Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 10/95 p. 1
  • Na-eto Jehova Mgbe Nile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-eto Jehova Mgbe Nile
  • Ozi Alaeze Anyi—1995
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Na-eto Eto, Toonụ Jehova!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Na-eto Jehova Kwa Ụbọchị
    Ozi Alaeze Anyi—2009
  • Too Jehova Kwa Ụbọchị
    Ozi Alaeze Anyi—1995
  • Ndị E Doro Iche Ịbụ Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto n’Ụwa Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1995
km 10/95 p. 1

Na-eto Jehova Mgbe Nile

1 E nwere ihe omume ole na ole ndị dị oké mkpa nke na ha kwesịrị ka anyị chebara ha echiche mgbe nile. N’ime ha anyị na-agụnye iri nri, iku ume, na ihi ụra. Ndị a dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-akwado onwe anyị n’ụzọ anụ ahụ. Pọl onyeozi tinyere nkwusa ozi ọma n’otu ọkwá ahụ mgbe ọ gbara ume, sị: “Ka anyị . . . na-achụ àjà, bụ́ otuto, nye Chineke mgbe nile.” (Hib. 13:15) Ya mere, inye Jehova otuto kwesịkwara ka anyị nọgide na-echebara ya echiche. Ọ bụ ihe anyị kwesịrị ịgbalị ime kwa ụbọchị, inye Nna anyị nke eluigwe otuto mgbe nile.

2 Mgbe ndị ọzọ nwara ịdọrọ echiche ya gaa n’ebe ọzọ, Jisọs zaghachiri, sị: “Aghaghị m izikwa . . . ozi ọma alaeze Chineke.” (Luk 4:43) N’oge ije ozi afọ atọ na nkera ya, ihe nile o mere kwa ụbọchị nwere njikọ n’ụzọ ụfọdụ kpọmkwem n’inye Chineke otuto. Anyị maara na Pọl chere otú a, n’iburu echiche o kwupụtara ná 1 Ndị Kọrint 9:16 n’uche: “Ahụhụ dịịrị m, a sị na ezisaghị m ozi ọma.” A gbara ndị Kraịst ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi ume ịdị njikere mgbe nile ịgọpụrụ olileanya ha nye ndị ọzọ. (1 Pita 3:15) Taa ọtụtụ narị puku ndị ọsụ ụzọ na-anụ ọkụ n’obi na ọtụtụ nde ndị nkwusa ọgbakọ na-agbalị iṅomi ihe nlereanya ọma ndị dị otú ahụ.

3 Mgbe anyị chere echiche banyere ịnụ ọkụ n’obi sitere n’obi dum nke Jisọs Kraịst, bụ́ Onye Nlereanya anyị gosipụtara, a na-akpali anyị ịgbasochi ijeụkwụ ya anya. (1 Pita 2:21) Mgbe ụfọdụ anyị pụrụ inwe nkụda mmụọ mgbe anyị na-eche nsogbu nke ịdị ndụ kwa ụbọchị ihu. Olee otú anyị pụrụ isi jiri ohere dị iche iche kwa ụbọchị mee ihe n’ụzọ bara uru iji too Jehova mgbe anyị nwere ọrụ ego na-ewe oge nile anyị? Anyị apụghịkwa ịhapụ ibu ọrụ ezinụlọ nke na-achọ ihe dị ukwuu n’oge anyị. Ọtụtụ ndị na-eto eto ji ọrụ dị mkpa nke ịga ụlọ akwụkwọ kwa ụbọchị n’aka. Ụfọdụ pụrụ iche na ọ pụghị ikwe omume ito Jehova n’ihu ọha kwa ụbọchị. Mgbe ụfọdụ, ụfọdụ pụrụ ikwe ka otu ọnwa dum gabiga n’esoroghị ndị ọzọ kerịta ozi ọma ahụ n’ụzọ ụfọdụ.

4 Jeremaịa bụ otu onye na-apụghị ịkwụsị. Mgbe ọ kwụsịrị ikwu okwu n’aha Jehova ruo nwa oge, o nwere mmetụta nke ọkụ na-ere ere a na-apụghị ịnagide anagide n’ime onwe ya. (Jer. 20:9) N’agbanyeghị ihe yiri ka ọ bụ ihe isi ike na-erikpu erikpu, Jeremaịa na-achọta mgbe nile ụzọ ụfọdụ iji zie ndị ọzọ ozi Jehova. Ànyị pụrụ iṅomi ihe nlereanya ya nke obi ike ma nọgide na-achọ ohere iji too Onye Okike anyị kwa ụbọchị?

5 Anyị ikwu okwu banyere Jehova ekwesịghị ịbụ ihe a na-eme nanị n’oge ndị e buworo ụzọ mee ndokwa ha maka isoro ndị nkwusa ndị ọzọ gbaa àmà n’ókèala ọgbakọ. Nanị ihe dị anyị mkpa bụ onye ga-ege ntị. Anyị na-anọgide na-ezute ndị mmadụ kwa ụbọchị—ha na-abịa n’ebe obibi anyị, anyị na ha na-arụkọ ọrụ, anyị na ha na-akwụkọ n’ahịrị ná nnukwu ụlọ ahịa, anyị na ha na-azụkọ ahịa n’ime ahịa, ma ọ bụ anyị na ha na-abakọ n’ụgbọ njem ọha. Nanị ihe ọ na-ewe bụ ekele enyi na enyi na otu ajụjụ na-akpali iche echiche ma ọ bụ okwu ga-akpalite mkparịta ụka. Ọtụtụ achọpụtawo nke a ịbụ ụdị ịgba àmà ha kasị na-arụpụta ihe. Ebe anyị nwere ọtụtụ ohere iji gwa ndị ọzọ okwu banyere ozi ọma ahụ, ọ ga-abụ ihe na-ezighị ezi nye anyị ikwere ka otu ọnwa dum gabiga n’agbaghị àmà Alaeze.

6 Ọ dịghị mgbe ihe ùgwù nke ito Jehova ga-akwụsị. Dị ka ọbụ abụ ahụ gosipụtara, ihe ọ bụla nke na-eku ume kwesịrị ịdị na-eto Jehova, n’ezie anyị chọkwara ka a gụnyekọta anyị. (Abụ Ọma 150:6) Ọ bụrụ na obi anyị na-akpali anyị ime otú ahụ mgbe nile, anyị ga-eji ohere dị iche iche na-eme ihe n’ụzọ bara uru kwa ụbọchị iji kwuo okwu banyere Jehova na Okwu ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya