Igbe Ajụjụ
◼ N’ọnọdụ ebe a na-achụghị mmadụ n’ọgbakọ n’ihi na o nwere ezi nchegharị, ọ̀ ka kwesịrị ekwesị ịmachibido ya ịrụ ọrụ nkwusa ahụ n’ọnọdụ ụfọdụ?
Mgbe a dọrọ mmadụ aka ná ntị site n’aka òtù ikpe, a na-etinyekarị mmachibido ụfọdụ. Ndị a pụrụ ịgụnye azaghị ajụjụ ná nzukọ, ime ihe omume ma ọ bụ ihe ngosi, ma ọ bụ ịnọchite anya ọgbakọ n’ekpere. Ebe ọ bụ na ihe ọjọọ o mere bụ ihe àmà nke adịghị ike ime mmụọ, itinye mmachibido dị iche iche bụ ngosipụta nke obiọma nke na-eme ka ibu ọrụ ya dịkwuoro ya mfe. Mgbe ahụ ọ ga-enwekwu ohere maka ihe ime mmụọ ndị dị ka ọmụmụ ihe onwe onye na ntụgharị uche.
Ọ dịghị mkpa igbochi ya ikere òkè n’ọrụ nkwusa na inye akụkọ ozi ya. (Rom 10:9, 10) Ọrụ nkwusa na-enyere anyị aka ijigide okwukwe anyị. Ya mere, onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịdị na-ekere òkè mgbe nile n’ime nkwusa, si otú a na-egosipụta okwukwe dị n’obi ya site n’ọrụ.
Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ihe ọjọọ o mere bụ nnọọ nke ọtụtụ ndị maara? Ma eleghị anya, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ka ọ na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ, ma ọ dịghị ihe ọzọ ruo oge ụfọdụ, n’akụkụ ókèala ebe a na-amachaghị maka nsogbu ahụ. Ọ dị mma iburu n’uche na ọrụ nkwusa ahụ bụ akụkụ bụ́ isi nke ozi anyị na-ejere Chineke, ndị Jehova nile kwesịkwara ịdị na-ekere òkè na ya.—Mat. 24:14; 28:18-20.
Gịnịkwanụ maka onye a nabataworo mgbe a chụpụsịworo ya n’ọgbakọ? È kwesịrị ikwe ka o kere òkè n’ozi ubi ozugbo ahụ? Ee, n’ikwekọ n’ihe ndị ahụ a kọwapụtara n’elu, e kwesịrị ikwe ka ọ na-ekere òkè n’ozi ubi mgbe a nabataghachisịrị ya. Dị ka ọ dị n’ihe banyere ihe ùgwù ndị ọzọ, a na-eweghachi ndị a nwayọọ nwayọọ ka kọmitii ikpe na-ahụ ọganihu ime mmụọ nke onye ahụ.