N’ihi Gịnị Ka E Ji Nwee Oge Dị Nnọọ Nta?
OGE. Ọ pụrụ isiri anyị ike ịkọwa kpọmkwem ihe okwu ahụ pụtara, ma anyị maara n’ezie na ọ dịghị mgbe ọ na-eyi ka oge ọ na-ezuru anyị. Anyị makwaara na ọ na-agafe ngwa ngwa. N’ezie, anyị na-amakarị ọsụ, sị, “Oge na-efe nnọọ ọsọ.”
Otú o sina dị, o doro anya na ihe onye England na-ede uri bụ́ Austin Dobson kwuru bụtụ eziokwu mgbe o kwuru na 1877, sị: “Ị̀ na-asị na oge na-aga? Mbanụ! Ewo, Oge anaghị aga, ọ bụ anyị na-aga.” Kemgbe ọ nwụrụ na 1921, Dobson agaalarị eri ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 80; oge ka nọgidekwara.
Oge Bara Ụba
Bible na-agwa anyị banyere Onye Okike nke ihe a kpọrọ mmadụ, sị: “Tupu a mụpụta ugwu, ma ọ bụ tupu Ị kpụọ ụwa na elu ụwa dum mmadụ bi, ọbụna site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi, Gị onwe gị bụ Chineke.” (Abụ Ọma 90:2) Ya mere oge ga-adịru mgbe Chineke n’onwe ya ga-adịru—ebighị ebi!
N’ụzọ dị nnọọ iche n’ebe Chineke nọ, bụ́ onye nwere ikike ịdịru ebighị ebi, anyị na-agụ banyere ụmụ mmadụ, sị: “N’ihi na ụbọchị anyị nile agawo n’ime nrubiga ókè nke iwe Gị: anyị emewo ka afọ nile anyị gwụsịa dị ka otu nze ume. Ụbọchị afọ nile anyị dị [iri afọ asaa]; ma ọ bụrụ na ha esite n’ịdị ike anyị ruo [iri afọ asatọ], otú ọ dị, nganga ha bụ nanị ịdọgbu onwe ha n’ọrụ na ajọ ihe; n’ihi na ọ gbapụwo ọsọ ọsọ, anyị wee felaa dị ka nnụnụ.”—Abụ Ọma 90:9, 10.
N’ihi gịnị ka ndụ ji dị nnọọ mkpirikpi taa, ebe Bible na-akụzi n’ụzọ doro anya na nzube Chineke bụ ka mmadụ dị ndụ ebighị ebi? (Jenesis 1:27, 28; Abụ Ọma 37:29) Kama ịdị ndụ na-enweghị ọgwụgwụ dị ka Chineke zubere, n’ihi gịnị ka ụmụ mmadụ ji adị, ná nkezi, ihe na-erughị ụbọchị 30,000, n’okpuru ọnọdụ ndị kasị mma? N’ihi gịnị ka ụmụ mmadụ ji nwee oge dị nnọọ nta? Ònye ma ọ bụ gịnị kpatara ọnọdụ a dị mwute? Bible na-enye azịza ndị doro anya ma na-eju afọ.a
Oge Na-adịwanye Mkpirikpi
Ndị meworo okenye ga-agba akaebe na e nweela ndụ ezughị ike karị n’ime iri afọ ndị na-adịbeghị anya. Otu odeakụkọ, bụ́ Dr. Sybille Fritsch, kọwapụtara na oge e ji arụ ọrụ n’izu esila n’awa 80 gbadata ruo awa 38 n’ime afọ 200 gara aga, “ma nke a emebeghị ka anyị kwụsị ime mkpesa.” O mere ka o doo anya, sị: “Oge adịghị; oge bụ ego; ịchọ oge dị nnọọ ka ikwo ume; ndụ gbalụ gbalụ.”
Ihe ọhụrụ ndị e mepụtara emewo ka e nwee ohere ọgbọ ndị bu ụzọ na-echetụdịghị n’echiche ma ọlị. Ma ka ohere e nwere ịrụ ọtụtụ ọrụ na-adị ukwuu karị, otú ahụ ka obi nkoropụ a na-enwe n’ihi inwe oge dị nnọọ nta iji rụọ ha na-adị ukwuu karị. N’ụbọchị ndị a, n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa, ndị mmadụ enweghị ohere ọ bụla, a rụpụ otu ihe a banye n’ọzọ ngwa ngwa. Papa aghaghị ịga ọrụ n’elekere anya 7:00 nke ụtụtụ, Mama aghaghị ịkpọga ụmụaka ụlọ akwụkwọ n’elekere anya 8:30 nke ụtụtụ, Papa Ukwu na dọkịta yiri agba n’elekere anya 9:40 nke ụtụtụ, anyị nile aghaghịkwa ijikere maka otu nzukọ dị mkpa n’elekere anya 7:30 nke anyasị. Ka a na-arụpụ otu ihe ma jiri ọsọ banye n’ọzọ, ọ na-afọ nnọọ nke nta ka oge ghara ịfọdụ maka ezumike ọ bụla. Anyị na-emekwa mkpesa banyere ọrụ na-agwụ ike anyị na-arụ kwa ụbọchị, banyere ihe nchụso ndị na-agwụ ike.
Ọ Bụghị Nanị Anyị Nwere Oge Dị Nta
Onye Iro Chineke, bụ́ Setan Ekwensu, onye atụmatụ ya dugara n’igbubilata afọ ndụ nke ihe a kpọrọ mmadụ, aghọziela onye mmebi iwu ya na-akpa aka ọjọọ. (Tụlee Ndị Galetia 6:7, 8.) N’ikwu banyere ọmụmụ nke Alaeze Mesaịa n’eluigwe, Mkpughe 12:12 na-enye anyị ihe mere anyị ga-eji enwe olileanya mgbe ọ na-asị: “N’ihi nke a, ka obi na-atọ unu ụtọ, unu eluigwe nile, na unu ndị bi n’ime ha. Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri: n’ihi na ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.”—Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.
Dị ka usoro ngụkọ oge Bible a pụrụ ịdabere na ya, tinyere mmezu amụma Bible si dị, anyị na-ebi ugbu a n’ọgwụgwụ nke “nwa oge” ahụ. Lee ihe ọṅụ ọ bụ ịmara na oge Setan n’ozuzu ya gaje ịgwụchapụ n’oge na-adịghị anya! Ozugbo e wezụgara ya n’ụsọ, a ga-eweghachi ụmụ mmadụ na-erube isi n’izu okè, ha pụkwara inweta ndụ ebighị ebi ahụ Jehova zubere maka ha ná mmalite. (Mkpughe 21:1-4) Nsogbu nke enweghị oge agaghịzi adị.
Ị̀ pụrụ ichetụ n’echiche ihe inwe ndụ ebighị ebi—ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi—ga-apụta? Ọ dịghị mgbe ị ga-enwe nchegbu ọzọ banyere ihe ndị ị na-aghaghị ịhapụ ime. Ọ bụrụ na ị chọkwuru oge, echi, ma ọ bụ izu ọzọ, ma ọ bụ afọ ọzọ, dị—n’ezie, mgbe ebighị ebi nke na-agbatịpụ n’ihu gị!
Iji Amamihe Na-eji Oge Anyị Nwere Ugbu A Eme Ihe
N’ịghọta na oge o nwere iji kpaa ike n’ahụ ụmụ mmadụ dị mkpirikpi, Setan na-agbalị ime ka ndị mmadụ jiri nnọọ ọrụ n’aka nke na ha adịghị enwe oge iji gee ntị n’ozi ọma nke Alaeze Chineke e guzobeworo. N’ihi ya, anyị ga-eme nke ọma ịṅa ntị na ndụmọdụ Chineke, bụ́: “Lezienụ anya nke ọma otú unu na-ejegharị, ọ dịghị ka ndị na-amaghị ihe, kama dị ka ndị maara ihe; na-azụchapụrụ onwe unu oge a nile, n’ihi na ụbọchị ndị a jọrọ njọ. N’ihi nke a unu aghọla ndị na-enweghị uche, kama ghọtanụ ihe bụ ihe Onyenwe anyị na-achọ.”—Ndị Efesọs 5:15-17.
Lee ka o si dị mkpa ka anyị jiri amamihe na-eji oge anyị eme ihe ndị kasị mkpa kama ịla ya n’iyi ná nchụso ndị na-enweghị isi bụ́ ndị na-adịghị eweta abamuru na-adịgide adịgide! Anyị kwesịrị ịzụlite otu ụdị àgwà ahụ Mosis nwere mgbe o ji okwu ndị a sitere n’ezi obi rịọ Jehova arịrịọ: “Si otú a mee ka anyị mara ịgụta ụbọchị anyị, ka anyị wee mee ka obi amamihe bịa.”—Abụ Ọma 90:12.
N’eziokwu, n’ụwa taa onye ọ bụla ji ọrụ n’aka. Otú o sina dị, Ndịàmà Jehova na-agbasi gị ume ike iji ụfọdụ n’ime oge gị ndị dị oké ọnụ ahịa mụta ihe Chineke na-achọ n’aka gị iji nweta ndụ ebighị ebi n’okpuru ịchịisi Alaeze ya. Otu awa i tinyere n’ịmụchi Bible anya kwa izu, ‘na-aghọta ihe bụ́ ihe Onyenwe anyị na-achọ,’ pụrụ ime ka ị hụ mmezu nke okwu ndị a n’onwe gị: “Si n’ihe ọjọọ wezụga onwe gị, mee ezi ihe; birikwa ruo mgbe ebighị ebi. Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:27, 29.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Lee akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, isiakwụkwọ nke 6, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.