Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w08 11/1 p. 4-5
  • Gịnị n’Ezie Na-eme Mmadụ Mgbe Ọ Nwụrụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị n’Ezie Na-eme Mmadụ Mgbe Ọ Nwụrụ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị n’Ezie Bụ Hel?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ndị Ajọ Omume Hà Ga-aga Ọkụ Ala Mmụọ?
    Teta!—2009
  • Ọnwụ Abụghị Onye Iro A Na-apụghị Imeri Emeri
    Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
  • Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Nkwenye Gị ná Mbilite n’Ọnwụ Siruru n’Ike?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
w08 11/1 p. 4-5

Gịnị n’Ezie Na-eme Mmadụ Mgbe Ọ Nwụrụ?

“Mkpụrụ obi niile anaghị anwụ anwụ, ọbụna mkpụrụ obi nke ndị njọ . . . A na-eji ọkụ na-anaghị anyụ anyụ ata ha ahụhụ, ha agaghịkwa anwụ anwụ, ahụhụ ha enweghị ike ịkwụsị akwụsị.”—Clement nke Alexandria, onye na-ede akwụkwọ nke dịrị ndụ n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ itoolu gara aga.

DỊ KA Clement, ndị na-akụzi na hel bụ ebe a na-ata ndị mmadụ ahụhụ kweere na mkpụrụ obi mmadụ anaghị anwụ anwụ. Baịbụl ọ̀ kwadoro ozizi a? Tụlee otú Okwu Chineke si zaa ajụjụ ndị na-esonụ.

Mmadụ mbụ, bụ́ Adam, ò nwere mkpụrụ obi na-anaghị anwụ anwụ? Bible Nsọ nke Igbo Union Version kwuru banyere otú e si kee Adam, sị: “Jehova, bụ́ Chineke, wee were ájá sitere n’ala kpụọ mmadụ, O wee kuo ume ndụ nye n’ohere imi ya abụọ; mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.” (Jenesis 2:7) Cheta na amaokwu a asịghị na e nyere Adam mkpụrụ obi.

Olee ihe mechara mee Adam mgbe o mere mmehie? Chineke ekwughị na ya ga-ata ya ahụhụ ebighị ebi na hel. Kama nke ahụ, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik si otú a sụgharịa ihe Chineke kwuru: “Site n’ọsịsọ nke ihu gị ka ị ga-eji enweta nri gị, ruo mgbe ị ga-alọghachi n’ala ebe ọ bụ na ya ka i si pụta; ntụ ka ị bụ, na ntụ ka ị ga-alaghachi.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche; Jenesis 3:19) Ihe a Chineke kwuru enweghị ka o si gosi na o nwere ihe dị n’ahụ́ Adam nke nọgidere na-adị ndụ mgbe ọ nwụrụ. Mgbe Adam nwụrụ, mkpụrụ obi bụ́ Adam nwụrụ.

Ò nwere mmadụ nwere mkpụrụ obi na-anaghị anwụ anwụ? Chineke gwara Ezikiel onye amụma, sị: “Mkpụrụ obi ọbụla mehierenụ ga-anwụ.” (Ezikiel 18:4, nsụgharị Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik) Pọl onyeozi dere, sị: “Mmehie batara n’ụwa site n’aka otu onye [ya bụ, Adam], ọ bụkwa site na mmehie a ka ọnwụ ji bata n’ụwa. Ọnwụ wee si otu a gazuo mmadụ niile, n’ihina mmadụ niile mehiere.” (Ndị Rom 5:12, nsụgharị Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik) Ọ bụrụ na mmadụ niile na-eme mmehie, ihe ọ pụtara bụ na mkpụrụ obi niile na-anwụ anwụ.

Mkpụrụ obi nwụrụ anwụ ọ̀ ma ihe, ka ihe ọ̀ na-afụ ya ụfụ? Okwu Chineke kwuru, sị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.” (Ekliziastis 9:5, nsụgharị Bible Nsọ nke Igbo Union Version) Mgbe Baịbụl na-akọwa ihe na-eme mmadụ mgbe ọ nwụrụ, ọ sịrị: ‘Ọ na-alaghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya niile alawo n’iyi.’ (Abụ Ọma 146:4, nsụgharị Bible Nsọ nke Igbo Union Version) Ọ bụrụ na ndị nwụrụ anwụ “adịghị ama ihe ọ bụla,” ọ bụrụkwa na ‘echiche ha niile na-ala n’iyi,’ olee otú ọkụ ga-esi na-afụ ha ụfụ na hel?

Jizọs Kraịst ekwughị na onye nwụrụ anwụ ma ihe ọ bụla, kama, o ji ọnwụ tụnyere ụra.a (Jọn 11:11-14) Ma, ụfọdụ ndị nwere ike ikwu na Jizọs kụziri na ọkụ dị na hel nakwa na a ga-atụba ndị mmehie n’ọkụ mmụọ. Ka anyị tụlee ihe Jizọs kwuru n’ezie banyere hel.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ ebe a kọwara ya nke ọma, gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Anyị Mụtara n’Aka Jizọs—Banyere Olileanya Dịịrị Ndị Nwụrụ Anwụ,” nke dị na peeji nke 16 na nke 17.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya