Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ, Ngwọta Zuru Ụwa Ọnụ
Ahụhụ dị ebe niile, ọtụtụ ndị na-enwekwa ọmịiko n’ahụ́ ndị na-ata ahụhụ. Dị ka ihe atụ, ndị ọrụ ahụ́ ike na-arụ ọrụ ehihie na abalị iji nyere ndị ahụ́ na-adịghị ma ọ bụ ndị merụrụ ahụ́ aka. Ndị na-aghọ ọkụ, ndị uwe ojii, ndị ome iwu, na ndị na-azọpụta ndị ọdachi dakwasịrị na-agba mbọ ibelata ma ọ bụ igbochi ahụhụ ndị ọzọ na-ata. Mbọ ndị ahụ na-enyere ndị mmadụ n’otu n’otu aka, ma ọ dịghị mmadụ ma ọ bụ òtù ụmụ mmadụ ọ bụla ga-akwụsịli ahụhụ n’ụwa niile. Ma, Chineke ga-akwụsịli ahụhụ n’ụwa niile, ọ ga-akwụsịkwa ya.
Akwụkwọ Baịbụl ikpeazụ mesiri anyị obi ike na nke a ga-eme, bụ́ ebe kwuru, sị: “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.” (Mkpughe 21:4) Chee echiche banyere mmadụ ole ga-erite uru ná nkwa ahụ. Nkwa ahụ gosiri na ihe niile Chineke kwuru banyere ịkwụsị ahụhụ niile bụ eziokwu. Ọ ga-eme nke ahụ site n’iwepụ agha, agụụ, ọrịa, ikpe na-ezighị ezi, na ndị ajọ omume niile, n’ụwa. O nweghị mmadụ ga-emeli nke ahụ.
Ihe Alaeze Chineke Ga-eme
Chineke ga-eji onye nke abụọ kacha elu n’eluigwe na ala, bụ́ Jizọs Kraịst a kpọlitere n’ọnwụ, mezuo nkwa ya. Oge na-abịa mgbe Jizọs ga-achị ụwa niile, n’enweghị onye na-ama ya aka. Ndị eze, ndị president, ma ọ bụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị agaghịzi achị ụmụ mmadụ. Kama nke ahụ, ọ bụ naanị otu Eze na otu ọchịchị ga-achị ụmụ mmadụ, ya bụ, Alaeze Chineke.
Alaeze ahụ ga-ewepụ ọchịchị niile nke ụmụ mmadụ. Ogologo oge gara aga, Baịbụl buru amụma, sị: “Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị. A gaghịkwa enyefe ndị ọ bụla ọzọ alaeze ahụ. Ọ ga-egwepịa alaeze ndị a niile, mee ka ha ghara ịdịkwa, ma ya onwe ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.” (Daniel 2:44) Ndị mmadụ n’ụwa niile ga-adị n’otu n’okpuru otu ọchịchị ezi omume, bụ́ Alaeze Chineke.
Mgbe Jizọs nọ n’ụwa dị ka mmadụ, o kwuru banyere Alaeze ahụ ọtụtụ ugboro. O kwuru banyere ya n’ekpere nlereanya ahụ, wee gwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere otú a: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:10) Ị̀ hụrụ na Jizọs gosiri na e nwere ihe jikọrọ Alaeze ahụ na ime uche Chineke n’ụwa? Ọ bụkwa uche Chineke iwepụ ahụhụ n’ụwa niile.
Ọchịchị ezi omume Chineke ga-eweta ngọzi ndị ọ na-adịghị ọchịchị mmadụ ga-ewetali ha. Cheta na Jehova nyere Ọkpara ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta ka ụmụ mmadụ wee nwee ike inweta ndụ ebighị ebi. Mgbe Alaeze ahụ ga-abara ụmụ mmadụ uru ga-achịwa, ụmụ mmadụ ga-eji nwayọọ nwayọọ zuo okè. Olee ihe ga-esi na nke ahụ pụta? Jehova “ga-eloda ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu niile.”—Aịzaya 25:8.
Ụfọdụ nwere ike ịjụ, sị: ‘Olee ihe mere Chineke emebeghị ihe kemgbe? Gịnị ka ọ na-eche?’ Jehova gaara eme ihe kemgbe iji kwụsị ma ọ bụ ọbụna gbochie ahụhụ niile ma ọ bụrụ na ọ chọrọ. Kama ime otú ahụ, o kwere ka ọ ka dịrị, ọ bụghị n’ihi ọdịmma nke ya, kama maka ọdịmma ebighị ebi nke ụmụ ya nọ n’ụwa. Ndị nne na nna hụrụ ụmụ ha n’anya ga-ekwe ka ha taa ahụhụ ma ọ bụrụ na ha maara na nke a ga-abara ha uru ruo ogologo oge. N’otu aka ahụ, e nwere ezigbo ihe ndị mere Jehova ji kwere ka ụmụ mmadụ taa ahụhụ nwa oge, Baịbụl kọwakwara ha. Ụfọdụ n’ime ha bụ mmadụ inwe ike ikpebiri onwe ya ihe ọ ga-eme, mmehie, na esemokwu banyere oruru o ruuru Jehova ịchị eluigwe na ala. Baịbụl kọwakwara na e nyere otu ajọ mmụọ ohere ịchị ụwa ruo oge ụfọdụ.a
Ọ bụ ezie na ebe a agaghị ezuru anyị ikwu ihe ndị ahụ niile, e nwere ihe abụọ nwere ike ịgba anyị ume ma mee ka anyị nwee olileanya. Nke mbụ bụ: Ngọzi Jehova ga-agọzi anyị ga-akarị ahụhụ ọ bụla anyị nwere ike ịta. E wezụga nke ahụ, Chineke mesiri anyị obi ike, sị: “A gaghị echeta ihe mbụ niile, ha agaghị abatakwa n’obi.” (Aịzaya 65:17) Chineke ga-ewepụ kpamkpam ahụhụ niile okwukwe o kwere ka ihe ọjọọ dịrị ruo nwa oge kpatara.
Nke abụọ bụ: Chineke ewepụtala oge a na-enweghị ike ịgbanwe agbanwe ọ ga-eji akwụsị ahụhụ. Cheta na onye amụma bụ́ Habakọk jụrụ Jehova mgbe ọ ga-ekwe ka ihe ike na ahụhụ dịruo. Jehova zara ya, sị: “Ọhụụ a bụ maka oge a kara aka . . . Ọ gaghị anọ ọdụ.” (Habakọk 2:3) Dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu na-eso nke a, “oge [ahụ] a kara aka” adịla nso.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ị chọọ ịgụkwu banyere ihe mere Chineke ji kwere ka ahụhụ dịrị, gaa n’isi 11 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Igbe dị na peeji nke 7]
Amaokwu Ndị Na-ekwu Maka Ọdịnihu Mara Mma
AGHA AGAGHỊ ADỊKWA:
“Bịanụ, hụ ọrụ dị iche iche nke Jehova, otú o si mee ihe ndị na-eju anya n’ụwa. Ọ na-eme ka agha kwụsị ruo na nsọtụ ụwa.”—Abụ Ọma 46:8, 9.
NDỊ ANYỊ HỤRỤ N’ANYA GA-EBILITE N’ỌNWỤ:
“A gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.”—Ọrụ 24:15.
MMADỤ NIILE GA-ENWE IHE ORIRI:
“Ọka ga-ejupụta n’elu ụwa; ọ ga-ejubiga ókè n’elu ugwu dị iche iche.”—Abụ Ọma 72:16.
ỌRỊA AGAGHỊ ADỊKWA:
“Ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’”—Aịzaya 33:24.
NDỊ AJỌ OMUME AGAGHỊ ANỌKWA:
“Ma a ga-ebipụ ndị ajọ omume n’ụwa; a ga-efopụkwa ndị na-aghọ aghụghọ na ya.”—Ilu 2:22.
A GA-ENWE IKPE ZIRI EZI:
“Lee! Otu eze [Kraịst Jizọs] ga-achị ka e wee nwee ezi omume; ndị isi ga-achịkwa dị ka ndị isi ka e wee nwee ikpe ziri ezi.”—Aịzaya 32:1.
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Alaeze Chineke ga-ewepụ ahụhụ ọ bụla anyị tarala