ịdị ndụ ebighị ebi.—Ndị Efesọs 5:15, 16.
Ndụ Ebighị Ebi—Ọ̀ Bụ Ihe Ezi Uche Dị na Ya?
Ọ bụ ezie na ịgbalị ịghọta ihe oge bụ n’ezie na-akpata obi nkoropụ, nye ọtụtụ ndị, echiche nke ndụ ebighị ebi bụ ihe kasị agbagwoju anya. Otu ihe kpatara nke a pụrụ ịbụ na ahụmahụ anyị nwere banyere oge abụkarịwo nke e jikọtara ya na usoro nke ọmụmụ, uto, ịka nkà, na ọnwụ. N’ihi ya, anyị ejiriwo usoro ịka nkà n’onwe ya mara ngafe nke oge. Nye ọtụtụ ndị, iche echiche n’ụzọ ọzọ ga-eyi imebi ihe oge n’onwe ya pụtara. ‘N’ihi gịnị ka ụmụ mmadụ ga-eji dị iche ná nke ahụ karịa ihe ndị ọzọ e kere eke?’ ka ha pụrụ ịjụ.
Ihe a na-elegharakarị anya n’ụzọ iche echiche a bụ eziokwu ahụ bụ́ na ụmụ mmadụ adịworị iche n’ebe ihe ndị ọzọ e kere eke nọ n’ọtụtụ ụzọ. Dị ka ihe atụ, ụmụ anụmanụ enweghị ọgụgụ isi nke ụmụ mmadụ nwere. N’agbanyeghị nzọrọ dị iche ndị a na-eme, ha adịghị emepụta ihe karịa ihe amamihe ebumpụta ụwa ha dugara ha ime. E nyeghị ha onyinye ime nkà, ha enweghịkwa ikike igosi ịhụnanya na ekele bụ́ nke ụmụ mmadụ nwere. Ọ bụrụ na e nyewo ụmụ mmadụ ihe dị nnọọ ukwuu n’àgwà na ikike ndị a nke mere ka ndụ nwee nzube, gịnị mere o jighị kwe omume ka ha bụrụ ndị e nyekwuru oge ma a bịa ná ndụ n’onwe ya?
N’aka nke ọzọ, ọ́ bụghị ihe dị ịtụnanya na osisi, bụ́ nke na-apụghị iche echiche, na-adịru ọtụtụ puku afọ mgbe ụfọdụ, ebe ụmụ mmadụ maara ihe pụrụ ịdị ndụ nanị ná nkezi nke afọ 70 ruo 80? Ọ́ bụghị eziokwu yiri ụgha na mbe, bụ́ nke na-enweghị ikike ime nkà, pụrụ ịdịru ndụ ihe karịrị afọ 200, ebe ụmụ mmadụ, bụ́ ndị e nyere ikike ndị a n’ụba, na-adị ndụ ihe dị nnọọ ala karịa ọkara nke oge ahụ?
Ọ bụ ezie na mmadụ apụghị ịghọtazu oge na mgbe ebighị ebi, nkwa banyere ndụ ebighị ebi ka bụ olileanya gbadosiri ụkwụ ike na Bible. N’ime ya, okwu ahụ bụ́ “ndụ ebighị ebi” pụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ugboro 40. Ma ọ bụrụ na nzube Chineke bụ na ụmụ mmadụ ga-adị ndụ ebighị ebi, n’ihi gịnị ka ọ na-ejibeghị mezuorị? A ga-atụle ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.