Sochie Mmasị Nile Iji Bara Ndị Ọzọ Uru
1 Gịnị bụ isi ihe nke na-enyere mmadụ aka inweta akwụkwọ anyị? Mmasị! Otu ihe ahụ bụ eziokwu mgbe a bịara n’ime nletaghachi. Mgbe ọ bụla mmadụ gosiri ọbụna mmasị dị nta n’ozi Alaeze, anyị kwesịrị ime ihe ọ bụla anyị pụrụ ime iji bara onye ahụ uru. Ya mere anyị na-eme nletaghachi n’ebumnobi nke ịzụlite mmasị onye ahụ na ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. Nke a bụ ihe mgbaru ọsọ anyị ọbụna mgbe anyị na-ahapụghị akwụkwọ. Olee otú a pụrụ isi mee nke a?
2 Ọ bụrụ na mkparịta ụka unu nweburu bụ banyere ịba ụba nke nsogbu alụmdi na nwunye, na ị hapụrụ akwụkwọ “Ịdị Ndụ Ebighị Ebi,” ị pụrụ ịmalite mkparịta ụka unu n’ụzọ dị otú a:
◼ “N’oge gara aga m bịara, anyị kwurịtara banyere alụmdi na nwunye na ndụmọdụ dị irè nke Bible nke pụrụ inyere anyị aka ịchọta obi ụtọ ka ukwuu. Ọ́ bụghị eziokwu na ọbụna n’ime ezinụlọ ndị kasị mma, nsogbu na-ebilite site n’oge ruo n’oge? [Nye ohere maka nzaghachi.] Bible na-enye anyị ndụmọdụ magburu onwe ya nke pụrụ inyere anyị aka idozi nsogbu ndị dị ná mmekọrịta ezinụlọ. A pụrụ ịgọzi ezinụlọ site n’ịmụkọ Bible ọnụ.” Sapeta peji nke 246, ma tụlee paragraf nke 23. Gụọ Jọn 17:3, ma kwuo na ị chọrọ inyere ezinụlọ ahụ aka ịmalite ịmụ Bible n’ebe obibi.
3 Ọ bụrụ na unu kwurịtara banyere ụmụaka na mkpa ha nwere maka ọzụzụ, ị pụrụ iwere mkparịta ụka ahụ gaa n’ihu n’ụzọ dị otú a:
◼ “N’oge gara aga anyị kwurịtara banyere ọzụzụ ime mmụọ nke dị ụmụaka mkpa na otú ndị mụrụ ụmụ pụrụ isi nyere ha aka. Ihe ka ọtụtụ n’ime ndị mụrụ ụmụ m gwaworo okwu nwere nchegbu banyere àgwà ọjọọ nke ọtụtụ ndị na-eto eto taa. Gịnị ka i chere banyere . . . ? [Nye otu ihe atụ nke àgwà ọjọọ nke ndị ntorobịa bụ́ nke a na-ahụkarị n’ógbè gị. Nye ohere maka nzaghachi.] Ka m gosi gị ụfọdụ n’ime ndụmọdụ ndị dị irè e nyere n’ime Bible.” Sapeta paragraf nke 22 na peji nke 246 n’akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi, tụleekwa ihe bụ isi, ma gụọ Ndị Efesọs 6:4. Gosi na ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ụmụaka chọrọ ọzụzụ na nduzi. Mgbe ndị mụrụ ụmụ na-arụsi ọrụ ike n’inye ya, ụmụaka na-enwe obi ụtọ karị, na-egosikwa nkwanye ùgwù n’àgwà ha karị. Kọwaa otú anyị si amụrụ ụmụ anyị Bible.
4 Ọ bụrụ na isiokwu mkparịta ụka gị bụ ụwa Paradaịs, mgbe ahụ ị pụrụ ikwu nke a iji kpalighachi mmasị ahụ:
◼ “Anyị lere anya n’ụfọdụ ihe osise n’akwụkwọ a ndị na-egosi anyị ihe ụwa ga-adị ka ya mgbe Chineke mere ka ọ ghọọ paradaịs. Ọ ga-abụrụ anyị ihe dị nta ma ọ bụrụ na anyị na ndị anyị hụrụ n’anya apụghị ịma ụtọ ya. Ị́ gaghị ekwenye?” Nye ohere maka nzaghachi. Mgbe ahụ sapeta peji nke 162 n’akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi. Gụọ Mkpughe 21:3, 4, kọwaakwa otú anyị na ndị anyị hụrụ n’anya pụrụ isi nọrọ mgbe nile. Ọ bụrụ na e nwere nzaghachi dị mma, gụọ Jọn 5:28, 29 iji gosi na ndị nwụrụ anwụ ga-alọghachi ná ndụ. Gosi ihu akwụkwọ ahụ ma kwuo, sị: “Ọ bụ nnọọ eziokwu—anyị pụrụ ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs n’elu ala!” Dokwaa maka nletaghachi ọzọ iji kparịta ihe mere anyị ji mara na ọ dị nso.
5 Nzube bụ isi nke nletaghachi bụ iji nyere ndị nwere mmasị aka irite uru site n’ozi Alaeze ahụ. Ihe ka ọtụtụ n’ime ndị mmadụ chọrọ ihe mkpali iji mee ka ha nwee agụụ maka ihe ime mmụọ. Dọrọ uche ha gaa kpọmkwem n’ihe ndị bụ isi nwere abamuru dị irè n’akwụkwọ ahụ, na-emesi ike otú ọ pụrụ isi nyere ha aka ịghọta Bible n’ụzọ ka mma. Nletaghachi ndị na-eru ihe mgbaru ọsọ ndị a ga-enyere ndị ọzọ aka ịbara onwe ha uru n’ụzọ kasị mma nke kwere omume.