Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w15 4/1 p. 16
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
w15 4/1 p. 16

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Olee otú ihe ga-adịrị ụmụ mmadụ n’ọdịnihu?

Ebe otu ezinụlọ gara ileta otu agadi nwaanyị bụ́ onye agbụrụ ọzọ

Olee otú ọnwụ Jizọs ga-esi eme ka mmadụ niile hụ ibe ha n’anya?

O doro anya na ndị sayensị ga na-emepụtakwu ọtụtụ ihe ndị e ji enyere ndụ aka. Ma, hà ga-emeli ka mmadụ niile hụ ibe ha n’anya? Mba. Ọtụtụ ndị nọ n’ụwa taa na-achọ naanị ọdịmma onwe ha, bụrụkwa ndị anyaukwu. Ma, ihe ọma Chineke bu n’obi imere anyị n’ọdịnihu enweghị atụ.—Gụọ 2 Pita 3:13.

Baịbụl kwuru na oge na-abịa mgbe mmadụ niile nọ n’ụwa a ga-ahụ ibe ha n’anya. Obi ga-eru onye ọ bụla ala, o nweghịkwa onye ga-akpatara ha nsogbu.—Gụọ Maịka 4:3, 4.

Olee otú ụmụ mmadụ ga-esi kwụsị ịchọ naanị ọdịmma onwe ha?

Chineke ekeghị mmadụ ka ọ na-achọ naanị ọdịmma onwe ya. Ma, mgbe nwoke mbụ Chineke kere nupụụrụ ya isi, ọ ghọziri onye na-ezughị okè. Ọ bụ ya bufeere anyị ịchọ ọdịmma onwe anyị naanị. Ma, Chineke ga-esi n’aka Jizọs mee ka ụmụ mmadụ zuokwa okè ọzọ.—Gụọ Ndị Rom 7:21, 24, 25.

Iji mezuo ihe a Chineke chọrọ, Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà ka o nwee ike mezie ihe nnupụisi nwoke mbụ ahụ kpataara anyị. (Ndị Rom 5:19) Jizọs si otú ahụ mee ka ụmụ mmadụ nwee olileanya na o nweghịzi ndị ga na-achọ naanị ọdịmma onwe ha n’ọdịnihu, ọ gaghịkwa na-agụ ndị mmadụ agụụ ime ihe ọjọọ.—Gụọ Abụ Ọma 37:9-11.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ isi nke 5 n’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya

I nwekwara ike inweta ya na www.jw.org/ig

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya