Ì Chetara?
Ì ritewo uru n’ịgụ mbipụta Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Lee ma ị̀ pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ:
• Olee ihe ụfọdụ mere e ji nwee oké ihe ọjọọ taa?
Otu n’ime ihe ndị na-akpata ihe ọjọọ bụ ọchịchọ ime ihe ọjọọ dị n’ime mmadụ. (Jenesis 8:21) Ihe ọzọ so akpata ya bụ na ọtụtụ mmadụ enweghị ezi ihe ọmụma banyere uche Chineke. Ọzọkwa, Setan, bụ́ onye ihe ọjọọ sitere n’aka, anọgidewo na-etinye aka n’ihe ụmụ mmadụ na-eme.—1/1, peeji nke 4-6.
• Olee uru ndị a pụrụ irite site n’okwu dị mma e kwuru na mgbe ya? (Ilu 12:25)
Ọ pụrụ ime ka onye a gwara ya nwee ùgwù onwe onye, gbaa ya ume ma kwalie ya ime ihe, ma mee ka onye ahụ mara na e ji ya kpọrọ ihe. Ọzọkwa, ka anyị na-enwe mmasị ịja ndị ọzọ mma, a na-enyere anyị aka ịhụ ebe ha na-eme nke ọma.—1/1, peeji nke 16-17.
• Olee ihe ndị dị n’ime igbe ọgbụgba ndụ ahụ?
Ihe ndị dị n’ime ya bụ mbadamba nkume abụọ ahụ e dekwasịrị Iwu ahụ na ha na mana. Mgbe Kora nupụchara isi, e tinyere mkpanaka Erọn n’ime Igbe ahụ ka ọ bụrụ ihe àmà nye ọgbọ ahụ. (Ndị Hibru 9:4) Ọ pụrụ ịbụ na e wepụrụ mkpanaka na mana ahụ n’ime Igbe ahụ tupu a rara ụlọ nsọ ahụ Solomọn wuru nye.—1/15, peeji nke 31.
• Gịnị mere ndị Juu nke oge Nehemaịa na-aghaghị iji weta nkụ n’ụlọ nsọ?
Iwu Mozis ekwughị ka a na-eji nkụ enye onyinye. Ma n’ụbọchị Nehemaịa, e nwere mkpa maka ịnọgide na-eweta nkụ iji na-esure àjà ndị a chụrụ n’elu ebe ịchụàjà n’ọkụ.—2/1, peeji nke 11.
• Gịnị bụ Ihe Odide Muratori?
Ọ bụ akụkụ nke otu ihe odide Latin. E bu ụzọ jiri Grik dee ihe ndị dị na ya n’ihe dị ka ná ngwụsị nke narị afọ nke abụọ O.A. O nwere ihe ndepụta kasị ochie nke akwụkwọ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst nke e weere dị ka ihe ndepụta a pụrụ ịtụkwasị obi, kwuokwa banyere akwụkwọ ndị ahụ na ndị dere ha.—2/15, peeji nke 13-14.
• Gịnị mere Eze Nwanyị Vashti nke Peshia ji jụwapụ isi ịga za òkù eze kpọrọ ya? (Esta 1:10-12)
Bible ekwughị ihe ndị mere o ji mee otú ahụ. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-ekwu na ọ jụrụ n’ihi na ọ chọghị ịkparị onwe ya n’ihu ndị ọbịa Eze ṅụrara anya. Ma ọ bụ ya abụrụ na nwunye eze a mara mma bụ onye isi ike, si otú ahụ na-esetịpụ ihe nlereanya ọjọọ nye ndị inyom ndị ọzọ bi na n’Alaeze Ukwu Peshia.—3/1, peeji nke 9.
• Olee otú ihe mgbapụta ahụ si anapụta anyị?
Àjà Jizọs chụrụ pụrụ ịnapụta anyị ná mmehie anyị ketara eketa, ọ pụkwara ịtọhapụ anyị n’ọnwụ nke mmehie ahụ kpatara. (Ndị Rom 6:23) Àjà a na-eme ka ezi Ndị Kraịst gharazie inwe obi amamikpe. Inwe okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ na-emekwa ka anyị kwụsị ịdị na-atụ ụjọ banyere mmekọrịta anyị na Chineke. (1 Jọn 2:1)—3/15, peeji nke 8.
• Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site ná mmachibido Iwu ahụ a machibidoro isi nwa ewu n’ime mmiri ara nke nne ya? (Ọpụpụ 23:19)
Isi nwa ewu otú ahụ nwere ike ịbụ ememe ndị ọgọ mmụọ na-eme iji dọọ mmiri. (Levitikọs 20:23) Chineke nyere nne ewu mmiri ara iji zụọ nwa ọhụrụ ya bụ́ nke ga-enyere nwa ọhụrụ ahụ aka n’uto ya. Isi nwa anụ ahụ a mụrụ ọhụrụ n’ime mmiri ara ahụ ga-abụ akwanyereghị mmekọrịta ahụ Chineke hiwere n’etiti nne na nwa ya ùgwù. Iwu a na-egosi obi ọmịiko nke Chineke.—4/1, peeji nke 31.