Usoro Ihe Omume Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze Na-aga n’Ihu
1 Ná Mgbakọ Distrikti “Ịdị n’Otu Alaeze” e nwere na United States na 1983, a mara ọkwa na a ga-enwe ụtụ ego pụrụ iche iji nye aka n’owuwu na ná mwugharị nke Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche dị gburugburu United States na Canada. N’oge ahụ, anyị amaghị ngọzi dị ukwuu ga-esi ná mmalite ahụ dị nta pụta. Anyị malitere ịhụ n’ụzọ zuru ezu karị ihe Abụ Ọma 92:4 kwuru n’ụzọ dabara adaba, sị: “N’ihi na I mewo ka m ṅụrịa site n’ọrụ Gị, Jehova: ọ bụ n’ọrụ nile nke aka Gị ka m ga-eti mkpu ọṅụ.”
2 Anyị na-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu ugbu a n’ihe a na-arụzu. Taa, usoro ihe omume nke iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ngwa ngwa n’ụwa nile na-aga n’ihu. N’ụzọ ụfọdụ, anyị nile nwere ihe ùgwù nke ikere òkè n’ọrụ a. Anyị na-eme otú a site n’inye onyinye ego ma ò buru ibu ma ọ dị nta iji nye aka kwado ọrụ nke iwukwu ebe ndị a na-anọ efe ofufe gburugburu ụwa. Ọtụtụ ụmụnna na-enyekwa ngwá ọrụ ha n’afọ ofufo maka iji ha eme ihe, tinyekwara oge ha, ike na nkà ha n’ihe owuwu ndị dị otú ahụ. Ihe ịga nke ọma ndokwa ahụ dum na-enwe bụ n’ihi nduzi, nkwado, na ngọzi bara ụba nke Jehova na-agọzi mgbalị anyị jikọtara aka na-eme.—Ọma 127:1.
3 Ọtụtụ alaka agbasowo ụkpụrụ ahụ e wepụtara na mbụ maka ọgbakọ ndị dị na United States. N’Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị dị n’ọtụtụ ala, e nwere igbe ebe ndị nkwusa na-etinye onyinye ha maka Ụtụ Ego Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Na United States, Ozi Alaeze Anyị nke March 1997 mara ọkwa mgbanwe e mere n’usoro ihe omume a. O kwuru, sị: “Kemgbe a malitere Ụtụ Ego Society Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze na 1983, ụmụnna ejiriwo mmesapụ aka nye onyinye, n’ụzọ dị otú a na-eme ka e nwee ike ịgbaziri ego maka iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ihe dị ka ọgbakọ 2,700 ná mba a eriteworị uru ná ndokwa a. Ọtụtụ ọgbakọ agaraghị enwe ike iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ ma ọ bụ ịrụzigharị ndị chọrọ nrụzi. E nwere oké mkpa ugbu a maka ịgbazinye ọgbakọ ndị dị ná mba ebe ndị e nwere ndakpọ akụ́ na ụba ego site n’ego ndị a e nyere n’onyinye. Society na ọgbakọ ndị ahụ, bụ ndị na-erite uru n’onyinye unu, nwere ekele dị ukwuu maka nkwado unu nọgidere na-akwado ndokwa a.”
4 Ịma ọkwa ahụ bụ òkù a kpọrọ maka ikerekwu òkè n’usoro ihe omume a nke iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ngwa ngwa. A ga-amụba ihe e ji Ụtụ Ego Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ịgụnye mkpa ụmụnna anyị nọ ná mba ndị ọzọ ka a ka ga-anọgide na-agbazinye ọgbakọ dị iche iche ego maka iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ná mba a. Isiokwu ọzọ nke sochiri n’Ozi Alaeze Anyị nke United States, nke August 1997, kwuru, sị: “A ka nwere mkpa maka iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ụwa nile. Nanị n’ime afọ ije ozi gara aga, e guzobere ọgbakọ 3,288 ndị ọhụrụ. Ọtụtụ n’ime ọgbakọ ndị a dị n’Africa, Eshia, n’Ebe Etiti nakwa n’Ebe Ndịda America, na n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe.”
5 Gịnị ka a rụpụtaworo kemgbe ahụ? Akwụkwọ 2001 Yearbook kọrọ, sị: “N’ihi ndokwa a, ná mba 30, ka ọ dị ugbu a, e wuchawo Ụlọ Nzukọ Alaeze dị 453, a nọkwa na-ewu 727 ndị ọzọ. [Na Nigeria, e wuru ma rara Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ dị 171 nye n’ime afọ ije ozi 2002.] E lekwasịwokwa anya karịsịa n’iwepụta ụkpụrụ ihe owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze kwesịrị ekwesị a ga na-agbaso ná mba ọ bụla bụ́ nke na-agụnye iji ihe e ji ewu ihe na usoro e si ewu ihe ndị dị n’ógbè ahụ eme ihe. Na Kenya, a na-eji nkume a wapụtara awapụta eme ihe; na Togo a na-ejikarị brik eme ihe; na [Nigeria nakwa na] Cameroon a na-ejikarị blọk e ji siment kpụọ eme ihe, e mesịa e tee ahụ́ ájá ahụ etee. N’ụzọ dị otú a, ụmụnna nọ n’ógbè ahụ na-enwe ike ịmụta ngwa ngwa nkà ndị a chọrọ iji rụọ ọrụ ndị dị mkpa ná mba ha.”
6 A pụrụ ịhụ ihe àmà nke ngọzi Jehova na-agọzi usoro ihe omume a na kọntinent ukwu bụ́ Africa. Ka ị na-ekiri foto nke Ụlọ Nzukọ Alaeze ụfọdụ e wuworo, chee echiche mmetụta ụdị ihe owuwu ahụ nweworo n’ọrụ Ndịàmà Jehova! Nke a bụ eziokwu n’akụkụ atọ pụtara ìhè—ịdị n’otu nke òtù ụmụnna anyị zuru ụwa ọnụ, mmetụta ọ na-enwe n’ógbè, na mmụba a na-enwe n’ọnụ ọgụgụ ndị na-abịa nzukọ ọgbakọ. Ọ bụ ezie na ihe ntinye a na-egosi Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị e wuru n’Africa, mbipụta Ozi Alaeze Anyị ndị ga-apụta n’ọdịnihu ga-elekwasị anya n’otú usoro ihe omume ahụ nke iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze si na-aga n’ihu n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa.
[Foto ndị dị na peeji nke 3]
CENTRAL AFRICAN REPUBLIC
Bimbo, Bangui
Begoua, Bangui
[Foto ndị dị na peeji nke 4]
Ukonga, Tanzania
[Foto dị na peeji nke 4]
Accra, Ghana
[Foto dị na peeji nke 4]
Salala, Liberia
[Foto dị na peeji nke 4]
Karoi, Zimbabwe
[Foto ndị dị na peeji nke 4, 5]
Allada, Benin—Ụlọ Nzukọ Alaeze nke dịbu adị
Allada, Benin—Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ
[Foto dị na peeji nke 5]
Kpeme, Togo
[Foto dị na peeji nke 5]
Sokodé, Togo
[Foto ndị dị na peeji nke 4, 5]
Fidjrosse, Benin
[Foto dị na peeji nke 6]
Lyenga, Zambia—Ụlọ Nzukọ Alaeze nke dịbu adị
[Foto dị na peeji nke 6]
Lyenga, Zambia—Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ
[Foto dị na peeji nke 6]
Kinshasa, Congo
[Foto dị na peeji nke 6]
Musambira, Rwanda