Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w00 1/15 p. 8
  • A Kọwaa Akwụkwọ Daniel!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Kọwaa Akwụkwọ Daniel!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gị na Akwụkwọ Daniel
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Jehova Ekwee Daniel Nkwa Ụgwọ Ọrụ Magburu Onwe Ya
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Gị n’Ezie?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • E Lere Ya Ule—Ma O Kwesịrị Ntụkwasị Obi Nye Jehova!
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
w00 1/15 p. 8

A Kọwaa Akwụkwọ Daniel!

NDỊ bịara mgbakọ nwere oké mmasị inweta akwụkwọ ahụ dị peji 320 e wepụtara ọhụrụ bụ́, Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel! Olee mmetụta ha nwere banyere akwụkwọ ahụ? Tụlee ihe ụfọdụ kwuru.

“Dị ka ọ dị n’ebe ihe ka ọtụtụ ná ndị nọ n’afọ iri na ụma nọ, ọ na-esiri m ike ịnụ ụtọ ịmụ akụkọ mgbe ochie. Ya mere mgbe m nwetara akwụkwọ ahụ bụ́, Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel! enwechaghị m mkpali ịgụ ya, ma agbalịrị m ịgụ ya. Nnaa, enweburu m nnọọ echiche na-ezighị ezi! Nke a bụ otu n’ime akwụkwọ ndị kasị mma m gụtụrụla. N’ezie ọ naghị ekwe ntọgbọ! Ọ naghịzi adị m ka m na-agụ banyere ihe mere ọtụtụ puku afọ gara aga. Nke a bụ nke mbụ ọ dị m ka m pụrụ itinye onwe m n’ọnọdụ Daniel. Apụrụ m n’ezie iji anya nke uche hụ ihe ọ ga-adị ka ya bụ́ mmadụ ịbụ onye a kpọpụrụ n’ezinụlọ ya, ziga n’ala ọzọ, ma lee nguzosi ike n’ezi ihe ya ule ugboro ugboro. Unu emeela nke ukwuu maka akwụkwọ a.”—Anya.

“Ihe kasị enyere m aka bụ ozi ahụ doro anya nke bụ́ na Jehova na-eduzi nnọọ ihe omume ndị metụtara ndị ya. Site n’ọhụụ na nrọ Daniel nakwa nke ndị ọzọ ọ kọwara, o doro anya na ọ dịghị mgbe Chineke anyị ga-ekwe ka ihe mee n’ụzọ megidere ihe o zubeworo. Nke a na-ewusi olileanya anyị nwere n’ihe ndị e gosipụtara n’ụzọ amụma ike, bụ́ ndị a na-achọta n’ime Bible banyere ụwa ọhụrụ nke ọ ga-eweta.”—Chester.

“Otú unu si mee ka e chetaghachi Daniel masịrị m. Amatakwuru m ya nke ọma site n’ụzọ unu si mee ka nchegbu ya dị iche iche pụta ìhè. Apụrụ m ịghọta n’ụzọ ka mma, ihe mere Jehova ji hụta ya dị ka ihe a na-achọsi ike nke ukwuu. N’oge ọnwụnwa na mkpagbu ya nile, o nweghị nchegbu banyere onwe ya. Nchegbu ya kasịnụ bụ maka Jehova na aha ọma Ya. Unu emeela maka ime ka isi ihe ndị a pụta ìhè.”—Joy.

“Nke a bụ ihe anyị nọworo na-echere! Ọ dịtụbeghị mgbe e gosipụtara ókè akwụkwọ Daniel metụtaruru onye nke ọ bụla n’ime anyị n’ezie. Mgbe m gụmiri akwụkwọ ọhụrụ ahụ n’anyasị nke ụbọchị m nwetara ya, aghaghị m nnọọ ịkwụsị ma kelee Jehova n’ekpere.”—Mark.

“Ihe anyị na-atụghị anya ya bụ mmetụta ọ ga-enwe n’ahụ ụmụ anyị. Ha dị afọ ise na afọ atọ. . . . Ọ bụ ezie na akụkọ banyere Daniel, Hananaịa, Mishael, na Azaraịa esowo ná ndị kasị amasị ha n’Akwukwọm nke Akukọ Bible, otú e si kọọ ha n’akwụkwọ Amụma Daniel emetụtawo ha n’ụzọ anyị na-atụghị anya ya. Ọbụna n’oge a ha dị obere, o yiri ka hà nwere ike itinye onwe ha n’ọnọdụ ndị ikom a na-eto eto bụ́ ndị ezi omume. Lee ndị nlereanya magburu onwe ha ha bụụrụ ụmụ anyị! Lee ngwá ọrụ magburu onwe ya unu nyeworo anyị! Ndewonụ, unu emeela nke ukwuu!”—Bethel.

“Ọ dị m ka eso m ụmụ okoro ahụ na-eto eto bụ́ ndị Hibru nọrọ n’ebe ahụ ka a na-ele okwukwe ha ule; nke ahụ gbakwara m ume inyocha okwukwe nke m. Igbe ntụleghachi ahụ isiokwu ya bụ́ “Gịnị Ka Ị Ghọtara?” na-akụbanye ihe ndị dị n’isiakwụkwọ ahụ n’ime obi mmadụ. Ana m ekeleghachi unu maka ọrụ ọzọ magburu onwe ya.”—Lydia.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya