Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w00 12/15 p. 3-7
  • Omenala Krismas—Hà Bụ nke Ndị Kraịst?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Omenala Krismas—Hà Bụ nke Ndị Kraịst?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Posada, “Ndị Amamihe Atọ ahụ,” na Nacimiento
  • Ilebatụkwu Anya n’Ọdịnala Ọmụmụ Kraịst
  • Ọmụmụ Jisọs Dị Ka Bible Si Kwuo
  • Ndị ahụ Na-agụ Kpakpando
  • Gịnị Ka Anyị Pụrụ Ịmụta Site n’Ihe Ndekọ Ahụ?
  • Gịnị Mere Ọtụtụ Ndị Jizi Agba Krismas?
    Teta!—2011
  • Krismas—Ọ̀ Bụ n’Ezie nke Ndị Kraịst?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Olee Otú Krismas Si Bido?
    Teta!—2011
  • Mkpọrọgwụ nke Krismas Oge A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
w00 12/15 p. 3-7

Omenala Krismas—Hà Bụ nke Ndị Kraịst?

OGE Krismas eruola. Gịnị ka nke ahụ pụtaara gị, ezinụlọ gị, na ndị enyi gị? Ọ̀ bụ oge ihe ime mmụọ, ka ọ̀ bụ nanị oge oriri na mkpori ndụ? Ọ̀ bụ oge ịtụgharị uche n’ọmụmụ Jisọs Kraịst ka ọ bụ oge ime omume ọ gbasaghị m n’ebe ụkpụrụ ndị Kraịst dị?

N’ịtụle ajụjụ ndị ahụ, buru n’uche na ọdịnala Krismas pụrụ ịdịgasị iche na-adabere n’ebe i bi. Dị ka ihe atụ, na Mexico nakwa ná mba ndị ọzọ dị na Latin America, ọbụna aha ya dị iche. Otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma mere ka ọ pụta ìhè na “e si n’okwu Bekee ochie bụ́ Christes Masse, Mas nke Kraịst, nweta” aha ya bụ́ Krismas. Otú ọ dị, La Navidad, ma ọ bụ Ọmụmụ, dị ka a na-akpọ ya n’ala ndị a dị na Latin America, na-ezo aka n’ọmụmụ Kraịst. Wepụtatụ oge iji tụlee ihe ọmụma ụfọdụ sitere na Mexico. Nke a pụrụ inyere gị aka ịkpụzi echiche gị banyere oge ezumike a.

Posada, “Ndị Amamihe Atọ ahụ,” na Nacimiento

Ememe ndị ahụ na-eji posada amalite na December 16. Akwụkwọ bụ́ Mexico’s Feasts of Life na-ekwu, sị: “Ọ bụ oge posada, bụ́ ụbọchị itoolu na-akpali akpali bụ́ ndị na-eduga ná Mgbede Ụbọchị Bu Krismas Ụzọ, ka a na-eme ememe e ji echeta ngagharị Josef na Meri gagharịrị nanị ha n’obodo Betlehem na oge ha mesịrị chọta ebe e gosiri ha obiọma ma nye ha ụlọ. Ezinụlọ dị iche iche na ndị enyi na-ezukọta ọnụ n’abalị iji meghachi ihe ndị mere n’ụbọchị ndị bu ọmụmụ Kraịst ụzọ.”

Dị ka e si eme ya, ìgwè mmadụ na-eburu ihe oyiyi nke Meri na Josef gaa n’otu ụlọ ma jiri abụ na-arịọ ka a kpọbata ha n’ime ụlọ, ma ọ bụ posada. Ndị nọ n’ụlọ ahụ na-ejikwa abụ azaghachi ha ruo mgbe ha ga-emesị kwere ka ndị ọbịa ahụ bata n’ime ụlọ. Mgbe ahụ, ha na-amalite oriri na nkwari, bụ́ ebe ụfọdụ mmadụ—ndị e kechiri anya, ndị jikwa osisi n’aka—na-eme onye nwachaa ibe ya anwaa ịkụwa piñata, bụ́ nnukwu ite ụrọ a chọrọ mma nke e kowere n’ụdọ. Ozugbo a kụwara ya, ndị ahụ na-eme ememe na-achịkọta ihe ndị dị n’ime ya (ihe nracha, mkpụrụ osisi, na ihe ndị yiri ha). Ihe na-esochi nke a bụ ihe oriri, ihe ọṅụṅụ, egwú, na ite egwú. A na-eri oriri posada asatọ site na December 16 ruo December 23. Na December 24, a na-eme ememe Nochebuena (Mgbede Ụbọchị Bu Krismas Ụzọ), ezinụlọ dị iche iche na-emekwa mgbalị iji nọkọọ ọnụ maka iri nri pụrụ iche.

Ọ dịghị ete aka, ememe Ụbọchị Afọ Ọhụrụ eruo, bụ́ nke a na-eji oriri oké mkpọtụ eme. Ná mgbede January 5, a na-atụ anya na Tres Reyes Magos (“ndị amamihe atọ”) ga-ewetara ụmụaka ihe ndị e ji egwuri egwú. Mmechi ya na-abụ oriri a na-enwe na January 6, bụ́ mgbe a na-eke rosca de Reyes (achịcha nwere ọdịdị mgbaaka). Ka a na-ata achịcha a, otu onye ga-ahụ obere nwa bebi na-anọchite anya nwa ọhụrụ ahụ bụ́ Jisọs, n’ime achịcha ya. Iwu ji onye ahụ hụrụ ya ịhazi ma kpọọ oriri ikpeazụ na February 2. (N’ebe ụfọdụ, a na-enwe obere ụmụ bebi atọ, bụ́ ndị na-anọchite anya “ndị amamihe atọ ahụ.”) Dị ka ị pụrụ ịhụ, oriri ndị e jikọrọ ha na Krismas na-aga n’ihu n’ihu.

N’oge a, a na-eme nnọọ nacimiento (ihe ngosi Ọmụmụ Kraịst) n’ebe nile. Gịnị ka nke a na-agụnye? N’ebe ọha mmadụ na-anọ nakwa n’ụlọ chọọchị na n’ebe obibi dị iche iche, a na-eji ihe oyiyi (ndị ukwu ma ọ bụ ndị nta) ndị e ji ceramic, osisi, na ụrọ mee, eme ihe ngosi. Ha na-anọchite anya Josef na Meri ka ha gburu ikpere n’ala n’ihu ihe a na-etinye nri anụ ụlọ bụ́ nke e nyiwere nwa a mụrụ ọhụrụ na ya. Mgbe mgbe, a na-enwe ndị ọzụzụ atụrụ na Los Reyes Magos (“ndị amamihe ahụ”). Ebe a na-anọ eme ya na-abụ n’ụlọ anụ, ụfọdụ anụmanụ pụkwara imejupụta ihe nkiri ahụ. Otú ọ dị, ihe oyiyi kasị apụta ìhè na-abụ nke nwa a mụrụ ọhụrụ, bụ́ nke a na akpọ n’asụsụ Spanish el Niño Dios (Chineke bụ́ Nwata). A pụrụ idewe ihe oyiyi a bụ́ isi n’ebe ahụ ná Mgbede Bu Ụbọchị Krismas Ụzọ.

Ilebatụkwu Anya n’Ọdịnala Ọmụmụ Kraịst

Banyere ememe Krismas dị ka e si marazuo ya n’ụwa nile, akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia Americana na-ekwu, sị: “Ihe ka ọtụtụ n’omenala ndị e jikọrọ ha na Krismas ugbu a abụbughị omenala Krismas kama ha bụ́ omenala ndị malitere tupu oge ndị Kraịst nakwa ndị na-abụghị nke ndị Kraịst bụ́ ndị chọọchị ndị Kraịst nakweere. Saturnalia, bụ́ ememe ndị Rom nke a na-eme n’etiti December, tụrụ ụkpụrụ maka ọtụtụ omenala oriri na nkwari nke Krismas. Dị ka ihe atụ, ọ bụ n’ememe a ka e si nweta oké oriri na nkwari, inye onyinye, na ịmụnye kandụl.”

Na Latin America, a pụrụ ime omenala Ọmụmụ Kraịst ndị ahụ bụ́ isi, tinyere ndị ọzọ a gbakwụnyere na ha. ‘Ebee ka e si nweta ha,’ ka ị pụrụ iche. N’eziokwu, ọtụtụ ndị bụ́ ndị chọrọ ịrapagidesi ike na Bible na-aghọta na omenala ụfọdụ adịghị ihe ọzọ ha bụ karịa ememe ndị Aztec. Otu akwụkwọ akụkọ Mexico City, bụ́ El Universal, kwuru, sị: “Mmadụ ndị si n’okpukpe dị iche iche ji eziokwu ahụ bụ́ na ememe ndị dị na kalenda ememe okpukpe ndị India dabakọrọ n’ememe ndị dị na kalenda ememe okpukpe ndị Katọlik mee ihe, n’ihi ya, ha ji nke a kwado ọrụ nzisa ozi ọma na ozi ala ọzọ ha. Ha ji ememe ndị a na-emere ihe ndị bụ́ chi nke ndị Kraịst dochie anya ememe ndị ahụ a na-emere ihe ndị bụ́ chi tupu ọbịbịa ndị Spain, webata ememe na ihe omume ndị Europe, ma gwakọta ya na ememe ndị India, bụ́ nke dugara ná ngwakọta omenala nke bụ́ n’ezie ebe e siworo nweta okwu ndị Mexico ji eme ihe.”

Akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia Americana na-akọwa, sị: “Ihe ngosi Ọmụmụ Kraịst ghọrọ akụkụ nke ememe Krismas ná mmalite . . . A na-ekwu na ọ bụ Senti Francis malitere ime ihe ngosi nke ọmụmụ Kraịst [ihe nkiri nke ihe a na-etinye nri anụ ụlọ] n’ime chọọchị.” E mere ihe ngosi ndị a bụ́ ndị na-egosi ọmụmụ Kraịst na chọọchị dị iche iche ná mmalite nke oge mba ọzọ na-achị Mexico. Ọ bụ ndị mọnk bụ́ ndị na-eso ụzọ Francis haziri ha iji kụziere ndị India banyere Ọmụmụ Kraịst ahụ. Mgbe e mesịrị, posada ghọrọ ihe a ma ama karị. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ nzube mbụ e ji malite ya, otú e si eme posada taa na-ekpughe ihe ọ bụ n’ezie. Ọ bụrụ na ị nọ na Mexico n’oge ememe a, ị pụrụ ịhụ ma ọ bụ chọpụta ihe otu onye edemede n’akwụkwọ akụkọ bụ́ El Universal mere ka ọ pụta ìhè n’okwu ya: “Posada, nke bụ́ ụzọ isi chetara anyị njem nne na nna Jisọs mere ka ha nọ na-achọ ụlọ ebe a pụrụ ịnọ mụọ Chineke Bụ́ Nwata, bụzi nanị ụbọchị ịṅụbiga mmanya ókè, imebiga ihe ókè, iribiga nri ókè, ime ihe na-enweghị isi, na ịrị elu nke mpụ.”

Echiche nke nacimiento malitere site n’ihe nkiri mbụ ndị e mere na chọọchị dị iche iche n’oge mba ọzọ na-achị Mexico. Ọ bụ ezie na ụfọdụ hụtara ya dị ka ihe na-adọrọ mmasị, ọ̀ na-egosi n’ụzọ ziri ezi ihe Bible na-ekwu? Nke ahụ bụ ajụjụ dabara adaba. Mgbe ndị ahụ a sị na ha bụ ndị amamihe atọ—ndị bụ́ n’ezie ndị na-agụ kpakpando—mere nleta ha, Jisọs na ezinụlọ ya ebighịzi n’ụlọ anụ ụlọ. Oge agafewo, ezinụlọ ahụ bizikwa n’ụlọ nkịtị. Ọ ga-akpali mmasị gị ịchọpụta nkọwa a zuru ezu dị n’ihe ndekọ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ nke dị na Matiu 2:1, 11. Ị pụkwara ịrịba ama na Bible ekwughị mmadụ ole ndị ahụ na-agụ kpakpando dị.a

Na Latin America, a na-eji ndị amamihe atọ ahụ edochi anya Santa Claus. Ma, dị ka a na-eme n’ala ndị ọzọ, ọtụtụ ndị nne na nna na-ezo ihe ụmụaka ji egwuri egwú n’ebe obibi ha. Mgbe ahụ, n’ụtụtụ January 6, ụmụaka na-achọgharị ha, dị ka a ga-asị na ọ bụ ndị amamihe atọ ahụ wetara ha. Nke a bụ oge ndị na-ere ihe ụmụaka ji egwuri egwú ji akpata ezigbo ego, ụfọdụ ejiriwo ihe ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu matara dị ka echiche efu, baa ọgaranya. Ọnụ ọgụgụ buru ibu, ọbụna n’etiti ụmụaka, adịghịzi anakwere akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme banyere ndị amamihe atọ ahụ. Ọ bụ ezie na ọ na-ewute ụfọdụ ndị na ndị kweere n’akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme a na-ebelata ebelata, gịnị ka mmadụ ọ bụla pụrụ ịtụ anya ya banyere echiche efu nke a nọgidere na-enwe nanị n’ihi ọdịnala na achụmnta ego?

Ndị Kraịst mbụ emeghị ememe Krismas, ma ọ bụ nke Ọmụmụ Kraịst. Otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma kwuru banyere nke a, sị: “E meghị ememe ahụ na narị afọ mbụ nke chọọchị ndị Kraịst, ebe ọ bụ na ụkpụrụ ndị Kraịst n’ozuzu ha bụ ime ememe ncheta ọnwụ nke ndị a ma ama kama ime nke ọmụmụ ha.” Bible na-ejikọ ememe ncheta ọmụmụ na ndị ọgọ mmụọ, ọ bụghị ya na ndị na-efe Chineke ezi ofufe.—Matiu 14:6-10.

N’ezie, nke a adịghị apụta na ọ baghị uru ịmụ na icheta ihe omume ndị bụ́ eziokwu bụ́ ndị metụtara ọmụmụ nke Ọkpara Chineke. Ihe ndekọ bụ́ eziokwu bụ́ nke dị na Bible na-enye ndị nile na-achọ ime uche Chineke nghọta na ihe mmụta ndị dị mkpa.

Ọmụmụ Jisọs Dị Ka Bible Si Kwuo

Ị ga-ahụ ihe ọmụma a pụrụ ịdabere na ya banyere ọmụmụ Jisọs n’Oziọma Matiu na Luk. Ha na-egosi na mmụọ ozi Gebriel letara nwa agbọghọ na-alụghị di nke aha ya bụ Meri bụ́ onye nọ n’obodo Nazaret nke Galili. Ozi dị aṅaa ka o ziri ya? “Leekwa, ị ga-atụrụ ime, mụta Nwa nwoke, kpọọ aha Ya Jisọs. Nwa nwoke ahụ ga-abụ onye ukwu, a ga-akpọkwa Ya Ọkpara nke Onye kachasị ihe nile elu: Onyenwe anyị Chineke ga-enyekwa Ya ocheeze nna Ya Devid: Ọ ga-abụkwa eze ụlọ Jekọb ruo mgbe nile ebighị ebi; alaeze Ya agaghị agwụkwa agwụ.”—Luk 1:31-33.

Ozi a juru nnọọ Meri anya. Ebe ọ na-alụbeghị di, o kwuru, sị: “Ihe a ga-esi aṅaa mee, ebe ọ dịghị nwoke m maara?” Mmụọ ozi ahụ zara, sị: “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye kachasị ihe nile elu ga-ekpuchikwa gị: n’ihi na Ihe dị nsọ nke ị dị ime Ya, a ga-akpọ Ya Ọkpara Chineke.” N’ịghọta na ihe a bụ uche Chineke, Meri kwuru, sị: “Lee, abụ m ohu nwanyị nke Onyenwe anyị; ya dịrị m ka okwu gị si dị.”—Luk 1:34-38.

Otu mmụọ ozi gwara Josef banyere nwa ahụ a ga-amụ n’ụzọ ọrụ ebube ka o wee ghara ịgba Meri alụkwaghịm, bụ́ ihe ọ nọ na-eme atụmatụ ime mgbe ọ matasịrị banyere ime ahụ ọ dị. Mgbe ahụ, o jikeere iburu ibu ọrụ nke ilekọta Ọkpara Chineke.—Matiu 1:18-25.

E mesịa, iwu sitere n’aka Siza Ọgọstọs manyere Josef na Meri isi Nazaret dị na Galili gaa Betlehem dị na Judia, bụ́ obodo nna nna ha, iji debanye aha ha n’akwụkwọ. “Mgbe ha nọ ebe ahụ, ụbọchị ya zuru ka ọ ga-amụta nwa. O wee mụta Nwa nwoke mbụ ya; o wee kee Ya n’ákwà okike, nyiwe Ya n’ihe a na-etinye nri anụ ụlọ, n’ihi na ụzọ adịghị nye ha n’ụlọ ndị ije.”—Luk 2:1-7.

Luk 2:8-14 na-akọwa ihe sochirinụ: “Ndị ọzụzụ atụrụ dị n’otu ala ahụ na-anọ n’ọhịa, na-echekwa ìgwè atụrụ ha n’abalị. Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị wee guzo ha nso, ebube nke Onyenwe anyị mụwakwara ha gburugburu: ha wee tụọ egwu nke ukwuu. Mmụọ ozi ahụ wee sị ha, Unu atụla egwu; n’ihi na lee, ana m ezi unu ozi ọma nke oké ọṅụ nke ga-adịrị ndị Israel nile: n’ihi na taa n’obodo Devid ka a mụrụ nye unu Onye nzọpụta, Nke bụ́ Kraịst Onyenwe anyị. Nke a ga-abụkwara unu ihe ịrịba ama Ya; Unu ga-ahụ Nwa ọhụrụ e kere n’ákwà okike, na-edinakwa n’ihe a na-etinye nri anụ ụlọ. Na mberede ìgwè usuu ndị mmụọ ozi nke eluigwe wee nọnyere mmụọ ozi ahụ, na-eto Chineke, sị, Otuto dịrị Chineke n’ebe kachasị ihe nile elu, udo dịkwa n’elu ụwa n’etiti mmadụ ndị ihe ha dị Ya ezi mma.”

Ndị ahụ Na-agụ Kpakpando

Ihe ndekọ Matiu na-ekwu na ndị na-agụ kpakpando bụ́ ndị si Ọwụwa Anyanwụ bịara Jerusalem ịchọ ebe a mụrụ Eze ndị Juu. Eze Herọd nwere nnọọ mmasị na nke a—ma o bughị ezi ihe n’obi. “O wee zie ha jee Betlehem, sị, Gaanụ chọpụta nke ọma okwu banyere Nwatakịrị ahụ; ma mgbe ọ bụla unu ga-achọta Ya, bịa kọọrọ m, ka mụ onwe m wee jeekwa kpọọ isiala nye Ya.” Ndị ahụ na-agụ kpakpando chọtara nwatakịrị ahụ ma “kpughee igbe akụ̀ ha, chee onyinye n’ihu Ya, ọlaedo na frankincense na myrrh.” Ma ha alaghachikwurughị Herọd. “Chineke dụrụ ha ọdụ ná nrọ ka ha ghara ịlaghachi jekwuru Herọd.” Chineke ji mmụọ ozi dọọ Josef aka ná ntị banyere ihe Herọd na-ezube ime. Josef na Meri kuruziiri nwa ha nwoke gbaga Ijipt. Ọzọ, ná mgbalị ajọ Eze Herọd mere iji gbuo Eze ọhụrụ ahụ, o nyere iwu ka e gbuo ụmụntakịrị nwoke nile nọ n’ógbè Betlehem. Olee ụmụntakịrị nwoke ndị ha bụ? Ha bụ ndị dị site n’afọ abụọ gbadaa.—Matiu 2:1-16.

Gịnị Ka Anyị Pụrụ Ịmụta Site n’Ihe Ndekọ Ahụ?

Ndị ahụ na-agụ kpakpando bụ́ ndị bịara nleta—mmadụ ole ọ sọrọ ha ha dịrị—efeghị ezi Chineke ahụ. Nsụgharị Bible bụ́ La Nueva Biblia Latinoamérica (Mbipụta nke 1989) na-ekwu n’ihe odide ala ala peeji ya, sị: “Ndị Magus ahụ abụghị ndị eze, kama ha bụ ndị dibịa afa na ndị nchụàjà nke okpukpe ndị ọgọ mmụọ.” Ha bịara n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ọmụma ha banyere kpakpando ndị ha na-amụ banyere ha. Ọ bụrụ na Chineke chọrọ iduru ha gaa n’ebe nwa ọhụrụ ahụ nọ, ọ gaara eduru ha gaa kpọmkwem n’ebe ọ nọ n’ebughị ụzọ duga ha Jerusalem nakwa n’obí eze Herọd. Mgbe e mesịrị, Chineke mere ihe iji mebie atụmatụ ha iji chebe nwata ahụ.

N’oge Krismas, ihe ndekọ a na-abụkarị nke e ji akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme na ndị e chepụtara echepụta mejupụta, bụ́ ndị na-eme ka a ghara ịghọta ihe kasị mkpa: na a mụrụ nwa ọhụrụ a ịbụ Eze dị ebube, dị ka a maara Meri na ndị ọzụzụ atụrụ ahụ n’ọkwa. Ee e, Jisọs Kraịst abụghịzi nwa ọhụrụ, ma ọ bụ ọbụna nwata. Ọ bụ ya bụ Eze na-achị achị nke Alaeze Chineke, bụ́ nke ga-ewepụ ịchịisi nile na-emegide uche Chineke n’isi nso, ọ ga-edozikwa nsogbu nile nke ihe a kpọrọ mmadụ. Nke ahụ bụ Alaeze anyị na-arịọ maka ya n’Ekpere Onyenwe Anyị.—Daniel 2:44; Matiu 6:9, 10.

Site n’ihe ndị mmụọ ozi ahụ gwara ndị ọzụzụ atụrụ ahụ, anyị na-amụta na ohere maka nzọpụta ghere oghe nye ndị nile dị njikere ịṅa ntị n’ozi nke ozi ọma ahụ. Ndị nwetara ihu ọma Chineke na-aghọ “ndị ihe ha dị Ya ezi mma.” E nwere atụmanya ndị dị ebube maka udo n’ụwa nile n’okpuru Alaeze Jisọs Kraịst, ma ndị mmadụ aghaghị ịdị njikere ime uche Chineke. Oge Krismas ọ̀ na-enye aka ime nke a, ọ̀ na-egosipụtakwa ọchịchọ ahụ? Ọtụtụ ndị nwere ezi obi bụ́ ndị chọrọ ịgbaso Bible na-eche na azịza ya doro anya.—Luk 2:10, 11, 14.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ọ dị nkọwa ọzọ a na-ekwesịghị ileghara anya: Na nacimiento nke ndị Mexico, e zoro aka n’ebe nwa ọhụrụ ahụ nọ dị ka “Chineke bụ́ Nwata,” na-enye echiche na ọ bụ Chineke n’onwe ya bịara n’ụwa dị ka nwa ọhụrụ. Otú ọ dị, Bible na-egosi Jisọs ịbụ Ọkpara Chineke nke a mụrụ n’ụwa; ya na Jehova, bụ́ Chineke pụrụ ime ihe nile, abụghị otu onye ma ọ bụ hara nhata. Tụlee ihe bụ́ eziokwu banyere nke a, bụ́ nke e gosipụtara na Luk 1:35; Jọn 3:16; 5:37; 14:1, 6, 9, 28; 17:1, 3; 20:17.

[Igbe dị na peeji nke 4]

ỤFỌDỤ GA-ENWE IHE IJUANYA

N’akwụkwọ ya bụ́ The Trouble With Christmas, onye edemede bụ́ Tom Flynn kọwara nkwubi okwu ndị o ruru na ha mgbe o jisịrị ọtụtụ afọ nyochaa Krismas:

“Ọnụ ọgụgụ dị nnọọ ukwuu nke ọdịnala ndị anyị na-ejikọta ha na Krismas ugbu a malitere n’ọdịnala nke okpukpe ndị ọgọ mmụọ ndị malitere tupu oge ndị Kraịst. Ụfọdụ n’ime ha nwere ihe ndị na-enye echiche mmekọrịta mmadụ na ibe ya, mmekọahụ, ma ọ bụ ihe ọmụmụ banyere usoro mbara igwe na ụwa bụ́ ndị pụrụ ime ka ndị gụrụ akwụkwọ, ndị maara banyere omenala n’oge a kwụsị ikere òkè n’ọdịnala ndị ahụ ozugbo ha ghọtara ebe ha si malite n’ụzọ ka doo anya.”—Peeji nke 19.

Mgbe Flynn nyesịrị ọtụtụ ihe ọmụma iji kwado okwu ya, ọ laghachiri n’ihe ahụ bụ́ isi: “Otu n’ime ihe kasị bụrụ ihe na-ekwekọghị ekwekọ banyere Krismas bụ ịdị nnọọ ole na ole nke ihe ndị bụ́ nke ndị Kraịst n’ezie a na-eme na ya. Ozugbo anyị wepụsịrị ihe ndị malitere tupu oge ndị Kraịst bụ́ ndị a na-eme na ya, ihe ka ukwuu n’ihe ndị ga-afọdụ ga-abụ ihe ndị malitere mgbe oge ndị Kraịst gasịrị, kama ịbụ ndị si n’aka ndị Kraịst n’ezie malite.”—Peeji nke 155.

[Foto dị na peeji nke 7]

Ọkwa a mara banyere ọmụmụ Jisọs nyere ihe ndabere maka ọrụ ọ ga-arụ n’ọdịnihu dị ka Eze Chineke họpụtara

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya