Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w00 12/1 p. 8
  • Jehova Na-enye Ndị Ya Ebe Izu Ike

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Na-enye Ndị Ya Ebe Izu Ike
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Ezigbo Nnwere Onwe Si Ruo Ndị Maya Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Kalenda Ndị Maya nke Dị Ịtụnanya
    Teta!—2005
  • Gwa Ha na Ị Hụrụ Ha n’Anya
    Ihe Ndịàmà Jehova Kọrọ
  • E Mere Ka O Doo Ha Anya na Kathmandu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
w00 12/1 p. 8

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Jehova Na-enye Ndị Ya Ebe Izu Ike

ỊHỤ ebe izu ike nke ndo dị na ya n’ụzọ si n’ugwu gafere na-abụrụ onye njem ike gwụrụ ihe oké obi ụtọ. Na Nepal, a na-akpọ ụdị ebe izu ike ahụ chautara. Ezigbo chautara pụrụ ịdịdewe osisi banyan na-adị pokopoko, ebe ndo dị a na-anọdụ ala ma zuru ike. Ịrụ chautara bụ omume obiọma, a dịghịkwa akpọ aha ihe ka ọtụtụ n’ime ndị na-arụ ya.

Ahụmahụ ndị e si Nepal nweta na-egosi otú Jehova Chineke siworo ghọọrọ ọtụtụ “ndị njem” n’ime usoro ihe a, bụ́ ndị ike gwụworo, Isi Iyi nke ọṅụ na ume ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ.—Abụ Ọma 23:2.

• Lil Kumari bi n’obodo ukwu mara mma bụ́ Pokhara, bụ́ nke a na-anọ ahụ Ugwu Himalaya ahụ snow na-ekpuchi elu ya, nke ọma. Ma n’ịbụ onye na-echegbu onwe ya banyere ókè ego ezinụlọ ya na-enweta hà, Lil Kumari chere na ọ dịchaghị olileanya ha nwere. Mgbe otu n’ime Ndịàmà Jehova letara ya, olileanya dị ebube sitere na Bible kpaliri ya, ọ rịọkwara ozugbo ka e duziere ya ọmụmụ Bible ebe obibi.

Ọ bụ ezie na ọmụmụ ihe ahụ na-atọ Lil Kumari ụtọ, ọ dịghịrị ya mfe ịga n’ihu n’ihi mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ nke ezinụlọ ya. Ma ọ kwụsịghị. Ọ gachiri nzukọ ndị Kraịst anya ma tinye ihe ọ mụtara n’ọrụ, karịsịa n’okwu banyere nwunye ido onwe ya n’okpuru. N’ihi ya, ma di ma nne Lil Kumari bịara ghọta na Bible ọ na-amụ na-abara ezinụlọ ahụ dum uru.

Ma di ya ma ọtụtụ ndị ikwu ya na-amụ Okwu Chineke ugbu a. N’otu mgbakọ e mere na Pokhara na nso nso a, Lil Kumari gere ntị n’usoro ihe omume ahụ ya na mmadụ 15 n’ime ndị ikwu ya. O kwuru, sị: “Ebe obibi m aghọọla ebe izu ike n’ihi na ezinụlọ anyị dị n’otu ugbu a n’ezi ofufe, achọtawokwa m ezi udo nke obi.”

• Ọ bụ ezie na ịkpa ókè n’ihi ọkwá bụ nke iwu na-akwadoghị na Nepal, ọ ka na-enwe mmetụta dị ukwuu n’ụzọ ndụ ndị mmadụ. N’ihi ya, ọtụtụ ndị na-enwe mmasị n’ihe Bible na-ekwu banyere ịha nhata na eleghị mmadụ anya n’ihu. Ịmụta na “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu” gbanwere ndụ Surya Maya na ezinụlọ ya nke ukwuu.—Ọrụ 10:34.

Ikpe na-ezighị ezi nke ịkpa ókè n’ihi ọkwá nakwa ibu arọ nke ọdịnala na omenala ndị gbanyesiri mkpọrọgwụ ike nọ na-ewute Surya Maya. Ebe ọ bụ nwanyị ji okpukpe kpọrọ ihe, Surya Maya rịọsiri arụsị ya dị iche iche arịrịọ ike maka enyemaka ruo ọtụtụ afọ. Ma a zaghị ekpere ya. Otu ụbọchị, ka ọ nọ na-arịọ maka enyemaka, ada nwa ya nwanyị dị afọ isii bụ́ Babita bịakwutere ya ma jụọ ya, sị: “N’ihi gịnị ka i ji na-arịọ maka enyemaka site n’aka arụsị ndị na-apụghị ime ihe ọ bụla?”

O mesịrị bụrụ na nne Babita so otu n’ime Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Babita ji ịnụ ọkụ n’obi kpọọ nne ya ochie òkù ịga otu nzukọ ndị Kraịst. Mgbe Surya Maya gara, o juru ya anya ịhụ ka ndị sitere n’ọkwá dị iche iche so ibe ha na-akpakọrịta n’enweghị ajọ mbunobi ọ bụla. Ọ rịọrọ ozugbo ka e duziere ya ọmụmụ Bible ebe obibi. Ọ bụ ezie na nke a mere ka ndị agbata obi ya kewapụ ya, ọ daghị mbà n’obi; amachaghị ka e si agụ ihe na ka e si ede ihe egbochighịkwa ya inwe ọganihu ime mmụọ.

Afọ asatọ agafeela, mmadụ isii kwa n’ime ndị òtù ezinụlọ ya, tinyere di ya na ụmụ ya atọ, aghọọla Ndịàmà Jehova. Surya Maya bụ onye ozi oge nile ugbu a, ọsụ ụzọ oge nile, jiri ọṅụ na-enyere ndị ọzọ aka ibutu ibu arọ ha n’ebe izu ike nke bụ́ ezie nke ọ bụ nanị Jehova pụrụ inye.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya