Nsogbu nke Ịkpa Ókè
“ỊHA NHATA PỤRỤ ỊBỤ IHE RUURU MMADỤ MA ELEGHỊ ANYA, MA Ọ DỊGHỊ IKE DỊ N’ỤWA NKE PỤRỤ IME KA E NWETA YA.”
Ihe a ka Honoré de Balzac, bụ́ onye France na-ede akwụkwọ ọgụgụ na narị afọ nke 19, kwuru. Ì kweere n’ihe o kwuru? Ọtụtụ ndị na-eche, dị ka e si kee ha, na ịkpa ókè dị njọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọbụna na narị afọ nke 21 a, ọha mmadụ ka bụ nke e kewara gaa n’imerime ọkwá.
CALVIN COOLIDGE, bụ́ president United States site na 1923 ruo 1929, nwere nchegbu banyere nsogbu nke ịkpa ókè ọkwa ma kwuo banyere “mkpochapụ a ga-emesị kpochapụ òtù ndị oké ozu nile.” Otú o sina dị, ihe dị ka afọ 40 Coolidge chịsịrị, Òtù Nnyocha nke Kerner, bụ́ nke a họpụtara inyocha njikọ dị n’etiti agbụrụ dị iche iche, kwupụtara ụjọ ya na United States ga-aghọrịrị òtù abụọ: “otu ga-abụ nke ndị isi ojii, otu ga-abụ nke ndị ọcha—ha ga-anọrọ onwe ha, ha agaghịkwa aha nhata.” Ụfọdụ na-ekwu na amụma a emezuolarị nakwa na “nkewa n’ihe banyere akụ̀ na ụba na agbụrụ na-arịwanye elu” ná mba ahụ.
N’ihi gịnị ka o ji taa akpụ imezu echiche nke ụmụ mmadụ ịha nhata? Otu isi ihe kpatara ya bụ ọdịdị mmadụ. Onye sobu n’òtù ndị omeiwu United States bụ́ William Randolph Hearst kwuru n’otu oge, sị: “Ma ọ dịghị ihe ọzọ, e kere mmadụ nile n’ụzọ ha nhata n’otu akụkụ, akụkụ ahụ bụkwa ọchịchọ ha ịbụ ndị na-ahaghị nhata.” Gịnị ka o bu n’uche? Ikekwe onye France na-eme egwuregwu nke narị afọ nke 19 bụ́ Henry Becque kwuru ya n’ụzọ ka doo anya, sị: “Ihe mere ịha nhata ji bụrụ ihe siri nnọọ ike nnweta otú ahụ bụ na anyị na-achọ ya nanị n’ebe ndị ka anyị n’ọkwá nọ.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ndị mmadụ chọrọ ka ọ bụrụ ndị ka ha n’ọkwá ka ha na ha ga-aha nhata; ma, ọ bụ mmadụ ole na ole ga-adị njikere ibelata ihe ùgwù na ihe ịga nke ọma ha site n’ime ka ha na ndị ha weere dị ka ndị ha ka n’ọkwá hara nhata.
N’oge ndị gara aga, ndị mmadụ na-abụ ndị a mụrụ dị ka ndị nkịtị, ndị a mụrụ n’ezinụlọ ndị oké ozu, ma ọ bụ ọbụna n’obí eze. Otú ahụ ka ọ ka dịkwa n’ebe ụfọdụ. Otú ọ dị, n’ọtụtụ ala taa, ọ bụ ego—ma ọ bụ enweghị ego—na-ekpebi ma mmadụ ọ nọ n’ọkwá dị ala, nke etiti, ma ọ bụ na nke dị elu. Ma, e nwere ihe ndị ọzọ na-ekpebi ọkwá mmadụ nọ na ya, dị ka agbụrụ, agụmakwụkwọ, na mmụta. N’ebe ụfọdụkwa, ịbụ nwoke ma ọ bụ nwanyị bụ isi ihe na-ebute ịkpa ókè, ebe a na-ele ụmụ nwanyị anya dị ka ndị nọ n’ọkwá dị ala.
Olileanya Ọ̀ Dịtụ?
Iwu ndị metụtara ihe ndị ruuru mmadụ enyewo aka wepụtụ ihe mgbochi ụfọdụ nke ọkwá. E tiri iwu megidere mkpapụ iche na United States. A machibidoro ịkpa ókè agbụrụ iwu na South Africa. Ịgba ohu, ọ bụ ezie na ọ ka dị, bụ ihe iwu megidere n’ọtụtụ ebe n’ụwa. Mkpebi ikpe dị iche iche emeela ka ụfọdụ ụmụ amaala nwee ikike inweta ala, iwu ndị megidere ịkpa ókè emewokwa ka ụfọdụ ndị ụwa na-atụ n’ọnụ nweta ahụ́ efe.
Nke a ọ̀ na-egosi na ịkpa ókè akwụsịla? Ọ dịchaghị egosi. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na e mewo ka ụfọdụ ịkpa ókè belata, a malitela inwe ụdị ịkpa ókè ndị ọhụrụ. Akwụkwọ bụ́ Class Warfare in the Information Age na-ekwu, sị: “Ókè a na-akpa n’òtù ndị nna ukwu na ndị ọrụ n’ozuzu ha yiri ihe na-ekwesịghị ekwesị taa, ma ọ dị otú a n’ihi na nnukwu òtù abụọ a ekewasịala gaa n’obere ìgwè nke ndị iwe ji.”
Ịkpa ókè ọ̀ ga-anọgide na-ekewa ndị mmadụ ruo mgbe ebighị ebi? Dị ka isiokwu na-esonụ ga-egosi, ọnọdụ a abụghị nke olileanya na-adịghị na ya.