Na-ebinụ Obi n’Ụzọ Kwesịrị Ozi Ọma Ahụ
1 Dị ka Ndịàmà Jehova, anyị na-achọ iwetara aha Jehova nsọpụrụ. Anyị matara na àgwà, okwu ọnụ, ọdịdị onwe onye, na uwe anyị pụrụ imetụta otú ndị ọzọ si ele ezi ofufe anya. Nke a bụ eziokwu karịsịa mgbe anyị nọ ná nzukọ anyị dị iche iche. Anyị kwesịrị ijide n’aka na ihe nile a na-ekwu ma na-eme ná nzukọ kwesịrị ozi ọma ahụ, na-ewetakwara Jehova nsọpụrụ.—Fil. 2:4.
2 Ọtụtụ n’ime ụkpụrụ ụwa maka uwe na ọdịdị onwe onye ezighị ezi nye ndị Kraịst. Nke a bụ okwu ndị ozi nke ozi ọma ahụ kwesịrị iji nlezianya lebara anya. Ụlọ Nche June 1, 1989, peji nke 20, na-ekwu, sị: “Ọ dịghị mkpa na uwe anyị ga-abụ ndị dara oké oké ọnụ ahịa, ma o kwesịrị ịdị ọcha, dị ụtọ n’anya, kwesị ekwesị. Akpụkpọ ụkwụ anyị kwesịrị ịbụ nke e doziri nke ọma, dịkwa mma n’anya. N’otu aka ahụ, ná nzukọ nile, gụnyere Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, anyị kwesịrị ịdị ọcha n’anụ ahụ, anyị kwesịkwara iyi uwe ndị dị ọcha, kwesịkwa ekwesị.”
3 Ịga ihe n’oge bụ akara nke nkwanye ùgwù na nchebara echiche ịhụnanya. Mgbe ụfọdụ, ọnọdụ ndị a na-apụghị izere ezere pụrụ igbochi anyị ịbịarute nzukọ n’oge. Ma àgwà nke ịbịa n’azụ oge pụrụ igosipụta enweghị nkwanye ùgwù maka nzube dị nsọ nke nzukọ na amataghị ibu ọrụ anyị nke izere imere ndị ọzọ mkpọtụ. Ndị na-abịa na-azụ oge na-adọpụkarị uche ndị ọzọ ma na-egbochi ha irite uru zuru ezu site n’ihe omume. Ịga ihe n’oge na-egosi nkwanye ùgwù maka echiche na ọdịmma nke ndị nile bịaranụ.
4 Ịhụnanya maka ndị agbata obi anyị kwesịrị ime ka anyị lezie anya izere ịkpata ndọpụ uche n’oge nzukọ. Ikwu okwu n’olu dị ala, iri ihe, ịta chingọm, ịsapegharị akwụkwọ, na ịga n’ụlọ mposi na-adịghị mkpa, pụrụ igbochi ntụkwasị uche n’ihe nke ndị ọzọ ma belata nkwanye ùgwù nke ebe ofufe Jehova kwesịrị inwe. O kwesịghị ekwesị ka onye ọ bụla jiri ọrụ metụtara ọgbakọ n’aka ma ọ bụ soro ndị ọzọ na-akparịta ụka, e wezụga ma e nwere ọnọdụ mberede nke chọrọ ka ụmụnna si n’oche ha pụọ. Ma ọ́ bụghị ya, mmadụ nile kwesịrị ịnọdụ ala ma na-ege ntị n’usoro ihe omume ahụ ka ha onwe ha na ezinụlọ ha wee rite uru. A chọghị àgwà na-adịghị mma n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ihi na ‘ịhụnanya adịghị eme ihe na-adịghị mma n’anya.’—1 Kọr. 13:4, 5; Gal. 6:10.
5 Akparamàgwà dị mma nke ụmụ anyị ná nzukọ na-ewetakwara aha Jehova otuto na nsọpụrụ. Ndị mụrụ ụmụ inye nlekọta chiri anya dị mkpa. E kwesịrị ịgba ụmụaka ume ịṅa ntị na ikere òkè. Ọtụtụ ndị nne na nna nwere obere ụmụaka na-ahọrọ ịnọdụ ala n’ebe ha nwere ike ịpụ n’ụzọ dị mfe ma hụ maka mkpa nke ụmụaka ha n’adọpụghị uche ndị ọzọ gabiga ókè.
6 Pọl dụrụ ọdụ, sị: ‘Na-ebinụ obi n’ụzọ kwesịrị ozi ọma ahụ.’ (Fil. 1:27) Mgbe ahụ, ka anyị gbalịa ịdị na-akpa ezi àgwà ma na-echebara ndị ọzọ echiche mgbe a na-aga nzukọ. Mmadụ nile imekọ ihe ọnụ ga-eme ka e nwee “mgbarịta ume . . . onye nke ọ bụla site n’okwukwe nke onye ọzọ.”—Rom 1:12, NW.