Ugwu Athos—Ọ̀ Bụ “Ugwu Nsọ”?
NYE ihe karịrị nde mmadụ 220 na-ekpe Chọọchị Ọtọdọks, Ugwu Athos, bụ́ ugwu dị mkputamkpu nke dị n’ebe ugwu Gris, bụ “ugwu kasị nsọ nye ndị Kraịst bụ́ ndị Ọtọdọks.” Nye ọtụtụ n’ime ha, ime njem ala nsọ gaa ‘n’ugwu nsọ’ nke Athos bụ ihe mgbaru ọsọ ha ji kpọrọ oké ihe. Gịnị bụ “ugwu nsọ” a? Ò si aṅaa dịwa mkpa otú ahụ? Ọ̀ bụkwa “ugwu” ndị na-atụ egwu Chineke na-aghaghị ilegara anya maka nduzi ime mmụọ na ezi ofufe?
Okwu ahụ bụ́ “ugwu nsọ” dị n’ime Bible. A na-eji ya eme ihe maka ofufe dị nsọ, dị ọcha, nke e bulikwara elu nke ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova. Ugwu Zaịọn nke dị na Jerusalem oge ochie ghọrọ “ugwu nsọ” mgbe Eze Devid bubatara igbe ọgbụgba ndụ ahụ n’ebe ahụ. (Abụ Ọma 15:1; 43:3; 2 Samuel 6:12, 17) Mgbe e wusịrị ụlọ nsọ Solomọn n’Ugwu Moraịa, “Zaịọn” bịara gụnye ebe ahụ ụlọ nsọ ahụ dị; n’ihi ya, Zaịọn nọgidere bụrụ “ugwu nsọ” Chineke. (Abụ Ọma 2:6; Joel 3:17) Ebe ọ bụ na ụlọ nsọ Chineke dị na Jerusalem, mgbe ụfọdụ a kpọkwara obodo ahụ “ugwu nsọ” Chineke.—Aịsaịa 66:20; Daniel 9:16, 20.
Gịnị banyere oge a? Ugwu Athos—ma ọ bụ ugwu ọ bụla ọzọ—ọ̀ bụ “ugwu nsọ” nke ndị mmadụ na-aghaghị inuga iji fee Chineke n’ụzọ ọ na-anara nke ọma?
“Ugwu Nsọ” Ndị Mọnk Bi na Ya
Ugwu Athos dị n’ebe nsọtụ ọwụwa anyanwụ nke Chalcidice Peninsula n’ọnụ ọnụ otu ala dị warara nke banyere n’Oké Osimiri Aegean n’ebe ọwụwa anyanwụ Thessaloníki nke oge a. Ọ bụ nnukwu ugwu nke marble jupụtara n’elu elu ya nke si n’oké osimiri kpọlie nnọọ elu ruo mita 2,032.
Ọ dịla anya e weere Athos dị ka ebe nsọ. N’akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme nke ndị Gris, ọ bụ ebe obibi nke ndị bụ́ chi tupu Ugwu Olympus aghọọ ebe obibi ha. N’oge ụfọdụ mgbe Constantine Onye Ukwu nwụsịrị (narị afọ nke anọ O.A.), Athos ghọrọ ebe nsọ nye chọọchị ndị Kraịst. Dị ka otu akụkọ mgbe ochie si kwuo, ka Meri “nwa agbọghọ na-amaghị nwoke” na Jọn Onye Na-ezisa Ozi Ọma so na-aga Saịprọs ileta Lazarọs, ajọ ifufe mberede buuru ha gaa Athos. N’ịbụ onye ịma mma nke ugwu ahụ kpaliri mmasị ya, Meri rịọrọ Jisọs ka o nye ya ya. N’ihi ya, a bịakwara mara Athos dị ka “Ogige nke Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke nke Dị Nsọ.” N’etiti oge nke alaeze ukwu Byzantium, a bịara mara ebe nile ahụ jupụtara na nkume dị ka Ugwu Nsọ. A nakweere ma mee ka aha a guzosie ike n’ụzọ iwu n’etiti narị afọ nke 11 site n’iwu Eze Ukwu Constantine nke Itoolu Monomachus nyere.
N’ihi ịdị mkputamkpu ya ma bụrụ nke dipụrụ adịpụ, Athos bụ ụdị ebe a na-ebikarị ndụ ịnapụ onwe onye ihe ụtọ. N’ime ọtụtụ narị afọ, ọ dọtara ndị ji okpukpe kpọrọ ihe site n’ógbè nile nke Ọtọdọks—ndị Gris, ndị Serbia, ndị Romania, ndị Bulgaria, ndị Russia, na ndị ọzọ—bụ́ ndị wuru ọtụtụ ebe obibi ndị mọnk, tinyere chọọchị na ógbè ha. Ihe dị ka 20 n’ime ndị a adịgidewo.
Ugwu Athos Taa
Taa, Athos bụ ógbè na-achị onwe ya, nke nwere iwu a nabatara na 1926. Mgbe ọtụtụ afọ nke ndalata gasịrị, ọnụ ọgụgụ ndị mọnk bi ebe ahụ arịala elu ruo ihe karịrị 2,000.
Nke ọ bụla n’ime ebe obibi ndị mọnk ahụ nwere usoro ubi, ụlọ ekpere, na ụlọ obibi nke ya. Ebe nsọ kasịnụ nke ndị ahụ na-anọ nanị ha dị n’ógbè Karoúlia, bụ́ nke tụgooro n’elu elu ebe ndị kpọliri elu nke Ugwu Athos. N’ebe a, ọ bụ nanị site n’usoro ụzọ nta ndị dị mgbagwoju anya, nkume ndị e ji mere stepụ, na ọtụtụ chen ka a pụrụ isi rute n’ìgwè ụlọ nta ndị dị na ya. N’Athos, ndị mọnk ka na-eme ememe okpukpe oge ochie ha na-eme kwa ụbọchị, na-eji klọọkụ Byzantium (nke ụbọchị ya na-amalite mgbe anyanwụ dara) na kalenda Julius (nke ji ụbọchị 13 nọrọ n’azụ kalenda Gregory) na-eme ihe.
Ọ bụ ezie na a na-ekwu na ebe okpukpe a nwetara “ịdị nsọ” ya site n’aka nwanyị, ruo 1,000 afọ, ndị mọnk na ndị na-anọ nanị ha n’ebe ahụ ekwuola na ebe ahụ nile ala dịịrị banye na mmiri bụ ebe a na-achọghị ịhụ ụdị ihe ọ bụla dị ndụ bụ́ nne—mmadụ na anụmanụ—tinyere ọnaozi ma ọ bụ nwoke na-agbaghị afụ ọnụ. N’oge na-adịbeghị anya, e wepụla iwu ndị metụtara ndị na-agbaghị afụ ọnụ na anụmanụ ndị bụ́ nne, ma a ka machibidosiri ụmụ nwanyị iwu ike irute mita 500 site n’ụsọ osimiri Athos.
“Ugwu Nsọ” Nye Mmadụ Nile
Athos ọ̀ bụ “ugwu nsọ” nke ndị Kraịst na-atụ egwu Chineke kwesịrị ịbịa fee ofufe na ya? Ka ọ na-agwa nwanyị Sameria okwu bụ́ onye kwere na e kwesịrị ịnọ n’Ugwu Geraịzim na-efe Chineke, Jisọs mere ka o doo anya na ọ dịghị ugwu nkịtị ọ bụla nke a ga-ahọpụta ọzọ dị ka ebe a ga-anọ na-efe Chineke ofufe. “Oge awa na-abịa, mgbe unu na-agaghị akpọ isiala nye Nna m, ma ọ bụ [na Geraịzim], ma ọ bụ na Jerusalem,” ka Jisọs kwuru. N’ihi gịnị? “Chineke bụ Mmụọ: ndị na-akpọkwa isiala nye Ya aghaghị ịkpọ isiala n’ime mmụọ na eziokwu.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Jọn 4:21, 24.
N’ịrụtụ aka n’oge anyị, Aịsaịa onye amụma buru amụma na ‘ugwu ihe atụ nke ụlọ Jehova ga-eguzosi ike n’elu ugwu nile, a ga-ebulikwa ya elu karịa ugwu nta nile,’ ndị si ná mba nile ga-enubakwa na ya n’ụzọ ihe atụ.—Aịsaịa 2:2, 3.
A na-akpọ ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị chọrọ iso Chineke na-enwe ezi mmekọrịta òkù ife Jehova ofufe “n’ime mmụọ na eziokwu.” Ọtụtụ nde mmadụ gburugburu ụwa arịgoola ‘n’ugwu Jehova.’ Ha onwe ha, tinyere ndị ọzọ, na-enwe mmetụta ahụ otu ọkàiwu bụ́ onye Gris nwere bụ́ onye kwuru banyere Athos, sị: “Ọ na-eju m anya ma ọnọdụ ime mmụọ ọ̀ bụ ihe a na-agbachibido n’ime mgbidi ma ọ bụ n’ebe obibi ndị mọnk.”—Tụlee Ọrụ 17:24.
[Igbe dị na peeji nke 31]
Nkwakọba nke Akụ̀ E Zoro Eri Oge
Eri ọtụtụ narị afọ, ndị mọnk nke Athos akwakọbawo akụ̀ dị oké ọnụ ahịa nke gụnyere ihe odide ndị a na-eme atụmatụ na ha ruru 15,000, bụ́ ndị e kwuru na ụfọdụ ha malitere ịdị na narị afọ nke anọ, na-eme ka ọ bụrụ otu n’ime nkwakọba kasị oké ọnụ ahịa n’ụwa. E nwere akwụkwọ mpịakọta, mpịakọta zuru ezu na mpempe akwụkwọ nke Oziọma ndị ahụ, abụ ọma na abụ ndị ọzọ, n’agụnyeghị ihe osise, ihe oyiyi, ihe a kpụrụ akpụ, na ihe ndị e ji ígwè rụọ bụ́ ndị merela ochie. A na-eme atụmatụ na otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ihe odide Grik ndị e nwere n’ụwa dị n’Ugwu Athos, ọ bụ ezie na ọ ka dị mkpa ka e debanye ọtụtụ n’ime ha n’akwụkwọ. Na 1997, na nke mbụ ya, ndị mọnk kwere ka e gosipụta ụfọdụ n’ime akụ̀ ha ndị dị oké ọnụ ahịa na Thessaloníki.
[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 31]
Telis/Òtù Na-ahụ Maka Njem Nlegharị Anya nke Mba Gris