Otú E Si Kasie Ndị Mmadụ Obi Mgbe E Gbuchara Ọtụtụ Ndị n’Ụlọ Akwụkwọ
IHU otu akwụkwọ akụkọ jiri nnọọ oji. Naanị ihe e biri na ya bụ: “N’ihi Gịnị?” Nke ahụ bụ ajụjụ ndị mmadụ jụrụ ọtụtụ ugboro mgbe nwata nwoke dị afọ iri na asaa gbagburu ndị mmadụ aghara aghara na Winnenden, n’ebe ndịda Germany, gbuo mmadụ iri na ise ma mechaa gbagbuo onwe ya. E wetulatara ọkọlọtọ obodo Germany n’ebe niile ná mba ahụ, akụkọ ọjọọ a gbasakwara ngwa ngwa n’ebe niile n’ụwa.
Winnenden bụ obodo mara mma ma baa ọgaranya, nke nwegasịrị ubi vaịn na ubi mkpụrụ osisi. Ụtụtụ March 11, 2009, malitere nnọọ ka ụtụtụ ndị ọzọ n’Ụlọ Akwụkwọ Sekọndrị nke Albertville. Na mberede, mgbe o ji ọkara gafee elekere itoolu nke ụtụtụ, ime ihe ike na ọgba aghara malitere.
Otu nwa okorobịa iwe ji bu égbè o wetara n’ọnụ ụlọ nna ya tibata n’ụlọ akwụkwọ ebe ọ gara akwụkwọ. N’egbughị oge, ọ gbagburu ụmụ akwụkwọ itoolu na ndị nkụzi atọ n’ime klas atọ nakwa na paseeji, merụọ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ́. N’ime nkeji ole na ole, ndị uwe ojii wụchara ebe ahụ. Ogbu mmadụ ahụ gbagara n’ogige ụlọ ọgwụ na-agwọ ọrịa uche nke dị nsọ n’ebe ahụ. O gburu onye na-arụzi ihe n’ebe ahụ. Ọ tụgideziri otu onye ọkwọ ụgbọala égbè ma manye ya ịkwọrọ ụgbọala ahụ gawa ebe ọ chọrọ. Mgbe ha gbaruru ihe dị ka kilomita iri anọ, onye ọkwọ ụgbọala ahụ jisiri ike gbafuo. N’otu ebe a na-ere ụgbọala, nwa okorobịa ahụ bú égbè gbagburu otu onye na-ere ụgbọala na onye bịara ịzụ ya ahịa ma merụọ ndị uwe ojii abụọ ezigbo ahụ́, bụ́ ndị ọ fọrọ obere ka ha chụkwute ya. Mgbe ndị uwe ojii ahụ mechara jide ya, ọ gbara onwe ya égbè n’isi.
Ndị maara nwa okorobịa ahụ bú égbè kwuru na ọ bụ nwata isi jụrụ oyi nke chọrọ ka ndị mmadụ hụ ya n’anya, chọọkwa inwe ndị enyi. Olee ebe mmiri si baa n’opi ụgbọgụrụ? Ọ ga-abụ na o nwere mgbe obi dara ya mbà, o jikwa égbè ụmụaka gwurie egwu ma gwuo egwuregwu ike ụfọdụ na-ewu ewu a na-egwu na kọmputa. Ma, ụfọdụ ndị ga-asị na ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị ọtụtụ puku ndị ọzọ na-eto eto. Oleekwanụ banyere ndị ahụ ọ gbagburu? Ọ̀ dị ụdị ndị ọ họọrọ ịgbagbu, ka ọ̀ gbagburu onye ọ bụla ọ hụrụ? Ndị mmadụ na-ekwu ihe dị iche iche mere o ji gbagbuo ụmụaka nwaanyị asatọ ma gbuo naanị otu nwata nwoke. O nweghị onye nwere ike ịkọ kpọmkwem ihe mere o ji mee otú ahụ.
Ihe Ndị Mmadụ Mere Ozugbo Ahụ
Heike kwuru, sị: “Mgbe nwa anyị nwoke kpọrọ m gwa m banyere égbè a na-agba n’ụlọ akwụkwọ ha, o juru m anya. Ma mgbe m nụrụ ụda ọtụtụ ụgbọala ndị uwe ojii na ụgbọ e ji ebu ndị ọrịa ka ha na-agbafesị n’ike n’ike, ụjọ tụrụ m.” O yiri ka ihe mere nwa okorobịa ahụ bú égbè egbukwughị ndị mmadụ n’ụlọ akwụkwọ ahụ bụ na ndị uwe ojii rutere ngwa ngwa. Mgbe a kpọpụchara ndị mmadụ n’ụlọ akwụkwọ ahụ, ndị enyemaka n’ọrụ ahụ́ ike, ndị na-enye ndụmọdụ banyere ahụ́ ike, na ndị ụkọchukwu bịara ebe ahụ, rụgide ọrụ ruo mgbe ike gwụrụ ha iji nyere ụmụ akwụkwọ ahụ aka.
N’oge na-adịghị anya, ndị nta akụkọ jupụtara n’ụlọ akwụkwọ ahụ, na-anwa ịgba ụmụ akwụkwọ ajụjụ ọnụ, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha na-enwetabeghị onwe ha. Otu nwa akwụkwọ gụtara ụgbọala ndị nta akụkọ televishọn iri abụọ na asatọ a dọwara n’ihu ụlọ akwụkwọ ahụ, bụ́ nke ụlọ ọrụ mgbasa ozi iri abụọ na isii nwe. Ndị nta akụkọ na-amarịta aka onye ga-aka ibe ya enweta akụkọ, bụ́ nke mere ka a kọọ ihe ndị a na-ejighị n’aka. Otu onye nta akụkọ gara na nke otu ezinụlọ a gbagburu nwa ha nwaanyị n’ụlọ akwụkwọ ahụ n’ụbọchị ahụ ihe ahụ mere iji nata foto nwata nwaanyị ahụ, ndị ọzọ kwụrụ ụmụ akwụkwọ ụgwọ ka ha kwere ka ha sere foto ha. Ọdachi ahụ mere ka o siere ụfọdụ ndị nta akụkọ ike ịmata ma ihe ka mkpa ọ̀ bụ ibu ndị nta akụkọ ibe ha ụzọ nweta akụkọ gbara ọkpụrụkpụ ka ọ̀ bụ ichebara ndị ihe ahụ metụtara echiche na ịkwanyere ha ùgwù.
Dị ka ọ na-adịkarị mgbe ụdị ihe ahụ mere, ndị mmadụ gawara n’okpukpe dị iche iche iji nweta nkasi obi na ka a kọwaara ha ihe kpatara ọdachi ahụ. N’ụbọchị arụ ahụ mere, chọọchị dị iche iche kpekọtara chọọchị ọnụ. Obi tọrọ ọtụtụ ndị ụtọ maka ndokwa ahụ e meere ha. Ma, obi dara ndị chọrọ inweta nkasi obi n’Okwu Chineke na azịza nke ajụjụ ndị na-enye ha nsogbu n’obi mbà. Otu ezinụlọ gara olili ozu nke nwa klas nwa ha nwoke. Nne ha kwuru, sị: “Otu bishọp kwuru banyere ahụhụ Job tara. Anọ m na-eche ka ọ gwa anyị ihe anyị ga-amụta na ya ma ọ bụkwanụ kasie anyị obi, ma o kwughị ihe ọzọ. O kwutụdịghị otu ihe mere Job ji taa ahụhụ ma ọ bụkwanụ ihe mechara mee Job.”
Ihe na-enweghị isi otu nwoke nụrụ were ya nnọọ iwe. Nwoke ahụ na Ndịàmà Jehova mụrụ Baịbụl ihe dị ka iri afọ atọ tupu mgbe ahụ ma ya emechaa kwụsị. Ugbu a, ọ maliteghachiri ịga ọmụmụ ihe ha.
Valisa, bụ́ otu nwata nwaanyị dị afọ iri na anọ nke ya na Ndịàmà na-amụ Baịbụl, nọ na klas dị nso n’ebe ahụ a kwafuru ọbara. Ozugbo ọ nụrụ ụda égbè, ọ malitere ikpegara Jehova ekpere. Ka e mesịrị, mgbe a jụrụ ya otú o mere, o kwuru na ihe ahụ merenụ mere ka ya mata na ihe ndị ya mụtara na Baịbụl banyere oge ikpeazụ ndị a dị oké egwu bụ eziokwu. (2 Timoti 3:1-5) Ndịàmà abụọ ji nnọọ oge ahụ na-agagharị ịkasi ndị agbata obi ha obi. Otu agadi nwaanyị bịakwutere ha ma kwuo, sị: “Ọtụtụ ndị kwesịrị imewekwu ihe a unu na-eme.” Ọ bụ ezie na arụ ahụ merenụ mere ndị mmadụ obi ọjọọ ma wụọ ha akpata oyi n’ahụ́, o mere ka ụfọdụ ndị ṅaa ntị n’ozi olileanya na nkasi obi dị n’Okwu Chineke.
Mkpaghasị Uche Na-ekweghị Ala Ala
N’ezie, ọbụna okwu nkasi obi kacha mma a gwara ndị ọdachi ahụ metụtara kpọmkwem enweghị ike iwepụ mwute na obi mgbawa ọ kpataara ha. Ọ dịghị ihe ị ga-agwa nne ma ọ bụ nna nke e gburu nwa ya nke ga-eme ka ọ kwụsịchaa inwe mwute ma ọ bụkwanụ onye uwe ojii nke gbagara n’ụlọ akwụkwọ ahụ ma chọpụta na nwunye ya so ná ndị e gburu.
Uche ghasasịrị ụmụ akwụkwọ ndị fọrọ afọ na ndị ezinụlọ ha, onye nke ọ bụla n’ụdị nke ya. Vassilios si n’ebe e si apụ n’ụlọ akwụkwọ ahụ mgbe e nwere ihe mberede mapụ ozugbo nwa okorobịa ahụ bú égbè malitere ịgba égbè. O chetara ihe merenụ, sị: “Mgbe m si na windo mapụ, ekpegaara m Jehova ekpere. Echere m na m na-aga ịnwụ. Echere m nnọọ na ọ bụ ekpere ikpeazụ m ka m na-ekpe.” N’izu ndị sochirinụ, ọ nọ na-arọ nrọ ọjọọ ma o hiwe ụra, ọ chọghịkwa ịgwa onye ọ bụla okwu. Ihe kacha wee ya iwe bụ otú ndị mmadụ si jiri ọdachi ahụ na-akpa ego na otú ndị na-achọ ịmata ihe merenụ si ajụ ajụjụ ndị na-egosi na ha anaghị echebara ndị o metụtara echiche. Ka oge na-aga, o nwetara onwe ya.
Jonas na Vassilios nọ n’otu klas, ọ hụkwara ka a gbagburu ụmụ klas ya ise. O kwuru, sị: “Ozugbo ihe ahụ mechara, o sighịrị m ike ịkọ ihe merenụ; ọ dị ka fim na-atụ ụjọ. Ma ugbu a, ikwu otú m mere na-esiri m ike. Ahụ́ na-agbanwe m agbanwe. Mgbe ụfọdụ, anaghị m achọ ikwu banyere ya; n’oge ndị ọzọ, ana m ekwu nnọọ banyere ya.” Ọ na-arọkwa nrọ ọjọọ ma na-enwe nsogbu ihi ụra.
Mgbe ụbọchị ụfọdụ gachara, e nyeghachiri ụmụ akwụkwọ ahụ ihe ha ndị dị na klas ha. Ndị dọkịta na-enyere ndị ihe ike mere aka gwara ha agwa na ịhụ ihe ndị ahụ nwere ike ime ka ha cheta ihe ahụ merenụ. Na mbụ, Jonas achọghị ibitụ kootu ya, akpa akwụkwọ ya, na okpu ọgba tum tum ya aka. Ụjọ na-ejidekwa ya mgbe ọ bụla ọ hụrụ onye yiri nwa okorobịa ahụ bú égbè ma ọ bụ onye nyafere akpa azụ ka ya. Mgbe nne na nna ya na-ele otu fim, a gbaa otu ọnụ égbè na ya, ahụ́ mawara ya jijiji. Ndị dọkịta gbalịrị inyere ndị ọdachi ahụ metụtara aka ịkwụsị ịtụ ụjọ mgbe ọ bụla ha chetara ihe ahụ merenụ.
Jürgen, bụ́ nna Jonas, na-arụ ọrụ n’ụlọ ọgwụ ahụ e gburu otu onye ọrụ ha. O kwuru na ọtụtụ ndị nne na nna na ndị ọrụ ibe ya nọ na-ajụ onwe ha ajụjụ ndị dị ka ‘Olee ihe mere ihe a ji mee? Olee ihe m gaara eme ma a sị na ọ bụ m ka ihe ahụ mere?’ Dị ka ihe atụ, ụjọ tụrụ otu onye na-arụ ọrụ n’ụlọ ọgwụ ahụ, bụ́ onye si na veranda hụ nwa okorobịa ahụ bú égbè ka ọ na-agafe, na ọ gaara agbakwa ya égbè nke na ụlọ ọgwụ ahụ nyewere ya ọgwụ.
Otú E Si Nyere Ụfọdụ Ndị Aka Idi Ya
Olee ihe nyeerela ụfọdụ ndị aka idi ọdachi ahụ na-awụ akpata oyi n’ahụ́? Jürgen kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na ọ na-esi ike mgbe ụfọdụ, ọ na-adị mma gị na ndị ọzọ ịnọ. Ịmata na ndị ọzọ na-eche banyere gị, na ọ bụghị naanị gị kwụ, na-enye aka.”
Obi tọkwara Jonas ụtọ na ndị ọzọ na-eche banyere ya, nke mere o ji sị: “Ọtụtụ ndị na-ezitere m kaadị na ozi ekele. Ụfọdụ na-agwa m ebe ndị m ga-agụ na Baịbụl, m na-agụkwa ha. Nke ahụ amaka.” Olee ihe ọzọ na-enyere ya aka? “Mgbe m tetara n’abalị n’ihi na o kwekwaghị m odidi, m na-ekpe ekpere. Mgbe ụfọdụ, m na-ege egwú ma ọ bụ Teta! e tinyere na teepụ.”a O kwukwara na Baịbụl gwara anyị ihe mere ihe a niile ji mee: Ọ bụ Setan na-achị ụwa, anyị bikwa n’oge ikpeazụ. Nna ya kwuru na ihe ndị dị otú ahụ ha ghọtara na-enyere ha aka idi ọnọdụ ahụ.
Ahụhụ Ga-akwụsị n’Oge Na-adịghị Anya
N’ime ụbọchị ole na ole, kandụl, okooko osisi, na akwụkwọ ozi jupụtara n’ihu ụlọ akwụkwọ ahụ. Kerstin chọpụtara na ọtụtụ ndị dere mpempe akwụkwọ ndị na-ajụ ihe mere ihe ahụ ji mee na ihe mere Chineke ji kwe ka o mee. Ebe o chere na e kwesịrị ịza ajụjụ ndị a, ya na Ndịàmà abụọ ọzọ dere akwụkwọ ozi nke ha ma tinye ya n’ebe nke ndị ọzọ dị.
N’ụbọchị e wepụtara maka icheta ndị ahụ nwụrụ anwụ, otu ụlọ ọrụ televishọn gosiri akwụkwọ ozi ahụ o dere ma kwuo ihe dị n’ahịrịokwu ndị malitere ya, nke bụ́: “N’ihi gịnị? N’ụbọchị ikpeazụ a, ọtụtụ ndị na-ajụkwu ajụjụ a, karịchaa ajụjụ ndị bụ́: Olee ebe Chineke nọ? Oleekwa ihe mere o ji kwe ka o mee?” Ma, ọ dị mwute na ọ bụ ebe ahụ ka ha kwụsịrị.
Olee ihe mere anyị ji kwuo na ọ dị mwute? Ọ bụ n’ihi na akwụkwọ ozi ahụ gara n’ihu ịkọwa otú ahụhụ niile si malite ma kwuo na Chineke “ga-ahụ na ihe ọjọọ niile ụmụ mmadụ kpatara kwụsịrị.” O kwuziri, sị: “N’akwụkwọ ikpeazụ nke Baịbụl, Chineke kwuru na ya ga-ehichapụ anya mmiri niile n’anya ndị mmadụ, nakwa na ọnwụ, na iru uju, ma ọ bụ ihe mgbu agaghị adịkwa ọzọ. Ihe mbụ niile agabigala.” Jehova Chineke ga-akpọlitedị ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. N’Alaeze ya ga-amalite ịchị n’oge na-adịghị anya, a gaghịkwa enwe ọdachi, mgbukpọ, ma ọ bụ ahụhụ. Chineke kwere nkwa, sị: “Lee! Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.”—Mkpughe 21:4, 5.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụ Ndịàmà Jehova na-ebipụta magazin Teta! na-ewepụtakwa nke e tinyere na teepụ.
[Foto dị na peeji nke 12]
Jonas nwetara kaadị kwuru, sị, “Anyị na-eche banyere gị”
[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 9]
Focus Agency/WPN
[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 9]
© imagebroker/Alamy
[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 10]
Foto: picture alliance
[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 11]
Foto: picture alliance