Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w14 8/1 p. 16
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Otú Ị Ga-esi Ama Ndị Na-efe Chineke Otú Ọ Chọrọ?
    Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
  • Gịnị Ga-eme Okpukpe Ndị E Nwere n’Ụwa A?
    Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
  • Olee Otú Ị Ga-esi Amata Ndị Na-efe Chineke Otú Ọ Chọrọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ofufe Chineke Na-anakwere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
w14 8/1 p. 16
Ebe Ndịàmà Jehova si n’agbụrụ dị iche iche na-akpa nkata n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Okpukpe niile hà na-eme ihe dị Chineke mma?

O nwere ike ịbụ na ihe ndị ị na-anụ n’akụkọ ụwa emeela ka ị mata na mgbe ụfọdụ, okpukpe ndị mmadụ na-ekpe na-eme ka ha kpaa arụ. Ọ bụghị okpukpe ma ọ bụ chọọchị niile na-eme ihe dị Chineke mma. (Matiu 7:15) N’eziokwu, okpukpe eduhiela ọtụtụ ndị.—Gụọ 1 Jọn 5:19.

Ma, Chineke maara na e nwere ndị ihe ọma na-adị mma ji obi ha niile chọọ ife ya. (Jọn 4:23) Chineke chọrọ ka ndị dị otú ahụ mụọ Okwu ya bụ́ Baịbụl ka ha mụta eziokwu.—Gụọ 1 Timoti 2:3-5.

Olee otú ị ga-esi mata nke bụ́ ezigbo okpukpe?

Jehova Chineke na-eme ka ndị si n’okpukpe dị iche iche dịrị n’otu. Otú o si eme ya bụ na ọ na-akụziri ha eziokwu, na-akụzikwara ha ka ha hụ ibe ha n’anya. (Maịka 4:2, 3) N’ihi ya, ihe ị ga-eji amata ndị na-ekpe ezigbo okpukpe bụ na ha hụrụ ibe ha n’anya.—Gụọ Jọn 13:35.

Jehova Chineke ji ezigbo okpukpe eme ka ndị dị iche iche dịrị n’otu.—Abụ Ọma 133:1

Ndị na-efe Chineke otú ọ chọrọ na-ekwere naanị ihe Baịbụl kwuru, ha na-akpakwa àgwà otú Baịbụl kwuru ka ndị na-efe Chineke na-akpa. (2 Timoti 3:16) Ha na-akwanyere aha Chineke ùgwù. (Abụ Ọma 83:18) Ha na-agwakwa ndị mmadụ na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-egboro ndị mmadụ mkpa ha. (Daniel 2:44) Ha na-eme ka ‘ìhè ha na-enwu’ otú Jizọs mere. Otú ha si eme ya bụ na ha na-emere ndị agbata obi ha ihe ọma. (Matiu 5:16) Ọ bụ ya mere na ihe ọzọ ị ga-eji amata ezigbo Ndị Kraịst taa bụ na ha na-aga n’ụlọ ndị mmadụ ezi ha ozi ọma gbasara Alaeze Chineke.—Gụọ Matiu 24:14; Ọrụ Ndịozi 5:42; 20:20.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ isi nke 15 n’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya

I nwekwara ike inweta ya na www.jw.org/ig

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya