Onyinye Maka Ọrụ Society Gburugburu Ụwa Na-akwado Mgbasawanye
Dị ka e buru n’amụma n’Aịsaịa 54:2, 3, ofufe dị ọcha nke Jehova anọgidewo na-agbasa n’ụwa dum. Nke a na-agụnye ala dị iche iche na kọntinent Africa na àgwàetiti ndị dị nso. N’ime iri afọ gara aga, e wepụwo mgbochi n’ọrụ Alaeze n’ebe ndị dị ka Angola, Cameroon, Equatorial Guinea, Etiopia, Madagascar, Malawi, Mozambique, na Togo. N’ala ndị a na ndị ọzọ ebe ubi ahụ chaworo acha maka owuwe ihe ubi, ndị ozi ala ọzọ nke Gilead, ndị gụsịrị akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi, ndị ezinụlọ Betel, na ndị ọzọ ewerewo ọrụ.—Mat. 9:37, 38.
O doro anya na mmụba nke ndị na-efe ezi ofufe ná nzukọ Jehova na-eme ka owuwu nke ọtụtụ narị Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ dị mkpa. Ọ dịwokwa mkpa ime atụmatụ maka Ụlọ Mgbakọ na alaka ụlọ ọrụ ndị ọhụrụ ma ọ bụ ndị sara mbara karị. Inye ego maka ọrụ ndị a nakwa ime ka ọrụ Alaeze ahụ na-aga n’ihu ọ bụghị nanị n’Africa kamakwa n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa ewepụwo ihe dị ukwuu n’onyinye a na-enweta maka ọrụ Society gburugburu ụwa.
Foto na ihe osise dị na peji abụọ nke ihe ntinye a na-enye gị nghọta ụfọdụ nke ihe Society nọ na-agbalị ịrụzu n’ubi Africa. Ihe e gosiri bụ ụfọdụ ihe owuwu na-aga n’ihu ugbu a na ọrụ ndị ga-amalite n’isi nso.
Site n’ile anya na chaatị ozi ubi dị na 1996 Yearbook, ị pụrụ ịghọtakwu ihe ndị nkwusa ná mba ndị a na-eme n’ozi. Mmụba ndị pụtara ìhè ewerewo ọnọdụ n’ọtụtụ ala, a na-egosipụtakwa ohere e nwere maka uto n’ọnụ ọgụgụ pụrụ iche nke ndị bịara Ememe Ncheta. Mgbe anyị bu n’uche ihe a na-arụzu n’Africa n’ebe a na na kọntinent ndị ọzọ dị ka akụkụ nke ọrụ nkwusa Alaeze ahụ na ime ndị na-eso ụzọ n’ụwa dum, ọ na-akụbanye n’ime anyị ihe ùgwù anyị nwere ịkwado ọrụ nke ezi ofufe n’ụzọ ihe onwunwe.—Luk 16:9; 1 Tim. 6:18.
[Foto dị na peeji nke 3]
Ụlọ Nzukọ Alaeze na KwaZulu-Natal, South Africa, nke e ji ụbọchị 9 wuo
[Foto dị na peeji nke 3]
Ụlọ Nzukọ Alaeze na-eweghị oké ego na Nigeria
[Foto dị na peeji nke 3]
Ụlọ Mgbakọ na Mozambique nke nwere oche maka 1,500 mmadụ, nke a ga-ewusị ka ọ na-erule ngwụsị 1996
[Foto dị na peeji nke 3]
Alaka ụlọ ọrụ Mozambique, nke ga-eru maka ịkwaba na ya ná ngwụsị 1996
[Foto dị na peeji nke 3]
Alaka Sierra Leone, e mere atụmatụ iwusị ya ná ngwụsị afọ a
[Foto dị na peeji nke 4]
Ụlọ Mgbakọ akụkụ ya ghesịrị oghe nke a rụsịworo na Mauritius, tinyere ogige alaka, nke a ga-ewusị ná mmalite 1997
[Foto dị na peeji nke 4]
Alaka Zimbabwe nke a na-ewu
[Foto dị na peeji nke 4]
Ụlọ Mgbakọ akụkụ ya ghesịrị oghe na alaka ọhụrụ a na-ewu na Senegal
[Foto dị na peeji nke 4]
Alaka ọhụrụ nke Kenya, n’isi obodo, bụ́ Nairobi
[Foto dị na peeji nke 4]
Alaka Madagascar, nke a ga-ewusị n’isi nso
[Foto dị na peeji nke 4]
Ụlọ alaka a na-eme atụmatụ ya maka Malawi