Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w15 7/1 p. 16
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Ọ̀ Dị Mgbe Ihe Ọma Ga-emeri Ihe Ọjọọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
w15 7/1 p. 16

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Olee otú ụmụ mmadụ si bido ime ihe ọjọọ?

Ebe Jizọs jụrụ ịnara Ekwensu alaeze niile nke ụwa

Ònye nwara Jizọs ka o mee ihe na-adịghị mma?​—Matiu 4:8-10

Ọ na-agụ ọtụtụ ndị agụụ ka ha na ndị ọzọ na-adị n’udo, nakwa ka ha na-akwụwa aka ọtọ ma na-eme obiọma. Gịnịzi mere ime ihe ike, mmegbu na arụrụala ji ju ebe niile? A na-anụ akụkọ ndị na-awụ akpata oyi n’ahụ́ n’ebe niile. È nwere onye na-eme ka ndị mmadụ na-akpa àgwà ọjọọ ndị a?—Gụọ 1 Jọn 5:19.

Chineke ò kere ndị mmadụ ka ha na-eme ihe ọjọọ? Mbanụ. Jehova Chineke kere anyị n’onyinyo ya, ya bụ, otú anyị ga-enwe ike ịhụ ndị ọzọ n’anya dị ka yanwa si hụ anyị n’anya. (Jenesis 1:27; Job 34:10) Ma, Chineke kwanyekwaara anyị ùgwù, nye anyị ikike ikpebi ihe anyị ga na-eme. Nne na nna anyị mbụ kpebiri ime ihe ọjọọ. Ha jụrụ ime ka Chineke, ghọzie ndị na-ezughị okè. Anyị si n’aka ha keta mmehie.—Gụọ Diuterọnọmi 32:4, 5.

Ò nwere mgbe ụmụ mmadụ ga-akwụsị ime ihe ọjọọ?

Chineke chọrọ ka anyị ghara ịna-eme ihe ọjọọ. (Ilu 27:11) Ọ bụ ya mere o ji na-akụziri anyị otú anyị ga-esi ghara ịna-eme ihe ọjọọ nakwa otú anyị ga-esi na-enwe ezigbo obi ụtọ. Ka ọ dịgodị, anyị agaghị ahụli ndị ọzọ n’anya otú Chineke si hụ anyị n’anya.—Gụọ Abụ Ọma 32:8.

E nwere ihe mere Chineke ji ka gba nkịtị ihe ọjọọ eju ebe niile. Ọ chọrọ ka mmadụ niile hụ nsogbu ndị ime ihe ọjọọ na-akpata. (2 Pita 3:7-9) Ma, n’oge na-adịghị anya, ndị ga-ebi n’ụwa ga-abụ naanị ndị na-erubere Chineke isi ma na-enwe obi ụtọ.—Gụọ Abụ Ọma 37:9-11.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ isi nke 3 n’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya

I nwekwara ike inweta ya na www.jw.org/ig

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya