Gosi na I Ji Ihe Ndị E Ji Akwado Ọrụ Ọchịchị Chineke Kpọrọ Ihe
1 Mgbe ọ na-eme ndokwa ịrụzi ụlọ nsọ ahụ, Eze Josaịa jara ndị e kenyere ịrụ ọrụ ahụ mma, na-ekwu, sị: “Ha na ndị ahụ agụghị ego nke a na-enye n’aka ha; n’ihi na ọ bụ n’ịkwesị ntụkwasị obi ka ndị ahụ na-eme ihe.” (2 Eze 22:3-7) Ojiji ndị ikom ahụ ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe pụtara ìhè n’ụzọ ha si jiri ego e nyefere ha n’aka mee ihe. Taa, ka anyị na-arụ ọrụ dị nsọ nke ozi ọma Chineke, ọ dịkwa mkpa n’otu aka ahụ ka anyị gosi ikwesị ntụkwasị obi n’ụzọ anyị si eji ego e nyefere anyị n’aka na-eme ihe.
2 N’ozi Ubi: Inwe ekele maka ozi dị oké mkpa nke dị ná mbipụta anyị dị iche iche na iburu n’uche ihe ọ na-ewe iji bipụta ha na-eme ka anyị jiri ha kpọrọ ihe nke ukwuu. Anyị ekwesịghị ịdị na-enye ndị na-egosighị ezi ekele maka ozi Bible akwụkwọ anyị aghara aghara. Ọ bụrụ na mmadụ egosi ntakịrị mmasị n’ozi ọma ahụ, anyị pụrụ inye ya traktị kama inye ya akwụkwọ ndị ọzọ.
3 Kesaa akwụkwọ n’ụzọ na-egosi na i ji ha kpọrọ ihe. Ahapụla ha n’ebe ọha na eze na-anọ, bụ́ ebe a ga na-atụsasị ha. Iji zere imefusi ihe, buru ụzọ gbakọọ akwụkwọ ole i nwere n’ụlọ tupu ị na-enwetakwu. Ọ bụrụ na mbipụta ọ bụla nke magazin gị na-afọ mgbe nile, chebara ibelata ọda gị echiche.
4 Akwụkwọ Ndị Ị Ga-eji Mee Ihe n’Onwe Gị: Anyị kwesịrị ịtụ ọda nanị maka mbipụta ndị dị anyị mkpa n’ezie. Anyị kwesịrị imeru ihe n’ókè karịsịa mgbe anyị na-etinye ọda maka Bible deluxe, Reference Bible, na akwụkwọ ndị ọzọ buru ibu, dị ka Concordance, Index, mpịakọta Insight, na akwụkwọ Proclaimers, bụ́ ndị na-ewe ego buru ibu iji mepụta ha.
5 Ị̀ na-ahụ na i dere aha gị na adres gị ná mbipụta ndị ị na-eji eme ihe n’onwe gị? Nke a na-enye aka ibelata iwere mbipụta ọzọ iji dochie ndị nke e dohiere edohie. Ọ bụrụ na akwụkwọ abụ, Bible, ma ọ bụ akwụkwọ e ji amụ ihe nke gị efunahụ gị, ikekwe ị pụrụ ịchọta ya n’ebe a chịkọtara ihe ndị furu efu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ n’ebe a na-enwe mgbakọ.—Luk 15:8, 9.
6 Ka anyị gbalịa iji akwụkwọ anyị na-eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya. Nke a bụ ụzọ isi na-egosipụta ikwesị ntụkwasị obi anyị n’iji ihe ndị e ji akwado ọrụ Alaeze ahụ ndị Jehova nyefere anyị n’aka na-eme ihe.—Luk 16:10.