A Chọkwuru Ụmụnna Nwoke n’Ozi Ọsụ Ụzọ
1 Pọl gbara anyị ume ‘ịrụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè.’ (1 Kọr. 15:58) Nye ọtụtụ ndị, nke a pụtara iwere ọrụ ọsụ ụzọ. N’August a gara aga, a tụkwasịrị ihe karịrị 460 ná ndị na-asụ ụzọ na Nigeria!
2 Ka ọ dị ugbu a ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ ná mba a bụ ụmụnna nwanyị. (Abụ Ọma 68:11) Lee ihe ọṅụ ọ ga-abụrụ ọgbakọ ma ọ bụrụ na ụmụnna nwoke ndị ọzọ enwee ike isonyere ndị na-eje ozi oge nile! (Abụ Ọma 110:3) O kwere nghọta na ọtụtụ ụmụnna nwoke aghaghị ilekọta ibu ọrụ dị ukwuu nke ọrụ ego na nke ezinụlọ. Ndị ọzọ na-arụsikwa ọrụ ike iji lekọta mkpa ime mmụọ nke ọgbakọ. Anyị nwere ekele maka ndị ikom a, bụ́ ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’ihi Alaeze ahụ.—1 Tim. 4:10.
3 Ka o sina dị, unu bụ ụmụnna nwoke ùnu pụrụ iwerekwu ọrụ ọsụ ụzọ? Ọ bụrụ na nwunye gị na-asụ ụzọ, ị̀ pụrụ isonyere ya? Ọ bụrụ na ị lawo ezumike nká, ị́ gaghị ekweta na ọ dịghị ụzọ ka eju afọ isi jiri oge gị mee ihe karịa n’ozi oge nile? Ọ bụrụ na ị ka na-agụsị akwụkwọ, ì jiriwo ekpere chebara iwere ozi ịsụ ụzọ echiche siri ike dị ka ihe mgbakwasị ụkwụ maka ihe ùgwù ije ozi ndị ọzọ?—Efe. 5:15-17.
4 Otu nwanna nwoke rere azụmahịa ya na-enye ego ma weghara ọrụ nwa oge ka o wee nwee ike ịsụ ụzọ. N’ihi idu ndú ya dị mma, atọ n’ime ụmụ anọ ya ghọrọ ndị ọsụ ụzọ ozugbo ha gụsịrị akwụkwọ. Nke anọ dịkwa njikere isonyere ha. A gọziwo nwanna nwoke a na ezinụlọ ya n’ụba.
5 Ọnụ Ụzọ Dị Ukwuu Ghere Oghe: Ọrụ ọsụ ụzọ pụrụ imepe “ọnụ ụzọ dị ukwuu nke a ga-ejikwa rụsie ọrụ ike.” (1 Kọr. 16:9) A pụrụ iji ụmụnna nwoke bụ ndị ọsụ ụzọ mee ihe n’ụzọ dị ukwuu n’ime ọgbakọ. Ịnụ ọkụ n’obi n’ozi ubi na-atụkwasị ihe n’ọdịdị ime mmụọ ha, na-atụnyekwa ụtụ n’ọganihu ha n’ụzọ ọchịchị Chineke. Ọrụ ọsụ ụzọ pụrụ imepe ụzọ maka ihe ùgwù ka ukwuu nke ije ozi. Mgbe afọ mbụ nke ịsụ ụzọ gasịrị, e nwere ngọzi nke ịga Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ. Ndị ohu na-eje ozi na ndị okenye na-alụbeghị nwanyị pụrụ iru eru ịga Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi. Ụmụnna ndị nwoke pụrụ imesị ruo eru maka ọrụ njegharị. Ee, ọrụ ọsụ ụzọ na-emepe ụzọ maka ihe ùgwù ije ozi ndị a ka ukwuu ná nzukọ Jehova.
6 Ụmụnna nwoke ndị pụrụ iwepụta ohere maka ọrụ ịsụ ụzọ oge nile pụrụ inweta obi ụtọ ka ukwuu nke na-abịa site n’inyekwu ihe.—Ọrụ 20:35.