Soro Ndị Ọzọ Kerịta Ihe Dị Ka Mkpa Ha Si Dị
1 Jehova na-eme ndokwa igbo mkpa ime mmụọ anyị site n’aka “ohu” ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi. (Mat. 24:45-47) Ọtụtụ n’ime ndokwa ndị a dị n’ụdị akwụkwọ, Bible, mpịakọta Ụlọ Nche na Teta!, vidio, kaseti ndị a na-ege ege, na disk kọmputa ndị e ji eme nnyocha na Bible. Ihe ndị Jehova na-enye na-ezu ezu mgbe nile n’emefusịghị ha emefusị. Ọ na-atụ anya ka anyị na ibe anyị kerịta ha, na-ejide n’aka na onye ọ bụla ritechara uru.
2 Ọ na-efu ego buru ibu iji mepụta ihe ndị dị otú ahụ. Ọ bụ òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ na-akwụ ụgwọ mmefu ndị a. Nke a bụ eziokwu karịsịa kemgbe nzukọ a malitere ndokwa ikesa akwụkwọ n’ekwughị ego ole a ga-akwụ, na-adabere kpam kpam n’onyinye afọ ofufo iji kwụọ ụgwọ ihe ndị a na-emefu.
3 Ụzọ Anyị Pụrụ Isi Nye Aka: Anyị pụrụ ịṅa ntị na ndụmọdụ Pọl nke isoro ndị ọzọ kerịta ihe ‘dị ka mkpa ha si dị.’ (Rom 12:13) Mgbe anyị na-enye onyinye ego maka ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ, anyị so ụmụnna anyị n’ụwa nile kpọmkwem na-ekerịta ihe anyị nwere. N’iburu nke a n’uche, ụfọdụ ekpebiwo iwepụta ọnụ ego ụfọdụ kwa ọnwa inye n’onyinye maka ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ, dị ka ha na-eme maka mmefu ndị a na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ha ghọtara na a na-eji ego ndị a eme ihe ọ bụghị nanị maka ibipụta akwụkwọ kamakwa maka akụkụ nile nke ọrụ ahụ. Cheedị echiche abamuru dị ukwuu nke òtù ụmụnna anyị zuru ụwa ọnụ ga-enweta ma ọ bụrụ na ọtụtụ ndị karị ga na-ekerechi òkè anya na nke a.
4 Ọzọkwa, anyị pụrụ isoro ha kerịta ihe site n’ịdị na-ewetulata aka mgbe anyị na-atụ ọda ihe ndị anyị pụrụ nnọọ inweta. Ịtụ ọda nanị ihe ndị dị anyị mkpa n’ezie na-eme ka ụmụnna anyị ndị bi n’ebe ndị ọzọ nwee ike inweta ihe ime mmụọ ndị dịkwa ha mkpa iji bụrụ ndị siri ike na iji mee ka ọrụ nkwusa ahụ na-aga n’ihu n’akụkụ ebe ha bi.—Hib. 13:16.
5 Anyị kwesịrị iburu nke a n’uche karịsịa mgbe anyị na-atụ ọda ihe ndị na-efu Society ego buru ibu imepụta. Ndị a na-agụnye kaseti vidio, CD-ROM, nnukwu akwụkwọ ndị e ji eme nnyocha, mpịakọta Ụlọ Nche na Teta!, na kaseti ndị a na-ege ege. Kama ịtụ ọda ka onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ nweta nke ya, ezinụlọ dum hà pụrụ iji nanị otu na-eme ihe? Ọ bụrụ na anyị ebelata ihe anyị na-ewere maka onwe anyị, ọ ga-enye ndị ọzọ ohere inwetakwa ihe ọma ndị ahụ anyị na-enweta.—Fil. 2:4.
6 A pụrụ iji onyinye anyị na-enye n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na nke ndị nwere mmasị bụ́ ndị naara akwụkwọ anyị na-enye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ nke Society kwụọ akụkụ ụfọdụ nke ụgwọ akwụkwọ ndị anyị na-etinye n’ubi. Otú ọ dị, mgbe a bịara n’ihe metụtara akwụkwọ ndị anyị na-atụ ọda ya maka iji eme ihe n’onwe anyị, gụnyere akwụkwọ abụ, Yearbook, Bible deluxe, na ihe ndị ọzọ, anyị apụghị ịtụ anya ka ndị nọ n’èzí kwụọrọ anyị ụgwọ ihe ndị anyị chọrọ. Ndị ohu Jehova raara onwe ha nye bụ ndị bụ́ isi na-enye nkwado ego a. N’iburu nke ahụ n’uche, ọtụtụ ndị nkwusa na-eme atụmatụ ihe ihe ndị a pụrụ ịdị na-ada ma ọ bụrụ na a na-emepụta ha maka iji achụ nta ego, ha na-enyekwa onyinye ha na ya kwekọrọ. Dị ka ihe atụ, Bible deluxe, nke ọnụ ya na-acha ọlaedo ọlaedo pụrụ ịda ₦900 ma ọ bụ karịa, akwụkwọ e ji eme nnyocha pụrụ ịda ₦1,300 ma ọ bụ karịa, kalenda nwere àgwà zuru ezu a na-ekowe n’ájá pụrụ ịda ₦50 ma ọ dịkarịa ala, otu akwụkwọ mpịakọta e tinyere na CD-ROM na-ada site na ₦1,000 ruo ₦2,300 ma ọ bụ karịa, compact disc egwú na-ada ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ₦300, a na-erekarịkwa kaseti vidio ụfọdụ otú ahụ ọtụtụ mgbe. Enyeghị onyinye zuru iji kwụọ ụgwọ mmefu ndị a, n’ikpeazụ ga-ebelata ihe nzukọ a gaara enwe ike ịrụzu n’ime ka ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ na-aga n’ihu.
7 Jisọs kwuru na a ga-amata ezi ndị na-eso ụzọ ya nke ọma site n’ịhụnanya ha nwere n’ebe ibe ha nọ. (Jọn 13:34, 35) Mmesapụ aka anyị n’inye onyinye ihe onwunwe, na achọghị ọdịmma onwe anyị nanị n’isoro ndị ọzọ ekerịta ihe dị ka mkpa ha si dị, bụ n’ezie ụzọ ndị dị mma isi gosipụta na anyị bụ ezi ndị Kraịst.