Nyere Ndị Ọzọ Aka Ịbara Onwe Ha Uru
1 Jehova na-ekwe nkwa ịkụziri anyị ihe anyị kwesịrị ịmara. Ọ na-emesi anyị obi ike n’Abụ Ọma 32:8, sị: “M ga-eme ka i nwee uche, M ga-ezikwa gị ihe n’ụzọ nke ị ga-eje ije n’ime ya: M ga-adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa gị n’ahụ.” Mmesi obi ike nke a na-abara anyị uru dị ukwuu. N’ụzọ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na-adịghị ya, anyị chọrọ igosi ndị ọzọ ụzọ ha pụrụ isi bara onwe ha uru site n’ịṅa ntị na ndụmọdụ amamihe ahụ sitere na Bible. (Aịsa. 48:17) Na September anyị pụrụ ime nke a site n’inyefe akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi. N’ikwu okwu anyị, e nwere ọtụtụ ụzọ anyị pụrụ isi gosi abamuru dị irè nke Bible.
2 N’ihi ịba ụba nke nsogbu alụmdi na nwunye taa, ị pụrụ ịhọrọ ịkọwapụta echiche nke a sitere n’akwụkwọ “Ịdị Ndụ Ebighị Ebi”:
◼ “Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị m gwaworo okwu na-echegbu onwe ha banyere ịrị elu dị egwu e nwere n’enweghị obi ụtọ nke alụmdi na nwunye na ịgba alụkwaghịm. Gịnị bụ uche gị banyere nsogbu nke a? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ọtụtụ ndị adawo n’ịghọta isi ihe ndị na-akpata ya. Ọ bụrụ na e jiri ezi obi mee mgbalị, ọ bụghị nanị na di na nwunye pụrụ ichekwa alụmdi na nwunye ha kama ha pụkwara ịchọta ezi obi ụtọ. Ụzọ isi nwee ihe ịga nke ọma dabeere n’itinye ndụmọdụ dị na Bible n’ọrụ.” Gụọ Ndị Efesọs 5:28, 29, 33. Sapeta peji nke 243, tụlee paragraf nke 16 na 17, mgbe ahụkwa nyefee akwụkwọ ahụ.
3 Oge bara uru na ọzụzụ nke sitere n’aka nne na nna dị ụmụaka mkpa. N’iche akwụkwọ “Ịdị Ndụ Ebighị Ebi” n’ihu mmadụ, ị pụrụ ikwu, sị:
◼ “Anyị nile na-echegbu onwe anyị banyere ọdịmma ọdịnihu nke ụmụ anyị ndị na-eto eto. N’uche gị, olee ụzọ kasị mma nne na nna pụrụ isi nyere ụmụ ha aka ịchọta ọdịnihu dị ntụkwasị obi? [Nye ohere maka nzaghachi.] Gee ntị na ndụmọdụ nke a sitere n’ilu Bible nke e dere n’ihe dị ka 3,000 afọ gara aga. [Gụọ Ilu 22:6.] Ọ bụ ezie na ụmụ anyị pụrụ irite uru n’ụzọ dị ukwuu site ná ntụziaka ha na-anata n’ụlọ akwụkwọ, ndị mụrụ ha na-enye ha ọzụzụ nke kasị baa uru n’ebe obibi. Ọ chọrọ oge, nlebara anya, na ịhụnanya, ma o kwesịrị nnọọ mgbalị ahụ.” Sapeta peji nke 245, tụlee paragraf nke 20 na 21, ma kọwazie otú a pụrụ isi jiri akwụkwọ ahụ mee ihe dị ka ihe ndabere maka ọmụmụ Bible ezinụlọ.
4 Ị pụrụ ịchọ inyefe akwụkwọ “Ịdị Ndụ Ebighị Ebi” site n’igosi otú ụwa ga-esi ghọọ paradaịs:
◼ “Eji m n’aka na ị na-echegbu onwe gị banyere ihe ndụ gị ga-adị ka ya n’ọdịnihu. N’Ekpere Onyenwe Anyị, Jisọs kụziiri anyị ikpe ekpere ka e mee uche Chineke n’ụwa dị ka e si eme ya n’eluigwe. Gịnị ka ụwa ga-adị ka ya mgbe nke ahụ weere ọnọdụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Nke a bụ otú onye na-ese ihe osise siri see ụwa paradaịs. [Gosi ihe osise ahụ dị na peji nke 12 na 13. Mgbe ahụ gụọ Aịsaịa 11:6-9, nke e denyekọrọ na paragraf nke 12.] Ọ́ gaghị amagbu onwe ya ibi n’ụwa dị otú a? Akwụkwọ a ga-egosi gị otú gị na ezinụlọ gị pụrụ isi biri na paradaịs dị ka nke a.”
5 Ịkwadebe okwu gị tupu oge eruo bụ ihe kasị mkpa n’ịmata ihe ịga nke ọma gị n’ọnụ ụzọ. Tupu ị kụọ aka, jide n’aka na i nwere ihe ị chọrọ ikwu kpọmkwem banyere otu echiche Akwụkwọ Nsọ. Ọzọ, buru n’obi otu okwu dị mkpirikpi banyere otu akụkụ na-akpali mmasị nke magazin ma ọ bụ traktị nke ị chọrọ inyefe ma ọ bụrụ na a naraghị akwụkwọ ahụ. Jiri ohere ọ bụla i nwere mee ihe iji kụọ mkpụrụ nke Alaeze na September. (Ekli. 11:6) Ị ga na-enyere ndị ọzọ aka inweta abamuru ndị ga-adịru mgbe ebighị ebi.