Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w18 Eprel p. 30-p. 31 para. 3
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ebe Anyị Na-edewe Ihe n’Ịntanet Na-abara ma Anyị ma Ndị Ọzọ Uru
    Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Ihe I Nwere Ike Ịmụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka
    Teta!—2020
  • Chọta Amamihe Ga-abara Gị Uru Kwa Ụbọchị na JW.ORG
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
w18 Eprel p. 30-p. 31 para. 3
Mmadụ ekwesịghị iwere ihe dị n’adres Ịntanet anyị tinye n’adres Ịntanet ọzọ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị mere na ọ dịghị mma ka mmadụ were akwụkwọ Ndịàmà Jehova tinye n’adres Ịntanet nke ya ma ọ bụ n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet?

Ụfọdụ ndị chere na o nweghị ihe o mere ma ha tinye akwụkwọ anyị n’adres Ịntanet nke ha ma ọ bụ n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet, ebe ọ bụ na a naghị ere ha ere. Ma, ime otú ahụ pụtara na ị daala iwu ndị dị n’ebe e dere Ihe Ndị Ị Ga-eme na Ihe Ndị Ị Na-agaghị Emea n’adres Ịntanet anyị. Ọ kpatakwala ezigbo nsogbu. Ihe e dere ebe ahụ kwuru hoo haa na ị gaghị esi na jw.org were ihe ndị e sere ese, akwụkwọ, akara ndị i nwere ike ịhụ, egwú, foto, vidio, nakwa isiokwu ndị dị na ya tinye n’ebe ọzọ n’Ịntanet.” Gịnị mere e ji sị ndị mmadụ emela ihe ndị a?

Mmadụ ekwesịghị iwere ihe dị n’adres Ịntanet anyị tinye n’adres Ịntanet ọzọ

Mmadụ ekwesịghị iwere ihe dị n’adres Ịntanet anyị tinye n’adres Ịntanet ọzọ

Ọ bụ naanị anyị nwere ikike imepụtaghachi ma ọ bụ ibipụtaghachi ihe ndị dị n’adres Ịntanet anyị. Ndị na-emegide anyị na ndị si n’ezi ofufe dapụ na-agbalị iji akwụkwọ anyị ndị ha tinyere n’adres Ịntanet ha na-arata Ndịàmà Jehova na ndị ọzọ. Ihe mere ha ji etinye ihe ndị ahụ n’Ịntanet bụ ka ha mee ka ndị na-agụ akwụkwọ ndị ahụ nyowe anyị enyowe. (Ọma 26:4; Ilu 22:⁠5) Ndị ọzọ na-eji ihe si n’akwụkwọ anyị ma ọ bụ akara jw.org akpọsa ngwa ahịa ha, amapawa n’ihe ndị ha chọrọ ire ere, nakwa n’ihe ndị a na-etinye n’ekwentị. Ebe ọ bụ naanị anyị nwere ikike imepụtaghachi ma ọ bụ ibipụtaghachi ihe ndị anyị tinyere n’Ịntanet, nakwa na iwu kwadoro akara e ji mara adres Ịntanet anyị, anyị nwere ikike ịkwụsị ndị mmadụ iji ha eme ụdị ihe ndị ahụ. (Ilu 27:12) Ọ bụrụ na anyị amara ụma hapụ ndị mmadụ, ọ bụrụgodị ụmụnna anyị, ka ha were ihe si na jw.org na-etinye n’adres Ịntanet ọzọ ma ọ bụ jiri akara bụ́ jw.org na-ere ngwa ahịa ha, ụlọikpe nwere ike ha agaghị ekweta ịkwado mbọ anyị na-agba ka anyị kwụsị ndị na-emegide anyị na ndị na-eji ihe dị na jw.org ere ahịa ha.

Adres Ịntanet Ndiàmà Jehova nakwa ihe ndị a na-etinye n’ekwentị

Isi ebe ọzọ na-abụghị jw.org adanlodu akwụkwọ ma  ọ bụ ihe ndị ọzọ anyị nwere, nwere ike ịkpatara gị nsogbu. Ọ bụ naanị “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi onye nwekwara uche” ka Jehova nyere ọrụ ịkụziri anyị Okwu ya. (Mat. 24:45) Ọ bụ naanị adres Ịntanet anyị ka “ohu” ahụ na-eji ewepụta ihe ndị e ji akụziri anyị Okwu Chineke. Ha bụ www.jw.org, tv.jw.org, na wol.jw.org. Anyị nwekwara naanị ihe atọ ndị a na-etinye n’ekwentị. Ha bụ JW Language®, JW Library®, na JW Library Sign Language®. Anaghị akpọsa ngwa ahịa na ha. Anaghịkwa egosi omume rụrụ arụ a na-ahụ n’ụwa Setan na ha. Ọ bụrụ na i si n’ebe na-abụghị adres Ịntanet anyị nweta ihe ọ bụla anyị na-ewepụta, ya ejukwala gị anya na o nwere ike bụrụ na a gbanweela ihe ụfọdụ na ya, ma o bụdị tinye ya nnu na ose.​—⁠Ọma 18:26; 19:⁠8.

Ihe ọzọkwa bụ na, ọ bụrụ na mmadụ etinye ụfọdụ ihe ndị anyị nwere n’ebe ndị mmadụ nwere ike ikwu ihe ha chere n’Ịntanet, o nwere ike ime ka ndị si n’ezi ofufe dapụ ma ọ bụ ndị na-akatọ anyị kwuwe ihe nwere ike ime ka elewe nzukọ Jehova anya ọjọọ. A ratala ụfọdụ ụmụnna iso ụdị ndị a na-arụrịta ụka n’Ịntanet, nke a emekwuola ka a na-ekwutọ aha Jehova. Ma, ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet abụghị ebe dị mma a ga-esi “jiri nwayọọ na-ezi ndị isi ike ihe.” (2 Tim. 2:​23-25; 1 Tim. 6:​3-5) Anyị achọpụtala na ụfọdụ ndị wayo ejirila aha nzukọ a ma ọ bụ aha Òtù Na-achị Isi ma ọ bụ aha onye so na ya mepee adres Ịntanet ma ọ bụ akaụnt n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet. O nweghị onye ọ bụla so n’Òtù Na-achị Isi nwere adres Ịntanet nke aka ya ma ọ bụ akaụnt n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet.

Ịgwa ndị mmadụ ka ha na-aga na jw.org ga-eme ka ọtụtụ ndị nụ “ozi ọma.” (Mat. 24:14) Si n’oge ruo n’oge, a na-eme ka ihe ndị anyị ji ezi ozi ọma dị n’Ịntanet kakwuo mma. Anyị chọrọ ka ha baara mmadụ niile uru. Dị ka e kwuru n’Ihe Ndị I Nwere Ike Ime na Ihe Ndị Ị Na-agaghị Eme, i nwere ike isi n’iimel zigara mmadụ ihe ndị anyị nwere ma ọ bụ gị ezigara ya ihe nwere ike ibuga ya n’ebe ọ ga-enweta ya na jw.org. Ọ bụrụ na anyị ana-agwa ndị nwere mmasị n’Okwu Chineke ka ha na-aga na jw.org, anyị na-eme ka ha mata na ọ bụ naanị “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi onye nwekwara uche” ka Chineke si n’aka ya na-akụziri ndị mmadụ Okwu ya.

a Ị gaa n’ala ala jw.org, ị ga-ahụ ebe e dere Ihe Ndị Ị Ga-eme na Ihe Ndị Ị Na-agaghị Eme. Ị pịa ya, ya ebuga n’ebe ị ga-ahụ ihe ndị i kwesịrị ime na ihe ndị ị na-ekwesịghị ime na jw.org. Ihe e kwuru ebe ahụ gbasakwara ihe niile dị n’ebe ndị anyị na-edebe ihe n’Ịntanet.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya