Bụrụnụ Ndị Nkụzi nke Okwu Chineke —Na-eji Broshuọ Eme Ihe
1 Ohu Jehova ọ bụla raara onwe ya nye nwere ibu ọrụ nke ikere òkè n’ọrụ nke ịkụziri ndị ọzọ Okwu Chineke. Ịdị mkpa nke ibu ọrụ a na-apụta ìhè mgbe anyị ghọtara na onye nyere anyị ọrụ a nke ‘ime ka mba nile bụrụ ndị na-eso ụzọ, na-ezi ha ihe,’ bụ onye nwere ike nile n’eluigwe na n’elu ụwa. (Mat. 28:18-20) Ya mere, ikere òkè n’ikwusa ozi ọma ahụ chọrọ na anyị ga-abụ ndị nkụzi!—2 Tim. 2:2.
2 N’August anyị pụrụ iji nkà nkụzi anyị mee ihe mgbe anyị na-enyefe broshuọ dị iche iche. Anyị pụrụ ịhọpụta n’ime ha echiche Akwụkwọ Nsọ ndị na-akpali mmasị ma kwadebe okwu ole na ole ga-enyere anyị aka ịmalite mkparịta ụka.
3 Mgbe ị na-enyefe broshuọ bụ́ “Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?” ị pụrụ ịsị:
◼ “Anyị ejewo na nke ọtụtụ n’ime ndị agbata obi gị wee mata na ha na-echegbu onwe ha banyere ịrị elu mberede nke mpụ, iyi egwu, na ime ihe ike. N’uche gị, n’ihi gịnị ka nke a jiworo bụrụ nsogbu otú a? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ọ bụ ihe na-akpali mmasị pụrụ iche nye anyị na Bible buru amụma na nke a ga-eme. [Gụọ 2 Timoti 3:1-3.] Rịba ama na nke a ga-ewere ọnọdụ na ‘mgbe ikpeazụ.’ Nke a pụtara na ọ dị ihe gaje ịbịa ná njedebe. Gịnị ka i chere na ọ bụ?” Nye ohere maka nzaghachi. Sapeta peji nke 22, rụtụ aka n’ihe osise ahụ, tụleekwa otu akụkụ akwụkwọ nsọ ma ọ bụ abụọ ndị e hotara na peji ahụ. Nyefezie broshuọ ahụ n’ụtụ ₦24 ma dokwaa ịlaghachi ma e mesịa iji kọwaa ihe mere anyị ji kwere na ngọzi ndị a dị nso.
4 Ọ pụrụ ịmasị gị iji ụzọ a mee ihe mgbe ị na-enyefe broshuọ bụ́ “Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?”:
◼ “Ọtụtụ ndị na-enwe ihe isi ike n’ịgbalị ịchọta ezi nzube n’ịdị ndụ. Ọ bụ ezie na ole na ole na-enwetụ obi ụtọ a kpaara ókè, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na-adị ndụ jupụtara ná mmechuihu na ahụhụ. Ì chere na nke a bụ ụzọ Chineke zubere ka anyị na-ebi ndụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Bible na-egosi na Chineke chọrọ ka anyị biri n’ụwa dị ka nke a.” Rụtụ aka n’ihe osise dị na peji nke 21, ma sapetazie peji nke 25 na 26, paragraf nke 4-6, ma kọwaa ihe o kweworo ná nkwa. Nyefee broshuọ ndị ahụ n’ụtụ a na-enyefe ya. Welite ajụjụ a maka ntụle mgbe ị ga-alaghachi: “Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na Chineke ga-emezu nkwa ya?”
5 Ị pụrụ inyefe broshuọ bụ́ “Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!” site n’igosi ihe osise ahụ dị n’ihu na azụ ya na ịjụ, sị:
◼ “Ọ̀ ga-amasị gị ibi n’ụwa nke jupụtara ná ndị obi ụtọ dị ka nke a? [Nye ohere maka nzaghachi.] Bible na-agwa anyị na Chineke hụrụ ndị mmadụ n’anya ma chọọ ka ha bie ndụ ebighị ebi n’obi ụtọ n’elu ala a.” Sapeta nọmba ihe osise nke 49, gụọkwa otu n’ime akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha. Mgbe ahụ, rụtụ aka n’ihe osise nke 50, ma kọwaa ihe anyị na-aghaghị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ibi na Paradaịs nke a. Nyefee broshuọ ahụ n’ụtụ a na-enyefe ya ma kwuo na ị ga-alaghachi ma tụlee ihe mere okwukwe na Jisọs Kraịst jiri dị oké mkpa.
6 Jehova na-enwe obi ụtọ mgbe anyị mere ka ‘ọganihu anyị pụta ìhè site n’ilezi ozizi anyị anya.’ (1 Tim. 4:15, 16) Broshuọ anyị dị iche iche pụrụ ịbụrụ anyị ezi ihe inyeaka ná mgbalị anyị inyere ndị agụụ na-agụsi ike ịnụ “ozi ọma nke ezi ihe” aka.—Aịsa. 52:7.