Ònye Ruru Eru Ime Nkwusa?
1 Mgbe a bịara n’ozi ahụ, ọ̀ dịwo mgbe ọ dịrị gị ka Mosis? Ọ sịrị: “Biko, Onyenwe anyị, Ọ bụghị onye ọkà okwu ka m bụ, ma ọ bụ na mgbe gara aga, ma ọ bụ site na mgbe Ị gwara ohu Gị okwu.” (Ọpụ. 4:10) Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, ọ pụrụ ịdị gị ka ọ bụ gị laa azụ. Ma, Jisọs ‘nyere anyị iwu ka anyị kwusaara ndị mmadụ, ka anyị kwusiekwa ya ike.’ (Ọrụ 10:42) Ya mere olee otú anyị si aghọ ndị nkwusa ruru eru nke ozi ọma?
2 Ọ bụghị ogo agụmakwụkwọ ụwa anyị na-eme ka anyị ruo eru maka ozi ahụ. Pọl sịrị na ‘a kpọghị ọtụtụ ndị maara ihe dị ka anụ ahụ si mara’ nakwa na “amamihe nke ụwa nke a bụ ihe nzuzu n’ebe Chineke nọ.” (1 Kọr. 1:26; 3:19) Jisọs họtara ndị ozi ya site n’ìgwè ndị na-arụ ọrụ ego—ọ dịkarịa ala anọ bụ ndị ọkụ azụ̀. Ndị ndú okpukpe dị mpako ledara ha anya dị ka “ndị na-amaghị ihe na ndị na-amụtaghị akwụkwọ.” E lee ha anya n’ụzọ ụwa si ele ihe anya, ndị ozi ahụ erughị eru ime nkwusa. Ma, okwu magburu onwe ya Pita kwuru n’ụbọchị Pentikọst kpaliri 3,000 mmadụ ịbụ ndị e mere baptism!—Ọrụ 2:14, 37-41; 4:13.
3 Jehova Na-eme Ka Anyị Ruo Eru Ime Nkwusa: Pọl kwupụtara, sị: “Iru eru anyị sitere na Chineke.” (2 Kọr. 3:5) Jehova, Isi Iyi nke amamihe, akụziworo ọtụtụ nde mmadụ ikwusara ndị ọzọ eziokwu Alaeze. (Aịsa. 54:13) A pụrụ ịhụ ịdị irè na ịmị mkpụrụ nke ọrụ a na 338,491 mmadụ e mere baptism n’afọ gara aga dị ka ‘akwụkwọ ozi ime ka a mata mmadụ’ bụ́ ndị dị ndụ. (2 Kọr. 3:1-3) Anyị nwere nnọọ ihe mere anyị ga-eji jiri nkwuwa okwu na nkwenyesi ike na-eme nkwusa banyere ihe anyị mụtaworo n’ọnụ Jehova.
4 Nzukọ Jehova ehiwewo usoro ihe omume nke ọzụzụ ná mba nile maka ndị ozi. N’iji Akwụkwọ Nsọ na ụba nke ihe ndị dị iche iche na-enye aka ịmụ Bible eme ihe, a na-akụziri anyị, na-azụkwa anyị ịbụ ndị ‘zuru okè’ ime nkwusa. (2 Tim. 3:16, 17) Nkà ihe ọmụma a na-achọta n’akwụkwọ Society emetụwo ọtụtụ ndị n’obi. Dị ka ihe atụ, otu akwụkwọ a na-ebipụta mgbe mgbe na Sweden kwuru, sị: “Ná nkwado maka okwukwe Ndịàmà Jehova na-ekwusa, e nwere ọkpọka sayensị Bible dị ịtụnanya na nke na-emetụta mba nile.”
5 Site ná nduzi a na-enye ná nzukọ ise anyị kwa izu, usoro ihe omume anyị nke ọgụgụ Bible na ọmụmụ ihe, ndụmọdụ a na-enye n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, enyemaka onwe onye nke ndị ozi ọzọ nweworo ahụmahụ na-enye, na karịsịa, nkwado nke mmụọ nsọ Jehova, obi pụrụ isi anyị ike na Jehova na-ele anyị anya dị ka ndị ruru nnọọ eru ime nkwusa. “Dị ka ndị sitere na Chineke, ọ bụ n’ihu Chineke, n’ime Kraịst ka anyị na-ekwu.”—2 Kọr. 2:17.
6 Ọ bụrụ na anyị ejiri ọzụzụ ọchịchị Chineke nke Chineke na-enye site ná nzukọ ya mee ihe n’ụzọ zuru ezu, anyị agaghị enwe ihe ọ bụla mere anyị ga-eji laa azụ ma ọ bụ tụọ egwu. Anyị pụrụ iji ọṅụ kwusaara ndị ọzọ, na-ejide n’aka na Jehova ga-agọzi mgbalị nile anyị.—1 Kọr. 3:6.