Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w00 3/1 p. 19
  • E Nyeghachiri Okwukwe Ha Ụgwọ Ọrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • E Nyeghachiri Okwukwe Ha Ụgwọ Ọrụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Edebesịwo M Okwukwe Ahụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ekpere Òle Ndị Ka A Na-aza?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Otú Jehova Si Aza Ekpere Anyị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • “Onye Ihe Na-agara nke Ọma Ka Mmadụ nke Chọtaworo Amamihe Bụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
w00 3/1 p. 19

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

E Nyeghachiri Okwukwe Ha Ụgwọ Ọrụ

PỌL onyeozi bụ nwoke okwukwe ya pụtara ìhè, ọ gbakwara ndị kwere ekwe ibe ya ume ịzụlite okwukwe n’otu aka ahụ. O kwuru, sị: “Onye na-abịakwute Chineke aghaghị ikwe na Ọ dị, na Ọ na-egosikwa Onwe ya Onye na-enyeghachi ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Ahụmahụ ndị na-esonụ e si Mozambique nweta na-egosi otú Jehova si enyeghachi okwukwe siri ike ụgwọ ọrụ ma na-aza ekpere ndị e ji ezi obi kpee.

• Otu nwanna nwanyị di ya nwụrụ nke si n’ógbè ebe ugwu nke Niassa, nwere nchegbu banyere otú ya na ụmụ ya isii ga-esi gaa Mgbakọ Distrikti “Ụzọ Ndụ nke Chineke.” Nanị ụzọ o si akpata ego bụ ire ihe n’otu ahịa dị n’ógbè ahụ, ma mgbe ụbọchị mgbakọ ahụ ruru, ihe o nwere bụ nanị ego ga-ezuru ya na ezinụlọ ya ịgba ụgbọ okporo ígwè gaa agaa. Otú o sina dị, o kpebiri inwe obi ike ná ndokwa Jehova ma gaa n’ihu n’atụmatụ ya ịnọ ná mgbakọ ahụ.

Ya na ụmụ ya isii banyere n’ụgbọ okporo ígwè. Ka ha nọ na-aga, onye na-eso ụgbọ ahụ bịakwutere ya ịnata ya tiketi. Mgbe ọ hụrụ baajị ya, ọ jụrụ ya ụdị kaadị nkọwa o yi. Nwanna nwanyị ahụ gwara ya na ọ bụ iji mee ka a mara ya dị ka onye na-aga mgbakọ distrikti nke Ndịàmà Jehova. “Ebee ka a ga-enwe mgbakọ a?” ka onye ahụ na-eso ụgbọ jụrụ. Mgbe ọ chọpụtasịrị na ebe a ga-anọ enwe mgbakọ ahụ bụ n’ógbè dị nso bụ́ Nampula, nke dị ihe dị ka kilomita 300 site n’ebe ahụ, n’ụzọ a na-atụghị anya ya, ọ nara ya nanị ọkara nke ego tiketi o kwesịrị ịkwụ! O jizi ọkara nke ọzọ nke ego ụgbọ ha nye ya na ezinụlọ ya tiketi ha ga-eji alaghachi. Lee obi ụtọ o nwere n’ihi ịtụkwasị Jehova obi!—Abụ Ọma 121:1, 2.

• Ruo ihe dị ka afọ 25, otu nwanyị ji nnọọ okpukpe kpọrọ ihe kpegaara Chineke ekpere ka o gosi ya ụzọ ziri ezi isi fee ya ofufe. Chọọchị ọ na-aga na-ejikọta ememe okpukpe na ememe ọdịnala, o nwekwara obi abụọ ma ụdị ofufe a ọ̀ na-amasị Chineke.

Ọ na-akọ, sị: “Anọwo m mgbe nile na-echeta okwu Jisọs ndị e dekọrọ na Matiu 7:7: ‘Rịọnụ, a ga-enyekwa unu; chọọnụ, unu ga-achọtakwa; kụọnụ, a ga-emeghekwara unu.’ N’iburu akụkụ akwụkwọ nsọ a n’uche, ekpegaara m Chineke ekpere mgbe nile ka o duga m n’eziokwu ahụ. Otu ụbọchị, onye pastọ chọọchị anyị gwara ndị nile na-arụ ọrụ n’ahịa dị n’ógbè ahụ ka ha wetara ya ego tinyere ụfọdụ n’ime ihe ndị ha rụtara ka o wee nwee ike ịgọzi ha. Elere m arịrịọ a anya dị ka ihe Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, ya mere ewetaghị m ihe ọ bụla. Mgbe pastọ ahụ hụrụ na ọ dịghị ‘onyinye’ ọ bụla m wetara, ọ malitere ịkparị m n’ihu ndị òtù chọọchị ahụ nile. Achọpụtara m n’ụbọchị ahụ na ihe a abụghị ụzọ Chineke chọrọ ka e si na-efe ya, ya mere esi m na chọọchị ahụ pụọ. Ka ọ dị mgbe ahụ, anọgidesiri m ike n’ekpere iji chọta eziokwu ahụ.

“N’ikpeazụ, enwetara m obi ike ma kpọtụrụ otu onye ikwu m bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova. O nyefere m traktị, mgbe m gụrụ ya, achọpụtara m ozugbo na Chineke na-aza ekpere m. Ka oge na-aga, nwoke mụ na ya bi malitere ịghọta eziokwu Bible, anyị debakwara alụmdi na nwunye anyị n’akwụkwọ iwu. Otú ọ dị, mgbe nke ahụ gasịrị, di m dara oké orịa. Ma ruo kpọmkwem mgbe ọ nwụrụ, ọ gbara m ume ịnọgidesi ike n’ụzọ nke eziokwu ka anyị wee nwee ike izute ọzọ na Paradaịs.

“Ana m enwe ekele n’ebe Jehova nọ ruo mgbe ebighị ebi maka ịza ekpere m na igosi m ụzọ ziri ezi isi fee ya ofufe. A zawokwa ekpere m n’ihi na ahụwo m ụmụ m asatọ ka ha ghọchara ndị ohu Jehova raara onwe ha nye.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya