Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w13 7/1 p. 7
  • È Nwere Okpukpe nke Bụ́ Ezigbo Okpukpe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • È Nwere Okpukpe nke Bụ́ Ezigbo Okpukpe?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ntụkwasị Obi Dị Mkpa Iji Bie Ndụ Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Ikpe Okpukpe Dị Ọcha Maka Nlanarị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Gịnị Mere O Ji Dị Mkpa Ka I Leruo Okpukpe Gị Anya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
w13 7/1 p. 7

È Nwere Okpukpe nke Bụ́ Ezigbo Okpukpe?

Ọ bụrụ na e nweela okpukpe ma ọ bụ chọọchị mere ihe na-adịghị gị mma, o nwere ike isiri gị ike ikweta na e nwere okpukpe nke bụ́ ezigbo ya. Ma, ka obi sie gị ike na e nwere okpukpe nke bụ́ ezigbo ya. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o nwere ndị ọ kpọrọ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Ọ kụziiri ha ka ha na-eme ihe Chineke kwuru. A ka nwere ezigbo ndị na-eso ụzọ Kraịst, ya bụ, ndị na-agba mbọ ka ha na-ebi ndụ otú Ndị Kraịst kwesịrị ibi. Ma, olee ndị ha bụ?

Estelle, bụ́ onye e kwuburu okwu ya, sịrị: “M mechara mụwa Baịbụl mgbe Ndịàmà Jehova bịara na-akụziri m ya. Obere oge mụ na ha malitere ịmụ Baịbụl, aghọtara m ihe e dere na Jọn 8:32. Ebe ahụ sịrị: ‘Unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.’”

Ray, bụ́ onye ọzọ e kwuburu okwu ya, sịrị: “Mgbe mụ na Ndịàmà Jehova bidoro ịmụ Baịbụl, amụtara m na ọ bụghị Chineke kpatara ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata. Obi tọrọ m ụtọ ịmara na n’agbanyeghị na e nwere ezigbo ihe mere Chineke ji kwere ka ihe ọjọọ na-eme, o kwere nkwa na ya ga-akwụsị ya n’oge na-adịghị anya.”

O doro anya na ọ naghị adịrị mmadụ mfe ime ihe ọma mgbe ọtụtụ ndị na-anaghị eme otú ahụ. Ma, onye chọrọ ime ihe ziri ezi ga-emeli ya. E nwere ọtụtụ ndị chọrọ ka e nyere ha aka ka ha mụta ihe Baịbụl na-akụzi na ịna-eme ya eme. Ọ bụ ya mere Ndịàmà Jehova ji akụziri ọtụtụ nde mmadụ Baịbụl n’anaghị ha ego ọ bụla. N’izu ọ bụla, ọtụtụ ndị na-amụta ihe Baịbụl na-akụzi. Nke a emeela ka ha na Chineke malite ịdị ná mma ma na-enwekwu obi ụtọ ná ndụ.a

Ọ́ gaghị adị mma ka ị jụọ Ndịàmà Jehova ihe mere ha ji kwere na okpukpe ha bụ nke ezigbo ya?

Mgbe ọzọ ị hụrụ Ndịàmà Jehova ọ́ gaghị adị mma ka ị jụọ ha ihe mere ha ji kwere na okpukpe ha bụ nke ezigbo ya? Chọpụta ihe ha na-akụzi na ihe ndị mmadụ ji mara ha, gị ekpebizie ma è nwere okpukpe nke bụ́ ezigbo ya.

a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmụtakwu otú ị ga-esi nwekwuo obi ụtọ, gụọ akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya