Ụlọ Akwụkwọ Gilead Ezipụ Klas Ya nke 100
ỤLỌ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead ekerewo òkè dị mkpa ná nkwusa zuru ụwa ọnụ nke Alaeze Chineke n’oge a. Kemgbe Ụlọ Akwụkwọ Gilead malitere ịzụ ndị ozi ala ọzọ na 1943, ndị gụsịrị akwụkwọ na ya ejewo ozi n’ihe karịrị 200 ala. Na March 2, 1996, klas nke 100 gụsịrị akwụkwọ.
Ụmụ akwụkwọ ahụ agawo akwụkwọ n’oge mgbe ihe karịrị mita abụọ nke snow daworo n’Ebe Agụmakwụkwọ nke Watchtower dị na Patterson, New York. N’abụghị ihe ijuanya, snow nọ na-ada n’ụbọchị ha na-agụsị akwụkwọ. Ka o sina dị, ụlọ ezumezu juru n’ọnụ, ndị ọzọ mapụtaranụ nọ na-ege ntị na Patterson, Wallkill, na Brooklyn—2,878 mmadụ ná ngụkọta.
Theodore Jaracz, onye so na Kọmitii Izi Ihe nke Òtù Na-achị Isi, jere ozi dị ka onye isi oche. Mgbe ọ nabatasịrị ndị bịara abịa si ọtụtụ ala n’ụzọ na-ekpo ọkụ, ọ kpọrọ mmadụ nile òkù ka ha bilie ọtọ ma bụọ abụ nke nọmba 52. Ụlọ ezumezu ahụ jupụtara n’ụda olu n’ito Jehova ka ha bụrụ “Aha Nna Anyị,” site n’akwụkwọ bụ́ Sing Praises to Jehovah. Abụ ahụ, tinyere okwu onye isi oche banyere iji agụmakwụkwọ eto Jehova, setịpụrụ ọnọdụ maka usoro ihe omume nke ga-esochi.
Ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ Site n’Ọnụ Ndị Meworo Okenye
Ihe mejupụtara akụkụ mbụ nke usoro ihe omume ahụ bụ okwu ndị dị mkpirikpi nke ụfọdụ ndị bụworo ohu Jehova ruo ogologo oge gwara klas ahụ na-agụsị akwụkwọ. Richard Abrahamson, onye òtù nke isi ụlọ ọrụ bụ́ onye malitere ozi oge nile ya na 1940, gbara klas ahụ ume, sị: “Nọgide Na-abụ Ndị A Na-eme Ka Ha Guzozie.” O chetaara ha na ha ahụworị oge ndị e mere ka ha guzozie ná ndụ ha dị ka ndị Kraịst, tinyere ọnwa ise ha nke ịgụ akwụkwọ na Gilead. Ya mere n’ihi gịnị ka ha kwesịrị iji nọgide na-abụ ndị e mere ka ha guzozie?
Ọkà okwu ahụ kọwara na okwu Pọl onyeozi ji mee ihe ná 2 Ndị Kọrint 13:11 “pụtara usoro na-aga n’ihu, ịnọgide na-ekwenyere mkpụzi ma ọ bụ nnụcha nke Jehova na-enye mmadụ, mgbanwe dị mma, ka mmadụ wee ruo ụkpụrụ Jehova ndị chọkwuru mgbalị.” N’ọrụ e kenyere ha ná mba ọzọ, klas ahụ na-agụsị akwụkwọ ga-ezute ihe ịma aka ndị ọhụrụ nye okwukwe ha. Ọ ga-adị ha mkpa ịmụ asụsụ ọhụrụ, mee mgbanwe iji kwekọọ n’ọdịbendị na ọnọdụ obibi ndụ dị iche, ma gbanwee iji kwekọọ n’ụdị ókèala dị iche iche. Ha ga na-emesokwa ọdịdị mmadụ dị iche iche n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ ha nakwa n’ọgbakọ ọhụrụ ha ihe. Ọ bụrụ na ha ga-eji nlezianya tinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ n’ọnọdụ ndị a nile, ná njikere ịbụ ndị e mere ka ha guzozie, mgbe ahụ, dị ka Pọl onyeozi dere, ha pụkwara ‘ịnọgide na-aṅụrị ọṅụ.’
John Barr, otu onye n’ime mmadụ ise so n’Òtù Na-achị Isi bụ́ ndị keere òkè n’ihe omume ahụ, si ná 1 Ndị Kọrint 4:9 were isiokwu ya. O chetaara ndị na-ege ya ntị na ndị Kraịst bụ ihe nkiri nye ndị mmụọ ozi na ndị mmadụ. “Ịmara nke a,” ka o kwuru, “na-atụkwasị ihe nke ukwuu n’ịdị mkpa nke ụzọ ndụ onye Kraịst, karịsịa mgbe ọ ghọtara na site n’ihe ọ na-ekwu na ihe ọ na-eme, ọ pụrụ inwe mmetụta dị ịrịba ama n’ahụ ndị na-ekiri ya, ma ndị a na-ahụ anya ma ndị a na-adịghị ahụ anya. Ekwenyere m na nke a bụ ihe ọ ga-adị nnọọ mma ka unu nile ezi ụmụnna nwoke na nwanyị nke klas nke 100 nke Gilead cheta ka unu na-apụ gaa akụkụ nile dịpụrụ adịpụ nke ụwa.”
Nwanna Barr gbara 48 ụmụ akwụkwọ ahụ ume ka ha buru n’uche, ka ha na-enyere ndị yiri atụrụ aka ịmụta eziokwu ahụ, na “ọṅụ dị n’ihu ndị mmụọ ozi Chineke n’isi otu onye mmehie nke na-echegharị.” (Luk 15:10) Ka ọ na-ezo aka ná 1 Ndị Kọrint 11:10, o gosiri na omume mmadụ banyere ndokwa ọchịchị Chineke na-emetụta ọ bụghị nanị ụmụnna anyị nwoke na nwanyị ndị anyị na-ahụ kamakwa ndị mmụọ ozi anyị na-adịghị ahụ. Lee ka o si baa uru iburu n’uche echiche a sara mbara karị!
Onye ọzọ so n’Òtù Na-achị Isi, bụ́ Gerrit Lösch, onye bụ́ n’onwe ya onye gụsịrị akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead, tụlere akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị ka Abụ Ọma 125:1, 2; Zekaraịa 2:4, 5; na Abụ Ọma 71:21 iji gosi na Jehova ‘na-agba ndị ya gburugburu.’ Ọ na-enye ha nchebe n’akụkụ ọ bụla. Chineke ọ̀ ga-enye nchebe dị otú ahụ nanị n’oge oké mkpagbu ahụ? “Ee e,” ka ọkà okwu ahụ zara, “n’ihi na Jehova bụrịị ‘mgbidi ọkụ,’ nchebe nye ndị ya. Afọ ahụ sochiri afọ a lụsịrị agha bụ́ 1919 hụtara ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ ahụ ka ha na-achọsi ike ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ n’ụwa nile ka ọ bụrụ àmà nye mba nile. Ha bụ ndị nnọchiteanya nke Jerusalem ihe atụ ahụ dị n’eluigwe. Jehova na-ekwe nkwa inye ndị nnọchiteanya a dị ka otu ìgwè nchebe Chineke n’oge ọgwụgwụ ihe nile. Ya mere ònye pụrụ ịkwụsịli ha? Ọ dịghị.” Lee ka o si bụrụ ihe na-emesi obi ike nye ha na ndị nile na-esochi ha anya n’ime uche Chineke!
Ulysses Glass, onye nọteworo anya n’òtù ndị nkụzi nke ụlọ akwụkwọ ahụ, gbara klas ahụ ume ‘imere onwe ha ọnọdụ doro ahụ ná nzukọ Jehova zuru ụwa ọnụ.’ Ọnọdụ doro ahụ bụ ọnọdụ ma ọ bụ ọrụ kasị kwesị ikike ma ọ bụ omume mmadụ. “Unu ndị ga-abụ ndị ozi ala ọzọ enwetawo ọnọdụ unu ná nzukọ zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova,” ka o kwuru. “Ma, ọ bụ ezie na ọ bara uru ugbu a, nke a bụ nanị mmalite nke ndụ gị dị ka onye ozi ala ọzọ.” Ọ ga-adị ha mkpa itinyesi mgbalị ike iji jiri ikike ha mee ihe na ikwekọ n’ọrụ ndị pụrụ iche Jehova na nzukọ ya na-enye ha.
Wallace Liverance, onye òtù nke ndị nkụzi Gilead bụ́ onye jere ozi ruo afọ 17 na Bolivia kwuru okwu ikpeazụ n’akụkụ a nke usoro ihe omume ahụ. “Ùnu ga-anwa Chineke?” ka ọ jụrụ ìgwè ụmụ akwụkwọ ahụ. Olee otú ha kwesịrị isi eme ya? Mba Israel nwara Chineke n’ụzọ na-ezighị ezi. (Deuterọnọmi 6:16) “O doro anya na ịnwa Chineke site n’ime mkpesa ma ọ bụ ịtamu ntamu ma ọ bụ ikekwe site n’igosi enweghị okwukwe n’ụzọ o si na-elekọta ihe ezighị ezi,” ka ọkà okwu ahụ kwuru. “Mgbe unu garuru n’ebe ọhụrụ e kenyere unu ọrụ, guzogidenụ ọchịchọ ahụ,” ka ọ gbara ume ya. Ya mere, gịnị bụ ụzọ ziri ezi isi nwaa Chineke? “Ọ bụ site n’ikwere okwu ya, site n’ime kpọmkwem ihe ọ na-ekwu, mgbe ahụkwa na-ahapụ ihe ọ ga-apụta n’aka ya,” ka Nwanna Liverance kọwara. Dị ka a hụrụ na Malakaị 3:10, Jehova na-akpọ ndị ya òkù, sị: “Biko, nwaanụ m.” O kwere nkwa na ọ bụrụ na ha ejiri ikwesị ntụkwasị obi webata otu ụzọ n’ụzọ iri ha n’ụlọ akụ̀ nke ụlọ nsọ ahụ, ọ ga-agọzi ha. “Gịnị ma unu lee ọrụ ozi ala ọzọ unu anya n’otu ụzọ ahụ?” ka ọkà okwu ahụ jụrụ. “Jehova chọrọ ka unu nwee ihe ịga nke ọma na ya, ya mere nwaanụ ya. Nọgidesienụ ike n’ọrụ unu. Meenụ mgbanwe ndị ọ chọrọ ka unu mee. Tachienụ obi. Leenụ ma ọ bụ na ọ gaghị agọzi unu.” Lee okwu ndụmọdụ ọma ọ bụ nye ndị nile na-ejere Jehova ozi!
Mgbe a bụsịrị abụ, usoro ihe omume ahụ gbanwere site n’okwu ihu ọha gaa n’ịgba ajụjụ ọnụ ndị na-eme obi ụtọ.
Okwu Ndị Dị Irè Sitere n’Ubi
Mark Noumair, bụ́ onye òtù ọhụrụ nke ndị nkụzi Gilead, kpọrọ ụmụ akwụkwọ ahụ òkù ịkọ ahụmahụ ndị ha nweworo n’ozi ubi mgbe ha na-aga akwụkwọ. Ndị a mere ka uru nke iji ọgụgụ isi mee ihe pụta ìhè ma nyekwa ndị na-ege ntị echiche ndị dị irè ha pụrụ iji mee ihe.
N’oge agụmakwụkwọ ha, ụmụ akwụkwọ nọ na klas Gilead nke a nwetara abamuru karịsịa site n’ịbụ ndị pụrụ isoro ndị òtù Kọmitii Alaka sitere 42 mba, bụ́ ndị nọkwa n’Ebe Agụmakwụkwọ ahụ dị na Patterson maka ọzụzụ pụrụ iche, kpakọrịta. Ọtụtụ n’ime ha agụsịwo akwụkwọ site na Gilead ọtụtụ afọ gara aga. N’usoro ihe omume ahụ, a gbara ndị nnọchiteanya sitere na klas nke 3, nke 5, nke 51, na nke 92, nakwa Ngalaba Ụlọ Akwụkwọ Gilead na Germany ajụjụ ọnụ. Lee ka okwu ha si bụrụ ihe bara uru!
Ha kwuru otú ọ dị ndị ozi ala ọzọ n’ahụ ka ha hụworo ka ọnụ ọgụgụ nke ndị na-enye Jehova otuto n’ebe e kenyere ha ọrụ na-amụba site n’ole na ole gaa n’ọtụtụ iri puku. Ha kọrọ banyere òkè ha kerewooro n’iji ozi ọma ahụ gaa n’ebe obibi ndị dịsasịrị adịsa n’Usoro Ugwu Andes na obodo nta ndị dị n’isi mmiri nke Osimiri Amazon. Ha tụlere ịgbara ndị na-amaghị akwụkwọ àmà. Ha kọrọ banyere mgba nke ha onwe ha gbara ịmụ asụsụ ndị ọhụrụ nakwa ihe ndị ahụ gụsịrị akwụkwọ pụrụ ịtụ anya ya n’ụzọ ezi uche dị na ya banyere ngwa ngwa ha ga-enwe ike ịgba àmà na ikwu okwu ihu ọha n’asụsụ dị ka Chinese. Ọbụna ha mere ihe ngosi nke ihe atụ iche ozi ọma n’ihu ndị mmadụ n’asụsụ Spanish na Chinese. Ha mesiri ya ike na ndị ozi ala ọzọ na-adịkarịsị irè mgbe ha mụtara ọ bụghị nanị asụsụ kamakwa echiche nke ndị ahụ. Ha kọrọ banyere ọnọdụ obibi ndụ siri ike a na-ahụkarị n’ala ndị dara ogbenye ma kwuo, sị: “Ndị ozi ala ọzọ kwesịrị ịghọta na ọnọdụ a na-abụkarị n’ihi nrigbu. Onye ozi ala ọzọ na-eme nke ọma karịsịa ma ọ bụrụ na o nwee mmetụta dị ka Jisọs nwere—o nwere ọmịiko n’ahụ ndị ahụ, bụ́ ndị yiri atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.”
Mgbe a bụsịrị abụ, usoro ihe omume ahụ gara n’ihu site n’okwu nke A. D. Schroeder, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi kwuru. O nwere ihe ùgwù nke ịbụ otu n’ime ndị nkụzi mbụ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilead mgbe e mepere ya na 1943. Dị ka njedebe kwesịrị ekwesị nye usoro ihe omume ahụ, o kwuru okwu n’isiokwu bụ “Ito Jehova Dị Ka Eze Onyenwe Anyị.” Ntụle na-adọrọ mmasị nke Nwanna Schroeder tụlere Abụ Ọma nke 24 tọrọ ndị nile na-ege ntị ụtọ n’ịhụ ihe ùgwù dị ukwuu ọ bụ ito Jehova dị ka Eze Onyenwe anyị.
Mgbe e kesịrị diplọma, bụsịakwa abụ ikpeazụ, Karl Klein nke Òtù Na-achị Isi jiri ekpere sitere n’ala ala obi mechie. Lee usoro ihe omume dị irè na nke na-enye ume ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ nke ahụ bụ!
N’ụbọchị ndị sochiri ngụsị akwụkwọ ahụ, 48 ndị òtù nke klas nke 100 ahụ malitere ịpụ gawa n’ọrụ ozi ala ọzọ e kenyere ha n’ala 17. Ma ọ bụghị mgbe ahụ ka ha na-amalite ozi ha. Ha enweworị ihe ndekọ siri ike nke ozi oge nile nke ndị Kraịst. Mgbe ha denyere aha ha na Gilead, ná nkezi, ha dị 33 afọ ma tinyekwa ihe karịrị 12 afọ n’ozi oge nile. Ụfọdụ n’ime ha abụwo ndị òtù nke ezinụlọ Betel zuru ụwa ọnụ nke Watch Tower Society. Ndị ọzọ ejewo ozi dị ka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị. Ọtụtụ n’ime ụmụ akwụkwọ ahụ ekereworị òkè n’ụdị ụfọdụ nke ozi mba ọzọ—n’Africa, Europe, Ndịda America, àgwàetiti dị iche iche nke osimiri, na n’etiti ìgwè na-asụ asụsụ mba ọzọ ná mba a mụrụ ha. Ma ugbu a ha na-esonyere ọtụtụ ndị ozi ala ọzọ ndị ọzọ bụ́ ndị nweworo obi ụtọ inwe ike ikwu, sị, ‘Anyị ga-eje ozi n’ebe ọ bụla n’ụwa ebe a chọrọ anyị.’ Ọchịchọ si ha n’obi bụ iji ndụ ha too Jehova.
[Igbe dị na peeji nke 27]
Ihe Banyere Klas Ahụ:
Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 8
Ọnụ ọgụgụ mba e zijere ha: 17
Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 48
Nkezi afọ ndụ: 33.75
Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 17.31
Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 12.06
[Foto dị na peeji nke 26]
Ndị Na-agụsị Akwụkwọ na Klas nke 100 nke Watchtower Bible School of Gilead
Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.
(1) Shirley, M.; Grundström, M.; Genardini, D.; Giaimo, J.; Shood, W.; Phair, P.; Buchanan, C.; Robinson, D. (2) Pine, C.; Kraus, B.; Racicot, T.; Hansen, A.; Beets, T.; Berg, J.; Garcia, N.; Fleming, K. (3) Whinery, L.; Whinery, L.; Harps, C.; Giaimo, C.; Berg, T.; Mann, C.; Berrios, V.; Pfeifer, C. (4) Randall, L.; Genardini, S.; Kraus, H.; Fleming, R.; D’Abadie, S.; Shirley, T.; Stevenson, G.; Buchanan, B. (5) Robinson, T.; Garcia, J.; Harps, P.; Racicot, D.; D’Abadie, F.; Phair, M.; Stevenson, G.; Shood, D. (6) Beets, L.; Pfeifer, A.; Berrios, M.; Pine, J.; Mann, L.; Randall, P.; Grundström, J.; Hansen, G.