Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w15 10/15 p. 28-29
  • Ịbịaru Chineke Nso Dị M Mma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịbịaru Chineke Nso Dị M Mma
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Kwụsịnụ Ichegbu Onwe Unu”
    Teta!—2010
  • Obi Ekele Maka Nkwado Jehova nke Na-adịghị Ada Ada
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Anyị Amụtala Ọtụtụ Ihe n’Aka Onye Ozizi Kachanụ ná Ndụ Anyị Niile
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Jehova Emeela Ka ‘Ụzọ M Kwụrụ Ọtọ’
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
w15 10/15 p. 28-29
Ebe Sarah Maiga nọ n’ọgba tum tum ya nwere ụkwụ atọ na-ezi otu nwaanyị na nwa ya nwaanyị ozi ọma

Ịbịaru Chineke Nso Dị M Mma

M KWỤSỊRỊ ito mgbe m dị afọ itoolu. Anyị bi na Kot Devụa mgbe ahụ. Adị m iri afọ anọ na atọ ugbu a. M sụrụ ezigbo mkpụmkpụ. Adị m amaụkwụ atọ n’ogologo. Mgbe papa m na mama m matara na agaghịzi m eto, ha gwara m ka m rụsiwe ọrụ ike ka otú m dị ghara ịna-echu m ụra. M malitere ire mkpụrụ osisi n’ihu ụlọ anyị, na-edewekwa ebe ahụ ọcha. O mere ka ọtụtụ ndị na-abịa azụ m ahịa.

Nke bụ́ eziokwu bụ na ịrụsi ọrụ ike agbanweghị ihe ọ bụla. M ka sụrụ mkpụmkpụ. Idewe ihe n’elu tebụl na ime ihe ndị ọzọ na-enweghị ihe ha bụ na-abụrụ m ọgụ na mgba. Ọ dị ka ọ̀ bụ ndị ka m ogologo okpukpu abụọ ka a rụụrụ ihe niile. Ọ dị m ka ọ̀ bụ ụwa nke m kacha njọ. Ma ihe gbanwere mgbe m dị afọ iri na anọ.

Otu ụbọchị, ụmụ nwaanyị abụọ bụ́ Ndịàmà Jehova bịara zụọ m mkpụrụ osisi, malitekwa ịmụrụ m Baịbụl. N’oge na-adịghị anya, m ghọtara na ịmara Jehova na nzube ya dị mkpa karịa mkpụmkpụ m dị. Ihe a m mụtara baara m uru. Abụ Ọma 73:28 bụ amaokwu Baịbụl kacha amasị m. Mmalite amaokwu ahụ sịrị: “Ịbịaru Chineke nso dị m mma.”

Ndị ezinụlọ anyị mechara sí na Kot Devụa kwaga Bokina Faso. Ndụ m wee gbanwee. Mgbe anyị bi na Kot Devụa, ndị mmadụ na-ahụkarị m n’ebe ahụ m na-anọ ere mkpụrụ osisi. Ma, n’ebe ọhụrụ a anyị kwatara, e nweghị onye ma m. Ọtụtụ ndị ahụtụbeghị onye dị́ ka m. Otú ndị mmadụ si ele m anya na-eme m ihere. Ruo ọtụtụ izu, ekweghị m apụta èzí. Ma, m mechara cheta otú ịbịaru Jehova nso si dị m mma. M degaara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova akwụkwọ, ha ezitere m onye kwesịrị ekwesị, ya bụ, otu nwanna nwaanyị bụ́ onye ozi ala ọzọ aha ya bụ Nani. Ọ na-eji ọgba tum tum abịa.

1. Sarah na otu nwanna nwaanyị; 2. Ebe Sarah na-eme ihe ngosi n’ọmụmụ ihe

Ụzọ ndị dị́ n’ebe anyị bi na-amị amị mgbe niile. N’udu mmiri, ebe niile na-abụ apịtị apịtị. Nwanna nwaanyị ahụ na ọgba tum tum ya na-ada ọtụtụ ugboro n’ụzọ ma ọ bịawa ịmụrụ m ihe. Ma, ọ daghị mbà. Ka oge na-aga, ọ gwara m ka o buru m gaa ọmụmụ ihe. Ọ pụtara na m ga-apụ èzí, diwe anya ndị mmadụ ga na-ele m. Ihe ọzọ bụ na ịnọ n’elu ọgba tum tum ahụ ga-eme ka o sikwuoro Nani ike ịgba ya. Ma, m kwetara n’ihi na m chetara ihe nke abụọ amaokwu ahụ kacha amasị m kwuru. Ọ sịrị: “Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ka m ji mere ebe mgbaba.”

Mụ na Nani na-adanye n’apịtị mgbe ụfọdụ. Ma, ọ naghị ewute anyị n’ihi na ọmụmụ ihe dị anyị mkpa. Obi dị m ụtọ na, kama ilewe m ụdị anya ahụ ndị mmadụ na-ele m, ndị nọ́ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ji obiọma nabata m. E mere m baptizim mgbe ọnwa itoolu gara.

Ihe nke atọ e kwuru n’amaokwu Baịbụl ahụ kacha amasị m bụ: “Ka m wee kọsaa ọrụ ya niile.” M matara na ihe ga-akacha esiri m ike bụ ikwusa ozi ọma. M ka na-echeta ụbọchị mbụ m gara ozi ụlọ n’ụlọ. Ụmụaka na ndị toro eto nọ na-ele m, na-eso m ma na-ejije otú m si aga ije. O wutere m. Ma, m nọ na-agwa onwe m na Paradaịs dị ha mkpa otú ọ dịkwa mụnwa. N’ihi ya, ike agwụghị m.

Iji mee ka ihe dịtụrụ m mfe, m zụtara ígwè nwere ụkwụ atọ, nke a na-eji aka anyagharị. É ruo n’ebe a ga-arị ugwu, onye mụ na ya na-arụ n’ozi ọma na-akwara m n’ígwè ahụ rịa ya, ma anyị gbadatawa, ya arịgoro n’elu ya, anyị agbadawa. Ịga ozi ọma siiri m ike ná mmalite. Ma, o mechara tọwa m ezigbo ụtọ, mụ amalite ịsụ ụzọ oge niile n’afọ 1998.

M mụụrụ ọtụtụ ndị Baịbụl, mmadụ anọ n’ime ha mekwara baptizim. Otu n’ime ụmụnne m ndị nwaanyị batakwara n’ọgbakọ. Ọtụtụ mgbe, ịnụ otú ndị ọzọ si na-eme nke ọma n’ọgbakọ na-agba m ume mgbe obi dawara m mbà. Otu ụbọchị, mgbe ịba ji m, m natara akwụkwọ ozi sí Kot Devụa. E nwere otu nwa akwụkwọ nọ́ na mahadum dị́ na Bokina Faso m maliteere ọmụmụ Baịbụl ma nyefee ya otu nwanna nwoke. Nwa akwụkwọ ahụ mechara kwaga Kot Devụa. Obi dị m ezigbo ụtọ mgbe m nụrụ na ọ bụzi onye nkwusa a na-emebeghị baptizim.

Ebe Sarah Maiga na-eme ncha

Olee otú m si enweta ego m ji egbo mkpa m? Otu òtù na-enyere ndị nwere nkwarụ aka kụziiri m ịkwa ákwà. Otu nwaanyị só ná ndị nkụzi anyị hụrụ otú m si arụsi ọrụ ike ma sị m: “Anyị ga-akụziri gị otú e si eme ncha.” Ha kụziiri m ya. M na-anọ n’ụlọ anyị eme ncha e ji asa ihe. Ncha m na-amasị ọtụtụ ndị. Ha na-agwakwa ndị ọzọ banyere ya. M na-eji ọgba tum tum nwere ụkwụ atọ ebugara ya ndị ahịa m.

N’afọ 2004, o wutere m na m kwụsịrị ịsụ ụzọ n’ihi na ọkpụkpụ azụ na-egbusi m mgbu ike. Ma, m ka na-agachi ozi ọma anya.

Ndị mmadụ na-ekwu na e ji ịmụmụ ọnụ ọchị mara m. Obi na-adị m ụtọ mgbe niile n’ihi na ịbịaru Chineke nso dị m mma.—Akụkọ Sarah Maiga kọrọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya