Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w09 5/1 p. 18
  • Mgbe Jehova Kọwara Onwe Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbe Jehova Kọwara Onwe Ya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịmata Ụzọ Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Àgwà Jehova Ndị Magburu Onwe Ha
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2020
  • Ònye Bụ Ezi Chineke Ahụ?
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Mozis—Otú Ndụ Ya Si Emetụta Gị
    Teta!—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
w09 5/1 p. 18

Bịaruo Chineke Nso

Mgbe Jehova Kọwara Onwe Ya

Ọpụpụ 34:6, 7

OLEE otú ị ga-esi kọwaa Chineke, ụdị onye ọ bụ na otú o si eme ihe? Chegodị otú ọ ga-adị gị ma a sị na i nwere ike ịjụ Chineke banyere onwe ya ma nụrụ ka o ji ọnụ ya na-akọwara gị àgwà ndị o nwere. Ọ bụ ụdị ihe meere Mozis onye amụma. Obi dị anyị ụtọ na o si n’ike mmụọ nsọ dee ihe ahụ merenụ.

Mgbe Mozis nọ n’Ugwu Saịnaị, ọ rịọrọ Jehova, sị: “Biko, mee ka m hụ ebube gị.” (Ọpụpụ 33:18) N’echi ya, onye amụma ahụ nwere ohere ọma nke ịhụpere ebube Chineke.a Mozis akọghị ihe niile ọ hụrụ n’ọhụụ ahụ dị ebube. Kama nke ahụ, o dere ihe ka nnọọ mkpa, ya bụ, ihe Chineke kwuru. Ka anyị leba anya n’ihe Jehova kwuru, bụ́ nke e dere n’Ọpụpụ 34:6, 7.

Ihe mbụ Jehova kwuru banyere onwe ya bụ na ya bụ “Chineke nke na-eme ebere, na-emekwa amara.” (Amaokwu nke 6) Otu ọkà mmụta Baịbụl kwuru na okwu Hibru a sụgharịrị “na-eme ebere” na-egosi na Chineke “nwere ọmịiko, dị nnọọ ka nna na-enwe n’ebe ụmụ ya nọ.” Okwu a sụgharịrị ‘onye na-eme amara’ yiri okwu “e ji akọwa onye obi ya kpaliri inyere onye nọ ná mkpa aka.” O doro anya na Jehova chọrọ ka anyị mara na ya na-eji ịhụnanya si ya n’ala ala obi elekọta ndị na-efe ya ofufe otú ahụ ndị mụrụ ụmụ si elekọta ụmụ ha, ihe ndị na-akpa ha na-emetụkwa ya n’obi.—Abụ Ọma 103:8, 13.

Ihe ọzọ Jehova kwuru bụ na ya bụ “onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ.” (Amaokwu nke 6) Ọ naghị eweso ndị ohu ya nọ n’ụwa iwe ọsọ ọsọ. Kama nke ahụ, ọ na-enwere ha ndidi, na-edi ezughị okè ha ma na-enye ha ohere ka ha gbanwee omume ọjọọ ha.—2 Pita 3:9.

Chineke kwukwara na “obiọma ya na eziokwu ya dị ukwuu.” (Amaokwu nke 6) Obiọma, ma ọ bụ ịhụnanya na-adịgide adịgide, bụ àgwà dị oké mkpa nke na-eme ka Jehova na ndị ya nọgide na-adị n’ezigbo mma. (Diuterọnọmi 7:9) Ọ bụkwa n’ebe Jehova nọ ka eziokwu si malite. O nweghị ike iduhie onye ọ bụla, o nweghịkwa onye nwere ike iduhie ya. Ebe ọ bụ “Chineke nke eziokwu,” anyị nwere ike inwe nnọọ okwukwe n’ihe niile o kwuru, ma ihe ndị o kwere nkwa na ha ga-eme n’ọdịnihu.—Abụ Ọma 31:5.

Eziokwu ọzọ dị mkpa Jehova chọrọ ka anyị mara banyere onwe ya bụ na ọ “na-agbaghara njehie na mmebi iwu na mmehie.” (Amaokwu nke 7) Ọ ‘dị njikere ịgbaghara mmehie’ nke ndị mmehie chegharịrị echegharị. (Abụ Ọma 86:5) Ma, Jehova anaghị anabatatụ ihe ọjọọ. O kwuru na “ọ gaghị anwa anwa hapụ inye ntaramahụhụ.” (Amaokwu nke 7) Chineke anyị dị nsọ bụ́ onye na-ekpe ikpe ziri ezi agaghị ahapụ inye ndị ma ụma na-eme mmehie ntaramahụhụ. Mee elu mee ala, ha ga-eji isi ha buru ihe ha metara.

Nkọwa a Jehova kọwara àgwà ndị o nwere na-egosi nke ọma na ọ chọrọ ka anyị mara ya, marakwa ụdị onye ọ bụ na otú o si eme ihe. Nke a ọ́ naghị eme ka ị chọọ ịmatakwu àgwà ọma ndị o nwere?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mozis ejighị anya ya hụ Jehova, n’ihi na ọ dịghị mmadụ ga-ahụ Chineke ma dị ndụ. (Ọpụpụ 33:20) O doro anya na Jehova mere ka Mozis hụ ebube Ya n’ọhụụ, si n’ọnụ mmụọ ozi nke nọchiri anya ya gwa Mozis okwu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya