Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 9/15 p. 16-21
  • Jehova Ọ̀ Na-achọ Ihe Gabigara Ókè n’Aka Anyị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Ọ̀ Na-achọ Ihe Gabigara Ókè n’Aka Anyị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Jehova Chọrọ n’Oge Gara Aga
  • Iwu Jehova Nyere Israel
  • Iwu Jehova Ọ̀ Dị Arọ?
  • Ihe Jehova Na-achọ n’Ezie
  • Ọ Gabigaghị Ókè
  • Nwatakịrị Nwaanyị Nyeere Otu Dike Aka
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • O Nupụrụ Isi ma Mechaa Mee Ihe A Gwara Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Ọ Masịrị Ya Inyere Onye Ọzọ Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Nwa Agbọghọ Nta nke Ji Obi Ike Kwuo Okwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 9/15 p. 16-21

Jehova Ọ̀ Na-achọ Ihe Gabigara Ókè n’Aka Anyị?

“Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị, ma ọ́ bụghị nanị ime ihe e kpere n’ikpe, na ịhụ ebere n’anya, na iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?”—MAỊKA 6:8.

1. Gịnị pụrụ ịbụ ihe mere ụfọdụ ndị na-ejighị ejere Jehova ozi?

JEHOVA na-achọ ihe n’aka ndị ya. Ma mgbe ị gụsịrị okwu ndị dị n’elu nke e hotara site n’amụma Maịka, ị pụrụ ikwubi n’ụzọ ziri ezi na ihe ndị Chineke na-achọ bụ ihe ndị ezi uche dị na ha. Ka o sina dị, ọtụtụ ndị adịghị ejere Onye Okike Ukwu anyị ozi, ụfọdụ ndị jetụwokwaara ya ozi akwụsịwo ime otú ahụ. N’ihi gịnị? N’ihi na ha na-eche na Chineke na-achọ ihe gabigara ókè n’aka anyị. Ọ̀ na-eme otú ahụ? Ka ọ̀ pụrụ ịbụ na e nwere nsogbu n’omume mmadụ n’ebe ihe ndị Jehova na-achọ dị? Akụkọ ihe mere eme na-eme ka a ghọta isiokwu a.

2. Ònye bụ Neaman, gịnịkwa ka onye amụma Jehova gwara ya ka o mee?

2 Ekpenta dakwasịrị onyeisi agha Siria bụ́ Neaman, ma a gwara ya na n’Israel e nwere onye amụma Jehova nke pụrụ ịgwọ ya. Ya mere Neaman na ìgwè ndị ya na ha so mere njem gaa Israel ma mesịa bịarute n’ụlọ onye amụma Chineke bụ́ Elaịsha. Kama isi n’ụlọ ya pụta iji kelee onye ọbịa ya a ma ama, Elaịsha zigara onye ozi ya ka ọ gwa Neaman, sị: “Saa ahụ ugbo asaa n’ime Jọdan, anụ ahụ gị ga-alaghachikwutekwa gị, ị ga-adịkwa ọcha.”—2 Ndị Eze 5:10.

3. N’ihi gịnị ka Neaman ji jụ na mbụ ime ihe Jehova chọrọ ka o mee?

3 Ọ bụrụ na Neaman emee ihe ndị a chọrọ ka o mee bụ́ nke onye amụma Chineke kwupụtara, a ga-agwọ ya ọrịa na-asọ oyi. Ya mere, Jehova ọ̀ na-achọ ihe gabigara ókè n’aka ya? Ọ bụchaghị otú ahụ. Ma, Neaman agajeghị ime ihe Jehova chọrọ ka o mee. “Abana na Fapa, bụ́ osimiri Damaskọs, hà adịghị mma karịa mmiri Israel nile?” ka o kpesara. “Ḿ gaghị asa ahụ n’ime ha, dị ọcha?” Neaman wee chigharịa, lawa n’ọnụma.—2 Ndị Eze 5:12.

4, 5. (a) Gịnị bụ ụgwọ ọrụ a kwụghachiri Neaman maka nrubeisi ya, oleekwa otú o si meghachi omume mgbe o nwetara ya? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle ugbu a?

4 Gịnị n’ezie bụ nsogbu Neaman? Ọ bụghị na ihe a chọrọ n’aka ya siri nnọọ ike omume. Ndị ohu Neaman ji akọ kwuo, sị: “A sị na ọ bụ ihe ukwu [ka] onye amụma gwara gị mee, ị́ gaghị eme ya? ị̀ ga-esikwa aṅaa ghara ime ya mgbe ọ sịrị gị, Saa ahụ, dịkwa ọcha?” (2 Ndị Eze 5:13) Ihe bụ́ nsogbu bụ omume Neaman. O chere na e nyeghị ya ùgwù ruuru ya nakwa na a gwara ya ka o mee ihe o doro anya na o lere anya dị ka ihe na-adịghị irè na nke na-eweda n’ala. Otú ọ dị, Neaman nabatara ndụmọdụ ndị ohu ya ji akọ nye ya ma sụnye onwe ya n’ime Osimiri Jọdan ugboro asaa. Cheedị ụdị ọṅụ o nwere mgbe “anụ ahụ ya [laghachiri] dị ka anụ ahụ nwa okoro nta, o wee dị ọcha”! Ekele jupụtara ya n’obi. Ọzọkwa, Neaman kwupụtara na site na mgbe ahụ gawa, ya agaghị efe chi ọzọ ma ọ bụghị Jehova.—2 Ndị Eze 5:14-17.

5 N’akụkọ ihe mere eme nile nke mmadụ, Jehova agwawo ndị mmadụ ka ha rube isi n’iwu nchịkwa dị iche iche. Anyị na-agba gị ume ịtụle ụfọdụ n’ime ha. Ka ị na-eme otú ahụ, jụọ onwe gị otú ị gaara esiwo meghachi omume ma ọ bụrụ na Jehova chọworo ka i mee ihe ndị dị otú ahụ. E mesịa, anyị ga-atụle ihe Jehova na-achọ n’aka anyị taa.

Ihe Jehova Chọrọ n’Oge Gara Aga

6. Gịnị ka a gwara mmadụ abụọ mbụ ahụ ka ha mee, oleekwa otú ị gaara esi meghachi omume nye ntụziaka ndị dị otú ahụ?

6 Jehova nyere mmadụ abụọ mbụ ahụ, bụ́ Adam na Iv, ntụziaka ịzụ ụmụ, ibuda ụwa n’okpuru onwe ha, na inwe ike n’ahụ ụmụ anụmanụ. E jikwa ebe obibi sara mbara yiri ogige gọzie nwoke ahụ na nwunye ya. (Jenesis 1:27, 28; 2:9-15) Ma e nwere ihe e gbochiri ha ime. Ha agaghị eri mkpụrụ sitere n’otu osisi, otu n’ime ọtụtụ osisi ndị na-amị mkpụrụ dị n’ogige Iden. (Jenesis 2:16, 17) Nke ahụ abụghị ịchọ ihe gabigara ókè, ọ̀ bụ ya? Ị́ gaaraghị enwe ọṅụ ịrụ ọrụ dị otú ahụ, na-enwe atụmanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ahụ ike zuru ezu? N’agbanyeghị na onye ọnwụnwa batara n’ogige ahụ, ị́ gaaraghị ajụ arụmụka ya? Ị́ gaghịkwa ekweta na o ruuru Jehova inye otu ihe mgbochi ahụ dị mfe?—Jenesis 3:1-5.

7. (a) Ọrụ dị aṅaa ka e nyere Noa, mmegide dịkwa aṅaa ka o nwetara? (b) Olee otú i si ele ihe Jehova chọrọ n’aka Noa anya?

7 Mgbe e mesịrị, Jehova gwara Noa ka o wuo ụgbọ dị ka ihe ga-abụ ihe nchebe gabiga iju mmiri zuru ụwa ọnụ. N’ihi ịdị ukwuu nke ụgbọ ahụ, ọrụ ahụ adịghị mfe, a rụkwara ya ma eleghị anya n’etiti ịkwa emo na ibu iro. Ma, lee ihe ùgwù ọ bụụrụ Noa inwe ike ịzọpụta ezinụlọ ya, n’ekwughị banyere ọtụtụ ụmụ anụmanụ a zọpụtakwara! (Jenesis 6:1-8, 14-16; Ndị Hibru 11:7; 2 Pita 2:5) Ọ bụrụ na e nyere gị ọrụ dị otú ahụ, ị̀ gaara arụsiwo ọrụ ike iji rụzuo ya? Ka ị̀ gaara ekwubi na Jehova na-achọ ihe gabigara ókè n’aka gị?

8. Gịnị ka a gwara Abraham ka o mee, gịnịkwa ka e mere ihe atụ ya site ná nrubeisi ya?

8 Chineke gwara Abraham ka o mee ihe tara nnọọ akpụ, na-agwa ya, sị: “Biko, were nwa gị nwoke nke i nwere nanị ya, onye ị hụrụ n’anya, bụ́ Aịsak, jee ala Moraịa; suree ya n’ebe ahụ, ka ọ bụrụ àjà nsure ọkụ.” (Jenesis 22:2) Ebe ọ bụ na Jehova ekwewo nkwa na Aịsak bụ́ onye na-enweghị nwa mgbe ahụ ga-enwe nwa, e lere okwukwe Abraham nwere n’ikike Chineke iweghachi ndụ Aịsak, ule. Mgbe Abraham nwara ịchụ Aịsak n’àjà, Chineke chebere nwa okoro ahụ. Ihe omume a nyere ihe atụ na Chineke ga-eji Ọkpara ya chụọ àjà maka ihe a kpọrọ mmadụ nakwa na ọ ga-emesị kpọlite ya n’ọnwụ.—Jenesis 17:19; 22:9-18; Jọn 3:16; Ọrụ 2:23, 24, 29-32; Ndị Hibru 11:17-19.

9. N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị bụrụ na Jehova nọ na-achọ ihe gabigara ókè n’aka Abraham?

9 Ụfọdụ pụrụ iche na Jehova Chineke nọ na-achọ ihe gabigara ókè n’aka Abraham. Ma ọ̀ nọ na-eme otú ahụ? Ọ̀ bụ enweghị ịhụnanya n’ezie bụ́ Onye Okike anyị, bụ́ onye pụrụ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ, ịgwa anyị ka anyị rubere ya isi ọbụna ma ọ bụrụ na nke a ga-akpatara anyị ịnọ n’ụra ọnwụ nwa oge? Jisọs Kraịst na ụmụazụ ya nke oge mbụ echeghị otú ahụ. Ha dị njikere ịta ahụhụ nke ntirụ ahụ, ọbụna ọnwụ n’onwe ya, iji mee uche Chineke. (Jọn 10:11, 17, 18; Ọrụ 5:40-42; 21:13) Ọ bụrụ na ọnọdụ achọọ ya, ị̀ ga-adị njikere ime otu ihe ahụ? Tụlee ụfọdụ n’ime ihe ndị Jehova chọrọ n’aka ndị kweere ịbụ ndị ya.

Iwu Jehova Nyere Israel

10. Ole ndị kwere nkwa ime ihe nile Jehova chọrọ, gịnịkwa ka o nyere ha?

10 Ụmụ Abraham site na nwa ya nwoke bụ́ Aịsak na nwa nwa ya bụ́ Jekọb, ma ọ bụ Israel, mụbara ghọọ mba Israel. Jehova gbapụtara ụmụ Israel n’ohu n’Ijipt. (Jenesis 32:28; 46:1-3; 2 Samuel 7:23, 24) N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, ha kwere nkwa ime ihe ọ bụla Chineke chọrọ n’aka ha. Ha sịrị: “Ihe nile Jehova kwuru, anyị ga-eme ya.” (Ọpụpụ 19:8) N’ikwekọ n’ọchịchọ ụmụ Israel nke ịbụ ndị ọ na-achị, Jehova nyere mba ahụ ihe karịrị iwu 600, gụnyere Iwu Iri ahụ. Ka oge na-aga, iwu ndị a nke Chineke, bụ́ ndị o nyere site n’aka Mosis, bịara bụrụ ndị a maara nanị dị ka Iwu ahụ.—Ezra 7:6; Luk 10:25-27; Jọn 1:17.

11. Gịnị bụ otu nzube nke Iwu ahụ, oleekwa iwu nchịkwa ndị nyere aka imezu ya?

11 Otu nzube nke Iwu ahụ bụ iji chebe ụmụ Israel site n’inye iwu nchịkwa ndị dị mma ndị na-achịkwa ihe ndị dị ka ụkpụrụ omume mmekọahụ, nzụrịta ahịa, na ilekọta nwa. (Ọpụpụ 20:14; Levitikọs 18:6-18, 22-24; 19:35, 36; Deuterọnọmi 6:6-9) E nyere ụkpụrụ nduzi banyere otú mmadụ ga-esi na-emeso mmadụ ibe ya nakwa ụmụ anụmanụ ya ihe. (Levitikọs 19:18; Deuterọnọmi 22:4, 10) Ihe ndị a chọrọ banyere ememe kwa afọ na izukọta ọnụ maka ofufe nyere aka ichebe ndị ahụ n’ụzọ ime mmụọ.—Levitikọs 23:1-43; Deuterọnọmi 31:10-13.

12. Gịnị bụ nzube bụ́ isi nke Iwu ahụ?

12 Pọl onyeozi kwuru otu nzube bụ́ isi nke Iwu ahụ, o dere, sị: “A tụkwasịrị ya n’ihi njehie, ruo mgbe Mkpụrụ ahụ [Kraịst] ga-abịa, bụ́ Onye e kweworo nkwa.” (Ndị Galetia 3:19) Iwu ahụ chetaara ụmụ Israel na ha ezughị okè. Mgbe ahụ, n’ụzọ ezi uche dị na ya, àjà zuru okè bụ́ nke pụrụ iwepụ mmehie ha kpam kpam dị ha mkpa. (Ndị Hibru 10:1-4) N’ihi ya, nzube Iwu ahụ bụ iji kwadebe ndị ahụ ịnabata Jisọs, onye bụ́ Mesaịa, ma ọ bụ Kraịst ahụ. Pọl dere, sị: “Iwu ahụ aghọwo onye ozizi anyị ikuru anyị bịakwute Kraịst, ka e wee site n’okwukwe gụọ anyị ná ndị ezi omume.”—Ndị Galetia 3:24.

Iwu Jehova Ọ̀ Dị Arọ?

13. (a) Olee otú ụmụ mmadụ na-ezughị okè si lee Iwu ahụ anya, n’ihi gịnịkwa? (b) Iwu ahụ ọ̀ dị arọ n’ezie?

13 Ọ bụ ezie na Iwu ahụ dị “nsọ, ziekwa ezi, bụrụkwa ezi ihe,” ọtụtụ ndị lere ya anya dị ka nke dị arọ. (Ndị Rom 7:12) Ebe ọ bụ na Iwu ahụ zuru okè, ụmụ Israel apụghị idebe ụkpụrụ ya dị elu. (Abụ Ọma 19:7) Ọ bụ ya mere Pita onyeozi ji kpọọ ya “yoke . . . nke ma nna anyị hà ma anyị onwe anyị na-enweghị ike iburu.” (Ọrụ 15:10) N’ezie, Iwu ahụ n’onwe ya adịghị arọ, irubere ya isi bakwaara ndị ahụ uru.

14. Olee ihe atụ ole na ole ndị na-egosi na Iwu ahụ baara ụmụ Israel uru nke ukwuu?

14 Dị ka ihe atụ, n’okpuru Iwu ahụ, a dịghị atụ onye ohi mkpọrọ kama ọ ghaghị ịrụ ọrụ iji kwụghachi ihe ndị o zuru okpukpu abụọ ma ọ bụ karịa. Onye e zuru ohi na-esi otú ahụ ghara inwe mfu ọ bụla, a dịghịkwa ebo ndị na-arụsi ọrụ ike ibu arọ iji lekọta ụlọ mkpọrọ. (Ọpụpụ 22:1, 3, 4, 7) A machibidoro nri ndị na-adịghị mma. Ọ bụrụ na e sighị anụ ezì nke ọma, ọ pụrụ ibu ọrịa trichinosis, ewi pụkwara ibu ọrịa tularemia. (Levitikọs 11:4-12) N’otu aka ahụ, Iwu ahụ bụ ihe nchebe site n’ịmachibido imetụ ozu aka. Ọ bụrụ na mmadụ emetụ ozu aka, ọ ga-asa ahụ ya na uwe ya. (Levitikọs 11:31-36; Ọnụ Ọgụgụ 19:11-22) A ga-eli nsị n’ala, na-echebe ndị ahụ pụọ ná mgbasa nke nje, bụ́ nke sayensị chọpụtara ịdị adị ya nanị na narị afọ ndị na-adịbeghị anya.—Deuterọnọmi 23:13.

15. Gịnị ghọrọ ibu arọ nye ụmụ Israel?

15 Iwu ahụ achọghị ihe gabigara ókè n’aka ndị ahụ. Ma a pụghị ikwu otu ihe ahụ banyere ndị ikom weghaara ọrụ nke ịkọwa Iwu ahụ. Banyere Iwu ndị ha nyere, akwụkwọ bụ́ A Dictionary of the Bible, nke James Hastings dere, na-ekwu, sị: “E ji usoro ụmụ irighiri ụkpụrụ nduzi gbaa ihe ọ bụla e nyere n’iwu n’ime Bible gburugburu. . . . E si otú a nwaa iwebata ọnọdụ ọ bụla a pụrụ ichetụ n’echiche n’ime Iwu ahụ, sitekwa n’izuzu obi ebere na-adịghị na ya nwaa ịchịkwa omume nile nke mmadụ site n’ụkpụrụ a na-aghaghị idebe kpọmkwem otú ahụ o si dị bụ́ nke dabeere n’ahụmahụ. . . . A pịnyụrụ olu nke akọ na uche; ike na-arụ ọrụ nke okwu Chineke bụ nke e mere ka ọ ghara ịdị ike, bụrụkwa nke e ji ọtụtụ ụkpụrụ nduzi e webatara ewebata bokwasị.”

16. Gịnị ka Jisọs kwuru banyere ụkpụrụ nduzi na ọdịnala ndị dị arọ nke ndị ndú okpukpe?

16 Jisọs Kraịst katọrọ ndị ndú okpukpe bụ́ ndị bokwasịrị ndị mmadụ ọtụtụ ụkpụrụ nduzi, na-asị: “Ha na-eke ibu dị arọ dịkwa ike obubu, tụkwasị ha n’ubu mmadụ; ma ha onwe ha achọghị iji otu mkpịsị aka ha wezụga ha.” (Matiu 23:2, 4) O kwuru na ụkpụrụ nduzi na ọdịnala ha ndị mmadụ mere, gụnyere oké nsacha, mere “okwu Chineke ka ọ bụrụ ihe efu.” (Mak 7:1-13; Matiu 23:13, 24-26) Otú ọ dị, ọbụna tupu Jisọs abịa n’ụwa, ndị ozizi okpukpe n’Israel nọ na-akọwahie ihe Jehova na-achọ n’ezie.

Ihe Jehova Na-achọ n’Ezie

17. N’ihi gịnị ka Jehova na-ejighị nwee obi ụtọ n’àjà nsure ọkụ nke ụmụ Israel na-enweghị okwukwe?

17 Site n’ọnụ onye amụma bụ́ Aịsaịa, Jehova kwuru, sị: “Afọ ejuwo m n’àjà nsure ọkụ nile e ji ebulu chụọ, na abụba ụmụ ehi e mere ka ha maa abụba; ọzọ, ọbara oké ehi na nke ụmụ atụrụ na nke mkpi atọghị m ụtọ.” (Aịsaịa 1:10, 11) N’ihi gịnị ka Chineke na-ejighị nwee obi ụtọ n’àjà ndị ya onwe ya sịrị ka a chụọ n’Iwu ahụ? (Levitikọs 1:1–4:35) Ọ bụ n’ihi na ndị ahụ mesoro ya n’ụzọ mkparị. N’ihi ya, a dụrụ ha ọdụ, sị: “Saanụ ahụ, meenụ onwe unu ka unu dị ọcha; wezụganụ ihe ọjọọ nke omume unu nile n’ihu anya m abụọ; hapụnụ ime ihe ọjọọ: mụtanụ ime ezi ihe; chọọnụ ikpe ziri ezi, meenụ ka onye na-eme ihe ike gazie agazie, kpeenụ nwa mgbei ikpe ziri ezi, kpeenụ ọnụ nwanyị di ya nwụrụ.” (Aịsaịa 1:16, 17) Nke a ọ́ dịghị enyere anyị aka ịghọta ihe Jehova na-achọ n’aka ndị ohu ya?

18. Gịnị n’ezie ka Jehova nọ na-achọ n’aka ụmụ Israel?

18 Jisọs gosiri ihe Chineke na-achọ n’ezie. O mere otú ahụ mgbe a jụrụ ya ajụjụ bụ́, “Olee ihe dị ukwuu nke e nyere n’iwu n’ime iwu anyị?” Jisọs zaghachiri, sị: “Ị ga-ewere obi gị dum, werekwa mkpụrụ obi gị dum, werekwa uche gị dum, hụ Onyenwe anyị Chineke gị n’anya. Nke a bụ ihe ukwu na ihe mbụ e nyere n’iwu. Ihe nke abụọ nke yiri ya bụ nke a, Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị. Iwu dum, na ndị amụma Chineke, na-ekokwasị n’ihe abụọ ndị a e nyere n’iwu.” (Matiu 22:36-40; Levitikọs 19:18; Deuterọnọmi 6:4-6) Onye amụma bụ́ Mosis kwuru otu ihe ahụ mgbe ọ jụrụ, sị: “Gịnị ka Jehova, bụ́ Chineke gị, na-arịọ n’aka gị, ma ọ́ bụghị ịtụ egwu Jehova, bụ́ Chineke gị, ije ije n’ụzọ Ya nile, na ịhụ Ya n’anya, na iwere obi gị nile na mkpụrụ obi gị nile fee Jehova, bụ́ Chineke gị, ofufe, idebe ihe nile Jehova nyere n’iwu, na ụkpụrụ Ya nile”?—Deuterọnọmi 10:12, 13; 15:7, 8.

19. Olee otú ụmụ Israel si nwaa iyi ndị dị nsọ, ma gịnị ka Jehova gwara ha?

19 N’agbanyeghị omume ọjọọ ha, ụmụ Israel chọrọ iyi ndị dị nsọ. Ọ bụ ezie na Iwu ahụ chọrọ ka a na-ebu ọnụ nanị n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie a na-eme kwa afọ, ha malitere ibu ọnụ mgbe mgbe. (Levitikọs 16:30, 31) Ma Jehova baara ha mba, na-asị: “Ọ́ bụghị nke a bụ obubu ọnụ M na-ahọpụta? ịtọpụ agbụ nile nke mmebi iwu, ịtọsa ihe okike nile nke yoke, na izilaga ndị a na-emegbu emegbu ka ha nwere onwe ha, ka unu tijiekwa yoke ọ bụla? Ọ́ bụghị ikesara onye agụụ na-agụ nri gị, ka i meekwa ndị e wedara n’ala ndị na-awagharị awagharị ka ha bata n’ụlọ gị? mgbe ị hụrụ onye gba ọtọ, ka i kpuchie ya: ka ị gharakwa izonahụ onye ahụ gị onwe gị?”—Aịsaịa 58:3-7.

20. Jisọs ji banyere gịnị baara ndị ihu abụọ okpukpe mba?

20 Ndị Israel ahụ bụ́ ndị ezi omume n’anya onwe ha nwere nsogbu yiri nke ndị ihu abụọ okpukpe ahụ Jisọs gwara, sị: “Unu na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke mkpa akwụkwọ na-esi ísì ụtọ na anise na cummin, unu ahapụwokwa ihe ka arọ n’iwu, bụ́ ikpe, na ebere, na okwukwe: ma ọ dị mkpa ka unu mee ihe ndị a, ka unu gharakwa ịhapụ ihe ahụ.” (Matiu 23:23; Levitikọs 27:30) Ọ̀ bụ na okwu Jisọs adịghị enyere anyị aka ịghọta ihe Jehova na-achọ n’aka anyị n’ezie?

21. Olee otú onye amụma bụ́ Maịka si chịkọta ihe Jehova na-achọ na ihe ọ na-adịghị achọ n’aka anyị?

21 Iji mee ka ihe Jehova na-achọ na ihe ọ na-adịghị achọ n’aka anyị doo anya, onye amụma Chineke bụ́ Maịka jụrụ, sị: “M̀ ga-eji gịnị bịa n’ihu Jehova, rube isi n’ihu Chineke dị elu? m̀ ga-abịa n’ihu Ya chịrị ihe àjà nsure ọkụ, chịrị ụmụ ehi gbara otu afọ? Ọ̀ ga-atọ Jehova ụtọ, bụ́ [ọtụtụ puku] ebulu ma ọ bụ [ọtụtụ iri puku] iyi mmanụ? m̀ ga-enye ọkpara m n’ihi njehie m, mkpụrụ afọ m n’ihi mmehie mkpụrụ obi m? Gị mmadụ, O gosiwo gị ihe dị mma; ọ̀ bụkwa gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị, ma ọ́ bụghị nanị ime ihe e kpere n’ikpe, na ịhụ ebere n’anya, na iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?”—Maịka 6:6-8.

22. Gịnị kpọmkwem ka Jehova chọrọ n’aka ndị nọ n’okpuru Iwu ahụ?

22 Ya mere, gịnịzi kpọmkwem ka Jehova chọrọ n’aka ndị ahụ dịrị ndụ n’okpuru Iwu ahụ? N’ezie, ha ga-ahụ Jehova Chineke n’anya. Ọzọkwa, Pọl onyeozi kwuru, sị: “E debezuwo iwu nile n’otu okwu, bụ́ nke a; Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Ndị Galetia 5:14) N’otu aka ahụ, Pọl gwara ndị Kraịst nọ na Rom, sị: “Onye na-ahụ mmadụ ibe ya n’anya edebezuwo iwu. . . . Ịhụnanya bụ idebezu iwu.”—Ndị Rom 13:8-10.

Ọ Gabigaghị Ókè

23, 24. (a) Gịnị mere ọ na-ekwesịghị iji bụụrụ anyị ihe gabigara ókè ime ihe Jehova na-achọ? (b) Gịnị ọzọ ka anyị ga-atụle?

23 Ọbụbụ Jehova bụ Chineke nke na-ahụ n’anya, nke na-echebara mmadụ echiche, nke na-eme ebere, ọ́ dịghị amasị anyị? Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, bụ́ Jisọs Kraịst, bịara n’ụwa iji mee ka ịhụnanya Chineke pụta ìhè—iji mee ka ndị mmadụ mara otú ha dịruru oké ọnụ ahịa nye Jehova. N’inye ihe atụ nke ịhụnanya Chineke, Jisọs kwuru banyere egwele na-abachaghị n’ihe, sị: “Otu n’ime ha agaghị ada n’ala ma Nna unu ekweghị.” Ya mere o kwubiri, sị: “Unu atụla egwu; ọnụ ahịa unu onwe unu karịrị nke ọtụtụ egwele.” (Matiu 10:29-31) N’ezie, o kwesịghị ịbụrụ anyị ihe gabigara ókè mgbe ọ bụla ime ihe ọ bụla Chineke nke na-ahụ n’anya otú ahụ na-achọ!

24 Otú ọ dị, gịnị ka Jehova na-achọ n’aka anyị taa? N’ihi gịnịkwa ka o ji yie ka ụfọdụ hà na-eche na Chineke na-achọ ihe gabigara ókè? Site n’inyocha ajụjụ ndị a, anyị kwesịrị inwe ike ịhụ ihe mere o ji bụrụ ihe ùgwù magburu onwe ya ime ihe ọ bụla Jehova chọrọ.

Ì Pụrụ Ịza?

◻ N’ihi gịnị ka ụfọdụ pụrụ iji jụ ijere Jehova ozi?

◻ Olee otú ihe ndị Jehova na-achọ siworo dịgasịa iche eri afọ ndị gaworo aga?

◻ Nzube ndị dị aṅaa ka Iwu ahụ mezuru?

◻ N’ihi gịnị ka ihe Jehova na-achọ n’aka anyị ji bụrụ nke na-agabigaghị ókè?

[Foto dị na peeji nke 18]

Ụkpụrụ nduzi mmadụ mere, dị ka oké nsacha, emeela ka ofufe bụrụ ihe dị arọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya