Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w16 Ọgọst p. 18-19
  • Na-achọ Ihe Bara Uru Karịa Ọlaedo

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-achọ Ihe Bara Uru Karịa Ọlaedo
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • MMADỤ NWERE IKE ỊHỤ ỌLAEDO NA MBEREDE
  • ONYE AHỤ NWERE IKE ỊCHỌKWU
  • ONYE AHỤ NWERE IKE ỊGBASI MBỌ IKE
  • Ọlaedo—Ihe Omimi Dị na Ya
    Teta!—1998
  • È Kwubigara Okwu Ókè Banyere Akụ̀ na Ụba Eze Solomọn?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ị̀ Maara?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ị Pụrụ Ịchọta Akụ Dị Oké Ọnụ Ahia Karịa Ọlaedo!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
w16 Ọgọst p. 18-19
Ndị na-achọ ọlaedo

Na-achọ Ihe Bara Uru Karịa Ọlaedo

Ị̀ chọtatụla ọlaedo? Ọtụtụ ndị achọtatụbeghị. Ma, ọtụtụ nde mmadụ achọtala ihe bara uru karịa ọlaedo. Ọ bụ amamihe Chineke, nke a na-agaghị ejili “ezi ọlaedo gbanweta.”—Job 28:12, 15.

E NWERE ike ikwu na ndị jí obi ha niile na-amụ Baịbụl yiri ndị na-achọ ọlaedo. Ndị na-amụ Baịbụl kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike, na-amụsikwa Baịbụl ike ka ha nweta amamihe na-enweghị atụ. Ebe anyị na-amụ Baịbụl, olee ihe anyị ga-amụta ma anyị leba anya n’ụzọ atọ e si achọta ọlaedo?

MMADỤ NWERE IKE ỊHỤ ỌLAEDO NA MBEREDE

Ka e were ya na ị nọ na-aga n’akụkụ osimiri, hụ ihe yiri irighiri nkume na-egbuke egbuke. Gị ehulata welite ya, leruo ya anya, obi adị gị ụtọ na ị hụla ọlaedo. Ọ dị obere karịa otu mkpụrụ ọka, dịkwa ụkọ karịa ezigbo dayamọnd. N’eziokwu, ị ga-elegharị anya ma ị̀ ga-ahụ ọlaedo ndị ọzọ.

O nwere ike ịbụ na i mere ụdị ihe ahụ mgbe Onyeàmà Jehova bịara n’ụlọ gị, jiri Baịbụl zie gị ozi ọma mere ka i nwee olileanya. I nwere ike icheta mgbe mbụ ị chọtara ihe e nwere ike ịkpọ akụ̀ bara ezigbo uru. O nwere ike ịbụ mgbe mbụ ị hụrụ aha Chineke, bụ́ Jehova, na Baịbụl. (Ọma 83:18) Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ mgbe ị mụtara na ị ga-abụli enyi Jehova. (Jems 2:23) Ị matara ozugbo na i nwetala ihe bara uru karịa ọlaedo. Ma eleghị anya, ị chọsikwuru ike ịmụta ihe ndị ọzọ bara ezigbo uru ka akụ̀.

ONYE AHỤ NWERE IKE ỊCHỌKWU

Mgbe ụfọdụ, irighiri ọlaedo na-adị n’ime mmiri. N’oge a na-ejikarị aga achọ ya, ndị na-agbasi mbọ ike ịchọta ọlaedo nwere ike ịchọgide n’ụdị ebe ahụ hụ ọtụtụ ọlaedo a ga-ereta ọtụtụ nde naịra.

Mgbe gị na Onyeàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl, o nwere ike ịdị gị ka ị̀ bụ onye jí efere na-achọ ọlaedo n’ime mmiri. Ka ị na-atụgharị uche n’amaokwu Baịbụl dị́ iche iche, ị matakwuru ihe Baịbụl kwuru, okwukwe gị esikwuo ike. Ka ị na-amụtakwu eziokwu ndị dị́ na Baịbụl, ị matara otú ị ga-esi mee ka gị na Jehova dị́ ná mma na otú ị ga-esi nọsie ike n’ịhụnanya ya ka i nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi.—Jems 4:8; Jud 20, 21.

Ebe nwanna na-amụ Baịbụl

Ị̀ na-agbasi mbọ ike ịmụta eziokwu Baịbụl bara ezigbo uru otú ahụ onye na-achọ ọlaedo na-agbalịsi ike ịchọta ọlaedo?

O nwere ike ịbụ na ị nọ na-amụsi Baịbụl ike ka ị mụta eziokwu bara ezigbo uru otú ahụ onye na-achọ ọlaedo na-agba mbọ ịchọta ọlaedo n’ime mmiri. Mgbe ị mụtachara eziokwu gbara ọkpụrụkpụ dị́ na Baịbụl, o nwere ike ịbụ na o mere ka i nyefee Chineke onwe gị ma mee baptizim.—Mat. 28:19, 20.

ONYE AHỤ NWERE IKE ỊGBASI MBỌ IKE

Onye na-achọ ọlaedo nwere ike ịhụ irighiri ọlaedo n’ime ụdị nkume ụfọdụ. Otú irighiri ọlaedo si eju n’ime ụdị nkume ahụ na-eme ka ndị na-achọ ọlaedo kụwaa ya ma wepụtachaa ọlaedo ndị ahụ. A kụwaa ya, i nwere ike ị gaghị ahụ ọlaedo dị́ na ya ozugbo i lere ya anya. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ị hụ nnukwute nkume dị́ arọ ka akpa simenti iri abụọ, ọlaedo dị́ n’ime ya ga-eji obere ihe karịa mkpụrụ akị. Ma, ndị na-achọ ọlaedo na-agba mbọ kụwaa nkume ahụ n’ihi na ha ma uru ọlaedo bara.

Mmadụ kwesịkwara ịna-agbasi mbọ ike mgbe ọ mụtachara “ozizi ndị mbụ banyere Kraịst.” (Hib. 6:1, 2) Mgbe ị na-amụ Baịbụl, i kwesịrị ịgbalịsi ike ka ị mụta ihe ọhụrụ na ihe ga-abara gị uru. N’ihi ya, gịnị ka ị ga-eme ka i nwee ike ịna-amụta ihe mgbe ị na-amụ Baịbụl n’agbanyeghị na o teela ị mụwara Baịbụl?

Ka ọ na-agụ gị agụụ ịmụta ihe. Amụla ihe naanị elu elu. Na-agbasi mbọ ike. Ị ga-amụta ihe bara ezigbo uru na Baịbụl gbasara amamihe Chineke na ihe ọ chọrọ ka anyị na-eme. (Rom 11:33) Jiri akwụkwọ ndị e ji eme nchọnchọ n’asụsụ unu na-eme nchọnchọ ka i nwee ike ịna-amụtakwu ihe na Baịbụl. I mewa nchọnchọ, wetuo obi ka ị mata ihe i kwesịrị ime banyere nsogbu gị na otú Baịbụl si zaa ajụjụ ndị i nwere. Jụọ ndị ọzọ amaokwu Baịbụl na isiokwu ndị kacha nyere ha aka ma gbaa ha ume. Na-akọrọ ndị ọzọ ihe ndị tọrọ gị ụtọ ị mụtara mgbe ị na-amụ Okwu Chineke.

Ma, ihe i kwesịrị ibu n’obi na-amụ ihe abụghị ka ị mụọ ya buru n’isi. Pọl onyeozi kwuru na “ihe ọmụma na-afụli elu.” (1 Kọr. 8:1) N’ihi ya, gbalịsie ike ka ị dịrị umeala n’obi, ka okwukwe gị siekwa ike. Inwechi ofufe ezinụlọ na ọmụmụ ihe onwe onye anya ga-enyere gị aka ịna-eme ihe Jehova kwuru, meekwa ka ị na-enyere ndị ọzọ aka. Nke kadị mkpa bụ na ị ga na-enwe aṅụrị n’ihi na i nwetala ihe bara uru karịa ọlaedo.—Ilu 3:13, 14.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya