Ebe Agụmakwụkwọ nke Watchtower Ezipụ Ndị Ozi Ala ọzọ
ỤLỌ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead enwewo klas ọmụmụ ihe n’ebe dị iche iche. N’agbata 1943 na 1960, n’ihe owuwu ndị dị na South Lansing, New York, U.S.A., 35 klas, nke ihe mejupụtara ya bụ ụmụ akwụkwọ si 95 ala, nwetara ọzụzụ pụrụ iche. Mgbe ahụ ụlọ akwụkwọ ahụ kwafere n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile dị na Brooklyn, New York, ebe ọ rụrụ ọrụ ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 28 afọ. Malite na 1988 ruo ná mmalite 1995, Ụlọ Akwụkwọ Gilead nwere klas ọmụmụ ihe na Wallkill, New York.
N’ime afọ ndị a ụlọ akwụkwọ ahụ gbasawanyere ụzọ o si arụ ọrụ. N’okpuru nduzi ya, e nyere klas atọ na Mexico ọzụzụ were izu iri; a chịkọtara ise n’ime ụdị klas ahụ na Germany; abụọ n’India. Eri 1987 ụlọ akwụkwọ ọzọ nọ n’okpuru ya nke a maara dị ka Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi enwewo klas ọmụmụ ihe na 34 ala, na-enye ụmụ okorobịa ruru eru ọzụzụ pụrụ iche na-ewe izu asatọ. Otú ọ dị, ntụziaka e nyere klas nke 99 nke Gilead, n’Ebe Agụmakwụkwọ nke Watchtower ahụ e wuru ọhụrụ na Patterson, New York, bụ ihe ọmụmụ were 20 izu, bụ́ nke gụnyere ihe ọmụmụ sara mbara nke Bible dum, ntụle nke akụkọ ihe mere eme na nhazi nke Ndịàmà Jehova nke oge a, tinyere ndụmọdụ sara mbara banyere ọrụ ozi ala ọzọ.
Na September 2, klas nke 99 ahụ gụsịrị akwụkwọ. Usoro ihe omume ngụsị akwụkwọ ahụ were hour atọ weere ọnọdụ n’ụlọ nzukọ ọhụrụ ahụ dị n’Ebe Agụmakwụkwọ nke Watchtower ahụ. O jupụtara n’ọnụ. Ndị ọzọ nọ n’ihe owuwu Betel dị na Patterson, Wallkill, na Brooklyn na-ege ntị bụ ndị e ji ígwè electronic jikọta. Nke a bụ ụbọchị na-akpali akpali ọ bụghị nanị nye klas ahụ na-agụsị akwụkwọ na ndị ikwu na ezi ndị enyi ha kamakwa nye ọtụtụ narị ndị keere òkè dị ka ndị ọrụ afọ ofufo n’iwu ihe owuwu ọhụrụ ụlọ akwụkwọ ahụ mara mma.
N’okwu mmeghe ya, Carey Barber nke Òtù Na-achị Isi lekwasịrị anya n’ịdị mkpa nke ihe na-ewere ọnọdụ. O kwuru, sị: “Nke a gaje ịbụ ebe bụ isi maka ọrụ agụmakwụkwọ kasị ukwuu nke Chineke nke a rụtụworo n’ụwa a.” Ọ kọwara na anyị na-akpụdewe njedebe nke ibu agha dị n’etiti mkpụrụ nwanyị ahụ na mkpụrụ nke agwọ ahụ. (Jenesis 3:15) Nanị ndị ga-alanarị nsọkọrịta isi ahụ na-emenye ụjọ n’oge mkpagbu ukwu ahụ na-abịanụ, ka o gosiri, ga-abụ ndị nwere ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke, ndị na-erubekwa isi na ya.
“Usoro agụmakwụkwọ anyị nwere ugbu a,” ka o kwupụtara, “bụ nke a haziri iji mee ka ndị Jehova n’ebe nile nọrọ n’ọnọdụ dị mma nke ntozu okè a kọwara n’Ilu 1:1-4—nke ịma amamihe na ịdọ aka ná ntị, inwe ike ịghọta nghọta, ịnara ịdọ aka ná ntị ahụ nke na-enye uche, ezi omume, ikpe, izi ezi, na izuzu.” Lee ihe nchebe ọ bụ inwe akụ̀ ime mmụọ ndị dị otú ahụ!
Ndụmọdụ Nye Klas ahụ Na-agụsị Akwụkwọ
Usoro okwu ise dị mkpirikpi nke a gwara klas ahụ na-agụsị akwụkwọ sochiri okwu mmeghe ndị ahụ. Harold Jackson, onye bụbu onye nkụzi nke Gilead, onye sokwa ugbu a ná ndị ọrụ nke isi ụlọ ọrụ dị na Brooklyn, gbara klas ahụ ume, sị, “Rapagidesie Ike n’Afọ Ojuju Gị nke Chineke.” Lloyd Barry, onye bụworo onye ozi ala ọzọ ruo ogologo oge, onye sokwa ugbu a n’Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Iji Ịdị Umeala n’Obi Na-ejere Jehova Ozi.” Ọ kọwara na àgwà a ga-adị mkpa nye ndị ahụ gụsịrị akwụkwọ ná mgbanwe ha gaa n’ọnọdụ ọhụrụ tinyere ná mmekọrịta nke ha na ndị ozi ala ọzọ ibe ha, ha na ọgbakọ ndị ha ga-eje ozi na ha, na ha na ndị obodo.
Karl Adams, onye na-eje ozi ugbu a dị ka otu n’ime ndị nkụzi nke Gilead sooro klas ahụ tụgharịa uche n’ajụjụ bụ́ “Gịnị Ka Okwukwe Ga-eduje Gị Ime?” Ọ gbara ha ume ka ha ghara ịdị ka ndị Israel ahụ mere mkpesa banyere ọnọdụ ndị dị n’ọzara ma nwee ọchịchọ ịlaghachi n’Ijipt kama, ka ha dị ka Abraham, bụ́ onye legara anya n’Alaeze Chineke kama ịlaghachi na Ua nke Kaldea dị ka ngwọta nke nsogbu dị iche iche. (Ọpụpụ 16:2, 3; Ndị Hibru 11:10, 15, 16) Ulysses Glass, bụ́ onye na-edebanye aha n’ụlọ akwụkwọ ahụ, jiri ahụmahụ Esaf dị ka e dekọrọ n’Abụ Ọma 73 mee ihe iji dụọ ndị klas ahụ na-agụsị akwụkwọ ọdụ, “Gbakọọ Ngọzi Gị Nile.” Albert Schroeder kwa, onye so na Kọmitii Izi Ihe nke Òtù Na-achị Isi kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Jehova Na-enye Ihe.” Dị ka ihe àmà nke inye ihe dị otú ahụ, o zoro aka n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead n’onwe ya na òkè ọ na-ekere n’ịrụzu oké ọrụ ahụ nke ime nkwusa na ime ndị na-eso ụzọ.
Ka e mesịrị, ndị na-ege ntị ji oké mmasị ṅaa ntị mgbe Milton Henschel, bụ́ onye isi oche nke Watch Tower Society, kwuru okwu banyere “Ihe Dị n’Ahụ Ibe Anyị.” Ọ gụrụ ma kwuo okwu n’ụzọ sara mbara ná Ndị Rom isi nke 12. Gụnyere ihe ndị ọzọ, o kwuru, sị: “Anyị aghaghị iburu n’uche na anyị na ndị ohu ibe anyị nọ n’ọgbakọ nwere mmekọrịta chiri anya.” O kwukwasịrị: “Ọ dị mma ka anyị na-eche banyere ibe anyị mgbe nile dị ka ihe Jehova nwere, kama ịdị na-akatọ akatọ, kama ịdị na-achọpụta mmejọ, ka anyị na-enye aka mgbe nile. Anyị na-enyere onwe anyị aka mgbe anyị jigidere ịdị n’otu ime mmụọ nke ọgbakọ ndị Kraịst.” O gosiri otú a pụrụ isi gosipụta inye aka dị otú ahụ n’ịkwadebe nri n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ, na-eburu n’uche na ọ bụghị mmadụ nile pụrụ iri otu ụdị ihe ahụ. Ọ gbakwara ume ịdị na-enye aka kama ịdị na-eme nkatọ mgbe e so ndị Kraịst ibe anyị na-enwechaghị ka ọ hà ha na-eje ozi ubi. Ọ bụrụ na anyị na-enye aka n’ezie, na-ewuli elu, na-agbarịtakwa ibe anyị ume, ka Nwanna Henschel mere ka ọ pụta ìhè, “Jehova ga-ahụ anyị n’anya maka nke a.” Lee aha ndụmọdụ magburu onwe ya nke ahụ bụ nye ndị ozi ala ọzọ ndị ga na-eje ozi n’ala ndị dị nnọọ iche n’ebe ndị ha na-ahapụ!
Ịmata Klas ahụ nke Ọma Karị
Ụmụ akwụkwọ 48 ahụ nke klas nke 99 gbara 32 afọ ndụ ná nkezi, ha etinyewokwarịị ihe karịrị afọ 11 n’ozi oge nile.
Ịgba ajụjụ ọnụ ndị bụ akụkụ nke usoro ihe omume ngụsị akwụkwọ ahụ nyere ndị na-ege ntị ohere ịmata ole na ole n’ime ha nke ọma karị. Nikki Liebl, nke si United States, na Simon Bolton si England, kọrọ ihe ụfọdụ ndị tinyeworo okwukwe ha na Jehova ga-egboro ha mkpa anụ ahụ ha n’ule. Ha hụrụ nlekọta Jehova ka ha butere ozi oge nile ụzọ.
Isabelle Kazan, bụ́ onye asụsụ ala nna ya bụ French, kwuru na ya amụworị asụsụ Arabic iji gbaara ndị na-asụ Arabic nọ n’obodo ya àmà. Mgbe ọ malitere na 1987, ihe mejupụtara otu ìgwè ntakịrị dị na Paris bụ nanị ụmụnna anọ na-asụ Arabic, tinyere ya onwe ya na otu nwanna nwanyị ọzọ bụ́ ndị na-amụ asụsụ ahụ. (Ọ dịghị mfe. Ha ga-etinye hour asatọ n’ịkwadebe ọmụmụ ihe Ụlọ Nche ha kwa izu iji nwee ike ịza ajụjụ.) Mgbalị ahụ ọ̀ bara uru? Taa, e nwere ụmụnna ndị na-asụ asụsụ Arabic ndị a haziri gaa na sekit ise n’ime France nile. Nwa akwụkwọ ọzọ, bụ́ Miko Puro, kọrọ otú asụsụ French ọ mụrụ n’ụlọ akwụkwọ si nyere ya aka ime nkwusa gwa ndị Africa gbatara ọsọ ndụ n’ala nna ya bụ́ Finland, ọ ga-abakwa uru n’ọrụ ozi ala ọzọ ya na Benin. Bonny Bowes kọrọ mgba ọ gbara iji na-asụ asụsụ French n’ụzọ dị were were ka o wee nwee ike ije ozi n’ụzọ dị irè na Quebec, Canada. Bjarki Rasmussen, si Denmark, kọkwara ahụmahụ dị iche iche ya na nwunye ya nweworo n’afọ ndị ha jere ozi na Faeroe Islands. Ee, ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ ndị a bụ ndị ozi oge nile nweworo ahụmahụ.
E kenyere ndị ahụ gụsịrị akwụkwọ ọrụ na 19 ala—n’Africa, Central na South America, Ọwụwa Anyanwụ Europe, na Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. Ndị gụsịrị akwụkwọ na klas ndị bu ụzọ ejelaarị ozi n’ihe karịrị 200 ala. Ọtụtụ n’ime ndị ahụ gụsịworo akwụkwọ ka ji ọrụ n’aka n’ebe ndị e kenyere ha ọrụ. Ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ ndị a na-esonyere ha ugbu a n’ịgbasawanyekwu àmà Alaeze ahụ ruo ebe ụwa sọtụrụ.—Ọrụ 1:8.
[Foto ndị dị na peeji nke 25]
Klas agụmakwụkwọ n’Ebe Agụmakwụkwọ nke Watchtower
[Foto dị na peeji nke 26]
Klas nke 99 Na-agụsị Akwụkwọ nke Ụlọ Akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead
Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.
(1) Heffey, S.; Riley, E.; Mortensen, D.; Honable, A.; Bolton, J.; Poole, J.; Siimes, G.; Sousa, L. (2) Pashnitski, B.; Shepherd, D.; Pashnitski, W.; Järvinen, J.; Paulsen, K.; Rasmussen, E.; Schewe, C.; Olsson, L. (3) Paulsen, E.; Samsel, T.; Bowes, B.; Harris, E.; Kazan, I.; Liebl, N.; Sousa, P.; Puro, J. (4) Lager, K.; Lager, V.; Golden, K.; Bolton, S.; Johnson, M.; Johnson, S.; Liebl, A.; Rasmussen, B. (5) Harris, D.; Samsel, W.; Schewe, O.; Heffey, R.; Kazan, L.; Riley, T.; Järvinen, O.; Puro, M. (6) Mortensen, D.; Golden, R.; Honable, L.; Shepherd, M.; Bowes, R.; Siimes, T.; Poole, E.; Olsson, J.
[Foto ndị dị na peeji nke 27]
Ha ka nọ n’ozi ha: (aka ekpe) Charles Leathco na nwunye ya, bụ́ Fern, na Brazil, ndị gụsịrị akwụkwọ na klas nke mbụ na nke isii nke Gilead; (n’ala ala) Martha Hess, na Japan, onye gụsịrị akwụkwọ na klas nke asaa nke Gilead